Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alisa

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Tọki

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Tọki

NDỊ KRAỊST oge mbụ gbara ezigbo mbọ izi ọtụtụ ndị ‘ozi ọma alaeze’ Chineke. (Mat. 24:14) Ụfọdụ gadịrị mba ọzọ kwusaa ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na-eje ozi ala ọzọ, ọ gara n’ebe obodo Tọki dị ugbu a zie ọtụtụ ndị ozi ọma. * Mgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gara, n’afọ 2014, a gbara mbọ pụrụ iche ọzọ ikwusa ozi ọma na Tọki. Gịnị mere e ji mee ya? Oleekwa ndị so kwusaa ya?

“GỊNỊ NA-EME?”

Ndị nkwusa nọ na Tọki karịrị puku abụọ na narị asatọ. Ma ndị niile bi n’obodo ahụ dị nde iri asaa na itoolu. Ọ pụtara na onye nkwusa ọ bụla ketara izi iri puku mmadụ abụọ na puku asatọ ozi ọma. O doro anya na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bi n’obodo a ka e zirila ozi ọma. Ihe mere e ji hazie ozi ọma a pụrụ iche bụ ka e jiri obere oge zie ọtụtụ ndị ozi ọma. Ihe dị ka narị ụmụnna ise na iri ise, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Tọkish, si n’obodo ndị ọzọ bịa na Tọki ka ha soro ụmụnna ndị bi na ya kwusaa ozi ọma n’oge ahụ. Olee uru ozi ọma ahụ ha kwusara bara?

E ziri ọtụtụ ndị ozi ọma. Otu ọgbakọ dị n’Istanbul dere, sị: “Mgbe ndị mmadụ hụrụ anyị, ha jụrụ, sị: ‘Ùnu nwere mgbakọ pụrụ iche ebe a? Anyị na-ahụ Ndịàmà Jehova ebe niile.’” Otu n’ime ọgbakọ dị n’obodo Izmia dere, sị: “Otu nwoke nke na-arụ n’ebe a na-aba tagzi bịakwutere otu okenye bi n’obodo ahụ, jụọ ya, sị, ‘Gịnị na-eme? Ùnu wepụtakwuru oge na-aga ozi ọma?’” O doro anya na mkpọsa ahụ kpọtụrụ akpọtụ.

Steffen

Ozi ọma ahụ tọgburu ụmụnna ndị ahụ si obodo ọzọ bịa atọgbu. Otu nwanna si Denmak, aha ya bụ Steffen, kwuru, sị: “M na-ezi ndị na-anụtụbeghị gbasara Jehova ozi ọma kwa ụbọchị. O doro m anya na m na-eme ka ha mata aha Jehova.” Nwanna ọzọ si Frans aha ya bụ Jean-David dere, sị: “Anyị ji ọtụtụ awa zie ozi ọma naanị n’otu okporo ámá. O nweghị ihe dị ka ya. Ọtụtụ ndị amaghị Ndịàmà Jehova. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na anyị ziri mmadụ ozi ọma n’ọnụ ụlọ ọ bụla, gosi otu n’ime vidio anyị, nyefeekwa akwụkwọ.”

Jean-David (ọ nọ n’etiti)

 Narị ụmụnna ise na iri ise ahụ so kwusaa ozi ọma nyefere ihe dị ka puku akwụkwọ iri isii naanị n’izu abụọ. Ozi ọma a pụrụ iche e kwusara mere ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma.

Ụmụnna ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. Ozi ọma ahụ pụrụ iche mere ka ụmụnna ndị bi n’obodo ahụ malite ịnụ ọkụ n’obi. Ọtụtụ n’ime ha malitere iche banyere ozi oge niile. N’eziokwu, otu afọ e kwusachara ya, ndị ọsụ ụzọ oge niile e nwere na Tọki ji iri asatọ na abụọ karịa ole ha dịbu.

Şirin

Ụmụnna ndị si mba ọzọ bịa kwuru otú ozi ọma ahụ pụrụ iche si baara ha uru n’ozi ọma ha na-ekwusa mgbe ha laghachiri n’obodo ha. Otu nwanna nwaanyị si Jamanị aha ya bụ Şirin dere, sị: “Ọ na-adịrị ụmụnna ndị bi na Tọki mfe izi ozi ọma mgbe ha na-anọghị n’ozi ọma. Ihere na-eme m izi ozi ọma mgbe m na-anọghị n’ozi ọma. Ma, ozi ọma a pụrụ iche, na àgwà ụmụnna ndị obodo a, nakwa ekpere m kpere ugboro ugboro mere ka m mee ihe m na-agaraghị emeli. M kwusadịrị ozi ọma n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè a rụrụ n’ime ala, nyekwa ndị mmadụ traktị. Ihere anaghịzi eme m otú ọ na-emebu m.”

Johannes

Nwanna si Jamanị aha ya bụ Johannes sịrị: “M mụtara ụfọdụ ihe ga-abara m uru n’ozi ọma m na-ekwusa. Ụmụnna ndị bi na Tọki chọsiri ike ime ka ọtụtụ ndị mata eziokwu. Ha na-eji ohere ọ bụla ha nwere ezi ndị mmadụ ozi ọma. M kpebiri ịna-eme otú ahụ ma m laghachi Jamanị. Ugbu a, m na-ezi ndị mmadụ ozi ọma karịa otú m na-emebu.”

Zeynep

Otu nwanna nwaanyị si Frans aha ya bụ Zeynep sịrị: “Mkpọsa a abaarala m ezigbo uru n’ozi ọma m na-ekwusa. O nyerela m aka ịna-akatakwu obi ma na-atụkwasịkwu Jehova obi.”

O mere ka ụmụnna dịkwuo ná mma. Otú ụmụnna ndị ahụ si obodo dị iche iche si hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu apụghị ụmụnna apụ n’obi. Jean-David anyị kwuburu gbasara ya sịrị: “Ụmụnna lere anyị ọbịa. Ha nabatara anyị ka ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha, meekwa ka ahụ́ ruo anyị ala n’ụlọ ha. Amabu m na anyị na ụmụnna  anyị dị n’otu n’ụwa niile. Agụọkwala m banyere ya ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ anyị. Ma ugbu a, ejirila m anya m hụ ya. Obi adịkwuola m ụtọ na m bụ Onyeàmà Jehova. M na-ekelekwa Jehova maka ihe ọma a o meere m.”

Claire (ọ nọ n’etiti)

Nwanna nwaanyị si Frans aha ya bụ Claire kwuru, sị: “Ma ànyị si Denmak, Frans, Jamanị, ma ọ bụ Tọki, anyị niile bụ otu ezinụlọ. Ọ dị ka à ga-asị na Chineke ji nnukwu nchicha hichaa ókè niile dị n’agbata mba na mba.”

Stéphanie (ọ nọ n’etiti)

Nwanna nwaanyị ọzọ si Frans aha ya bụ Stéphanie sịrị: “Ozi ọma ahụ pụrụ iche kụziiri anyị na ihe mere ka anyị dịrị n’otu abụghị omenala ma ọ bụ asụsụ, kama ọ bụ maka na anyị niile hụrụ Jehova n’anya.”

Ọ BAALA EZIGBO URU KEMGBE AHỤ

Ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị ahụ si mba ọzọ malitere iche gbasara ịkwaga Tọki ka ha soro na-arụ ọrụ buru ibu a ka ga-arụ n’ebe ahụ. Ọtụtụ ndị akwagala ebe ahụ. Obi dị ụmụnna ụtọ maka ndị a na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa.

Dị ka ihe atụ, e nwere otu obere ìgwè nwere ndị nkwusa iri abụọ na ise. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ bụ naanị otu okenye ka ha nwere. Chegodị otú obi si dị ha ụtọ mgbe ụmụnna isii si Jamanị nakwa Nedalandz kwaga Tọki n’afọ 2015 ka ha nyere ha aka.

IBUTE ỤZỌ N’IKWUSA OZI ỌMA

Gịnị ka ụmụnna ndị a kwagara Tọki kwurula gbasara otú ihe si dịrị ha n’ebe ahụ? N’eziokwu, ihe na-esitụ ike mgbe ụfọdụ. Ma, Jehova na-agọzi ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Lee ihe ụfọdụ n’ime ha kwurula:

Federico

Otu nwanna lụrụla nwaanyị, bụ́ onye dị afọ iri anọ na otu aha ya bụ Federico, si Spen kwaga Tọki. O kwuru, sị: “Ihe mere m ji nwee ohere, uche m adịrịkwa n’ihe ndị ka mkpa bụ na enweghị m ọtụtụ ihe.” Ọ̀ ga-agwali ndị ọzọ ka ha jewe ụdị ozi a? Ọ sịrị: “Eheenụ. Ọ bụrụ na ihe i bu n’obi kwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa bụ ka i nyere ndị ọzọ aka ka ha mata Jehova, ọ pụtara na i nyefere ihe niile n’aka Jehova. Ị ga-ahụkwu otú ọ ga-esi na-elekọta gị.”

Rudy

 Nwanna Rudy ji nwaanyị. O si Nedalandz kwaga Tọki. Ọ dịkwa afọ iri ise na asaa. Ọ sịrị: “Obi na-adị m ezigbo ụtọ ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma na ịkụziri ọtụtụ ndị na-anụtụbeghị ozi ọma eziokwu Baịbụl. Obi na-abụ m sọ aṅụrị ma m hụ otú obi si adị ndị mmadụ ụtọ mgbe ha mụtara eziokwu.”

Sascha

Nwanna ọzọ aha ya bụ Sascha si Jamanị. Ọ dị afọ iri anọ na abụọ. Ọ lụọkwala nwaanyị. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m nọ n’ozi ọma, m na-ahụ ndị na-anụtụbeghị gbasara eziokwu Baịbụl. Ime ka ụdị ndị ahụ mata gbasara Jehova na-atọgbu m atọgbu.”

Atsuko

Atsuko bụ nwanna nwaanyị si Japan. Ọ lụọla di. Ọ dịkwa afọ iri atọ na isii. Ọ sịrị: “Mgbe mbụ, m na-achọ ka Amagedọn bịa ozugbo. Ma kemgbe m kwagara Tọki, m na-ekele Jehova maka otú o si ka nwee ndidi. Ka m na-ahụkwu otú Jehova si na-eduzi ozi ọma a, m na-achọkwu ịbịarukwu ya nso.”

Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Alisa si Rọshịa kwaga Tọki. Ọ dị afọ iri atọ na otu. Ọ sịrị: “Ijere Jehova ụdị ozi a enyerela m aka idetụ ya ire ma hụ ihe ọma niile ọ na-emere m.” (Ọma 34:⁠8) Ọ sịkwara: “Jehova bụ Nna m, bụrụkwa ezigbo Enyi m. Ejirila m otú ihe si dịrị m n’oge dị iche iche matakwuo ụdị onye ọ bụ. Ihe na-eme m obi ụtọ juru eju bara abara. Ngọzi Jehova ezuola m ahụ́.”

‘WELIE ANYA GỊ LEE UBI’

Mkpọsa ahụ pụrụ iche e mere na Tọki mere ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma. Ma, a ka nwere ọtụtụ ebe a na-ekwusatụbeghị ozi ọma na ha. Kwa ụbọchị, ọtụtụ ndị gara ikwusa ozi ọma na Tọki na-ahụ ndị na-anụtụbeghị gbasara Jehova. Ị̀ chọrọ ịga kwusawa ozi ọma n’ụdị ebe ahụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ, anyị na-asị gị: ‘Welie anya gị lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.’ (Jọn 4:35) Ị̀ ga-agali nye aka n’obodo ebe ubi ‘chara acha maka owuwe ihe ubi’? Ọ bụrụ na ị ga-agali, mewe ihe i kwesịrị ime ugbu a ka i nwee ike ime otú ahụ. Ihe doro anya bụ: Ịgbakwu mbọ ka ozi ọma ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa’ ga-eme ka i nweta ọtụtụ ngọzi na-enweghị atụ.​—⁠Ọrụ 1:⁠8.

^ para. 2 Gụọ broshọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ peeji nke 32 ruo 33.