Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ime Mgbaasị

Ime Mgbaasị

Ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase ọ̀ dị njọ?

“Unu echigharịkwurula ndị na-agba afa . . . ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.”—Levitikọs 19:31.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Obi anaghị eru ụfọdụ ndị ala ma ndị ha nwụọ. Ha na-ekwu na o nwere ike ịbụ na ha na-ata ahụhụ n’ebe ha nọ. Ọ bụ ya mere ha ji aga ajụ ase na nke ndị na-agba afa.

IHE BAỊBỤL KWURU

N’oge ochie, ndị mmadụ na-ajụkarị ndị nwụrụ anwụ ase. Ma, Baịbụl kwuru hoo haa otú Chineke si ele ndị na-eme ya anya. Dị ka ihe atụ, Jehova Chineke nyere ndị Izrel iwu, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu . . . onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase . . . ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diuterọnọmi 18:10-12) Baịbụl kwukwara na ndị na-eme mgbaasị, ụdị ọ sọkwara ya ya bụrụ, “agaghị eketa alaeze Chineke.”—Ndị Galeshia 5:19-21.

 Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ merụọ ha ahụ́?

“Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekliziastis 9:5.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ nwere ebe ha nọ ndụ. N’ihi ya, ha na-agakwuru ndị na-agba afa ka ha jụọrọ ha ndị nwụrụ anwụ ase. Ụfọdụ na-achụkwara ndị nwụrụ anwụ àjà ka ha wee ghara inye ha nsogbu.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị . . . Ịhụnanya ha na ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi.” (Ekliziastis 9:5, 6) Ihe e kwuru n’ebe a gosiri na ndị nwụrụ anwụ anwụchaala. Ha anaghị eche echiche. Ha anaghị efe Chineke. O nweghị ihe ọ bụla ha na-emeli. Abụ Ọma 115:17 sịrị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị eto Jaa, onye ọ bụla nke na-agbada n’ebe ịnọ duu adịghịkwa eto ya.”

Ọ̀ bụ na e nweghị mgbe ndị dibịa afa na-ekwu eziokwu?

“È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?”—Aịzaya 8:19.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ na-ekwu na ndị dibịa afa nwere ike ịjụta onye nwụrụ anwụ ihe ọ bụ naanị onye ahụ nwụrụ anwụ na ndị ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya ma.

IHE BAỊBỤL KWURU

Na Samuel nke mbụ isi iri abụọ na asatọ, e kwuru ihe eze Sọl mere mgbe mmụọ Chineke hapụrụ ya. Ọ gara jụọ onye na-agba afa ase, bụ́kwa ihe Jehova gwara ha ka ha ghara ime. Nwaanyị mgbaasị ahụ gwara Sọl ihe ọ sị na ọ bụ ohu Jehova a na-akpọ Samuel gwara ya. Ma, ọ̀ bụ Samuel ka ọ gwara okwu n’eziokwu? Mbanụ! Ọ bụghị Samuel ka ya na ya kwuru okwu, kama ọ bụ onye mere ka ọ̀ bụ Samuel.

Onye ahụ bụ mmụọ ọjọọ na-ejere “nna ụgha” bụ́ Setan ozi. (Jọn 8:44) Gịnị mere ndị mmụọ ọjọọ ji eme ka ndị mmadụ chee na ndị nwụrụ anwụ ka nwere ebe ha nọ ndụ? Ọ bụ maka na ha chọrọ ka ndị mmadụ chewe na Chineke bụ onye ụgha nakwa ka ha ghara ịtụkwasị ihe dị na Baịbụl obi.—2 Timoti 3:16.

Ihe a niile Baịbụl kwuru ò gosiri na nke ndị nwụrụ anwụ agaala? Mba. Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe ndị nọ n’ili ga-ebilite n’ọnwụ. * (Jọn 11:11-13; Ọrụ Ndịozi 24:15) Chineke ga-emezu nkwa ahụ n’oge na-adịghị anya. Ma, anyị amatala na o nweghị ebe ndị anyị nwụrụ anwụ nọ na-ata ahụhụ.

^ para. 16 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe Baịbụl kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ, gụọ isi nke asaa n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Isiokwu ya bụ “Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ.”