Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ụwa A Nsogbu Juru, Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka?

N’ụwa A Nsogbu Juru, Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka?

Ọ̀ na-adị gị ugbu a ka nsogbu ndị juru n’ụwa ọ̀ kpawala gị aka ọjọọ karịa otú o metụrụla? N’ime nsogbu ndị a, olee nke na-eme n’ebe i bi?

  • agha

  • ọrịa na-efe efe

  • ọdachi ndị na-emere onwe ha

  • ịda ogbenye

  • ịkpọasị

  • tigbuo zọgbuo

Ọ na-abụ ọdachi dakwasị ọtụtụ ndị, ha achịrị obi n’aka. Ha na-echekwa na ụwa ha agwụla. Obi na-amapụ ụfọdụ ndị ma ihe ọjọọ mee ha. Ma, nsogbu mmadụ na-akadị njọ ma ọ bụrụ na mgbe ọ bụla ihe ọjọọ mere, ike ụwa na-agwụkarị onye ahụ, obi ana-amapụkarịkwa ya.

Ọ bụrụ na ihe ọjọọ emee, i kwesịrị ime ihe ozugbo ka i chebe ndị ị hụrụ n’anya na ihe i ji akpa afọ gị. I kwesịkwara ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ sie gị ike nakwa ka ị na-enwe obi ụtọ.

Gịnị ka i nwere ike ime ugbu a ka nsogbu ndị juru n’ụwa ghara ịna-akpakarị gị aka ọjọọ?