Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 37

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Jiri Obi Anyị Niile Na-erubere Jehova Isi?

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Jiri Obi Anyị Niile Na-erubere Jehova Isi?

“Ọ̀ bụ na anyị agaghị edo onwe anyị n’okpuru Nna [anyị]?”—HIB. 12:9.

ABỤ NKE 9 Jehova Bụ Eze Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere Jehova isi?

ANYỊ kwesịrị ịna-erubere Jehova isi * n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Ebe ọ bụ ya kere anyị, ọ bụ ya kwesịrị ịna-agwa anyị ihe anyị ga na-eme. (Mkpu. 4:11) Ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji na-erubere ya isi bụ na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma. Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị achịala ndị mmadụ ibe ha. Ma, e were otú ha si achị tụnyere otú Jehova si achị, anyị ga-aghọta na ọ bụ Jehova kacha mara ihe, hụ anyị n’anya, na-eme ebere, ma na-eme amara.—Ọpụ. 34:6; Rom 16:27; 1 Jọn 4:8.

2. Gịnị na gịnị ka Ndị Hibru 12:9-11 kwuru mere anyị ji kwesị ịna-erubere Jehova isi?

2 Jehova chọrọ ka anyị na-erubere ya isi n’ihi na ọ bụ Nna anyị nke hụrụ anyị n’anya, ọ bụghị naanị maka na anyị na-atụ egwu ya. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, ọ kọwara na anyị kwesịrị ‘ido onwe anyị n’okpuru Nna’ anyị nke eluigwe n’ihi na ọ na-akụziri anyị ihe ga-abara anyị uru.—Gụọ Ndị Hibru 12:9-11.

3. (a) Olee otú anyị si egosi na anyị na-erubere Jehova isi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Otú anyị si erubere Jehova isi bụ ịgbasi mbọ ike na-eme ihe niile ọ gwara anyị mee nakwa ịgbalịsi ike ka anyị ghara iji aka anyị na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ilu 3:5) Anyị mata àgwà Jehova ndị magburu onwe ha, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-erubere ya isi. N’ihi  gịnị? N’ihi na ihe niile ọ na-eme na-egosi na o nwere àgwà ndị a. (Ọma 145:9) Ka anyị na-amụtakwu gbasara Jehova, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, ọ gaghị adị mkpa ka e depụtara anyị ọtụtụ iwu ga na-agwa anyị mee nke a ma ọ bụ emela nke a. Anyị ga na-amụta iche echiche na ile ihe anya otú Jehova chọrọ ma na-agbara ihe ọjọọ ọsọ. (Ọma 97:10) Ma, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịna-esiri anyị ike irubere Jehova isi. Gịnị kpatara ya? Gịnịkwa ka ndị okenye, ndị nna, na ndị nne nwere ike ịmụta n’aka Gọvanọ Nehemaya, Eze Devid, na Meri nne Jizọs? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

GỊNỊ MERE IRUBERE JEHOVA ISI NWERE IKE IJI SIERE ANYỊ IKE?

4-5. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 7:21-23, gịnị mere irubere Jehova isi nwere ike iji siere anyị ike?

4 Otu n’ime ihe mere irubere Jehova isi nwere ike iji siere anyị ike bụ na anyị niile ketara mmehie na ezughị okè. Ọ bụ ihe mere anyị ji achọkarị inupụ isi. Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi taa mkpụrụ osisi ọ sịrị ha atala, ha jizi aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 3:22) Taa, ọtụtụ ndị na-eleghara ihe Jehova kwuru anya ma na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.

5 O nwedịrị ike isiri ndị na-efe Jehova ike ịna-erubere ya isi mgbe niile. Ụdị ihe ahụ mere Pọl onyeozi. (Gụọ Ndị Rom 7:21-23.) Anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma otú ahụ Pọl chọrọ. Ma, anyị ga na-agbalịsi ike mgbe niile ka anyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ.

6-7. Olee ihe nke abụọ nwere ike ime ka o siere anyị ike irubere Jehova isi? Nye ihe atụ.

6 Ihe ọzọ nwere ike ime ka o siere anyị ike irubere Jehova isi bụ omenala obodo anyị na ebe anyị nọ too. Ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eche dị iche n’ihe Jehova chọrọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-eche echiche otú ụdị ndị ahụ si eche. Ka anyị leba anya n’otu ihe atụ.

7 N’ebe ụfọdụ, a na-agwakarị ndị na-eto eto ka ha jiri ndụ ha niile na-achụ ego. Ụdị nsogbu ahụ bịaara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mary. * Tupu ya amụta gbasara Jehova, ọ gara otu n’ime ụlọ akwụkwọ kacha ewu ewu n’obodo ha. Ndị ezinụlọ ya nọ na-enye ya nsogbu ka o nweta ọrụ ga-eme ka a na-akwanyere ya ùgwù ma na-akwụ ya ezigbo ụgwọ. Ọ bụkwa ihe yanwa chọrọ. Ma, mgbe ọ mụtara gbasara Jehova ma hụ ya n’anya, ọ gbanwere ihe ndị ọ chọrọ ime. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-ahụ ohere m gaara eji nwee ezigbo ego. Ma, ọ gaghị ekwe m jeere Jehova ozi otú m na-eme ugbu a. Ọ naghị adịrị m mfe ịjụ ya n’ihi ebe m toro. M na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ka m ghara ịnara ọrụ ga-eme ka m ghara ime ike m niile n’ofufe ya.”—Mat. 6:24.

8. Olee ihe anyị ga-amụ ugbu a?

8 Ọ bụrụ na anyị erubere Jehova isi, ọ ga-abara anyị uru. Ma, e nwere ihe ọzọ mere ndị okenye, ndị nna, ndị nne, na ndị ọzọ Chineke nyere ikike ji kwesị ịna-erubere Chineke isi. Ọ na-abara ndị ọzọ uru ma ha mee otú ahụ. Ka anyị mụọ gbasara ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ka anyị mụta otú anyị ga-esi jiri ikike Chineke nyere anyị mee ya obi ụtọ.

 IHE NDỊ OKENYE GA-AMỤTA N’AKA NEHEMAYA

Ndị okenye na-eso arụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze otú ahụ Nehemaya si soro rụzie mgbidi Jeruselem (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 11) *

9. Olee nsogbu ụfọdụ Nehemaya chọpụtara?

9 Jehova nyere ndị okenye ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ịzụ ìgwè atụrụ ya. (1 Pita 5:2) Ndị okenye nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe ma ha mụọ gbasara otú Nehemaya si meso ndị Jehova. Ebe Nehemaya bụ gọvanọ na-achị Juda, o nwere ikike ime ọtụtụ ihe. (Nehe. 1:11; 2:7, 8; 5:14) Chegodị nsogbu ụfọdụ Nehemaya chọpụtara. Ọ matara na ndị Juu emerụọla ụlọ nsọ nakwa na ha anaghịzi enye ndị Livaị onyinye Iwu Mozis kwuru ka a na-enye ha. Ndị Juu anaghịzi edebe iwu Ụbọchị Izu Ike. Ụfọdụ n’ime ha lụkwara ụmụ nwaanyị mba ọzọ. Gọvanọ Nehemaya kwesịrị ime ihe gbasara nsogbu ndị ahụ.—Nehe. 13:4-30.

10. Gịnị ka Nehemaya mere gbasara nsogbu ndị ahụ ọ chọpụtara?

10 Nehemaya ejighị ikike ya manyewe ha ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Kama, o kpesiri ekpere ike, rịọ Jehova ka o duzie ya. Ọ kụzikwaara ha Iwu Jehova. (Nehe. 1:4-10; 13:1-3) Nehemaya wetukwara onwe ya ala soro ha na-arụ ọrụ. O sodị ha rụzie mgbidi Jeruselem.—Nehe. 4:15.

11. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8, olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-emeso ndị nọ n’ọgbakọ?

11 O nwere ike ịbụ na nsogbu ndị okenye na-ahụ n’ọgbakọ abụghị ụdị nke ahụ Nehemaya chọpụtara. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ ha ga-esi na-eme ka ya. Dị ka ihe atụ, ha na-agbasi mbọ ike maka ụmụnna ha. Ha anaghịkwa ekwe ka ikike ha nwere mee ka ha dị mpako. Kama, ha na-eji obiọma emeso ọgbakọ. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.) Otú ha si agwa ndị ọzọ okwu na-egosi na ha hụrụ ha n’anya, dịrịkwa umeala n’obi. Otu nwanna aha ya bụ Andrew, bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ, sịrị: “Achọpụtala m na ọ bụrụ na okenye adịrị obiọma ma na-emeso ụmụnna ihe ka enyi, ọ na-eru ụmụnna n’obi. Àgwà ndị a na-eme ka ọgbakọ  na-eme ihe ndị okenye kwuru.” Okenye ọzọ bụ́ aka ochie aha ya bụ Tony kwuru, sị: “M na-agbalị ime ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:3 ma na-agbasi mbọ ike iwere na ndị ọzọ ka m. Ọ na-eme ka m ghara ịna-eme ka onye ọchịchị aka ike.”

12. Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịdị umeala n’obi?

12 Ndị okenye kwesịrị ịdị umeala n’obi otú ahụ Jehova dị. N’agbanyeghị na Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa, ọ “na-ewetu onwe ya ala” ka o nwee ike ‘isi n’ájá kulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.’ (Abụ Ọma 18:35; 113:6, 7) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị achọ iji anya ahụ ndị dị mpako ma ọ bụ ndị dị nganga.—Ilu 16:5.

13. Gịnị mere okenye kwesịrị iji ‘chịkwaa ire ya’?

13 Ọ bụrụ na okenye na-erubere Jehova isi, o kwesịrị ‘ịchịkwa ire ya.’ Ma ọ́ bụghị ya, o nwere ike ịgwa mmadụ okwu ọjọọ ma onye ahụ akwanyereghị ya ùgwù. (Jems 1:26; Gal. 5:14, 15) Andrew ahụ anyị kwuru okwu ya sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka ọ̀ bụ m gwa nwanna ọ bụla m chere na ọ kwanyereghị m ùgwù okwu ọjọọ. Ma, echeela m gbasara ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha ji obi ha niile fee Jehova. Ime otú ahụ nyeere m aka ịmụta uru ịdị umeala n’obi bara.” Otú ndị okenye si egosi na ha na-erubere Jehova isi bụ iji obiọma na-agwa ndị niile nọ n’ọgbakọ okwu, ma ndị okenye ibe ha.—Kọl. 4:6.

IHE NDỊ NNA NWERE IKE ỊMỤTA N’AKA EZE DEVID

14. Olee ọrụ Jehova nyere ndị nna, oleekwa ihe ọ chọrọ ka ha mee?

14 Jehova nyere ndị nna ọrụ ịbụ ndị isi ezinụlọ. Ọ chọrọ ka ha na-azụ ụmụ ha ma na-eduzi ha. (1 Kọr. 11:3; Efe. 6:4) Ma, ọ pụtaghị na ndị nna nwere ikike ime otú masịrị ha. Ọ bụ Jehova malitere ezinụlọ. N’ihi ya, ndị nna ga-aza ya ajụjụ otú ha si meso ndị ezinụlọ ha. (Efe. 3:14, 15) Ndị nna ga-egosi na ha na-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na ha ejiri ikike o nyere ha na-eme ihe dị ya mma. Ịmụ gbasara Eze Devid ga-enyere ha ezigbo aka.

Otú nna si ekpe ekpere kwesịrị igosi ndị ezinụlọ ya na ọ dị umeala n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Gịnị mere ndị nna ji kwesị ichebara ihe Eze Devid mere echiche?

15 Jehova họpụtara Devid ka ọ bụrụ onyeisi ezinụlọ ya na onyeisi mba Izrel niile. N’ihi ya, Devid nwere ikike ime ọtụtụ ihe. Mgbe ụfọdụ, o ji ikike ahụ mee ihe ọ na-ekwesịghị ime. (2 Sam. 11:14, 15) Ma, otú o si gosi na ọ na-erubere Jehova isi bụ na ọ nabatara aka ná ntị Jehova dọrọ ya. Ọ gbalịsiri ike ime  ihe Jehova kwuru. O ji obi ya niile kpee ekpere, gwa Jehova otú obi dị ya. (Ọma 51:1-4) Ihe ọzọ bụ na otú o si dị umeala n’obi mere ka ọ nabata aro ndị ọzọ tụụrụ ya, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. (1 Sam. 19:11, 12; 25:32, 33) Devid mụtara ihe n’ihe o mejọrọ ma mee ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha ya mkpa.

16. Olee ihe ndị nna ga-amụta n’aka Devid?

16 Ụfọdụ ihe ndị nna ga-amụta n’aka Eze Devid bụ: Ejila ikike Jehova nyere gị eme ihe ị na-ekwesịghị ime. Kweta ihe i mejọrọ, ma nabata ndụmọdụ ndị ọzọ si na Baịbụl nye gị. Ị na-eme otú ahụ, ndị ezinụlọ gị ga na-akwanyere gị ùgwù n’ihi na ị dị umeala n’obi. Mgbe gị na ndị ezinụlọ gị na-ekpe ekpere, gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi ka ndị ezinụlọ gị mata na ọ bụ ya ka ị tụkwasịrị obi gị niile. Nke ka nke bụ, mee ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha gị mkpa ná ndụ. (Diut. 6:6-9) I mee otú ahụ, ọ ga-abara ndị ezinụlọ gị ezigbo uru.

IHE NDỊ NNE NWERE IKE ỊMỤTA N’AKA MERI

17. Olee ọrụ Jehova nyere ndị nne?

17 Jehova nyere nne ọrụ dị ezigbo mkpa n’ezinụlọ. E nwekwara ikike o nyere ya iduzi ụmụ ya. (Ilu 6:20) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị nne kụziiri ụmụ ha nwere ike ịdị ha n’obi ná ndụ ha niile. (Ilu 22:6) Ka anyị leba anya n’ihe ndị nne nwere ike ịmụta n’aka Meri nne Jizọs.

18-19. Olee ihe ndị nne nwere ike ịmụta n’aka Meri?

18 Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ na-akwanyere Jehova ùgwù, ya na ya dịkwa n’ezigbo mma. Ọ dị njikere ime ihe ọ bụla Jehova chọrọ, ọ bụrụgodị na ihe ahụ ga-eme ka ndụ ya gbanwee.—Luk 1:35-38, 46-55.

Ọ bụrụ na ike gwụrụ nne ma ọ bụ na iwe ji ya, o nwere ike isiri ya ike igosi ndị ezinụlọ ya na ọ hụrụ ha n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf 19) *

19 Ọ bụrụ na ị bụ nne, e nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi na-eme ka Meri. Olee otú i nwere ike isi mee ya? Nke mbụ bụ na i kwesịrị ime ka gị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ Baịbụl na ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Nke abụọ bụ na i kwesịrị ịdị njikere ịna-agbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ gị iji mee Jehova obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ndị mụrụ gị na-ewekarị iwe ọkụ, na-agwakwa ụmụ ha okwu ọjọọ. I nwere ike ịna-eche na ọ bụ otú ahụ ka e kwesịrị isi na-azụ ụmụaka. Ugbu a ị mụtarala otú Jehova chọrọ ka e si na-azụ ụmụ, ọ ka nwere ike ịna-esiri gị ike inwere ụmụ gị ndidi ma jiri olu ọma na-agwa ha okwu, karịchaa ma ha mee ihe na-adịghị mma mgbe ike gwụrụ gị. (Efe. 4:31) Ụdị ihe ahụ mee, ihe kacha mkpa ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka. Otu nwanna  nwaanyị aha ya bụ Lydia kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-ekpesi ekpere ike ka m ghara iji iwe gwa nwa m okwu ma o nupụrụ m isi. O nwedịrị mgbe ụfọdụ m na-akwụsị ikwu ihe m chọrọ ikwu ma kpee ekpere n’obi m ka Jehova nyere m aka. Ekpere na-enyere m aka ijide onwe m.”—Ọma 37:5.

20. Olee nsogbu ụfọdụ ndị nne na-enwe, oleekwa otú ha nwere ike isi merie ya?

20 Nsogbu ọzọ ụfọdụ ndị nne na-enwe bụ na ọ na-esiri ha ike igosi ụmụ ha na ha hụrụ ha n’anya. (Taị. 2:3, 4) Ụfọdụ ndị nne toro n’ezinụlọ ndị nne na nna na ụmụ ha na-anaghị esi otu ụzọ aga. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, emela ihe ọjọọ ahụ nne na nna gị mere. Nne na-erubere Jehova isi nwere ike ịmụta otú ọ ga-esi egosi ụmụ ya na ọ hụrụ ha n’anya. O nwere ike isiri ya ike ịgbanwe otú o si eche echiche, otú obi dị ya nakwa otú o si akpa àgwà. Ma, ọ ga-emeli ya. O mee ya, ọ ga-abara ya na ezinụlọ ya uru.

AKWỤSỊLA ỊNA-ERUBERE JEHOVA ISI

21-22. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 65:13, 14, olee uru ndị anyị na-erite n’irubere Jehova isi?

21 Eze Devid maara uru irubere Jehova isi bara. O dere, sị: “Iwu Jehova ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ; ihe Jehova nyere n’iwu dị ọcha, na-eme ka anya na-enwu gbaa. E jiriwokwa ha dọọ ohu gị aka ná ntị; idebe ha na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.” (Ọma 19:8, 11) Taa, anyị nwere ike ịhụ ihe dị iche ná ndị na-erubere Jehova isi na ndị jụrụ irubere ya isi. Ndị na-erubere Jehova isi ‘na-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma.’—Gụọ Aịzaya 65:13, 14.

22 Ọ bụrụ na ndị okenye, ndị nna, na ndị nne ejiri obi ha niile na-erubere Jehova isi, ndụ ha ga-aka mma, ezinụlọ ha ga na-enwekwu obi ụtọ, ọgbakọ niile ana-adịkwukwa n’udo. Nke ka nke bụ na ha ga na-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) È nwere uru karịrị ya?

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị kwesịrị iji na-erubere Jehova isi. Anyị ga-amatakwa ihe ndị okenye, ndị nna, na ndị nne kwesịrị iji ikike Chineke nyere ha na-eme. Ha nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka Gọvanọ Nehemaya, Eze Devid, na Meri nne Jizọs.

^ par. 1 NKỌWAKWU: Irube isi na-ewe ndị mmadụ iwe ma ọ bụrụ na a manyere ha amanye irubere mmadụ isi. Ma, ndị Chineke na-eji aka ha kpebie irubere ya isi. N’ihi ya, irubere Chineke isi anaghị ewe ha iwe.

^ par. 7 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye so nwa ya nwoke na-arụzi ihe ụfọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, otú ahụ Nehemaya si soro na-arụzi mgbidi Jeruselem.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-edu ezinụlọ ya n’ekpere.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: Nwata nwoke ji ọtụtụ awa gwuo egwuregwu kọmputa mgbe ọ na-emebeghị ihe ndị o kwesịrị ime n’ụlọ ma ọ bụ rụọ ihe ndị nkụzi nyere ya rụọ. Mama ya ewetuo obi mgbe o si ọrụ lọta na-agbazi ya n’agwaghị ya okwu ọjọọ n’agbanyeghị na ike gwụchara ya.