Mgbakọ e mere n’Indianapolis dị n’Indiana, n’afọ 1925
1925—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga
ỤLỌ NCHE Bekee nke January 1, 1925 kwuru, sị: “Ndị Kraịst tụsiri anya ike ka afọ a ruwe eruwe.” Ma, o kwukwara, sị: “Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha gbasara ihe nwere ike ime n’ime afọ a nke na ha agaghịzi eji ọṅụ na-eme ihe Onyenwe anyị chọrọ ka ha mee.” Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl tụrụ anya ya n’afọ 1925? Olee otú ha si na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike n’agbanyeghị na ihe ụfọdụ ha tụrụ anya ha emeghị?
IHE HA TỤRỤ ANYA YA EMEZUGHỊ
Ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl tụrụ anya na ụwa ga-aghọ Paradaịs n’afọ 1925. N’ihi gịnị? Nwanna Albert Schroeder, onye mechara soro n’Òtù Na-achị Isi, kwuru, sị: “N’oge ahụ, anyị chere na ndị fọrọ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-aga eluigwe ka ha soro n’Alaeze Chineke nakwa na a ga-akpọlite Ebreham, Devid, na ndị ọzọ ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie n’ọnwụ ka ha bụrụ ndị isi ga na-achị ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa.” Mana ka afọ ahụ na-agwụ, ihe ha na-atụ anya ya emezughị. Ihe a mere ka iwe wee ụfọdụ ndị.—Ilu 13:12.
N’agbanyeghị na ihe Ndị Mmụta Baịbụl tụrụ anya ya emezughị, ọtụtụ n’ime ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Ha ghọtara na ikwusa gbasara Jehova bụ ọrụ kacha mkpa ha kwesịrị ịrụ. Dị ka ihe atụ, ka anyị lee otú ha si jiri redio kwusaara ọtụtụ ndị ozi ọma.
HA RỤKWURU ỤLỌ ỌRỤ REDIO
N’afọ 1924, ọtụtụ ndị gere ihe omume a gbasara n’ụlọ ọrụ redio a kpọrọ WBBR. N’ihi ya, n’afọ 1925, Ndị Mmụta Baịbụl rụrụ ụlọ ọrụ redio ọzọ bụ́ ọkpọka n’ebe dị nso na Chikago, nke dị n’Ilinọị. Aha ụlọ ọrụ redio ọhụrụ ahụ bụ WORD, nke pụtara “okwu” n’ihi na a ga-eji ya na-ekwusa Okwu Chineke. Nwanna Ralph Leffler onye so rụọ ụlọ ọrụ redio ahụ sịrị na ndị nọ n’ebe ndị dị anya na-ege ozi a na-agbasa n’ụlọ ọrụ redio ahụ n’abalị ezigbo oyi na-atụ. Dị ka ihe atụ, otu ezinụlọ bi n’otu obodo dị n’Alaska bụ́ ebe dị ihe karịrị puku kilomita ise (5,000) gere otu n’ime ihe omume ndị mbụ ụlọ ọrụ redio ahụ gbasara. Mgbe ha gechara ya, ha degaara ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ redio ahụ akwụkwọ ozi kelee ha maka ịkwadebe ihe omume ahụ gbara ha ume ma nyere ha aka ịmatakwu gbasara Chineke na Baịbụl.
Aka ekpe: Nnukwu poolu ụlọ ọrụ redio a kpọrọ WORD nke dị na Batavịa Ilinọị
Aka nri: Mgbe Nwanna Ralph Leffler na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ redio ahụ
Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1925 kwuru ihe mere ọtụtụ ndị ji nwee ike ịnụ ihe a na-ekwu na redio ahụ. Ọ sịrị: “Ụlọ ọrụ redio ahụ bụ otu n’ime ụlọ ọrụ redio ndị kacha bụrụ ọkpọka n’Amerịka. Ndị nọ n’ebe ọdịda anyanwụ na n’ebe ọwụwa anyanwụ Amerịka na-anụ ihe a na-agbasa na redio ahụ, ma ndị nọ na Kuba ma ndị nọ n’ime ime ebe ugwu Alaska. Ọtụtụ ndị na-anụtụbeghị ozi ọma nwere mmasị ịmụtakwu gbasara ya mgbe ha nụrụ ihe a na-agbasa n’ụlọ ọrụ redio ahụ.”
Nwanna George Naish
N’oge ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl nọ na-agbakwa mbọ iji redio ekwusa ozi ọma na Kanada. N’afọ 1924, a rụrụ otu ụlọ ọrụ redio na Saskatun dị na Saskachewan. Aha ya bụ CHUC. Ọ bụ otu n’ime ụlọ ọrụ redio ndị mbụ ndị okpukpe nwe na Kanada. N’afọ 1925, nzukọ Jehova chọwara ebe ọzọ buru ibu a ga-ebufe ụlọ ọrụ redio ahụ. N’ihi ya, ha zụtara otu ebe a na-anọbu eme ihe nkiri na Saskatun, rụgharịa ya, bufezie ụlọ ọrụ redio ahụ n’ebe ahụ.
Ụlọ ọrụ redio ahụ mere ka ọtụtụ ndị bi na Saskachewan nụ ozi ọma na nke mbụ ya, ma ndị nọ n’obodo mepere emepe ma ndị nọ n’ime ime obodo. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo dịpụrụ adịpụ, otu nwaanyị aha ya bụ Graham detara akwụkwọ kwuo ka e zitere ya akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl mgbe o gechara ozi a gbasara na redio ahụ. Nwanna George Naish sịrị: “Otú o si kwuo ka e nyere ha aka gosiri anyị na e kwesịrị ime ihe ngwa ngwa. N’ihi ya, anyị zigaara ya mpịakọta niile nke akwụkwọ Studies in the Scriptures.” O gbughị oge, nwaanyị ahụ kwusaara ozi ọma na-abakwu n’ime ime obodo ahụ.
ANYỊ MỤTARA EZIOKWU DỊ MKPA
E nwere otu isiokwu dị mkpa gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke March 1, 1925. Isiokwu ahụ bụ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ.” Gịnị mere isiokwu a ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na ruo oge ụfọdụ, Ndị Mmụta Baịbụl ma na Setan nwere nzukọ nke ya. Ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ọjọọ nọ n’eluigwe, ndị okpukpe ụgha, ndị achụmnta ego, na ndị ọchịchị nọ n’ụwa. Ma, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji isiokwu ahụ nyere ụmụnna aka ịghọta na Jehova nwekwara nzukọ nke ya. Nzukọ ya dị nnọọ iche na nke Setan. Ọ na-akwado Jehova ma na-emegide Setan na ndị òtù ya. (Mat. 24:45) Ohu ahụ kọwakwara na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914 nakwa na ‘agha ahụ dara n’eluigwe’ n’afọ ahụ mere ka a chụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, meekwa ka ha gharazie inwe ike ịhapụ ụwa.—Mkpu. 12:7-9.
Ihe ọhụrụ a a kọwara siiri ụfọdụ ndị ike ịghọta. Ọ bụ ya mere isiokwu ahụ ji sị: “Ọ bụrụ na e nwere ndị na-agụ Ụlọ Nche na-ekwetaghị ihe e kwuru ebe a, anyị na-atụrụ ha aro ka ha nwee ndidi, tụkwasị Jehova obi ma jiri obi ha niile na-efe ya.”
Ma, otu onye kọpọtụa (ya bụ, ọsụ ụzọ oge niile) aha ya bụ Tom Eyre si Briten kọrọ otú obi dị ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl gbasara isiokwu ahụ. Ọ sịrị: “Obi tọrọ ụmụnna ụtọ maka otú a e si kọwaa Mkpughe isi 12. Ozugbo anyị matara na Alaeze Chineke achịwala n’eluigwe, anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ya ndị ọzọ. O mere ka anyị na-ewepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma, nyekwara anyị aka ịchọpụta na e nwere ihe ndị dị ịtụnanya Jehova ga-eme n’ọdịnihu.”
ỊGBARA JEHOVA ÀMÀ
Taa, Ndịàmà Jehova na-ekwukarị gbasara Aịzaya 43:10, ebe sịrị: “Jehova kwuru, sị: ‘Unu bụ ndị àmà m. N’eziokwu, unu bụ ndị ohu m m họọrọ.’” Mana, tupu afọ 1925, a naghị ekwukarị gbasara ya n’akwụkwọ anyị. Ma egwú dagharịrị. N’afọ 1925, e kwuru gbasara Aịzaya 43:10, 12 n’Ụlọ Nche iri na otu.
Ná ngwụcha ọnwa Ọgọst afọ 1925, Ndị Mmụta Baịbụl gara mgbakọ n’Indianapolis dị n’Indiana. N’ozi e ji anabata ndị mmadụ, nke e dere n’akwụkwọ usoro ihe omume mgbakọ ahụ, Nwanna Joseph F. Rutherford sịrị: “Ihe mere anyị ji bịa mgbakọ a bụ ka . . . Onyenwe anyị nye anyị ike anyị ga-eji laghachi ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.” N’abalị asatọ niile e ji mee mgbakọ ahụ, a gbara ndị bịara ya ume ka ha jiri ohere ọ bụla gbaara Jehova àmà.
Na Satọdee, abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Ọgọst, Nwanna Rutherford kwuru okwu isiokwu ya bụ “Òkù Ime Ihe.” N’okwu ahụ, o kwusiri okwu ike na ikwusa ozi ọma dị mkpa. Ọ sịrị: “Jehova gwara ndị ya, sị: . . . ‘Unu bụ ndị àmà m. Abụkwa m Chineke.’ O nyeziri ha iwu doro anya, sị: ‘Gwunyenụ ihe ga na-agbara mba dị iche iche àmà.’ Naanị ndị nwere ike ịgbara Jehova àmà bụ ndị o ji mmụọ ya na-eduzi n’ihi na ha bụ ndị ya.”—Aịza. 43:12; 62:10.
Traktị bụ́ Message of Hope
Mgbe Nwanna Rutherford kwuchara okwu ahụ, ọ gụpụtara ihe e dere n’akwụkwọ a kpọrọ “Ozi Olileanya.” Akwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka anyị nweta “udo, ọganihu, ahụ́ ike, ndụ, nnwere onwe, na obi ụtọ ebighị ebi.” Ndị gere okwu ahụ ji otu obi nabata ya. E mechara sụgharịa ozi a n’ụfọdụ asụsụ ma bipụta ya na traktị, kesaakwa ya ihe dị ka nde iri anọ (40,000,000).
Afọ ole na ole gafere tupu Ndị Mmụta Baịbụl azawa Ndịàmà Jehova. Ma, ha malitere ịghọta na ha kwesịrị ịna-ekwusa gbasara Jehova.
HA MALITERE ỊGARA NDỊ GERE NTỊ NLETAGHACHI
A gbara Ndị Mmụta Baịbụl ume ka ha na-agaghachi na nke ndị gosiburu mmasị n’ozi ọma, ọ bụghị naanị inye ha akwụkwọ. Ihe a a gwara ha mee dabara adaba n’ihi na ha na-adịkwu ọtụtụ n’ụwa niile. Mgbe e mechara mkpọsa e ji kesaa traktị bụ́ Message of Hope, Bulletin a sịrị: “Hazienụ ka unu gaghachi n’ụlọ ebe a na-enyeghị ndị mmadụ akwụkwọ ọzọ, mana ya abụrụ na e nyere ha traktị ahụ bụ́ Message of Hope.”
Bulletin nke January 1925 kwuru ihe otu Onye Mmụta Baịbụl bi na Plano dị na Tezas kwuru. Ọ sịrị: “O juru anyị anya na mgbe anyị gaghachiri ebe ndị anyị ziburu ozi ọma, ndị mmadụ gere ntị karịa otú ndị nọ n’ebe anyị na-ezitụbeghị ozi ọma si ege. Anyị agaala n’otu obere obodo zie ozi ọma ugboro ise n’ime afọ iri gara aga. . . . Na nso nso a, mama m na Nwanna Nwaanyị Hendrix gaghachiri ebe ahụ. Akwụkwọ ha nyere ebe ahụ karịrị nke e nyetụrụla.”
Na Panama, otu onye kọpọtụa sịrị: “Ọtụtụ ndị chụpụrụ m n’ụlọ ha na mbụ nabataziri m mgbe m gaghachiri nke ugboro abụọ ma ọ bụ atọ. Ihe m na-emekarị n’afọ a bụ ịgaghachi na nke ndị m gaburula na nke ha. Ụfọdụ n’ime ha na-egekwa ezigbo ntị.”
IHE HA NỌ NA-ATỤ ANYA YA
N’akwụkwọ ozi a na-edegara ndị kọpọtụa niile n’afọ ọ bụla, Nwanna Rutherford kọwara otú e si kwusaa ozi ọma n’afọ ahụ nakwa ihe ọzọ ha ga-eme. Ọ sịrị: “N’afọ a bụ́ 1925, unu akasiela ọtụtụ ndị nọ ná mwute obi. Ikwusa ozi ọma emeela unu obi ụtọ . . . N’afọ 1926, a ga-enwe ọtụtụ ohere unu ga-eji gbaara Chineke na Alaeze ya àmà, meekwa ka a mata ndị bụ́ ezigbo ndị na-efe ya. . . . Ka anyị niile jiri olu anyị bụkuo Chineke anyị na Eze anyị abụ otuto.”
Ka afọ 1925 na-agwụ, ụmụnna nọ na-eme atụmatụ ime ka Betel dị na Bruklin bukwuo ibu. N’afọ 1926, ha ga-amalite ịrụ ọrụ kachanụ ha rụtụrụla n’ihe banyere ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova.
Mgbe a na-arụ Betel dị n’Adams Street dị na Bruklin, Niu Yọk n’afọ 1926
a Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ.

