ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 42

ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ekpere Gị Na-akakwu Mma

Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ekpere Gị Na-akakwu Mma

“ M ji obi m niile na-akpọ gị. Jehova, biko, za m. M ga-eso ntụziaka gị.”​—ỌMA 119:145.

IHE A GA-AMỤ

Ichebara ekpere ndị e dere na Baịbụl echiche ga-enyere anyị aka ime ka ekpere anyị na-akakwu mma.

1-2. (a) Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ịgwa Jehova otú ọ dị anyị n’obi ma anyị kpewe ekpere? (b) Olee otú anyị si mara na Jehova na-ewetu obi ege ntị n’ekpere anyị?

 Ị̀ CHỌPỤTALA na mgbe ụfọdụ, ihe ị na-eme bụ ịna-ekwu otu ihe mgbe ị na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ekwu ihe na-esighị gị n’obi? Ụdị ihe a nwere ike ime anyị niile. Mere nke a mere nke ọzọ nwere ike ime ka anyị na-egbu ekpere anyị nkenke mgbe niile. O nwedịrị ike isiri anyị ike ịgwa Jehova otú ọ dị anyị n’obi n’ihi na anyị chere na anyị erughị eru ịbịa n’ihu ya.

2 Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ihe dị Jehova mkpa abụghị otú okwu si aga anyị were were n’ọnụ ma anyị kpewe ekpere, kama ọ bụ ka anyị jiri obi anyị niile na-agwa ya okwu. Ọ na-anụ “arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ” ya. (Ọma 10:17) Ọ na-ewetu obi ege ihe niile anyị na-ekwu n’ihi na ihe gbasara anyị na-emetụ ya n’obi.​—Ọma 139:1-3.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Anyị nweziri ike ịjụ, sị: Gịnị mere anyị ji kwesị ịgwa Jehova okwu n’ekpere n’atụghị ụjọ? Olee otú anyị ga-esi mee ka ekpere anyị na-akakwu mma? Olee otú ichebara ekpere ndị e dere na Baịbụl echiche ga-esi enyere anyị aka ime ka ekpere anyị na-akakwu mma? Gịnị ka anyị nwere ike ime ma nchegbu mee ka anyị ghara ịma ihe anyị ga-agwa Jehova n’ekpere? Ka anyị zaa ajụjụ ndị a.

NA-AGWA JEHOVA OKWU N’EKPERE N’ATỤGHỊ ỤJỌ

4. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịgwa Jehova okwu n’ekpere n’atụghị ụjọ? (Abụ Ọma 119:145)

4 Anyị ghọta na Jehova bụ enyi anyị chọrọ ka ihe gaziere anyị, anyị ga na-agwa ya okwu n’atụghị ụjọ. Onye dere Abụ Ọma nke 119 gbalịrị ka ya na Jehova dịrị ná mma otú ahụ. Nsogbu zuru ya ahụ́. Ụfọdụ ndị ghagidere ya ụgha. (Ọma 119:23, 69, 78) Ya na ezughị okè nke ya nọkwa na-alụ. (Ọma 119:5) N’agbanyeghị ya, ụjọ atụghị ya ịgwa Jehova otú ọ dị ya n’obi.​—Gụọ Abụ Ọma 119:145.

5. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ikpe ekpere? Mee ihe atụ.

5 Jehova chọrọ ka ndị medịrị mmehie dị oké njọ na-agwa ya okwu n’ekpere. (Aịza. 55:6, 7) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ikpe ekpere. Dị ka ihe atụ, onye furu ụzọ ma na ya nwere ike ịjụ ndị mmadụ ajụjụ ka ọ mata ebe o kwesịrị isi. Ò kwesịrị ikwe ka ihere ma ọ bụ ụjọ mee ka ọ ghara ịjụ ajụjụ? Mba. Ọ na-echeta na onye ajụjụ anaghị efu ụzọ. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ime. Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka anyị amaghị ihe anyị ga-eme eme ma ọ bụ na anyị emehiela, anyị kwesịrị ịgwa Jehova okwu n’ekpere n’atụghị ụjọ.​—Ọma 119:25, 176.

OTÚ Ị GA-ESI MEE KA EKPERE GỊ NA-AKAKWU MMA

6-7. Olee otú iche banyere ụdị Chineke Jehova bụ ga-esi enyere anyị aka ka ekpere anyị na-akakwu mma? Mee ihe atụ. (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

6 Ọ bụrụ na anyị ana-akọrọ Jehova ihe anyị chere na otú ọ dị anyị n’obi, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi mee ka ekpere anyị na-akakwu mma?

7 Na-eche banyere ụdị Chineke Jehova bụ. a Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-agwa ya ihe anyị chere na otú obi dị anyị. (Ọma 145:8, 9, 18) Weregodị Nwanna Nwaanyị Kristine dị ka ihe atụ. Papa ya na-eme tigbuo zọgbuo. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Ọ dịghịrị m mfe ikweta na Jehova bụ Nna hụrụ m n’anya m ga na-agwa otú ọ dị m. M chere na ebe ndị m na-anaghị emeta ga-eme ka ọ jụ m.” Olee àgwà Jehova nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere mere ka obi ruo m ala. M ma na e nweghị mgbe ọ ga-ahapụ m. Ọ bụrụgodị na m daa, ọ ga-eji obiọma kulite m. Icheta ihe a na-eme ka ọ dịrị m mfe ịkọrọ ya ma ihe na-eme m ezigbo obi ụtọ ma ihe na-agbawa m obi.”

8-9. Olee uru ụfọdụ ọ na-aba ma anyị buru ụzọ chee banyere ihe anyị chọrọ ikpe n’ekpere? Mee ihe atụ.

8 Chee gbasara ihe ị ga-ekwu. Tupu gị ekpewe ekpere, i nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ: ‘Olee nsogbu ndị mụ na ha na-alụ ugbu a? È nwere onye m kwesịrị ịgbaghara? È nwere ihe gbanwere ná ndụ m n’oge na-adịbeghị anya m kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere m aka na ya?’ (2 Eze 19:15-19) Anyị nwekwara ike icheta otú Jizọs kụziiri anyị ka anyị si na-ekpe ekpere ma chee banyere ihe anyị nwere ike ịrịọ Jehova gbasara aha ya, Alaeze ya, na uche ya.​—Mat. 6:9, 10.

9 E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Aliska. O siiri ya ike ikpe ekpere mgbe ọ matara na di ya na-arịa ọrịa kansa n’ụbụrụ, nke ga-emecha gbuo ya. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Otú o si gbawaa m obi mere ka isi na-agba m ghara ghara nke na amaghị m ihe m ga-ekwu n’ekpere.” Gịnị nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Tupu mụ ekpewe ekpere, m na-ebu ụzọ chee ihe m ga-agwa Jehova ka m ghara ịna-ekwu naanị banyere onwe m na ọrịa na-arịa di m. O meela ka obi na-erukwu m ala, mụ enweekwa ike ịna-akọrọ Jehova ihe dị iche iche n’ekpere.”

10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịgba ekpere anyị ọsọ? (Kọwaakwa foto.)

10 Agbala ekpere gị ọsọ. Ọ bụ eziokwu na ekpere dị nkenke nwere ike ime ka anyị na Jehova dị ná mma, ma, ọ bụrụ na anyị ewepụta oge kpetee ekpere aka, o nwere ike ime ka anyị gwakwuo Jehova otú obi dị anyị. b Di Nwanna Nwaanyị Aliska aha ya bụ Elijah kwuru, sị: “M na-agbalị ikpe ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị. Iwepụta oge kpetee ekpere aka emeekwala ka mụ na Jehova na-adịkwu ná mma. Ọ naghị adị Jehova ọsọ ọsọ ka m kpechaa ekpere. N’ihi ya, m na-ewetu obi na-akọrọ ya ihe dị m n’obi.” Lee ihe i nwere ike ime: Chọta oge nakwa ebe ga-eme ka i nwee ike ikpe ekpere n’enweghị ihe ga-eme ka uche gị pụọ na ya. I nwedịrị ike ikpepụta ya ekpepụta. Gbalịakwa si otú a na-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro.

Chọta oge ị ga-eji na-ekpete ekpere aka na ebe ị ga-anọ na-ekpe ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


CHEE GBASARA EKPERE NDỊ OHU JEHOVA JI OBI HA NIILE KPEE NA BAỊBỤL

11. Olee uru ọ ga-abara gị ma i chee gbasara ekpere ndị ohu Jehova ji obi ha niile kpee na Baịbụl? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ọ̀ Dị Gị Otú Ọ Dị Ha?”)

11 O nwere ike ịbara gị uru ma i chee banyere ihe ndị ohu Jehova n’oge ochie kwuru n’ekpere ha nakwa n’abụ ndị ha ji too Jehova. Ka ị na-eche banyere otú ha si kọọrọ Jehova ihe niile dị ha n’obi, ọ ga-eme ka i nwee ike ịkọrọ ya otú ọ dị gị n’obi. I nwere ike isi na ya mụta okwu ọhụrụ ndị ị ga na-etinye n’ekpere gị. O nwekwara ike ime ka ị hụ ekpere ndị nwere ike ịdaba n’otú ihe si dịrị gị.

12. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị mgbe anyị na-eche gbasara ekpere ndị e dere na Baịbụl?

12 Ka ị na-eche gbasara ekpere e dere na Baịbụl, jụọ onwe gị, sị: ‘Ònye kpere ekpere ahụ? Olee otú ihe dịịrị ya? Gịnịkwa mere o ji kpee ya? Otú ihe si dịrị ya mgbe o kpere ekpere a ọ̀ bụ otú o si dịrị m? Olee ihe ndị m nwere ike ịmụta na ya?’ O nwere ike ịbụ na i kwesịrị imekwu nchọnchọ ka i nwee ike zaa ajụjụ ndị a. Ma, ime otú ahụ ga-abara gị ezigbo uru. Ka anyị leba anya n’ekpere anọ dị na Baịbụl.

13. Olee otu ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Hana gbasara ekpere? (1 Samuel 1:10, 11) (Kọwaakwa foto.)

13 Gụọ 1 Samuel 1:10, 11. Mgbe Hana kpere ekpere a, e nwere nsogbu abụọ bịaara ya. Ọ bụ nwaanyị aga. Nwunye di ya ekweghịkwa ya ṅụọ mmiri tọgbọ iko. (1 Sam. 1:4-7) Ọ bụrụ na i nwere nsogbu na-ekweghị ala ala, gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ekpere Hana? O wepụtara oge kọọrọ Jehova ihe niile na-echegbu ya. Mgbe o mechara otú ahụ, obi ruru ya ala. (1 Sam. 1:12, 18) Obi nwekwara ike iru anyị ala ma anyị “bunye Jehova ibu na-anyịgbu” anyị. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgwa ya ihe niile na-echegbu anyị na otú ha mere ka obi dị anyị.​—Ọma 55:22.

Mgbe Hana bụ nwaanyị aga, nwunye di ya ana-akọkwa ya ọnụ, ọ gwara Jehova otú ọ dị ya n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)


14. (a) Olee ihe ọzọ anyị na-amụta n’aka Hana? (b) Olee otú ịtụgharị uche n’ekpere ndị e dere na Baịbụl si eme ka ekpere anyị ka mma? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

14 Afọ ole na ole Hana mụchara nwa ya bụ́ Samuel, ọ kpọọrọ ya gakwuru Ịlaị bụ́ nnukwu onye nchụàjà. (1 Sam. 1:24-28) N’ekpere Hana ji obi ya niile kpee, o kwuru na obi siri ya ike na Jehova na-echebe ndị ji obi ha niile na-efe ya, na-elekọtakwa ha. c (1 Sam. 2:1, 8, 9) A ka nwekwara nsogbu ndị ha na ya na-alụ. Ma, kama ịna-eche naanị banyere ha, o bidoro iche banyere otú Jehova si gọzie ya. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ ga-adịrị anyị mfe idi nsogbu ọ bụla anyị nwere ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’otú Jehova sirila nyere anyị aka ruo ugbu a.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ekpere Jeremaya onye amụma kpere? (Jeremaya 12:1)

15 Gụọ Jeremaya 12:1. E nwere mgbe o ruru, obi ajọwa Jeremaya njọ mgbe ọ hụrụ na ihe na-agaziri ndị ọjọọ. Otú ndị Izrel ibe ya sikwa na-emeso ya nọ na-ewute ya. (Jere. 20:7, 8) O nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị ya ma anyị hụ ka ihe na-agaziri ndị aghụghọ ma ọ bụ ma a na-akwa anyị emo. Ọ bụ eziokwu na Jeremaya gwara Jehova ihe na-ewute ya, o nweghị mgbe ọ sịrị na ihe Jehova mere adịghị mma. Mgbe ọ hụrụ otú Jehova si dọọ ndị ya bụ́ ndị isi ike aka ná ntị, obi bịara sikwuo ya ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi. (Jere. 32:19) Anyịnwa nwekwara ike ịkọrọ Jehova ihe na-ewute anyị n’ekpere, obi esie anyị ike na mgbe oge ya ruru, ọ ga-emezi ihe ọ bụla mebiri emebi ugbu a.

16. Ọ bụrụ na nsogbu anyị mere ka anyị ghara imeli ihe ụfọdụ, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka otu onye Livaị a dọọrọ n’agha laa obodo ọzọ? (Abụ Ọma 42:1-4) (Kọwaakwa foto.)

16 Gụọ Abụ Ọma 42:1-4. Onye dere abụ a bụ onye Livaị a dọọrọ n’agha laa obodo ọzọ. O nweghịkwa ike iso ndị Izrel ibe ya fee Jehova n’ụlọ nsọ ya. Abụ ọma a gosiri otú obi dị ya. O nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị ya ma ọ bụrụ na ọrịa anaghị ekwe anyị pụọ èzí ma ọ bụ na a tụrụ anyị mkpọrọ n’ihi ihe anyị kweere. O nwere ike obi dịtụ anyị mma, ya ajọtụ anyị njọ. Ma, anyị kwesịrị ịkọrọ Jehova otú ọ bụla ọ dị anyị n’obi. Ime otú ahụ nwere ike inyere anyị aka ịghọtakwu otú obi dị anyị ma mee ka anyị cheta ihe kacha mkpa. Dị ka ihe atụ, onye Livaị ahụ ghọtara na ọ ga-enwe ohere ndị ọzọ ọ ga-eji too Jehova. (Ọma 42:5) Ọ tụgharịkwara uche n’otú Jehova si na-elekọta ya. (Ọma 42:8) Ikpesi ekpere ike nwere ike inyere anyị aka ichebara otú obi dị anyị echiche, mee ka obi ruo anyị ala, anyị enwetakwa ike anyị ga-eji tachie obi.

Onye Livaị dere Abụ Ọma nke 42 gwara Jehova otú ọ dị ya n’obi. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa Jehova otú ọ dị anyị n’obi, o nwere ike ime ka anyị na-echeta ihe kacha mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


17. (a) Gịnị ka anyị na-amụta n’ekpere Jona onye amụma kpere? (Jona 2:1, 2) (b) Olee otú ihe ụfọdụ e kwuru n’Abụ Ọma nwere ike isi nyere anyị aka ma ihe siere anyị ike? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

17 Gụọ Jona 2:1, 2. Jona onye amụma kpere ekpere a mgbe ọ nọ n’afọ nnukwu azụ̀. Ọ bụ eziokwu na o nupụụrụ Jehova isi, obi siri ya ike na ọ ga-anụ ekpere ya. N’ekpere ahụ, Jona kwuru ọtụtụ ihe dị n’Abụ Ọma. d Ọ ga-abụrịrị na ọ ma Abụ Ọma ndị ahụ nke ọma. Ichebara ha echiche mere ka obi sie ya ike na Jehova ga-enyere ya aka. Otú ahụkwa ka ịgbalị bute amaokwu Baịbụl ụfọdụ n’isi nwere ike ime ka anyị cheta ha ha akasie anyị obi ma anyị kpeere Jehova ekpere mgbe ihe siri ike.

NA-EKPERE JEHOVA EKPERE MGBE NIILE KA GỊ NA YA NA-ADỊKWU NÁ MMA

18-19. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịma ihe anyị ga-agwa Jehova n’ekpere, olee ihe na-akasi obi e kwuru ná Ndị Rom 8:26, 27? Mee ihe atụ.

18 Gụọ Ndị Rom 8:26, 27. Mgbe ụfọdụ, nchegbu nwere ike ime ka anyị ghara ịma otú anyị ga-esi kọwaara Jehova otú obi dị anyị. Ma, e nwere ihe ga-enyere anyị aka. N’ụdị oge ahụ, mmụọ nsọ Chineke “na-arịọrọ anyị arịrịọ.” Olee otú o si eme ya? Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka e dee ọtụtụ ekpere n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Mgbe anyị na-agaghị akọwali ihe anyị chere, Jehova nwere ike iwere ihe ụfọdụ e kwuru n’ekpere ndị ahụ ka arịrịọ anyị chọrọ ịrịọ ya, ya aza ha.

19 Icheta ihe a nyeere otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Rọshịa aka. Aha ya bụ Yelena. A nwụchiri ya maka ikpe ekpere na ịgụ Baịbụl. Nchegbu mere ka o siere ya ike ikpe ekpere. Ọ sịrị: “M chetaziri na o ju m obi nke na amaghị m ihe m ga-ekpe n’ekpere, Jehova ga-ewere ekpere ndị ahụ e dere na Baịbụl ndị ohu ya n’oge ochie kpere . . . ka arịrịọ m chọrọ ịrịọ. . . . Ihe a kasiri m nnọọ obi mgbe ihe siiri m ezigbo ike.”

20. E nwee ihe na-echegbu anyị, olee otú anyị nwere ike isi kwadebe obi anyị tupu anyị ekpee ekpere?

20 E nwee ihe na-echegbu anyị, o nwere ike isiri anyị ike ime ka uche anyị dịrị n’ekpere anyị na-ekpe. Ihe nwere ike inyere anyị aka ịkwadebe obi anyị bụ ige akwụkwọ Abụ Ọma nke a na-egere egere. Anyị nwekwara ike ịgbalị dee otú ọ dị anyị edee, otú ahụ Eze Devid mere. (Ọma 18; 34; 142 na okwu mmeghe.) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị naanị otu ụzọ anyị kwesịrị isi kwadebe obi anyị tupu anyị ekpee ekpere. (Ọma 141:2) Mee nke ọ bụla kaara gị mma.

21. Gịnị mere anyị ga-eji jiri obi anyị niile na-ekpe ekpere?

21 Ọ na-eme anyị ezigbo obi ụtọ ịmata na Jehova na-aghọta otú obi dị anyị tupudị anyị ekwuo ihe ọ bụla. (Ọma 139:4) Ma, ọ chọrọ ka anyị gwa ya otú obi dị anyị nakwa otú anyị tụkwasịruru ya obi. N’ihi ya, ụjọ atụla gị ịgwa Nna gị nke eluigwe okwu n’ekpere. Si n’ekpere ndị e dere na Baịbụl mụta ihe. Jiri obi gị niile na-ekpe ekpere. Na-akọrọ Jehova ihe ndị na-eme gị obi ụtọ na ihe ndị na-agbawa gị obi. Ebe ọ bụ ezigbo Enyi gị, ọ ga na-enyere gị aka mgbe niile.

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

a Gụọ “Ụfọdụ n’ime àgwà ndị kachanụ Jehova nwere” dị n’akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova, n’isiokwu bụ́ “Jehova.”

b Ekpere a na-ekpe n’ihu ọha iji nọchite anya ọgbakọ na-adịkarị nkenke.

c N’ekpere Hana kpere, o kwuru ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ndị Mosis dere. Ọ ga-abụ na o wepụtara oge chebara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ echiche. (Diut. 4:35; 8:18; 32:4, 39; 1 Sam. 2:2, 6, 7) Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Meri bụ́ nne Jizọs ji okwu ndị yiri ndị nke ahụ Hana kwuru too Chineke.​—Luk 1:46-55.

d Ị chọọ ịhụ ihe atụ ndị ọzọ, i nwere ike ịtụle otú Jona 2:3-9 na Abụ Ọma 69:1 16:10; 30:3; 142:2, 3; 143:4, 5; 18:6; 3:8 si yie. Usoro e si dee amaokwu Baịbụl ndị a dabara n’ihe Jona kwuru n’ekpere o kpere.