Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 È KERE YA EKE?

Mbàrá Na-elo Àkwá Ya

Mbàrá Na-elo Àkwá Ya

E nwere ụdị mbàrá a na-ahụ n’Ọstrelia. Ndị ọkà mmụta na-ekwu na a naghịzi ahụ ya n’ebe ahụ kemgbe afọ 2002. Otú mbàrá ahụ si amụ nwa ya dị iche n’otú mbàrá ndị ọzọ si amụ nke ha. Ọ na-abụ mbàrá a yie àkwá, ya eloo ha. Àkwá ndị ahụ ga-adị n’afọ ya ruo ihe dị ka izu isii. Ha gbawa, ụmụ ya esi n’ọnụ ya na-arịpụtasị.

Mgbe ọ bụla mbàrá a loro àkwá ya, ọ na-akwụsị iri nri, afọ ya na-akwụsịkwa imepụta ihe na-agbari nri ka o wee ghara ịgbari àkwá ndị ahụ. Ọ bụ ihe ndị na-esi n’àkwá ndị ahụ apụta na-eme ka afọ ya ghara ịna-emepụta ihe na-agbari nri.

Mbàrá a na-elo ihe dị ka àkwà iri abụọ na anọ. Tupu ụmụ ya arịpụta, e kee ihe ọ na-anyị n’arọ ụzọ abụọ, ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ na otu ụzọ bụ ihe ụmụ ya ndị ahụ nọ ya n’afọ na-anyị n’arọ. Tupu ụmụ mbàrá a amalite ịrịpụta, afọ ya na-ebu nnukwu ibu nke na ọ na-apịkọ akpa ume ya mezie ka o si n’ahụ́ ya na-eku ume.

O ruo mgbe ụmụ mbàrá a ga-apụta, ha na-esi n’ọnụ nne ha na-apụta otu otu. Oge ụfọdụ, ụbọchị ole na ole ga-agafe tupu ha apụtachaa. Ma, ọ bụrụ na nne ha amata na ọ na-esiri ha ike ịpụta, ọ ga-eji aka ya gbụpụta ha. Ndị na-amụ gbasara ụmụ anụmanụ kwuru na ha ahụla ebe mbàrá a gbụpụtara ụmụ isii n’otu mgbe.

Ọ bụrụ na mbàrá a nọkatara dịrị dị ka ụfọdụ ndị na-eche, ọ pụtara na ọ ga-agbanwe ọtụtụ ihe n’otu ntabi anya ma n’ahụ́ ya ma n’otú o si eme ka o nwee ike yie àkwá, loo ha, burukwa ụmụ ya n’afọ ya ruo mgbe ha ga-apụta. Otu ọkà mmụta sayensị kweere n’ozizi evolushọn sịrị na e nweghị otú ihe niile na-eme n’ahụ́ mbàrá a ga-esi nọkata jiri nwayọọ nwayọọ malite n’ihi na ọ bụrụ na e nwehaala nsogbu ọ bụla, àkwá mbàrá ahụ ga-anwụkpọ. O kwukwara na ọ ga-abụrịrị na e mere mbàrá a ka o si otú ahụ na-amụ ụmụ ya. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Chineke kere mbàrá a otú ahụ.

Gịnị ka i chere? Ì chere na mbàrá a nọkatara si otú a mụwa nwa ka è nwere onye kere ya otú ahụ?