Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú Ị Ga-esi Gwa Nwa Gị Banyere Ozi Iberiibe

Otú Ị Ga-esi Gwa Nwa Gị Banyere Ozi Iberiibe

IHE NA-ECHEGBU GỊ

Ị nụla na ndị na-eto eto na-eji ekwentị ezigara ibe ha foto ndị gba ọtọ. I nwere ike ịna-eche ma nwa gị ò so eme ụdị ihe a.

O nwere ike ịbụ na ị maghị otú ị ga-esi gwa nwa gị banyere ya. Tupu anyị ekwuwe otú unu ga-esi ekwu banyere ya, ka anyị kwugodị ihe mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji ezigara ibe ha ụdị ozi ahụ na ihe mere o ji gbasa gị. *

IHE MERE HA JI EME YA

  • Ụfọdụ ụmụ okorobịa na-eme o nwee nwa agbọghọ ha na-achụ, ha ana-ezigara ya ozi iberiibe. Ụmụ agbọghọ na-emekwa otu ihe ahụ.

  • Oge ụfọdụ, nwa okorobịa nwere ike ịmanye nwa agbọghọ ọ na-achụ ka o zitere ya foto ya ebe ọ gba ọtọ.

  • Mgbe ụfọdụ, nwa okorobịa nwere ike izigara ndị enyi ya foto nwa agbọghọ gba ọtọ iji mee ha obi ụtọ. O nwekwara ike izigara ha ya ma ya na nwa agbọghọ ahụ tisaa iji menye ya ihere.

Ihe sọkwara ya ya bụrụ ya mere ha ji eziga ụdị ozi ahụ, ọ bụrụhaala na onye na-eto eto nwere ekwentị, o nwere ike ịba ná nsogbu. Otu akwụkwọ kwuru na naanị otu ihe mmadụ pịrị n’ekwentị nwere ike ime ihe ndị mmadụ na-agaghị echefu echefu.

Ọtụtụ ndị amaghị na ha zipụhaala foto ọ bụla, ndị mmadụ nweziri ike iji ya mee ihe dị ha mma. Otu akwụkwọ akụkọ kwuru na otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ gburu onwe ya n’Amerịka. Ihe mere o ji gbuo onwe ya bụ na enyi ya nwoke zigaara ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ha foto ya ebe ọ gba ọtọ. Foto ahụ bụ foto o ji ekwentị ya zigara enyi ya nwoke ahụ. Ụmụ akwụkwọ ha zigakwaara ndị ọzọ foto ahụ, ụfọdụ jikwa ya mee ya akaje.

N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị na-ejide ụmụaka ndị na-ezigara ibe ha foto iberiibe. E nwere ike ijide nne na nna ha ma ọ bụrụ na aha ha dị n’ekwentị ahụ. E nwekwara ike ijide ha ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe nwa ha ga-eji kwụsị iziga ụdị ozi ahụ.

 IHE I NWERE IKE IME

Gwa ya ihe ị chọrọ ka ọ na-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị gaghị enwe ike ịma ihe niile nwa gị ji ekwentị ya eme. Ma, i nwere ike ime ka ọ ghọta ihe ndị ị na-agaghị achọ ka o jiri ya na-eme, gwakwa ya ihe ị ga-eme ya ma o mee ihe ndị ahụ. Cheta na i kwesịrị ịma ihe ọ bụla nwa gị ji ekwentị ya eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Efesọs 6:1.

Mee ka ọ ghọta nsogbu ọ ga-akpatara ya. I nwere ike ịsị ya: “E nwere ụdị ozi iberiibe dị iche iche ndị na-eto eto na-ezigara ibe ha. Olee ụdị ihe i chere so n’ozi iberiibe?” “Olee ụdị foto i chere na ọ dịghị mma?” “N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị na-ejide ụmụaka ndị na-ezigara ibe ha foto iberiibe. Ì chere na ihe ahụ ndị ọchịchị na-eme dị njọ?” “Gịnị mere na iziga ụdị ozi iberiibe ahụ adịghị mma?” Gee ya ntị nke ọma ka ị nụ ihe ọ ga-aza. Nyekwara ya aka ka ọ ghọta nsogbu ụdị ozi ahụ nwere ike ịkpatara ma yanwa ma gịnwa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Hibru 5:14.

Ozi i ji ekwentị zipụ nwere ike ịkpatara gị nsogbu

Mee ihe atụ ga-eme ka ọ ghọtakwuo ihe ị na-ekwu. I nwere ike ịgwa nwa gị, sị: “Ka e were ya na nwa okorobịa na-amanye nwa agbọghọ ka o zitere ya foto ebe ọ gba ọtọ. Gịnị ka i chere nwa agbọghọ ahụ kwesịrị ime? Ò kwesịrị izigara ya foto ahụ ka ha ghara ise okwu? Ka ọ̀ ga-ajụ, ma ya na ya ana-akpakwarị? Ka hà ga-akwụsị ịkpa? Ka ò kwesịrị ịgwa ya nne ya ma ọ bụ nna ya?” Nyere ya aka ka o chebara ihe a echiche nke ọma.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Galeshia 6:7.

Mee ka ọ mata na o kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma. Jụọ ya ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere o ji dị mma ka mmadụ na-akpa àgwà ọma? Olee àgwà ị chọrọ ka e jiri mara gị? Olee otú obi ga-adị gị ma i zigara ndị ọzọ foto nwata ibe gị iji menye ya ihere? Obi ọ̀ ga-adị gị mma ma ị na-akpa àgwà ọma? Gbalịa nyere nwa gị aka ka o nwee ezi akọnuche.—1 Pita 3:16.

Na-akpa àgwà ọma. Baịbụl kwuru na onye ma ihe anaghị etinye aka n’omume rụrụ arụ, ọ naghịkwa eme ihu abụọ. (Jems 3:17) Otú i si akpa àgwà ọ̀ na-egosi na ị ma ihe? Otu akwụkwọ kwuru na ndị nne na nna ekwesịghị ịna-ekiri foto ndị gba ọtọ ka ụmụ ha nwee ike ịmụta àgwà ọma n’aka ha.