IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịna-agụ Baịbụl Kwa Ụbọchị

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịna-agụ Baịbụl Kwa Ụbọchị

Ọtụtụ ihe i nwere ime ọ̀ na-eme ka ọ na-esiri gị ike ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị? (Josh. 1:8) Ọ bụrụ otú ahụ, gbalịa mee otu n’ime ihe ndị a:

  • Tinye ihe ga na-echetara gị ya. Pịnye ekwentị gị otú ọ ga na-echetara gị mgbe i kwesịrị ịgụ Baịbụl.

  • Dowe Baịbụl gị ebe ị ga na-ahụ ya anya. Ọ bụrụ na ị na-eji Baịbụl nke e biri ebi agụ, dowe ya ebe ị ga na-ahụ ya anya kwa ụbọchị.​—Diut. 11:18.

  • Na-ege nke a na-egere egere. Na-ege Baịbụl nke a na-egere egere mgbe ị na-eme ihe ndị dịịrị gị n’ụbọchị. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Tara. Ọ bụ ọsụ ụzọ, bụrụkwa nne na-arụ ọrụ n’abalị. Ọ sịrị: “Ige Baịbụl nke a na-egere egere mgbe m na-eme ihe ndị dịịrị m n’ụlọ enyerela m aka ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị.”

  • Ike agwụla gị. Ọ bụrụ na e nwere ihe mere ka ị ghara ịgụ Baịbụl mgbe i kpebiri ịgụ ya, gụọ naanị amaokwu ole na ole ma ọ dịkarịa ala tupu gị ehie ụra. Ọ bụrụgodị naanị amaokwu ole na ole ka ị gụrụ, ọ ga-abara gị ezigbo uru.​—1 Pita 2:2.