Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa

Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa

IHE BỤ́ NSOGBU

Nwa okorobịa dị afọ iri na isii aha ya bụ Chinedu * sịrị: “Oge ụfọdụ, ụmụ agbọghọ chọrọ ka mụ na ha kpawa na-ana m nọmba ekwentị m. Ha gwa m ya, mụ aghara ha pụwa. Ma, m na-adị ajụ onwe m ma è nwere ihe o mere ma m nye ha ya? N’eziokwu, ụmụ agbọghọ ndị ahụ bụcha asampete.”

Ọnwụnwa ọ̀ na-abịara gị otú a o si abịara Chinedu? Ọ bụrụ na ọ na-abịara gị, i nwere ike izere ya.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ọ bụrụ na i kwere ka ọnwụnwa merie gị, ị ga-akpatara onwe gị nsogbu

E nweghị onye ọnwụnwa na-anaghị abịara. Ọnwụnwa na-abịa n’ụdị dị iche iche, na-abịakwara ma nwata ma okenye. Pọl onyeozi abụghịzi nwata mgbe o dere, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ,  . .  ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie.” (Ndị Rom 7:22, 23) N’agbanyeghị mgba a Pọl na mmehie nọ na-agba, o meriri mmehie. Gịnwa ga-emerilikwa ya. Anyị ekwesịghị ikwe ka anụ ahụ́ anyị na-achị anyị. (1 Ndị Kọrịnt 9:27) Ọ bụrụ na ị mụta otú ị ga-esi na-emeri ọnwụnwa ugbu a ị ka bụ nwata, ọ ga-enyere gị aka izere ọtụtụ nsogbu nwere ike ịbịara gị, nyekwara gị aka mgbe ị ghọrọ okenye.

Ihe ndị e ji agbasa ozi so akpata ọnwụnwa. Baịbụl kwuru na ọnwụnwa na-abịara ndị na-eto eto. Ọnwụnwa ndị ahụ na-esikwa ezigbo ike. (2 Timoti 2:22) Kama inyere ha aka, fim, egwú, tiivi, na akwụkwọ ndị na-eto eto na-agụ na-eme ka o sikwuoro ha ike izere ọnwụnwa. Ihe ndị a na-akụziri ha na ime ihe na-adịghị mma enweghị ihe o mere. Dị ka ihe atụ, na fim ọ bụla a na-egosi nwoke na nwaanyị hụrụ ibe ha n’anya, ha ga-enwerịrị mmekọahụ tupu fim ahụ agwụ. Ma, Baịbụl kwuru na onye ọ bụla n’ime anyị ‘ga-ezereli ọchịchọ anụ ahụ́.’ (1 Pita 2:11) Ọ pụtara na i nwere ike ikpebi na ị ga na-emeri ọnwụnwa. Olee otú ị ga-esi na-emeri ya?

 IHE I NWERE IKE IME

Mara ihe bụ́ nsogbu gị. Ị manụ na ọ bụ ihe ọ bụla na-amasị mmadụ ka e ji anwa ya ọnwụnwa. N’ihi ya, gbaa mbọ mara ihe bụ́ nsogbu gị ka i nwee ike ịma otú ị ga-esi kee nkwụcha maka mgbe a ga-eji ya nwaa gị ọnwụnwa?—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 1:14.

Jikere maka ọnwụnwa. Nọrọ ala chee echiche ka ị mara ụdị ọnwụnwa nwere ike ịbịara gị. Kwadebe ihe ị ga-eme ma ọ bụ otú ị ga-esi zere ya ma ọ bịa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 22:3.

Mara ihe dị njọ na ihe dị mma. Baịbụl kwuru na mgbe a nwara Josef ka ọ kwaa iko, o kwuru, sị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” (Jenesis 39:9) Ihe ahụ Josef kwuru gosiri na ọ ma ihe dị mma na ihe dị njọ. Gịnwa, ị̀ ma ihe dị mma na ihe dị njọ?

Gị na ndị ga-enyere gị aka izere ọnwụnwa na-akpa. Ọ bụrụ na ndị enyi gị bụ ndị hụrụ ihe dị mma n’anya, ha ga-enyere gị aka ịna-ezere ọnwụnwa. Cheta na Baịbụl sịrị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—Ilu 13:20.

Zere ihe ndị nwere ike ime ka izere ọnwụnwa siere gị ike. Dị ka ihe atụ:

  • Gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị anọla n’ebe ndị mmadụ agaghị na-ahụ unu.

  • Agala n’Ịntanet n’oge ma ọ bụ n’ebe ọ ga-adịrị gị mfe ile ndị gba ọtọ.

  • Zere ndị na-ekwu okwu rere ure na ndị na-akpa àgwà ọjọọ.

Olee ihe i chere ị ga na-eme nke ga-enyere gị aka ịna-ezere ọnwụnwa?—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 2 Timoti 2:22.

Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Na-ekpenụ ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.’ (Matiu 26:41) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova Chineke chọrọ ka ị na-emeri ọnwụnwa, ọ ga-enyekwara gị aka. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa gị gabiga ihe ị pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere gị ụzọ mgbapụ, ka i wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrịnt 10:13.

^ para. 4 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.