Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 39

‘Lee Oké Ìgwè Mmadụ’

‘Lee Oké Ìgwè Mmadụ’

“Ahụrụ m, ma, lee! oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, . . . ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.”—MKPU. 7:9.

ABỤ NKE 60 Ọ Ga-eme Ka Ha Nweta Ndụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú ihe si dịrị Jọn onyeozi n’ihe dị ka n’afọ 95?

N’IHE dị ka afọ 95, ihe siiri Jọn onyeozi ezigbo ike. O meela agadi, nọrọkwa n’ụlọ mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs. Ọ dịkwa ka ọ̀ bụ ya bụ naanị onyeozi ka dị ndụ. (Mkpu. 1:9) Ọ ma na ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na-eduhie ọgbakọ dị iche iche ma na-akpata nkewa. O nwere ike ịdị ka a gaghịzi enwe ezigbo Ndị Kraịst n’oge na-adịghị anya.—Jud 4; Mkpu. 2:15, 20; 3:1, 17.

“Oké ìgwè mmadụ” ahụ Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ ka ha yi uwe mwụda na-acha ọcha, jirikwa igu nkwụ n’aka ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)

2. Dị ka e dere na Mkpughe 7:9-14, olee ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

2 Ọ bụ n’oge a ihe siiri Jọn ike ka Chineke gosiri ya ọhụụ ihe ga-eme n’ọdịnihu. N’ọhụụ ahụ, a gwara ndị mmụọ ozi ka ha jide ifufe nke oké mkpagbu ruo mgbe a kachara ndị ohu Chineke akara. (Mkpu. 7:1-3) Ndị ohu Chineke ahụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Ha ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. (Luk 12:32; Mkpu. 7:4) Jọn mechakwara hụ ìgwè mmadụ ọzọ. Otú ha si buo ibu mere ka o tie mkpu, sị: “Lee!” O nwekwara ike ịbụ na ihe mere o ji tie mkpu ahụ bụ na ihe ọ hụrụ juru ya anya. Gịnị ka Jọn hụrụ? “Oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.” (Gụọ Mkpughe 7:9-14.) Chegodị ụdị obi ụtọ Jọn nwere ịmata na a ga-enwe ọtụtụ ndị ga na-efe Chineke otú ọ chọrọ n’ọdịnihu.

3. (a) Gịnị mere ọhụụ ahụ Jọn hụrụ kwesịrị iji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike? (b) Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 O doro anya na ọhụụ ahụ mere ka okwukwe Jọn sie ike. O kwesịkwara ime ka okwukwe anyị sie ike karịa, n’ihi na anyị bi n’oge ọhụụ Jọn ahụ na-emezu. Ọtụtụ nde mmadụ taa amalitela ife Jehova, nweekwa olileanya ịgafe oké mkpagbu ahụ ma dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa.  N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si mee ka ndị ya mata ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ kemgbe ihe karịrị afọ iri asatọ. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe abụọ gbasara ìgwè mmadụ ahụ: (1) na ha buru ezigbo ibu nakwa (2) na ha si ebe dị iche iche n’ụwa. Ihe abụọ a kwesịrị ime ka okwukwe ndị niile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ sikwuo ike.

OLEE EBE OKÉ ÌGWÈ MMADỤ AHỤ GA-EBI?

4. Olee eziokwu Baịbụl ndị chọọchị na-aghọtaghị, oleekwa otú Ndị Mmụta Baịbụl si dị iche na ha?

Ndị chọọchị anaghị akụzi eziokwu Baịbụl na otu ụbọchị, ndị na-erubere Chineke isi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (2 Kọr. 4:3, 4) Taa, ọtụtụ chọọchị na-akụzi na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe ma ha nwụọ. Ma, ọ bụghị ihe Ndị Mmụta Baịbụl ole na ole, bụ́ ndị malitere ibi Ụlọ Nche n’afọ 1879, kụziri. Ha ghọtara na Chineke ga-eme ka ụwa a bụrụkwa Paradaịs nakwa na ọtụtụ nde mmadụ na-erubere Chineke isi ga-ebi n’ụwa a, ọ bụghị n’eluigwe. Ma, o were oge tupu ha aghọtachaa ndị ndị ahụ na-erubere Chineke isi ga-abụ.—Mat. 6:10.

5. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl chere gbasara otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ?

5 Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndị Mmụta Baịbụl ghọtakwara na Akwụkwọ Nsọ kwuru na a ‘ga-esi n’ụwa zụta’ ụfọdụ ndị ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe. (Mkpu. 14:3) Ha ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ Ndị Kraịst nyefere Chineke onwe ha, jirikwa obi ha niile fee ya mgbe ha nọ n’ụwa. Oké ìgwè mmadụ ahụ kwanụ?

6. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl chere gbasara oké ìgwè mmadụ ahụ?

6 N’ọhụụ ahụ, Jọn hụrụ oké ìgwè mmadụ ahụ ka ha “guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 7:9) Ihe a Baịbụl kwuru mere ka Ndị Mmụta Baịbụl chee na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ebikwa n’eluigwe otú ahụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-ebi. Ọ bụrụ na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ebi n’eluigwe, oleekwanụ ihe dị iche na ha abụọ? Ndị Mmụta Baịbụl chere na ọ ga-abụrịrị na oké ìgwè mmadụ ahụ bụ ndị na-erubereghị Chineke isi nke ọma mgbe ha nọ n’ụwa. Ọ bụ eziokwu na ha bitụrụ ndụ dị mma, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha ka nọ na chọọchị dị iche iche. Ndị Mmụta Baịbụl kwuru na ịhụnanya ndị ahụ hụrụ Chineke erughị nke iso Jizọs chịa. Ebe ọ bụ na oké ìgwè mmadụ ahụ ahụchaghị Chineke n’anya, ha ga-eru eru ịnọ n’ihu ocheeze ahụ n’eluigwe, ma ọ bụghị ịnọrọ n’ocheeze.

7. Ole ndị ka Ndị Mmụta Baịbụl chere ga-ebi n’ụwa n’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, gịnịkwa ka ha chere gbasara ndị fere Chineke tupu Jizọs abịa n’ụwa?

7 Oleezi ndị ga-ebi n’ụwa? Ndị Mmụta Baịbụl chere na a kpọrọchaa otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ na oké ìgwè mmadụ ahụ gaa eluigwe, a ga-ahapụ ọtụtụ nde ndị ọzọ ka ha biri n’ụwa na-enwe obi ụtọ n’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị. Ndị Mmụta Baịbụl echeghị na ndị ahụ ga-ebi n’ụwa ga-efe Jehova tupu Kraịst amalite ịchị. Kama, ha chere na a ga-akụziri ndị ahụ iwu Jehova n’oge ahụ Kraịst ga-achị. E mechazie, ndị nke mere ihe Jehova na-achọ ebiri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, e bibie ndị nupụrụ isi. A bịa ná ndị ga-abụ “ndị isi” n’ụwa n’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, Ndị Mmụta Baịbụl chere na ụfọdụ n’ime ha nwere  ike ịga eluigwe ma Kraịst chịchaa. Ụfọdụ n’ime ha ga-abụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ndị fere Chineke tupu Jizọs abịa n’ụwa.—Ọma 45:16.

8. Olee ụzọ ndị atọ Ndị Mmụta Baịbụl chere na e nwere iji mezuo ihe Chineke chọrọ?

8 N’ihi ya, Ndị Mmụta Baịbụl chere na e nwere ụzọ ndị mmadụ atọ. Ndị nke mbụ bụ otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. Ndị nke abụọ bụ oké ìgwè mmadụ bụ́ Ndị Kraịst na-ahụchaghị Chineke n’anya, ndị ga-eguzo n’ihu ocheeze Jizọs n’eluigwe. Ndị nke atọ abụrụ ọtụtụ nde mmadụ a ga-akụziri ihe Jehova na-achọ n’ụwa n’otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. * Ma, mgbe oge ruru, Jehova nyeere ha aka ịghọta ihe a nke ọma.—Ilu 4:18.

OTÚ JEHOVA SI MEE KA A GHỌTAKWUO EZIOKWU

Ebe a na-eme ọtụtụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa baptizim ná mgbakọ e mere n’afọ 1935 (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. (a) Olee otú o si bụrụ na oké ìgwè mmadụ ahụ nọ n’ụwa ma “guzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ”? (b) Gịnị mere otú e sizi ghọta Mkpughe 7:9 ji daba adaba?

9 Ọ bụ n’afọ 1935 ka Ndịàmà Jehova ghọtara nke ọma ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ. Ha matara na iguzo “n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ” apụtaghị na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-aga eluigwe. Kama, o nwere ihe iguzo n’ihu ocheeze ahụ pụtara. N’agbanyeghị na oké ìgwè mmadụ ahụ bi n’ụwa, otú ha si “guzo n’ihu ocheeze ahụ” bụ na ha ghọtara na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa ma na-erubere ọchịchị ya isi. (Aịza. 66:1) Otú ha si guzo “n’ihu Nwa Atụrụ ahụ” bụ na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ. O yiri ihe e kwuru na Matiu 25:31, 32, ebe sịrị na e mere ka “mba niile,” ma ndị ajọ omume, zukọta “n’ihu” Jizọs mgbe ọ nọ n’ocheeze ya dị ebube. O doro anya na mba ndị a niile nọ n’ụwa, ọ bụghị n’eluigwe. Ihe ọhụrụ a ha ghọtara n’afọ 1935 dabara adaba. O mere ka a ghọta ihe mere Baịbụl ekwughị na a kpọọrọ oké ìgwè mmadụ ahụ gaa eluigwe. Naanị ndị Baịbụl kwere nkwa ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe bụ otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, ndị ga-eso Jizọs ‘chịa ụwa.’—Mkpu. 5:10.

10. Gịnị mere o ji dị mkpa ka a kụziere oké ìgwè mmadụ ahụ ihe Jehova chọrọ tupu otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị?

10 Kemgbe afọ 1935, Ndịàmà Jehova si otú ahụ ghọta na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ bụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ga-eme ka oké ìgwè mmadụ ahụ gafee oké mkpagbu ahụ bụ na a ga-akụziri ha ihe Jehova chọrọ tupu otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị. Ha kwesịrị igosi na okwukwe ha siri ezigbo ike iji nwee ike “ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme” tupu otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị.—Luk 21:34-36.

11. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl ji chee na a ga-akpọrọ ụfọdụ ndị gaa eluigwe ma Kraịst chịchaa otu puku afọ?

11 Oleekwanụ maka echiche ahụ bụ́ na a ga-emecha kpọrọ ụfọdụ ndị ezi omume n’ụwa gaa eluigwe ma Kraịst chịchaa otu puku afọ? Ụlọ Nche Bekee nke February 15, 1913, kwuru na ihe ahụ nwere ike ime. Ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl nwere ike ịna-eche, sị: ‘Oleekwanụ ihe mere ọ ga-eji bụrụ ụwa ka ndị ji obi ha niile fee Jehova tupu Jizọs abịa ga-eketa, Ndị Kraịst na-ahụchaghị Jehova n’anya  agaa eluigwe?’ Ha chere otú ahụ n’ihi ihe abụọ ha ghọtahiere. Nke mbụ bụ ha chere na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ebi n’eluigwe. Nke abụọ abụrụ na ha chere na ezi omume oké ìgwè mmadụ ahụ agaghị eru ka nke Ndị Kraịst e tere mmanụ.

12-13. Olee ihe ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ ghọtara gbasara olileanya ha nwere?

12 Ma, anyị amụtala na kemgbe afọ 1935, Ndịàmà Jehova ghọtara nke ọma na ọ bụ ndị ga-agafe Amagedọn bụ oké ìgwè mmadụ ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ. Ha ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta’ n’ụwa a. Ha ga “na-eti mkpu n’oké olu, sị: ‘Nzọpụta anyị si n’aka Chineke anyị, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, nakwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.’ ” (Mkpu. 7:10, 14) Ihe ọzọ bụ na Akwụkwọ Nsọ kụziiri anyị na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ga-enweta “ihe ka mma” karịa nke ndị fere Chineke tupu Jizọs abịa n’ụwa. (Hib. 11:40) Ihe a mere ka ụmụnna anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa fee Jehova ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.

13 Olileanya a na-eme ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ obi ụtọ. Ha ghọtara na ọ bụ Jehova ga-ekpebi ebe ndị ji obi ha niile na-efe ya ga-anọ na-efe ya, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ̀ bụ n’ụwa. Ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ ghọtara na naanị ihe mere ha ji nwee olileanya a bụ obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ, nke mere o ji zite Jizọs Kraịst ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ha.—Rom 3:24.

HA BURU EZIGBO IBU

14. Mgbe afọ 1935 gachara, olee ihe mere ọtụtụ ụmụnna ji na-eche otú amụma gbasara oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi mezuo?

14 Mgbe Ndịàmà Jehova ghọtachara ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ n’afọ 1935, ọtụtụ ndị ka nọ na-eche otú ndị ahụ ga-ebi n’ụwa ga-esi ghọọ oké ìgwè mmadụ. Dị ka ihe atụ, Nwanna Ronald Parkin dị afọ iri na abụọ mgbe a ghọtara ndị ga-abụ oké ìgwè mmadụ ahụ. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, e nwere ihe dị ka iri puku ndị nkwusa ise na isii n’ụwa niile. Ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị e tere mmanụ. N’ihi ya, o yichaghị ka oké ìgwè mmadụ ahụ hà buru ezigbo ibu.”

15. Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ sirila na-ebukwu ibu?

15 Ma mgbe afọ ụfọdụ gachara, a malitere iziga ndị ozi ala ọzọ n’ọtụtụ mba, nke mere ka Ndịàmà Jehova na-ebukwu ibu. N’afọ 1968, a malitere iji akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Otú akwụkwọ ahụ si kọwaa eziokwu  Baịbụl dị mfe nghọta, nke mere ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ karịa otú ha batatụrụla. N’ime afọ anọ, ihe karịrị ọkara nde mmadụ mere baptizim. Mgbe ọtụtụ ndị si na Chọọchị Katọlik na-apụta na Latịn Amerịka nakwa ná mba ndị ọzọ, a kagbuokwa iwu a machiri anyị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop nakwa ná mba ụfọdụ n’Afrịka, nde kwuru nde mmadụ mekwara baptizim. (Aịza. 60:22) N’afọ ndị na-adịchabeghị anya, nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi. O doro anya na e nweela oké ìgwè mmadụ. Ugbu a, ha karịrị nde mmadụ asatọ.

HA SI EBE DỊ ICHE ICHE N’ỤWA

16. Olee ebe oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi?

16 Mgbe Jọn na-ede ọhụụ ahụ, o dere na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi ná “mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile.” Zekaraya ebula ụzọ buo amụma na ụdị ihe ahụ ga-eme. O dere, sị: “Ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche ga-ejide, ee, ha ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu, sị, ‘Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’”—Zek. 8:23.

17. Olee ihe a na-eme iji nyere ndị si ná mba niile na asụsụ niile aka?

17 Ndịàmà Jehova ghọtara na ọ bụ ikwusa  ozi ọma n’ọtụtụ asụsụ ga-eme ka e nwee ndị si n’asụsụ niile ga na-efe Jehova. Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri atọ, anyị na-asụgharị ihe ndị e ji amụ Baịbụl. Ma, ugbu a, anyị na-asụgharị ihe ndị a karịa otú a sụgharịtụrụla ya kemgbe ụwa n’ihe karịrị narị asụsụ itoolu. O doro anya na isi ná mba niile na-akpọkọta oké ìgwè mmadụ bụ ọrụ ebube Jehova na-arụ n’oge anyị a. Ihe ndị a na-asụgharị n’ọtụtụ asụsụ emeela ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ jiri otu obi na-efe Jehova n’agbanyeghị na ha si ná mba dị iche iche. A ma Ndịàmà Jehova ama n’ụwa niile na ha na-ekwusasi ozi ọma ike, hụkwa ụmụnna ha n’anya. Ihe a na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.—Mat. 24:14; Jọn 13:35.

OLEE URU ỌHỤỤ AHỤ GA-ABARA ANYỊ?

18. (a) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 46:10, 11, gịnị mere o jughị anyị anya na Jehova emezuola amụma ahụ e buru gbasara oké ìgwè mmadụ ahụ? (b) Gịnị mere ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ anaghị eche na e nwere ihe funahụrụ ha?

18 Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka amụma gbasara oké ìgwè mmadụ ahụ. O jughị anyị anya na otú Jehova si mezuo amụma ahụ magburu onwe ya. (Gụọ Aịzaya 46:10, 11.) Obi dị oké ìgwè mmadụ ahụ ụtọ maka olileanya Jehova mere ka ha nwee. Ha anaghị eche na o nwere ihe funahụrụ ha ebe ọ bụ na Chineke ejighị mmụọ nsọ ya tee ha mmanụ ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe. Na Baịbụl, e nwere ndị nwoke na ndị nwaanyị nwere okwukwe, ndị Chineke nyere mmụọ nsọ ya, ma ha esoghị n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Otu n’ime ha bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Mat. 11:11) Onye ọzọ bụ Devid. (Ọrụ 2:34) Ha na ọtụtụ ndị ọzọ so ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ụwa ga-abụ paradaịs. Ha na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enwe ohere ha ga-eji gosi na ha na-akwado Jehova na ọchịchị ya.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ma anyị ghọta na ọhụụ ahụ Jọn hụrụ gbasara oké ìgwè mmadụ ahụ na-emezu n’oge anyị a?

19 O nwetụbeghị mgbe Chineke si ná mba niile kpọkọta ọtụtụ nde mmadụ, mee ka ha dịrị n’otu. Ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị kwesịrị ịna-enyere ọtụtụ ndị aka ka ha soro n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị so ‘n’atụrụ ọzọ.’ (Jọn 10:16) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka e nwee oké mkpagbu nke ga-ebibi ọchịchị niile na okpukpe niile na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Ihe ọma ga-emere ndị niile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ha ga-enwe ike ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa.—Mkpu. 7:14.

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

^ par. 5 N’isiokwu a, a ga-akọwa ọhụụ Jọn hụrụ, nke kwuru na a ga-achịkọta “oké ìgwè mmadụ.” O doro anya na ọ ga-eme ka okwukwe ndị niile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ sikwuo ike.

^ par. 8 Gụọ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 159-163.