ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 40

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

Jehova ‘Na-eme Ka Anyị Na-enwe Nnukwu Aṅụrị’

Jehova ‘Na-eme Ka Anyị Na-enwe Nnukwu Aṅụrị’

‘ M ga-abịakwute Chineke, onye na-eme ka m na-enwe nnukwu aṅụrị.’​—ỌMA 43:4.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-ekwu ihe nwere ike ime ka anyị kwụsị ịna-enwe ọṅụ na ihe anyị ga-eme ka anyị malitekwa inwe ọṅụ.

1-2. (a) Olee otú obi na-adị ọtụtụ ndị taa? (b) Olee ihe anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a?

 ỌTỤTỤ ndị taa na-achụ obi ụtọ ka à na-anwụ anwụ. Ma, ezigbo obi ụtọ anaghị ekwe ha nnweta. Obi anaghị adị ọtụtụ ndị mma. Ha na-echekwa na e nweghị mgbe ihe ga-adịrị ha mma. Ụfọdụ ndị Jehova nwekwara ike ịna-eche otú ahụ. Ebe ọ bụ na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ,’ anyị ma na nsogbu ndị ‘tara akpụ’ nwere ike ịbịara anyị, meekwa ka anyị na-echegbu onwe anyị.​—2 Tim. 3:1.

2 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe ndị nwere ike ime ka anyị kwụsị ịna-enwe ọṅụ na ihe anyị ga-eme ka anyị malitekwa inwe ọṅụ. Ma, ka anyị buru ụzọ chọpụta Onye ga-enyere anyị aka ịna-enwe ezigbo ọṅụ.

JEHOVA GA-EMELI KA ANYỊ NA-ENWE EZIGBO ỌṄỤ

3. Gịnị ka ihe ndị Jehova kere na-akụziri anyị gbasara ya? (Kọwaakwa foto.)

3 Jehova na-enwe obi ụtọ kemgbe. Ọ chọkwara ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ihe niile o kere eke na-egosi na ọ na-enwe ọṅụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọmarịcha ụwa anyị, ọtụtụ ihe ndị nwere ụcha dị iche iche anyị na-ahụ, otú ụmụ anụmanụ si egwu egwu, na nri ndị na-atọgbu anyị atọgbu juru eju bara abara. N’eziokwu, Chineke hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka ndụ na-atọ anyị ụtọ.

Nwa enyí: Image © Romi Gamit/Shutterstock; ụmụ nnụnụ penguin: Vladimir Seliverstov/500px via Getty Images; ụmụ ewu: Rita Kochmarjova/stock.adobe.com; dọfịn abụọ: georgeclerk/E+ via Getty Images

Anyị hụ ka ụmụ anụmanụ na-egwu egwu, anyị na-echeta na Jehova na-enwe ọṅụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


4. (a) Gịnị mere Jehova ji na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ọ na-ahụ ahụhụ juru n’ụwa? (b) Olee onyinye Jehova nyere anyị? (Abụ Ọma 16:11)

4 N’agbanyeghị na Jehova bụ “Chineke, onye obi ụtọ,” ọ na-ahụ nchegbu na ahụhụ juru n’ụwa. (1 Tim. 1:11) Mana, o kweghị ka ihe a niile mee ka ọ kwụsị inwe ọṅụ. Ọ ma na ahụhụ niile agaghị adịte aka n’ihi na o kpebiela mgbe ọ ga-akwụsị ha. O nwere ndidi ma na-echere ụbọchị ọ ga-ewepụ iru uju na ịta ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Ka ọ dị ugbu a, Jehova ghọtara ahụhụ anyị na-ata, chọọkwa ịna-enyere anyị aka. Olee otú o si enyere anyị aka? Otu ụzọ o si eme ya bụ na e nwere onyinye o nyere anyị, ya bụ, ọṅụ. (Gụọ Abụ Ọma 16:11.) Ka anyị hụ otú o si nye Ọkpara ya bụ́ Jizọs otu onyinye ahụ.

5-6. Gịnị mere Jizọs ji enwe ọṅụ?

5 Ọ bụ Jizọs kacha enwe obi ụtọ n’ihe niile Chineke kere. N’ihi gịnị? Legodị ihe abụọ kpatara ya. (1) ‘O yiri Chineke, onye a na-enweghị ike ịhụ anya.’ Ọ bụkwa ya mere o ji na-enwe ezigbo ọṅụ. (Kọl. 1:15) (2) Jizọs na Nna ya anọọla ogologo oge karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụkwanụ Nna ya ka ọṅụ si n’aka.

6 Jizọs na-enwe obi ụtọ n’ihi na ọ na-eme ihe Nna ya chọrọ ka o mee mgbe niile. (Ilu 8:30, 31; Jọn 8:29) Ọ bụ ya mere Jehova ji jiri ya na-eme ọnụ.​—Mat. 3:17.

7. Olee otú anyị ga-esi na-enwe ezigbo ọṅụ?

7 Anyịnwa ga-enweli ezigbo obi ụtọ ma anyị na-amatakwu Jehova, Onye obi ụtọ si n’aka. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-amụ gbasara Jehova ma na-emekwu ka ya, anyị ga na-enwekwu obi ụtọ. Ihe ọzọ ga-eme anyị obi ụtọ bụ ịna-eme ihe Chineke gwara anyị ka anyị mee nakwa ịmata na ihe anyị na-eme dị ya mma. a (Ọma 33:12) Anyị nwere ike ịkwụsị inwe ọṅụ mgbe ụfọdụ. O nwere ike ịbụ ụbọchị ole na ole ma ọ bụdị ruo ogologo oge. Ụdị ihe ahụ mee, gịnị ka anyị ga-eme? Ọ̀ pụtara na ihe anyị adịghịzi Jehova mma? Mba. Anyị ezughị okè. Mgbe ụfọdụkwa, ihe nwere ike ịna-ewute anyị, na-agbawa anyị obi, ma ọ bụ mee ka anyị daa mbà. Jehova ma na ihe a nwere ike ime. (Ọma 103:14) Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe ọṅụ nakwa otú anyị ga-esi nwewekwa ọṅụ.

EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE KA Ị KWỤSỊ INWE ỌṄỤ

8. Olee ihe nsogbu nwere ike ime anyị?

8 Ihe nke 1: Nsogbu. O nwere ike ịbụ na ị na-ata ahụhụ maka mkpagbu, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ịda ogbenye, ọrịa, ma ọ bụ nká. Ihe ndị a nwere ike ime ka anyị kwụsị ịna-enwe ọṅụ, karịchaa ma ọ bụrụ na e nweghị ihe anyị ga-emeli gbasara nsogbu bịaara anyị. Baịbụl kwuru hoo haa na “ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na obi adịghị ya mma.” (Ilu 15:13) E nwere otu okenye aha ya bụ Babis. Nwanne ya nwoke na nne na nna ya nwụrụ n’ime afọ anọ. Ọ sịrị: “Ọ dị m ka m̀ nọ naanị m n’enweghị onye ga-enyere m aka. Mgbe ụfọdụ, obi na-agbawa m n’ihi na ihe ndị m nọ na-eme ekweghị m wepụta oge ka mụ na mama m, papa m, na nwanne m nwoke nọrịa tupu ha anwụọ.” N’eziokwu, nsogbu nwere ike ime ka ike gwụ anyị, obi ana-ajọkwa anyị njọ.

9. Gịnị nwere ike inyere anyị aka inwewekwa ọṅụ? (Jeremaya 29:4-7, 10)

9 Gịnị nwere ike inyere anyị aka inwewekwa ọṅụ? Anyị nwere ike inwewekwa ọṅụ ma anyị tinyere ụwa anyị obiọma ma kwụsị ịna-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-agaghị agbanweli. Ụwa na-eme ka ndị mmadụ chee na ihe ga-eme ka ha nwee obi ụtọ bụ ihe niile izuru ha. Mana, ọ bụghị eziokwu. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ka ha gbalịa na-enwe obi ụtọ ebe ahụ. (Gụọ Jeremaya 29:4-7, 10.) Gịnị ka ihe a na-akụziri gị? Gbalịa were ụwa gị otú i si hụ ya ma na-enwe obi ụtọ maka ihe ọma ndị na-emere gị. Cheta na Jehova ga na-enyere gị aka. (Ọma 63:7; 146:5) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Effie nwere ihe mberede mere ka ọ gharazie ịna-agali ije. Ọ sịrị: “Jehova, ndị ezinụlọ anyị, na ndị ọgbakọ anyị nyeere m ezigbo aka ma kwado m. M chọrọ igosi ha na obi dị m ụtọ maka ya. N’ihi ya, m gbalịrị ike m niile na-enwe obi ụtọ.”

10. Gịnị mere anyị nwere ike iji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na nsogbu abịara anyị?

10 Ọ bụrụgodị na otú ihe dịịrị anyị abụghị otú anyị tụrụ anya ya ma ọ bụ na e nwere ihe mere anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị, anyị ka ga-enweli obi ụtọ. b (Ọma 126:5) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ abụghị otú ihe si dịrị anyị. Otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Maria sịrị: “Nsogbu bịara gị, ị ka ga na-enwe obi ụtọ n’ihi na ị na-echeta nkwa Jehova kwere anyị. Ọ pụtaghị na ị gaghị ebe ákwá ma ọ bụ gosi otú obi dị gị. Ma, Nna anyị nke eluigwe ga-enyeliri gị aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu bịaara gị.” Cheta na n’agbanyeghị otú ihe si siere gị ike ugbu a, nsogbu anyị niile agaghị adịte aka. Ha yiri ụkwụ a zọrọ n’ebe ájá juru. Mmiri zohaala, ya efuo. Otú ahụ ka nsogbu anyị niile ga-ala ka naị n’oge na-adịghị anya.

11. Olee otú akụkọ Pọl onyeozi si gbaa gị ume?

11 Ọ bụrụkwanụ na i chewe ma nsogbu ndị na-abịara gị hà na-egosi na ihe gị anaghịzi amasị Jehova? Ihe nwere ike inyere gị aka bụ iche gbasara ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge gara aga nsogbu bịakwaara. Chegodị gbasara Pọl onyeozi. Ọ bụ Jizọs ji aka ya họrọ ya ka “ọ gbaara ndị mba ọzọ, ndị eze nakwa ndị Izrel àmà.” (Ọrụ 9:15) Jizọs nyere Pọl ọrụ dị ezigbo mkpa. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ nsogbu bịaara Pọl. (2 Kọr. 11:23-27) Nsogbu ndị ahụ zooro Pọl ka mmiri hà gosiri na ihe ya amasịghịzi Jehova? Mbanụ. Kama, otú o si tachie obi gosiri na Jehova gọziri ya. (Rom 5:3-5) Chegodị gbasara otú ihe si dịrị gị. Ị ka ji obi gị niile na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara gị. N’ihi ya, ka obi sie gị ike na ihe gị masịrị Jehova.

12. Olee otú ihe ndị anyị tụrụ anya ha na-emezughị nwere ike isi mee ka anyị kwụsị inwe ọṅụ?

12 Ihe nke 2: Ihe anyị tụrụ anya ya na-emezughị. (Ilu 13:12) Anyị hụrụ Jehova n’anya. Obi dịkwa anyị ụtọ maka ihe niile ọ na-emere anyị. N’ihi ya, anyị na-eche otú anyị ga-esi jiri ike anyị niile jeere ya ozi. Ma, e nwee ihe anyị chọrọ ime n’ozi ya anyị na-emelighị n’ihi otú ihe si dịrị anyị, obi nwere ike ịna-ajọ anyị njọ. (Ilu 17:22) Otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Holly sịrị: “M chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze, ije ozi ná mba ọzọ, ma ọ bụ iso rụọ Betel ọhụrụ a na-arụ na Ramapo. Ma, otú ihe si dịrị m gbanwere. Enweghịzi m ike ime nke ọ bụla n’ime ha. Obi jọrọ m ezigbo njọ. Ọ na-agbawa obi ma mmadụ chọọ ime ihe ụfọdụ, ma e nweghị nke o meliri.” E nwere ọtụtụ ndị ọ na-adị otú ahụ.

13. Ọ bụrụ na otú ihe si dịrị anyị ekweghị anyị mee ihe ụfọdụ n’ozi Jehova, olee ihe ndị anyị ga-emeli?

13 Gịnị nwere ike inyere anyị aka inwewekwa ọṅụ? Cheta na Jehova adịghị aka ike. Ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ihe mere o ji jiri anyị kpọrọ ihe abụghị ihe anyị rụpụtara n’ozi ya. Ọ chọrọ ka anyị dịrị umeala n’obi ma jiri obi anyị niile na-efe ya. (Maị. 6:8; 1 Kọr. 4:2) Ihe ka ya mkpa bụ ụdị mmadụ anyị bụ, ọ bụghị ihe ndị anyị na-eme n’ozi ya. Ọ̀ ga-adị mma ka ihe anyị na-atụ anya ime karịa ihe Jehova na-atụ anya ka anyị mee? c Mbanụ. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na otú ihe si dịrị gị ekweghị ka i mee ihe ụfọdụ ị chọrọ ime n’ozi Jehova, gbalịa lekwasị anya n’ihe ndị ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịna-azụ onye na-eto eto ma ọ bụ na-enyere ụmụnna ndị mere agadi aka. I nwere ike ịgbalị gaa leta mmadụ, kpọọ ya n’ekwentị, ma ọ bụ zigara ya ozi ga-agba ya ume. Jehova ga-agọzi gị ma mee ka ị na-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a bara ezigbo uru ị ga-emeli. Chetakwa na n’oge na-adịghị anya, anyị ga-enwe ohere buru ibu ijere ya ozi otú anyị na-atụghị anya ya n’ụwa ọhụrụ. Nwanna Nwaanyị Holly anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ike gwụwa m, m na-akwụsịtụ, chetara onwe m na m ga-adị ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na Jehova enyere m aka, m ga-emeli ihe ụfọdụ m chọrọ ime n’ozi ya n’ụwa ọhụrụ.”

14. Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe ọṅụ?

14 Ihe nke 3: Ikpori ndụ. N’Ịntanet, anyị na-ahụ ndị yiri ndị na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi na ha na-ekpori ndụ mgbe niile. Anyị nwere ike ichewe na anyị mewe ihe ọ bụla masịrị anyị, na-azụ ihe ọ bụla anyị chọrọ, na-agakwa ebe ọ bụla anyị chọrọ, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ dịghị njọ ịna-eme onwe anyị obi ụtọ. Jehova kere anyị otú ihe ndị mara mma ga na-eme anyị obi ụtọ. Ma, ọtụtụ ndị achọpụtala na ihe ndị ha chere ga-eme ha obi ụtọ mechara mewe ha obi ọjọọ. Otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Eva sịrị: “Mmadụ chewe naanị otú ọ ga-esi na-ekpori ndụ, e nweghị ihe ọ bụla ga-ezuru ya.” Ọ bụrụ na anyị ewere ikpori ndụ ka ihe kacha mkpa, obi agaghị na-adị anyị mma.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Solomọn?

15 Ihe ndị mere ná ndụ Eze Solomọn na-akụziri anyị nsogbu ikpori ndụ nwere ike ịkpata. Ọ gbalịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ya obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, o riri ezigbo nri, gee egwú na-atọ ụtọ, zụọkwa ihe ọma niile e nwere ike iji ego azụta n’oge ya. Mana, ihe a niile emeghị ya obi ụtọ. Ọ sịrị: “Ike anaghị agwụ anya ịhụ ihe; ike anaghịkwa agwụ ntị ịnụ ihe.” (Ekli. 1:8; 2:1-11) Ihe ndị mmadụ chere na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ dị ka ego adịgboroja. Ọ na-eyi ihe bara uru, mana e nweghị uru ọ bara.

16. Olee otú inyere ndị ọzọ aka nwere ike isi eme ka anyị nwewekwa ọṅụ? (Kọwaakwa foto.)

16 Gịnị nwere ike inyere anyị aka inwewekwa ọṅụ? Jizọs kụziiri anyị na “a na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Otu okenye aha ya bụ Alekos sịrị: “M na-agbalị ime obere ihe iji nyere ndị ọzọ aka. Ka m na-enyekwuru ndị mmadụ aka, anaghịzi m eche banyere ihe m chọrọ. M na-enwekwa obi ụtọ.” Gịnị ka gịnwa nwere ike imere ndị ọzọ? Ị hụ onye obi na-adịghị mma, gbalịa gbaa ya ume. E nwere ike ị gaghị ewepụli nsogbu ya, ma ị ga-akasili ya obi ma i wetuo obi gee ya ntị, nweere ya ọmịiko, ma chetara ya ka o bunye Jehova ibu na-anyịgbu ya. (Ọma 55:22; 68:19) I nwekwara ike ichetara ya na Jehova ahapụbeghị ya. (Ọma 37:28; Aịza. 59:1) I nwedịrị ike imere ya ihe ọma ụfọdụ, dị ka isiri ya nri ma ọ bụ ịgwa ya ka o soro gị pụọ apụọ. Gwa ya ka o soro gị gaa ozi ọma. Ọ ga-eme ka o nwee obi ụtọ. Kwe ka Jehova jiri gị gbaa ndị ọzọ ume. Ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị na-enyere ndị ọzọ aka, anyị ga-enwe ezigbo ọṅụ.​—Ilu 11:25.

Kama ịna-eme ihe ị chọrọ mgbe niile, na-emere ndị ọzọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) d


17. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe ezigbo obi ụtọ, gịnị ka anyị ga-eme? (Abụ Ọma 43:4)

17 Anyị ga-enweli ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na Nna anyị nke eluigwe na-adịkwu ná mma. Baịbụl gwara anyị na Jehova na-eme ka anyị “na-enwe nnukwu aṅụrị.” (Gụọ Abụ Ọma 43:4.) N’ihi ya, n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, obi ga-eruli anyị ala. Ka anyị lekwasị Jehova anya n’ihi na ọ bụ ya ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ mgbe niile.​—Ọma 144:15.

ABỤ NKE 155 Ọ Bụ Gị Bụ Ọṅụ Anyị Ruo Ebighị Ebi

a Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Jehova Si Eme Ka Anyị Na-enwe Ọṅụ.”

b Dị ka ihe atụ, gaa na jw.org lee ajụjụ ọnụ a gbara Nwanna Dennis Christensen na nwunye ya Irina n’Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023—Agba nke 5.

c Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ya, gụọ isiokwu bụ́ “Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Ga-eruli ma Nwee Ọṅụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche July 15, 2008.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị zụtara ọtụtụ ihe dị ya mkpa, mana ihe kacha mee ya obi ụtọ bụ okooko osisi ọ zụtaara otu nwanna nwaanyị mere agadi e kwesịrị ịgba ume.