Mmadụ Abụọ A Họpụtara Ọhụrụ Ka Ha Soro n’Òtù Na-achị Isi
N’ABALỊ ise n’ọnwa Ọktoba afọ 2024, a mara ọkwa pụrụ iche ná nnọkọ a na-enwe kwa afọ na a họpụtala Nwanna Jody Jedele na Nwanna Jacob Rumph ka ha soro n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ha abụọ efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ.
Nwanna Jody Jedele na Damaris nwunye ya
A mụrụ Nwanna Jedele na Mizuri dị n’Amerịka. Ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ, ya na ndị ezinụlọ ha bi nso n’ebe a na-anaghị ezikarị ozi ọma na ya. N’ihi ya, ọ matara ọtụtụ ụmụnna si ebe dị iche iche na-abịa enye aka ekwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Otú ha si hụ ndị ọzọ n’anya na otú ha si dị n’otu nyeere Nwanna Jedele ezigbo aka. O mere baptizim n’abalị iri na ise n’ọnwa Ọktoba afọ 1983. Ozi ọma na-atọ ya ezigbo ụtọ. Mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile n’ọnwa Septemba afọ 1989.
Mgbe Nwanna Jedele na-eto eto, ndị mụrụ ya na-akpọ ya na nwanne ya nwaanyị aga Betel. Ihe ahụ nyeere ha abụọ aka ịchọ ịga jewe ozi na Betel. Ha mechakwara mee otú ahụ. Nwanna Jedele malitere ije ozi na Betel dị na Wọlkil n’ọnwa Septemba afọ 1990. Ebe mbụ ọ rụrụ bụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ihicha Ihe. O mechakwara rụọ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ ike.
N’oge ahụ, ọgbakọ ndị na-eji asụsụ Spanish amụ ihe nọ na-ebukwu ibu. Ha chọkwara ụmụnna ga-abịa nyere ha aka. N’ihi ya, Nwanna Jedele sonyeere otu n’ime ha ma mụwa asụsụ Spanish. O teghị aka, ya ahụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Damaris. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile na sekit ahụ Nwanna Jedele nọ. Ha mechara lụọ, ya esoro ya jewe ozi na Betel.
N’afọ 2005, ha hapụrụ Betel ịga lekọta nne na nna ha ji obi ha niile na-efe Jehova. N’oge ahụ, ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Nwanna Jedele nyekwara aka kụzie ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, sorokwa na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ nakwa Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè.
N’afọ 2013, a kpọrọ Nwanna Jedele na nwunye ya ka ha lọghachi Betel soro rụọ ụlọ ndị a na-arụ na Wọwik. Kemgbe ahụ, ha ejeekwala ozi na Patasịn nakwa na Wọlkil. Nwanna Jedele rụrụ ọrụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ná Ngalaba Na-enyere Ndị Dọkịta Aka Ịgwọ Ndịàmà Jehova n’Ejighị Ọbara. N’ọnwa Mach afọ 2023, a họpụtara ya ka o soro ná Ndị Na-enyere Kọmitii Ije Ozi aka. Ka ọ na-eche gbasara ozi niile o jere, ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, e nye mmadụ ọrụ ọhụrụ, o nwere ike ịtụ ya ụjọ. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka o kwesịrị icheta ịtụkwasị Jehova obi n’ihi na ọ bụ ya na-eme ka anyị nwee ike ime ihe ọ bụla ọ sị anyị mee.”
Nwanna Jacob Rumph na Inga nwunye ya
A mụrụ Nwanna Rumph na Kalịfọnịa dị n’Amerịka. Mgbe ọ dị obere, mama ya akwụsịla ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Ma, mama ya gbalịrị ịkụziri ya eziokwu dị na Baịbụl. Kwa afọ, ọ na-aga eleta nne nne ya bụ́ ezigbo Onyeàmà Jehova. Nne nne ya nyeere ya aka inwe mmasị n’eziokwu. Mgbe ọ dị afọ iri na atọ, o kwuru ka a mụwara ya Baịbụl. N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Septemba afọ 1992, o mere baptizim. Obi dị anyị ụtọ na mama ya mechara malite ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe, papa ya na ụmụnne ya amalitekwa ime nke ọma ma mee baptizim.
Mgbe Nwanna Rumph na-eto eto, ọ hụrụ ụdị obi ụtọ ndị ọsụ ụzọ na-enwe. N’ihi ya, mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, o bidoro ịsụ ụzọ n’ọnwa Septemba afọ 1995. N’afọ 2000, ọ kwagara ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’Ekwedọ. N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ si Kanada. Aha ya bụ Inga. Ha mechara lụọ ma jewe ozi n’otu obodo dị n’Ekwedọ e nwere ndị nkwusa ole na ole. Taa, ọgbakọ na-eme nke ọma dịzi ebe ahụ.
Ka oge na-aga, a họpụtara Nwanna Rumph na nwunye ya ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nwanna Rumph mechakwara bụrụ onye nlekọta sekit. N’afọ 2011, a kpọrọ ha ka ha gaa klas nke otu narị na iri atọ na abụọ (132) nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe ha gụchara, ha jere ozi n’ọtụtụ ebe, jeekwa ụdị ozi oge niile dị iche iche, dị ka ozi Betel, ozi ala ọzọ, na ọrụ sekit. Nwanna Rumph kụzikwara n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.
Nwanna Rumph na nwunye ya mechara laghachi Amerịka n’ihi ọrịa koronavaịrọs. A kpọrọ ha ka ha jewe ozi na Betel dị na Wọlkil. N’ebe ahụ, e nyere Nwanna Rumph ọzụzụ ná Ngalaba Ije Ozi. E mechara zighachi ha Betel dị n’Ekwedọ, bụ́ ebe Nwanna Rumph sonyere na Kọmitii Alaka. N’afọ 2023, e zigara ha Wọwik. Na Jenụwarị afọ 2024, a họpụtara Nwanna Rumph ka o soro ná Ndị Na-enyere Kọmitii Ije Ozi aka. Mgbe ọ na-ekwu banyere ebe ndị o jerela ozi, ọ sịrị: “Ihe na-eme ka ozi anyị na-eje pụọ iche abụghị ebe anyị na-eje ya, kama ọ bụ ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ.”
Obi dị anyị ụtọ maka ọrụ ụmụnna ndị a na-arụsi ike. Anyị ‘jikwa ụdị ndị a kpọrọ ihe.’—Fil. 2:29.

