ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 43
ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M
Na-echeta Ndị Ọzọ n’Ekpere
“ Na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere . . . Ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.”—JEMS 5:16.
IHE A GA-AMỤ
Ihe mere icheta ndị ọzọ n’ekpere ji dị mkpa na otú anyị ga-esi na-eme ya.
1. Olee otú anyị si mara na ekpere anyị dị Jehova mkpa?
EKPERE bụ onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị. Chegodị banyere ya: E nwere ọrụ ụfọdụ Jehova nyere ndị mmụọ ozi. (Ọma 91:11) E nwekwara ọrụ ndị dị ezigbo mkpa o nyere Ọkpara ya. (Mat. 28:18) Ma, è nwere onye o nyefere ọrụ ige ntị n’ekpere anyị? Mbanụ. Jehova kpebiri iji aka ya na-anụ ekpere anyị. Baịbụl kpọrọ ya “Onye na-anụ ekpere.”—Ọma 65:2.
2. Olee ihe ọma Pọl onyeozi mere n’ihe gbasara icheta ndị ọzọ n’ekpere?
2 Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịgwa Jehova hoo haa ihe ndị dị anyị mkpa, ma anyị kwesịkwara ịna-echeta ndị ọzọ n’ekpere. Pọl onyeozi mere otú ahụ. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, ọ sịrị ha: “M na-echetakwa unu n’ekpere mgbe niile.” (Efe. 1:16) Pọl chetakwara ndị mmadụ n’ekpere n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Timoti, sị: “Ana m ekele Chineke . . . Ọ bụ ya mere m ji echeta gị, ehihie na abalị, mgbe ọ bụla m na-arịọsi Chineke arịrịọ ike.” (2 Tim. 1:3) Pọl nwere ihe ndị na-echegbu ya o kpere ekpere maka ha. (2 Kọr. 11:23; 12:7, 8) Ma, o wepụtara oge cheta ndị ọzọ n’ekpere.
3. Gịnị nwere ike ime ka anyị chefuo icheta ndị ọzọ n’ekpere?
3 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichefu icheta ndị ọzọ n’ekpere. Maka gịnị? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sabrina a kwuru otu ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Ọrụ zuru anyị ahụ́ n’ụwa ochie a. Iche banyere nsogbu anyị nwere ike ime ka anyị na-ekpe ekpere naanị gbasara mkpa anyị.” Ị̀ chọpụtala na ọ na-eme gị mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka. Ọ ga-akọwa (1) ihe mere icheta ndị ọzọ n’ekpere ji dị mkpa nakwa (2) otú i nwere ike isi eme ya.
GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI NA-ECHETA NDỊ ỌZỌ N’EKPERE?
4-5. Olee otú icheta ndị ọzọ n’ekpere nwere ike isi ‘kpaa ezigbo ike’? (Jems 5:16)
4 Icheta ndị ọzọ n’ekpere “na-akpa ezigbo ike.” (Gụọ Jems 5:16.) Icheta ndị ọzọ n’ekpere ò nwere ike ịgbanwe ihe ga-eme ha? Ee. O nwere ike. Jizọs ma na Pita onyeozi ga-agọnahụ ya n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, ọ gwara Pita, sị: “Arịọsiela m arịrịọ ike ka ị ghara ịda mbà n’okwukwe.” (Luk 22:32) Pọl makwa na ekpere nwere ike ịgbanwe ihe na-eme mmadụ. Mgbe a tụrụ ya mkpọrọ arụrụala na Rom, o degaara Faịlimọn akwụkwọ ozi, sị: “Ekpere unu nwere ike ime ka a hapụ m, mụ enweekwa ike ịbịa hụ unu.” (Faị. 22) Ọ bụ ihe mechara mee. Ọ dịghị anya, Pọl esi na mkpọrọ pụta, kwusawakwa ozi ọma ọ na-ekwusa.
5 Ma, ọ pụtaghị na ikpe ekpere ga-eme ka anyị manye Jehova ka o mee ihe anyị chọrọ. Ọ ma ihe na-echegbu ndị ohu ya. Mgbe ụfọdụkwa, ọ na-emere ha ihe ha rịọrọ ya. Iburu ihe a n’obi ga-enyere anyị aka ịrịọsi Jehova arịrịọ ike gbasara nsogbu ọ bụla, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-eme ihe kacha mma banyere ya.—Ọma 37:5; 2 Kọr. 1:11.
6. Anyị cheta ndị ọzọ n’ekpere, olee otú o nwere ike ime ka obi dị anyị gbasara ha? (1 Pita 3:8)
6 Icheta ndị ọzọ n’ekpere na-eme ka anyị mụta ‘inwere ha obi ebere.’ (Gụọ 1 Pita 3:8.) Obi ebere na-eme ka anyị hụ ahụhụ mmadụ na-ata ma chọọ inyere ya aka. (Mak 1:40, 41) Otu okenye aha ya bụ Michael sịrị: “M cheta ndị ọzọ n’ekpere, ọ na-eme ka m ghọtakwuo nsogbu bịaara ha ma hụkwuo ha n’anya. Ihe gbasara ha na-emetụkwu m n’obi, ọ bụrụgodị na ha amaghị.” Okenye ọzọ aha ya bụ Richard kwuru uru ọzọ ọ na-aba. Ọ sịrị: “Anyị cheta mmadụ n’ekpere, ọ na-eme ka anyị chọkwuo ime ihe ga-abara ya uru.” Ọ sịkwara: “Anyị nyere onye anyị chetara n’ekpere aka, e nwere ike ikwu na anyị na-enye aka ka a za ekpere ahụ anyị kpere maka ya.”
7. Olee otú icheta ndị ọzọ n’ekpere si enyere anyị aka ile nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị? (Ndị Filipaị 2:3, 4) (Kọwaakwa foto.)
7 Icheta ndị ọzọ n’ekpere na-enyere anyị aka ile nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị. (Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4.) Ebe anyị bi n’ụwa Ekwensu na-achị, onye ọ bụla n’ime anyị nwere nsogbu nke ya. (1 Jọn 5:19; Mkpu. 12:12) Ọ bụrụ na anyị ana-echeta ndị ọzọ n’ekpere mgbe niile, ọ ga-eme ka anyị na-echeta na ‘ụmụnna anyị niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ anyị na-ata.’ (1 Pita 5:9) Otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Katherine sịrị: “Icheta ndị ọzọ n’ekpere na-echetara m na nsogbu na-abịakwara ndị ọzọ. Iburu ihe a n’obi na-eme ka m ghara ịna-eche naanị gbasara nsogbu nke m.”
Icheta ndị ọzọ n’ekpere ga-enyere anyị aka ile nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) d
EKPERE ANYỊ GA-ABARA HA URU
8. Olee ndị anyị nwere ike ịna-echeta n’ekpere anyị?
8 Olee ndị anyị nwere ike ịna-echeta n’ekpere anyị? Anyị nwere ike icheta ọtụtụ ndị n’ekpere n’enweghị onye nke anyị kpọrọ aha, dị ka ndị ọrịa, ndị na-eto eto ụmụ akwụkwọ ibe ha na-achị ọchị ma ọ bụ na-anwa ha ka ha mee ihe ọjọọ, ma ọ bụkwanụ ndị ha na nká na-alụ. E nwere ọtụtụ ụmụnna anyị ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọchịchị na-akpagbu. (Mat. 10:18, 36; Ọrụ 12:5) Ụfọdụ ụmụnna anyị gbapụrụ n’ụlọ ha n’ihi tigbuo zọgbuo ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpatara. E nwekwara ndị nke ọdachi ndị na-emere onwe ha kpara aka ọjọọ. O nwere ike ịbụ na anyị amaghị ụmụnna ndị a n’otu n’otu. Ma, icheta ha n’ekpere na-egosi na anyị ‘hụrụ ibe anyị n’anya’ otú ahụ Jizọs kwuru ka anyị mee.—Jọn 13:34.
9. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-echeta ndị Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya nakwa ndị nwunye ha n’ekpere?
9 Anyị nwekwara ike icheta ụmụnna Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya n’ekpere. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi na ndị na-enyere ha aka, ndị so na Kọmitii Alaka, ndị na-elekọta ngalaba ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ, ndị nlekọta sekit, ndị okenye ọgbakọ, na ndị ohu na-eje ozi. Ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị a nwere nsogbu nke ha, ma ha ka na-agbasi mbọ ike inyere anyị aka. (2 Kọr. 12:15) Dị ka ihe atụ, otu onye nlekọta sekit aha ya bụ Mark sịrị: “Otu n’ime ihe ndị kacha siere m ike bụ na m nọ ebe dị ezigbo anya n’ebe nne na nna m merela agadi bi. Ha abụọ na-arịa ọrịa. Ọ bụ eziokwu na nwanne m nwaanyị na di ya na-egboro ha mkpa ha, ma ọ na-ewute m na anaghị m emeliri ha ihe niile m chọrọ imere ha.” Ma ànyị ma ihe na-echegbu ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike ma ọ bụ na anyị amaghị, anyị kwesịrị ịna-echeta ha n’ekpere. (1 Tesa. 5:12, 13) Anyị kwesịkwara ịna-echeta ndị nwunye ha n’ekpere n’ihi na ha ji obi ha niile na-akwado ndị di ha ka ha nwee ike ịna-eje ozi ha.
10-11. Ọ̀ na-amasị Jehova ma anyị rịọ ya ka o nyere ụmụnna anyị niile aka n’akpọghị onye nke ọ bụla aha? Kọwaa.
10 Dị ka anyị kwurula, anyị na-echetakarị ọtụtụ ụmụnna anyị n’ekpere n’akpọghị onye nke ọ bụla aha. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere ndị a tụrụ mkpọrọ aka ma ọ bụ ka ọ kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi n’akpọghị onye nke ọ bụla aha. Otu okenye aha ya bụ Donald sịrị: “Anyị nwere ọtụtụ ụmụnna nsogbu na-abịara. N’ihi ya, ihe anyị na-eme mgbe ụfọdụ bụ ịsị Jehova nyere ha niile aka ka a ghara inwe onye nke anyị ga-echefu.”
11 Ụdị ekpere ahụ ọ̀ na-amasị Jehova? À na-ajụkwa ajụ? A sị ka e kwuwe, anyị amaghị ihe bụ́ mkpa ụmụnna anyị niile. N’ihi ya, ọ dịghị njọ ma anyị rịọ Jehova ka o nyere ha niile aka. (Jọn 17:20; Efe. 6:18) Ekpere ndị ahụ na-egosi na anyị ‘hụrụ ụmụnna niile n’anya.’—1 Pita 2:17.
MGBE ANYỊ NA-ECHETA ỤMỤNNA ANYỊ N’EKPERE N’OTU N’OTU
12. Olee otú anya iru anyị ala ga-esi enyere anyị aka ịna-echeta ụmụnna anyị n’ekpere n’otu n’otu?
12 Ka anya na-eru gị ala. E wezụga icheta ụmụnna anyị niile n’ekpere n’akpọghị onye nke ọ bụla aha, anyị kwesịkwara ịna-echeta ha n’ekpere n’otu n’otu. È nwere nwanna nọ n’ọgbakọ unu na-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala? È nwere onye na-eto eto n’ọgbakọ unu obi na-ajọ njọ n’ihi nsogbu a na-enye ya n’ụlọ akwụkwọ? È nwere nwanna naanị ya na-agbalị ‘ịzụ nwa ya ma na-agbazi ya otú Jehova chọrọ’? (Efe. 6:4) Ọ bụrụ na ị na-eleru anya ala, ị ga na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya ma na-enwekwuru ha ọmịiko, nke ga-eme ka ị na-echeta ha n’ekpere. b—Rom 12:15.
13. Olee otú anyị nwere ike isi na-echeta ndị anyị na-ahụtụbeghị n’ekpere?
13 Na-akpọ aha nwanna ma i chetawa ya n’ekpere. Anyị nwedịrị ike ịkpọ ụmụnna anyị na-ahụtụbeghị aha ma anyị chetawa ha n’ekpere. Dị ka ihe atụ, chee gbasara ụmụnna anyị nọ na mkpọrọ n’obodo ndị dị ka Krimia, Eritria, Rọshịa, na Sịngapọ. Na jw.org, i nwere ike ịhụ aha ndị a tụrụ mkpọrọ. c Otu onye nlekọta sekit aha ya bụ Brian sịrị: “Achọpụtala m na idetu aha nwanna a tụrụ mkpọrọ na ịkpọpụta ya akpọpụta na-enyere m aka ịkpọ aha ya ma m kpewe ekpere n’onwe m.”
14-15. Olee otú anyị nwere ike isi na-akpọ okwu aha n’ekpere anyị?
14 Na-akpọ okwu aha. Nwanna Michael anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M gụwa banyere ụmụnna a tụrụ mkpọrọ na jw.org, m na-agbalị iche otú obi ga-adị m ma ọ bụrụ m ka a tụrụ mkpọrọ. Ama m na m ga na-echegbu onwe m gbasara nwunye m. M ga-achọkwa ịhụ na a na-egboro ya mkpa ya. Ihe a na-enyere m aka ịma ihe m ga-arịọ Chineke ma m kpewe ekpere maka ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ lụrụ nwaanyị.”—Hib. 13:3 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.
15 Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara otú ihe na-adịrị ụmụnna anyị nọ na mkpọrọ kwa ụbọchị, ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe ndị ọzọ anyị ga-ekpe n’ekpere. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikpe ekpere ka ndị na-eche ha nche nweere ha obi ebere, nakwa ka ndị ọchịchị kwe ha ka ha na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. (1 Tim. 2:1, 2) Anyị nwekwara ike ikpe ekpere ka otú nwanna a tụrụ mkpọrọ si atachi obi gbaa ndị ọgbakọ ha ume ma ọ bụ ka ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova hụ àgwà ọma ya ma gewe ntị n’ozi ọma. (1 Pita 2:12) Anyị nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ ma anyị kpewe ekpere maka ụmụnna ndị na-atachi obi n’ọnwụnwa ndị ọzọ na-abịara ha. Ọ bụrụ na anya ana-eru anyị ala, anyị ana-akpọ ụmụnna anyị aha ma anyị kpewe ekpere, na-akpọkwa okwu aha n’ekpere anyị, anyị na-egosi na anyị ‘na-ahụkwu ibe anyị n’anya.’—1 Tesa. 3:12.
ILE EKPERE ANYỊ ANYA OTÚ DỊ MMA
16. Olee otú anyị ga-esi na-ele ekpere anyị anya otú dị mma? (Matiu 6:8)
16 Dị ka anyị hụrụla, icheta ndị ọzọ n’ekpere nwere ike ịgbanwe otú ihe si dịrị ha. Ma, anyị kwesịrị ịna-ele ekpere anyị anya otú dị mma. Anyị kpewe ekpere, anyị anaghị agwa Jehova ihe ọ na-amaghị ma ọ bụ ihe kacha mma ọ ga-eme. Jehova ma ihe ndị ohu ya chọrọ tupudị hanwa ma ọ bụ anyịnwa amara ya. (Gụọ Matiu 6:8.) Gịnịzi mere anyị ga-eji na-echeta ndị ọzọ n’ekpere? E wezụga ihe ndị anyị kwurula n’isiokwu a, ime otú ahụ na-egosi na anyị na-eche banyere ndị ọzọ. Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka anyị na-echeta ibe anyị n’ekpere. Jehova na-enwekwa obi ụtọ ma ọ hụ ka ndị ohu ya na-eme ka ya.
17-18. Olee ihe atụ e nwere ike iji kọwaa ịna-echeta ụmụnna anyị n’ekpere?
17 Ọ bụrụgodị na ekpere anyị emeghị ka otú ihe si dịrị ụmụnna anyị gbanwee, ọ na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya. Jehova na-ahụkwa mbọ anyị gbara. Ka anyị jiri ihe atụ a kọwaa ya: Ka e were ya na n’otu ezinụlọ, e nwere ụmụaka abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị. Ahụ́ adịghị nke nwoke, nke nwaanyị arịọ papa ha, sị: “Biko, nyere nwanne m nwoke aka. Ezigbo ahụ́ adịghị ya.” Papa ha na-agbalị inyere nwa ya ahụ aka. Ọ hụrụ ya n’anya, na-elekọtakwa ya nke ọma. Ma, obi ga-adị ya ezigbo ụtọ na nwa ya nwaanyị hụrụ nwanne ya nwoke n’anya nke na ọ rịọrọ papa ya ka o nyere ya aka.
18 Ọ bụ ihe Jehova na-agwa anyị ka anyị mee. Ọ chọrọ ka anyị na-eche banyere ibe anyị ma na-echeta ha n’ekpere. Ime otú ahụ na-egosi na ọ bụghị naanị onwe anyị ka anyị hụrụ n’anya, kama na anyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Jehova na-ahụkwa mbọ anyị gbara. (2 Tesa. 1:3; Hib. 6:10) Dị ka anyị kwukwara, mgbe ụfọdụ, ekpere anyị nwere ike ime ka otú ihe si dịrị ndị ọzọ gbanwee. N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike na-echeta ibe anyị n’ekpere.
ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b Lee vidio dị na jw.org isiokwu ya bụ Takeshi Shimizu: Jehova Bụ “Onye Na-anụ Ekpere.”
c Ị chọọ ịhụ aha ụmụnna ndị a tụrụ mkpọrọ, gaa n’ebe a na-achọ ihe na jw.org denye “Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere.”
d NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna nwoke na nwaanyị na-echeta ndị ọzọ n’ekpere n’agbanyeghị na ha nwere nsogbu nke ha.

