ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41
ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke
Ịhụnanya Chineke Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi
“ Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya pụrụ iche na-adịru mgbe ebighị ebi.”—ỌMA 136:1 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.
IHE A GA-AMỤ
Isiokwu a ga-akọwa otú ịghọta ihe Baịbụl kwuru banyere ịhụnanya Jehova nwere ike isi gbaa anyị ume mgbe nsogbu bịaara anyị.
1-2. Olee nsogbu na-abịara ọtụtụ Ndị Kraịst?
CHEGODỊ banyere ụgbọ mmiri nọ n’oké osimiri mgbe e nwere ebili mmiri. Ebili mmiri ahụ na-ebugharị ụgbọ ahụ. O nwere ike iburu ya gaa ebe ọ bụla ma ọ bụrụ na e jighị nko e ji ejide ụgbọ mmiri jide ya. Nko ahụ ga-eme ka ụgbọ mmiri ahụ kwụrụ otu ebe ka ebili mmiri ghara iburu ya tinye isi ebe ọzọ.
2 Nsogbu siri ezigbo ike bịara gị, i nwere ike ịdị ka ụgbọ mmiri ahụ. Otú obi dị gị nwere ike ịgbanwe n’egbughị oge. Obi nwere ike isi gị ike taa na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ na-akwado gị, o ruo echi, gị echewe ma ọ̀ na-ahụ ihe gị na ya na-alụ. (Ọma 10:1; 13:1) Otu enyi gị nwere ike ịgwa gị ihe ga-akasi gị obi, obi adịtụ gị mma. (Ilu 17:17; 25:11) Ma, ị nọtụkwa, ya emewe gị obi abụọ ma Jehova ọ̀ na-enyere gị aka. I nwedịrị ike ịna-eche ma ike gị ọ̀ gwụla Jehova. Nsogbu bịara gị, gịnị nwere ike ime ka ị kwụrụ chịm otú ahụ nko si ejide ụgbọ mmiri? Ya bụ, olee otú obi ga-esi sie gị ike mgbe niile na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ na-enyere gị aka?
3. Gịnị bụ “ịhụnanya pụrụ iche” e kwuru n’Abụ Ọma 31:7 na 136:1? Gịnịkwa mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụ Jehova kacha egosi ụdị ịhụnanya a? (Kọwaakwa foto.)
3 Otu ihe ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị bụ icheta ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere. (Gụọ Abụ Ọma 31:7; 136:1 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Okwu Hibru a sụgharịrị “ịhụnanya pụrụ iche” na-egosi otú mmadụ si eji obi ya niile ahụ onye ọzọ n’anya ma ghara ịgharịpụ ya. Ọ bụ Jehova kacha egosi ụdị ịhụnanya a. Baịbụl kwudịrị na ‘ịhụnanya ya pụrụ iche dị ukwuu.’ (Ọpụ. 34:6, 7 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) O kwukwara banyere Jehova, sị: “Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.” (Ọma 86:5) Chegodị ihe ọ pụtara: Jehova emekataghị hapụ ndị ji obi ha niile na-efe ya. Ọ bụrụ na anyị echeta na Jehova emekataghị gharịpụ anyị, ọ ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu tara akpụ bịara anyị.—Ọma 23:4
Nko e ji ejide ụgbọ mmiri na-eme ka ebili mmiri ghara iburu ụgbọ mmiri ahụ. Ọ bụ otú ahụ ka obi ike anyị nwere na Chineke hụrụ anyị n’anya ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)
CHETA NA ỊHỤNANYA JEHOVA SO N’IHE NDỊ BỤ́ ISI BAỊBỤL NA-AKỤZI
4. Olee ụfọdụ ihe so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi? Oleekwa ihe mere na ọ dịghị mfe mmadụ ime ka anyị kwụsị ikwere ha?
4 Ihe ọzọ ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị bụ icheta na ịhụnanya Jehova so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. Gịnị ka ị na-echeta ma ị nụ “ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi”? I nwere ike icheta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ị mụtara na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ị mụtara na aha Chineke bụ Jehova, na Jizọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, nakwa na a ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 83:18; Ekli. 9:5; Jọn 3:16; Mkpu. 21:3, 4) Ozugbo i kwetara na ihe ndị a bụ eziokwu, ọ dịghị mfe mmadụ ime ka ị kwụsị ikwere ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị ghọtara na ha niile gbakwasịrị ụkwụ n’eziokwu. Ka anyị hụ otú icheta na ịhụnanya Jehova so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi ga-esi nyere gị aka ịkwụsị iche na Jehova anaghị ahụ nsogbu bịaara gị ma ọ bụ na ihe gbasara gị anaghị emetụ ya n’obi.
5. Kọwaa otú mmadụ nwere ike isi jụ nkụzi ụgha.
5 Mgbe i bidoro ịmụ Baịbụl, olee ihe nyeere gị aka ịjụ nkụzi ụgha? O nwere ike ịbụ na ị matara ihe dị iche n’ihe okpukpe ị na-aga na-akụzi na ihe Baịbụl na-akụzi. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na i kwebuuru na Jizọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ma, ka ị na-amụ Baịbụl, ị jụrụ onwe gị, sị, ‘Ihe a ọ̀ bụ eziokwu?’ Mgbe ị mụchara ihe Baịbụl kwuru gbasara ya, ị matara na azịza ya bụ mba. Ị kwụsịrị ikwere nkụzi ụgha ahụ, kwerezie eziokwu a Baịbụl na-akụzi, ya bụ, na Jizọs bụ “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke” na “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Kọl. 1:15; Jọn 3:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na nkụzi ụgha nwere ike ‘ịgbanyesi mgbọrọgwụ ike,’ siekwa ike ịkụghasị. (2 Kọr. 10:4, 5) Ma, ozugbo ị mụtara nke bụ́ eziokwu, ị kwụsịrị ikweta nkụzi ụgha ndị ahụ.—Fil. 3:13.
6. Gịnị mere obi ga-eji sie gị ike na ‘ịhụnanya pụrụ iche Jehova hụrụ ndị ya na-adịru mgbe ebighị ebi’?
6 I nwere ike ime ụdị ihe ahụ ma a bịa n’ihe Baịbụl na-akụzi gbasara ịhụnanya Jehova. Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, ya emewe gị obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ gị n’anya, jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a m na-eche ọ̀ bụ eziokwu?’ Mata ihe dị iche n’ihe ahụ ị na-eche banyere ịhụnanya Jehova na ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 136:1, nke bụ́ amaokwu e si nweta isiokwu a. Gịnị mere Jehova ji kwuo na ịhụnanya ya “pụrụ iche”? Ihe ọzọ bụ na ọ bụ ịhụnanya a ka e kwuru gbasara ya n’abụ ọma ahụ n’ahịrịokwu bụ́ “ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.” Gịnịzi mere e ji kwuo gbasara ya ugboro iri abụọ na isii n’abụ ọma ahụ? Dị ka anyị kwurula, ịhụnanya pụrụ iche Jehova hụrụ ndị ya so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi, dịkwa ka eziokwu ndị ọzọ ị mụtara n’Okwu Chineke. Iche na Jehova ejighị gị kpọrọ ihe ma ọ bụ na ọ hụghị gị n’anya bụ ụgha chara acha. Jụ ya otú ahụ ị ga-esi ajụ ụgha ndị ọzọ ndị mmadụ na-akụzi.
7. Olee amaokwu ụfọdụ na-eme ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?
7 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kwuru na Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.” (Mat. 10:31) Jehova gwakwara ndị ya, sị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka. M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.” (Aịza. 41:10) Legodị otú ihe ndị a e kwuru si doo anya. Jizọs asịghị: ‘Unu nwere ike ịba uru karịa ọtụtụ nza.’ Jehova asịghịkwa: ‘M nwere ike inyere gị aka.’ Kama, ha sịrị: “Unu bara uru karịa ọtụtụ nza” nakwa “M ga-enyekwara gị aka.” Nsogbu bịara gị, ya emewe gị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya, ihe ụdị amaokwu ndị a nwere ike imere gị abụghị naanị ime ka obi dị gị mma. Ha nwere ike ime ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya. Amaokwu ndị ahụ kwuru ihe bụ́ eziokwu. I kpee ekpere gwa Jehova ihe ahụ na-eme gị obi abụọ ma chebara amaokwu ndị a echiche, ị ga-enwe ike ikwu ihe dị na 1 Jọn 4:16. Ebe ahụ sịrị: “Anyị amatakwala ma kwere na Chineke hụrụ anyị n’anya.” a
8. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ mgbe ụfọdụ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya?
8 Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ mgbe ụfọdụ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya? Mata ihe dị iche n’otú ahụ obi dị gị na ihe ị ma gbasara Jehova. Otú obi dị gị nwere ike ịgbanwe mgbe ọ bụla, ma ịhụnanya Jehova Baịbụl kụziiri anyị bụ eziokwu na-anaghị agbanwe agbanwe. Ọ bụrụ na anyị ekwetaghị na Jehova hụrụ anyị n’anya, anyị na-eleghara àgwà kacha mkpa Jehova nwere anya, ya bụ, ịhụnanya ya.—1 Jọn 4:8.
TỤGHARỊA UCHE N’OTÚ JEHOVA SI ‘HỤ GỊ N’ANYA’
9-10. Gịnị ka Jizọs na-ekwu maka ya mgbe ọ sịrị: “Nna m hụrụ unu n’anya” na Jọn 16:26, 27? (Kọwaakwa foto.)
9 Anyị ga-amụtakwu banyere ịhụnanya Jehova ma anyị chebara ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya echiche. Ọ sịrị ha: “Nna m hụrụ unu n’anya.” (Gụọ Jọn 16:26, 27.) Jizọs ekwughị ihe a ka obi dị ndị na-eso ụzọ ya mma. Ihe ndị ọzọ o kwuru gosiri na ọ naghị ekwu banyere otú obi dị ha n’oge ahụ. Kama ọ na-ekwu gbasara ihe ọzọ, ya bụ, ekpere.
10 Jizọs ka gwachara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịna-ekpe ekpere n’aha ya, ọ bụghị ịgwa ya okwu n’ekpere. (Jọn 16:23, 24) Ha kwesịrị ịmata ihe a. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya nwere ike ịchọ ịna-agwa ya okwu n’ekpere. A sị ka e kwuwe, Jizọs bụ ezigbo enyi ha. Ha nwere ike ịna-eche na otú o si hụ ha n’anya ga-eme ka ọ na-ege ntị n’arịrịọ ha ma kọọrọ Nna ya ihe ha rịọrọ. Ma, Jizọs sịrị na ha ekwesịghị iche otú ahụ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ gwara ha, sị: “Nna m hụrụ unu n’anya.” Ihe a so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl kụziri gbasara ekpere. Chegodị uru ihe a ga-abara gị. I si na Baịbụl mata onye Jizọs bụ ma hụ ya n’anya. (Jọn 14:21) Ma, dịkwa ka ndị mbụ ahụ soro ụzọ Jizọs, obi ga-esili gị ike ịgwa Chineke okwu n’ekpere ebe ị ma na ‘ọ hụrụ gị n’anya.’ Ị na-egosi na i kwetara ihe a Jizọs kwuru mgbe ọ bụla ị na-ekpere Jehova ekpere.—1 Jọn 5:14.
Obi ga-esili gị ike ịgwa Chineke okwu n’ekpere ebe ị ma na ‘ọ hụrụ gị n’anya’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10) b
GHỌTA IHE MERE I JI ENWE OBI ABỤỌ
11. Gịnị mere obi ga-eji dị Setan ụtọ ma o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?
11 Gịnị nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya? I nwere ike ịza na ọ bụ Ekwensu na-akpata ya. N’eziokwu, o so akpata ya. Ekwensu “na-achọ onye ọ ga-eri.” Ọ ga-adịkwa ya mma ma anyị nwewe ụdị obi abụọ ahụ. (1 Pita 5:8) A sị ka e kwuwe, ọ bụ ịhụnanya Jehova mere ka o nye anyị ihe mgbapụta. Setan chọkwara ka anyị chee na anyị erughị eru irite uru n’ihe mgbapụta ahụ. (Hib. 2:9) Ma, olee onye obi ga-adị ụtọ ma anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya? Ọ bụ Setan. Oleekwa onye obi ga-adị ụtọ ma anyị kwụsị ife Jehova ma nsogbu bịara anyị? Ọ bụ Setan. Ọ chọrọ ka anyị chee na Jehova ahụghị anyị n’anya. Mana, ọ bụtụdịghị eziokwu. Ọ bụ Setan ka Jehova na-ahụghị n’anya. N’agbanyeghị ya, otu n’ime “aghụghọ” ya bụ ịgbalịwa ka anyị chee na ọ bụ anyịnwa ka Jehova na-ahụghị n’anya nakwa na ọ jụla anyị. (Efe. 6:11) Anyị ghọta ihe Setan na-agbalị ime, anyị ga-ekpebisikwu ike ‘ịna-alụso ya ọgụ.’—Jems 4:7.
12-13. Olee otú mmehie anyị ketara n’aka Adam nwere ike isi mee ka o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?
12 E nwekwara ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ anyị n’anya. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ mmehie anyị ketara n’aka Adam. (Ọma 51:5; Rom 5:12) Mmehie mere ka anyị na Onye kere anyị ghara ịdị ná mma. Ọ kpakwara echiche anyị, obi anyị, na ahụ́ anyị aka ọjọọ.
13 Mmehie na-akpakwa otú obi na-adị anyị aka ọjọọ. Ọ na-eme ka obi na-ama anyị ikpe, anyị ana-echegbu onwe anyị, obi ekoro anyị n’elu, ihere ana-emekwa anyị. Obi nwere ike ịdị anyị otú a ma anyị mee mmehie. Ma, o nwekwara ike ịdị anyị otú a n’ihi na anyị na-echeta mgbe niile na anyị bụ ndị mmehie. Chineke ekeghịkwanụ anyị ka ọ na-adị anyị otú ahụ. (Rom 8:20, 21) Ị manụ na ụgbọala daa afọ, ike ọsọ agaghịzi adị ya. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị agaghị na-emeli ihe niile Chineke kere anyị ka anyị na-eme. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na mgbe ụfọdụ, anyị na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya. Mgbe ọ bụla ọ dị anyị otú ahụ, anyị kwesịrị icheta na Jehova bụ ‘Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye hụrụ ndị hụrụ ya n’anya ma na-edebe iwu ya n’anya.’—Nehe. 1:5.
14. Olee otú ichebara ihe mgbapụta ahụ echiche ga-esi enyere anyị aka ka anyị ghara ikweta na Chineke agaghị ahụli anyị n’anya? (Ndị Rom 5:8) (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Kpachara Anya Maka ‘Ike Dị Aghụghọ nke Mmehie.’”)
14 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche na anyị erughị eru ka Jehova hụ anyị n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị erughị eru. Ọ bụkwanụ ya mere ịhụnanya Jehova ji pụọ iche. Anyị anaghị arụta ịhụnanya ya n’ọrụ. Ma, ihe mgbapụta ahụ na-ekpuchi mmehie anyị. Ihe mekwaranụ Jehova ji nye anyị ihe mgbapụta bụ ka o nwee ike ịgbaghara mmehie anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:10) Chetakwa na Jizọs bịara ka ọ zọpụta ndị mmehie, ọ bụghị ndị zuru okè. (Gụọ Ndị Rom 5:8.) E nweghị onye n’ime anyị ga-emeli ka ndị zuru okè. Jehova anaghịkwanụ atụ anya ka anyị zuo okè. Anyị ghọta na mmehie anyị bu pụta ụwa nwere ike ime ka o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-ekpebisikwu ike na anyị agaghị ekwe ka o mee.—Rom 7:24, 25.
KPEBISIE IKE NA Ị GAGHỊ AHAPỤ JEHOVA
15-16. Ọ bụrụ na anyị ahapụghị Jehova, gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya? Maka gịnị? (2 Samuel 22:26)
15 Jehova chọrọ ka anyị kpebie ime ihe dị mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ‘ịghara ịhapụ ya.’ (Diut. 30:19, 20) Anyị mee otú ahụ, ka obi sie anyị ike na ọ gaghị ahapụ anyị. (Gụọ 2 Samuel 22:26.) Ọ bụrụhaala na anyị ejidesie Jehova aka ike, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga na-enyere anyị aka ná nsogbu ọ bụla bịaara anyị.
16 Dị ka anyị kwurula, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị. Anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga na-akwado anyị. Ọ bụ ihe Baịbụl na-akụzi. O mewe anyị obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ anyị n’anya, ka anyị tụgharịa uche n’ihe anyị ma bụ́ eziokwu, ọ bụghị n’ihe anyị chere n’oge ahụ. Ka obi sie anyị ike n’eziokwu Baịbụl gwara anyị na ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere na-adịru ebighị ebi.
ABỤ NKE 159 Nye Jehova Otuto
a Ebe ndị ọzọ bụ Diuterọnọmi 31:8, Abụ Ọma 94:14, na Aịzaya 49:15.
b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka ịna-elekọta nwunye ya ahụ́ na-adịghị, ịma otú ọ ga-esi jiri ego ha na-eme ihe bara uru, nakwa ịna-azụ nwa ha nwaanyị ka ọ hụ Jehova n’anya.

