Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ

Mgbaghara

Mgbaghara

“MGBE M DỊ OBERE, NDỊ EZINỤLỌ ANYỊ NA-AKPARỊKARỊ IBE HA, NA-ABARỊTAKWA MBA.” Ihe a ka otu nwaanyị aha ya bụ Patricia kwuru. O kwukwara, sị: “Amụtaghị m ịgbaghara mmadụ. Mgbe m tolitere, m ka na-ebu iwe n’obi ruo ọtụtụ ụbọchị, nke na-eme m ụra aga n’anya.” N’eziokwu, ndụ anaghị atọ onye na-ewe iwe ọkụ na onye na-ebu iwe n’obi ụtọ. Nchọpụta ndị e mere gosiri na ndị na-anaghị agbaghara ndị ọzọ mmejọ nwere ike . . .

  • Ikwe ka iwe mebie adịm ná mma ha na ndị ọzọ, ya emee ka ha na-anọ naanị ha, owu ana-amakwa ha

  • Ịna-ekwe ka obere ihe kpasuo ha iwe, na-echegbukarị onwe ha ma ọ bụkwanụ daa mbà n’obi

  • Ịna-elekwasịkarị anya ná mmejọ e mejọrọ ha, nke ga-eme ka ha ghara ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ

  • Ịna-enwe obi amamikpe n’ihi na ha ma na ha kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ

  • Ịna-echegbukarị onwe ha ma ọ bụ rịawa ọrịa ndị dị ka ọbara mgbali elu, ọrịa obi, ahụ́ mgbu ndị dị ka ogbu na nkwonkwo na isi ọwụwa *

GỊNỊ BỤ MGBAGHARA? Mgbaghara bụ mmadụ ileghara mmejọ e mejọrọ ya anya, ghara iwewe iwe ma ọ bụ iburu onye ahụ mejọrọ ya iwe n’obi ma ọ bụkwanụ chewe otú ọ ga-esi emegwara. Mmadụ ịgbaghara ibe ya apụtaghị na onye ahụ na-akwado ihe ọjọọ, na-eme ka à ga-asị na ihe ahụ e mejọrọ adịchaghị njọ ma ọ bụkwanụ na o meghịdị eme. Kama, ọ bụ mkpebi mmadụ kpachaara anya mee nke na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya ma chọọ ka ya na ha dịrị n’udo nakwa ka ya na onye ahụ mejọrọ ya dịrị ná mma.

Mgbaghara na-egosikwa na mmadụ nwere nghọta. Onye na-agbaghara mmejọ ghọtara na anyị niile na-emejọ, ma ọ bụ na-emehie ma n’okwu ọnụ ma n’omume. (Ndị Rom 3:23) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”​—⁠Ndị Kọlọsi 3:⁠13.

Ihe ọ pụtaziri bụ na mgbaghara bụ otu ụzọ dị mkpa e si egosi ịhụnanya, nke bụ́ “ihe nkekọ zuru okè  nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Otu ụlọ ọgwụ aha ya bụ Mayo Clinic dere ihe ụfọdụ gbasara mgbaghara n’adres Ịntanet ha. Ha kwuru na mgbaghara na-eme ka . . .

  • Mmadụ na ndị ọzọ na-adị ná mma, onye ahụ aghọtakwa otú ihe si dịrị onye mejọrọ ya ma nweere ya ọmịiko

  • Obi na-eru mmadụ ala, onye ahụ na Chineke adịrịkwa ná mma

  • Nchegbu na esemokwu belata

  • Ihe ndị na-eme ka mmadụ daa mbà belata

GBAGHARA ONWE GỊ. Otu akwụkwọ aha ya bụ Disability & Rehabilitation kwuru na mmadụ ịgbaghara onwe ya ihe o mejọrọ bụ “ihe kacha esi ike omume,” ma ọ bụ ya “kacha mkpa maka ahụ́ ike mmadụ,” n’ihi na ọ na-eme ka obi na-eru mmadụ ala, ahụ́ agbasiekwa ya ike. Olee ihe ndị nwere ike inyere gị aka ịgbaghara onwe gị?

  • Ewerela onwe gị ka onye na-agaghị emejọ ihe, kama, ghọta na dị ka onye ọ bụla ọzọ, ị ga na-emejọ ihe.​—⁠Ekliziastis 7:20

  • Mụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ ka ị ghara ime ha ọzọ

  • Na-enwere onwe gị ndidi. Àgwà ọjọọ ụfọdụ i nwere agaghị apụ gị n’ahụ́ n’otu ntabi anya.​—⁠Ndị Efesọs 4:​23, 24

  • Meta ezigbo ndị enyi, ndị nwere obiọma, ga na-agba gị ume. Ma, ha ga-abụkwa ndị ga na-agwa gị eziokwu mgbe niile.​—⁠Ilu 13:20

  • Ọ bụrụ na i mejọọ mmadụ, kweta na i mejọrọ ya ma rịọ mgbaghara ozugbo. Ọ bụrụ na i mee udo, obi ga-eru gị ala.​—⁠Matiu 5:​23, 24

IHE BAỊBỤL KWURU NA-ABA URU

Mgbe Patricia anyị kwuru gbasara ya ná mbido malitere ịmụ Baịbụl, ọ mụtara ịgbaghara mmejọ. O kwuru, sị: “M kwụsịrị ịna-eburu ndị mmadụ iwe n’obi. Iwe anaghịzi eme m ụra aga n’anya, anaghịzikwa m eji iwe emeso ndị ọzọ ihe. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Chineke hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka ihe gaziere anyị.”

Otu nwoke aha ya bụ Ron kwuru, sị: “Agaghị m ekpebili ihe ndị ọzọ ga-eme ma ọ bụ kwuo. Ma, m nwere ike ikpebi nke m. M chọọ ịna-enwe udo, m ga-akwụsị iburu ndị ọzọ iwe n’obi. M bidoro ile udo na ibu iwe n’obi anya ka ihe abụọ na-emegide onwe ha. Ọ bụrụ na m chọrọ udo, m ga-akwụsị ibu iwe n’obi. Obi na-eruzi m ala ugbu a.”

^ para. 8 Ebe e si nweta ya: Ebe ụlọ ọgwu Mayo Clinic na Johns Hopkins Medicine na-edebe ihe n’Ịntanet nakwa akwụkwọ aha ya bụ Social Psychiatry and Psychiatric Epidemiology.