Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ụmụaka Na-eru Uju Nne Ha ma Ọ Bụ Nna Ha

Mgbe Ụmụaka Na-eru Uju Nne Ha ma Ọ Bụ Nna Ha

Ị̀ na-eru uju nne gị ma ọ bụ nna gị nwụrụnụ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe ga-enyere gị aka idi ya? Gụọ isiokwu a ka ị hụ otú Baịbụl si nyere ndị na-eto eto atọ aka idi ọnwụ nne ha ma ọ bụ nna ha.

AKỤKỌ DAMI

Dami

Isi bidoro wawa papa m. Ma, ọ bịara na-aka njọ nke mere ka mama m kpọọ ndị ụlọ ọgwụ ka ha jiri ụgbọala ha bịa buru ya. M ka na-echeta mgbe ahụ ha bu ya na-apụ. Amaghị m na ihe ahụ bụ nke ikpeazụ m ga-ahụ ya. Mgbe abalị atọ gachara, ọrịa ụbụrụ gburu papa m. Adị m naanị afọ isii mgbe ahụ.

Kemgbe ọtụtụ afọ, m nọ na-ata onwe m ụta maka ọnwụ papa m. Mgbe ụfọdụ, m cheta mgbe ahụ e bu ya na-apụ, mụ ajụọ onwe m, sị: ‘Gịnị mere m ji guzoro ebe ahụ, n’emeghị ihe ọ bụla?’ Mgbe ụfọdụ, m hụ ndị agadi na-arịa ọrịa, mụ ana-ajụ onwe m, ‘Gịnị mere papa m ji nwụọ, mana, ndị a ka nọcha ndụ?’ Ka oge na-aga, mama m nyeere m aka ịkwụsị izochi ihe dị m n’obi. Ndịàmà Jehova ibe anyị nyekwaara m aka.

Ụfọdụ ndị na-eche na ihe mee mmadụ, onye ahụ nwere ike iru uju ya ozugbo ma chefuo ya. Ma, ọ dịghị otú ahụ n’ebe mụnwa nọ, n’ihi na ọ bụ mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na anọ ka m bidoro ruwa nke bụ́ uju.

Ihe m na-agwa ndị na-eto eto nne ha ma ọ bụ nna ha nwụrụ bụ: “Kọọrọ onye ọzọ otú obi dị gị. Ọ bụrụ na ị kọọrọ mmadụ otú obi dị gị n’egbughị oge, o nwere ike ime ka i nweta onwe gị ngwa ngwa.”

N’eziokwu, ọ na-ewute m na papa m anọghịzi ya ka ọtụtụ ihe na-eme ná ndụ m. Ma, ihe e dere ná Mkpughe 21:4 kasiri m obi. Ebe ahụ sịrị na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”

AKỤKỌ DERRICK

Derrick

Ihe ụfọdụ m na-echeta gbasara papa m bụ oge ndị mụ na ya na-eso aga egbu azụ̀ na oge ndị anyị na-aga atụrụ ndụ n’ugwu. Ọ na-enwe mmasị ịga n’ugwu.

O nwere mgbe ọrịa obi nyetụrụ ya nsogbu. Echetara m otu ugbo ma ọ bụ ugbo abụọ m gara leta ya n’ụlọ ọgwụ mgbe m ka dị obere. Ma, amaghị m na ọrịa ya ahụ abụghị obere ọrịa. O mechara nwụọ n’ọrịa ahụ mgbe m dị afọ itoolu.

Asị m ka m begbuo onwe m n’ákwá mgbe ahụ. Ákwá m bere mere ka m nọrọ n’oké mwute, o nweghịkwa onye m chọrọ ikwusara okwu. Obi ajọtụbeghị m njọ otú a mbụ. Ike ihe niile gwụrụ m. Òtù ndị na-eto eto m nọ na ya na chọọchị anyị nyetụụrụ m aka ná mbido, ma mechaa gbahapụ m. Ha nọ na-agwa m okwu ndị dị ka, “Oge papa gị ezuola” ma ọ bụ, “Chineke akpọrọla ya” ma ọ bụkwanụ, “Ọ nọ n’eluigwe ugbu a.” Ihe ndị ahụ ha nọ na-agwa m ejughị m afọ. Ma, amaghị m ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.

Mama m na Ndịàmà Jehova mechara bido mụwa Baịbụl. Mụ na nwanne m nwoke mechakwara soro ha mụwa Baịbụl. Anyị matara ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, matakwa na Chineke kwere nkwa na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) Ma, amaokwu Baịbụl kacha nyere m aka bụ Aịzaya 41:10, ebe Chineke sịrị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.” Mmata m matara na Jehova nọnyeere m kasiri m obi mgbe ahụ, ka na-akasikwa m ruo taa.

AKỤKỌ JEANNIE

Jeannie

Mgbe m dị afọ asaa, ọrịa kansa gburu mama m. Ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, ọ dị m ka ọ̀ bụ ná nrọ. Echetara m na ọ nwụrụ n’ụlọ, mama nnukwu m na papa nnukwu m nọkwa ya mgbe o mere. O mere ka ebe niile daa jii. Echetakwara m na ihe anyị riri lakpuo n’anyasị ụbọchị ahụ bụ àkwá e ghere eghe. Ọ dị m ka ụwa m ò ji nwayọọ nwayọọ na-achọ ịghasasị.

Ma mgbe ahụ, ma mgbe afọ anọ gafechara, m weere ya na m kwesịrị ịgbalị kata obi ma lekọtawa nwanne m nwaanyị nke nta. N’ihi ya, m zochiri mwute m nọ na-enwe. Ruokwa taa, ihe mee m, m ka na-emekwa ka à ga-asị na ihe ahụ anaghị ewute m. Ime otú ahụ adịkwanụghị mma.

M ka na-echeta otú Ndịàmà Jehova nọ n’obodo anyị si nyere anyị aka mgbe ahụ. N’agbanyeghị na o tebeghị anyị bidoro ịga ọmụmụ ihe ha, ha kpasịrị anyị àgwà ka anyị na ha ọ̀ matala kemgbe ọtụtụ afọ. Echeghị m na papa m siiri anyị nri abalị ruo otu afọ n’ihi na ụmụnna na-ebutere anyị nri mgbe ọ bụla.

O nwere otu ebe m na-anaghị echefu echefu na Baịbụl. Ọ bụ n’Abụ Ọma 25:16, 17. N’ebe ahụ, Devid rịọrọ Chineke, sị: “Chee ihu n’ebe m nọ, meere m amara; n’ihi na anọ m naanị m, anọkwa m n’ahụhụ. Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịwo ọtụtụ; mee ka m si ná nsogbu m nọ na ya pụta.” Ịmata na Jehova nọnyeere m mgbe m nọ ná mwute kasiri m obi. Baịbụl enyerela m aka ịkwụsị ịna-echegbu onwe m ma tinye uche m n’ihe ndị ga-eme ka obi na-adị m mma, dị ka olileanya mbilite n’ọnwụ. Enwere m olileanya ịhụ mama m ọzọ mgbe ahụ́ ga-esi ya ike n’ime paradaịs.—2 Pita 3:13.

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-akasi ndị na-eru uju obi? Danloduo akwụkwọ aha ya bụ “Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ.” Ị ga-ahụ ya na www.jw.org/ig. Pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịzie AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.