Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Onye M Bụ?

Olee Ụdị Onye M Bụ?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Ụdị Onye M Bụ?

Michael lepụrụ anya hụ Brad ka ọ na-abịa, ụjọ abịa ya n’ihi na ọ ma ihe ọ na-aga ime. Mgbe Brad bịarutere, ọ manyere aka n’akpa ya, wepụta ihe nye Michael, sị ya: “Nnaa, were.” Michael elee ya anya n’aka, hụ isi wii wii a fụrụ afụ, bụ́kwanụ ihe ọ tụrụ anya na ọ ga-enye ya. Ọ chọghị ịnara ya wii wii ahụ, ma ọ dị ya ka Brad ọ̀ ga-elewe ya anya ka onye na-amaghị ebe a nọ ma ọ jụ ịnara ya ya. Michael ewetuo olu sị ya, “Jidegodị ya, ka ọ dị ụbọchị ọzọ.”

Jessica lepụrụ anya hụ Brad ka ọ na-abịa, ya ejikere ejikere n’ihi na ọ ma ihe ọ na-aga ime. Mgbe Brad bịarutere, ọ manyere aka n’akpa ya, wepụta ihe nye Jessica, sị ya: “Nne, were.” Jessica elee ya anya n’aka, hụ wii wii a fụrụ afụ, bụ́kwanụ ihe ọ tụrụ anya na ọ ga-enye ya. Jessica akata obi, sị ya, “I meela, anaghị m ewe. Ndụ a m dị na-atọ m ụtọ. Ma, Brad, amaghị m na onye ma ihe otú a ị ma ga na-aṅụ ụdị ihe a.”

GỊNỊ ka i chere mere Jessica ji kata obi gwa Brad na ya agaghị ewe wii wii ahụ o nyere ya? Jessica ma ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ, ọ bụ ya mere o ji agbara nsogbu ọsọ, ọ chọghịkwa ka mmadụ na-atụrụ ya ihe ọ ga na-eme. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị na-akata obi ka Jessica? Ọ bụrụ na ị zaa onwe gị ajụjụ ndị a anyị na-aga ịtụle ugbu a, ọ ga-enyere gị aka.

NKE MBỤ: OLEE EBE NDỊ M DỊ MMA YA?

Ihe mere i ji kwesị ịjụ onwe gị ajụjụ a: Ọ bụrụ na ị mata ebe ndị ị dị mma ya na ihe ndị ị ga-emeli, ọ ga-eme ka i nwee ike ịna-akata obi.

Chebagodịrị ihe a echiche: Onye ọ bụla nwere onyinye Chineke nyere ya. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị ma otú e si ese ihe, nwee ndị ma akụ egwú nke ọma, nweekwa ndị ma eme egwuregwu ndị dị ka ịgba ọsọ. E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Raquel. * Ọ ma arụzi ụgbọala. O kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na ise, achọpụtara m na m ga-eme nke ọma ma m rụziwe ụgbọala.”

Ihe i nwere ike ịmụta na Baịbụl: Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu, n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrịnt 11:6) Pọl ekweghị ka ọnụ ndị mmadụ na-akọ ya na àgwà ọjọọ ha na-akpaso ya mee ka ụjọ bịa ya. O kweghịkwa ka o mee ka ọ hapụ ime ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl n’ihi na ọ ma Baịbụl nke ọma.—2 Ndị Kọrịnt 10:10; 11:5.

Leruo onwe gị anya. N’okpuru ebe a, dee otu ihe ị ma eme nke ọma.

․․․․․

Ngwa, dee otu ezigbo àgwà ị na-akpa. (Dị ka ihe atụ, ị̀ dị obiọma? Ị̀ na-emesapụ aka? Mmadụ ọ̀ ga-atụkwasịli gị obi? Ị̀ na-abịa ihe n’oge?)

․․․․․

 “Ihe jiri ndị ọzọ n’olu, m na-agbalị inyere ha aka. Ọ bụrụ na mmadụ bịara ịkwasara m ụwa ya, ya abụrụkwa na m ji ọrụ n’aka, m na-ahapụ ihe m na-eme gee ya ntị.”—Ugochi.

Ọ bụrụ na ị maghị otu ezigbo àgwà ị na-akpa, gbalịa cheta àgwà dị mma ị na-akpa ugbu a, bụ́ nke ị na-anaghị akpa mgbe ị bụ nwata. I cheta ya, dee ya n’okpuru ebe a. Dị ka ihe atụ, gụọ ihe dị n’igbe ahụ e dere “Ihe Ndị Na-eto Eto Ibe Gị Kwuru.”

․․․․․

NKE ABỤỌ: OLEE EBE NDỊ M NA-ANAGHỊ EME NKE ỌMA?

Ihe mere i ji kwesị ịjụ onwe gị ajụjụ a: Ọ bụrụ na ị kpachaghị anya, ebe ndị ị na-anaghị eme nke ọma nwere ike mee ka ị ghara ịbụ ụdị mmadụ ị chọrọ ịbụ.

Chebagodịrị ihe a echiche: O nweghị onye zuru okè n’ụwa a. (Ndị Rom 3:23) Onye ọ bụla nwere àgwà ọ na-akpa ọ ga-achọ ịkwụsị. Nwata nwaanyị aha ya bụ Seija kwuru, sị: “Amaghị m ihe mere ihe na-enweghị ihe ọ bụ ji ewe m ezigbo iwe. Obere ihe metụ, iwe eju m obi.”

Ihe i nwere ike ịmụta na Baịbụl: Pọl ma ebe ọ na-anaghị eme nke ọma, ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie.”—Ndị Rom 7:22, 23.

Leruo onwe gị anya. Olee ebe ị na-anaghị eme nke ọma i kwesịrị ịgba mbọ mewe nke ọma?

․․․․․

“Achọpụtara m na mgbe ọ bụla m lere fim gbasara nwoke na nwaanyị, obi na-ajọ m njọ nke na m na-achọwa nwa okorobịa mụ na ya ga-akpawa. Ugbu a, amarala m na ọ bụghị fim niile ka m kwesịrị ịna-ele.”—Bridget.

NKE ATỌ: OLEE IHE NDỊ M KPEBIRI IME NÁ NDỤ?

Ihe mere i ji kwesị ịjụ onwe gị ajụjụ a: I nwee ihe ndị i kpebiri ime ná ndụ, ndụ gị agaghị adị ghaa ghaa ghaa, ị ga na-agbara onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla chọrọ ime ka ị ghara ime ihe ahụ ọsọ.

Chebagodịrị ihe a echiche: Ì nwere ike nọkata gwa onye tagzi ka o buru gị gbagharịwa ebe niile ruo mgbe mmanụ ụgbọala ya gwụrụ? Ị manụ na a ga-elewe onye mere ụdị ihe ahụ anya ka onye iberiibe, ọ ga-efukwa ya ezigbote ego. Ọ bụrụ na i nwee ihe ndị i kpebiri ime ná ndụ, ọ ga-eme ka ị ghara iji ndụ gị na-eme ihe na-enweghị isi, ị ga-agbalịsikwa ike hụ na i mere ihe ndị ahụ i kpebiri.

Ihe i nwere ike ịmụta na Baịbụl: Pọl kwuru, sị: “Otú m si agba ọsọ abụghị ihe a na-ejighị n’aka.” (1 Ndị Kọrịnt 9:26) Pọl nwere ihe ndị o kpebiri ime ná ndụ ya, ọ bụ ya mere na o kweghị ka ihe ọ bụla ọzọ megharịa ya anya.—Ndị Filipaị 3:12-14.

 Leruo onwe gị anya. N’okpuru ebe a, dee ihe atọ ị ga-achọ ime tupu afọ ọzọ agwụchaa.

1 ․․․․․

2 ․․․․․

3 ․․․․․

N’ime ihe atọ ahụ i dere, họrọ nke i chere kacha dị gị mkpa ma dee ihe i nwere ike imewe ugbu a ka i nwee ike hụ na i mere ya.

․․․․․

“Ma mụ enweghị ihe m kpebiri ime, o nweghị ezigbo ihe m na-emepụtali. Ọ dị mma mmadụ inwe ihe o kpebiri ime ma gbaa mbọ hụ na o mere ya.”—Onyebuchi.

NKE ANỌ: OLEE IHE NDỊ M KWEERE?

Ihe mere i ji kwesị ịjụ onwe gị ajụjụ a: Ọ bụrụ na o nweghị ihe ndị i kweere, ị ga na-eme ihe ọ bụla mmadụ gwara gị mee. Otú ahụ ogwumagala si agbanwe ụcha ya ka ị ga-esi na-agbanwe, ka i nwee ike imete ndị ọgbọ gị mma. I mewekwanụ otú ahụ, ị gaghị abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ.

Chebagodịrị ihe a echiche: Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ‘chọpụta n’onwe ha ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.’ (Ndị Rom 12:2) Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ị mụtara n’Okwu Chineke, ị ga-abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme.

Ihe i nwere ike ịmụta na Baịbụl: Mgbe Daniel onye amụma ka na-eto eto, o “kpebisiri ike n’obi ya” na ya ga na-eme ihe Chineke kwuru n’agbanyeghị na ya na ndị ezinụlọ ha ebighị, ndị na-efe Chineke otú yanwa na-efe anọghịkwa nso. (Daniel 1:8) Ị̀ chọpụtara na ihe mere o ji bụrụ ihe ọ chọrọ ịbụ bụ maka na o kpebisiri ike ime uche Chineke? Daniel rubeere Chineke isi.

Leruo onwe gị anya. Olee ihe ndị i kweere? Dị ka ihe atụ:

● Ì kweere na Chineke dị? Ya bụrụ na i kweere, gịnị mere i ji kwere? Olee ihe mere obi ji sie gị ike na Chineke dị?

● Ì kweere na ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara gị uru ná ndụ? Ya bụrụ na i kweere, gịnị mere i ji kwere? Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya ekwesịghị inwe mmekọahụ. Ì kweere na ọ bụrụ na i gee Chineke ntị n’okwu a, ọ ga-aka abara gị uru karịa imewe otú ndị ọgbọ gị na-eme?

Ajụjụ ndị a abụghị ajụjụ ndị ị ga-aza ọkụ ọkụ. Medaa obi chọpụta ihe mere i ji kwere ihe ndị i kweere. I mee otú ahụ, ọ ga-eme ka obi sie gị ike ịkọwara ha ndị ọzọ.—Ilu 14:15; 1 Pita 3:15.

“Ụmụ akwụkwọ na-amanyekarị nwa akwụkwọ ibe ha ka o mee ihe ha chọrọ ma ha chọpụta na onye ahụ akwụsichaghị ike n’ihe o kweere. Achọghị m ka ụdị ihe ahụ mee m, ọ bụ ya mere m ji gbaa mbọ chọpụta ihe mere ihe ndị e ji Baịbụl kụziere m ji bụrụ eziokwu. Anaghịzi m asị ndị mmadụ, ‘Agaghị m eme ihe a ma ọ bụ ihe a n’ihi na anyị anaghị eme ya.’ Kama, m na-agwa ha na ‘ihe a ma ọ bụ ihe a adịghị mma.’ Ihe ọ bụla m kwuru na ọ dịghị mma bụ ihe m kweere.”​—Danielle.

Mee elu mee ala, gịnwa ga-ekpebi ụdị onye ị chọrọ ịbụ. Ọ bụ gịnwa ga-ekpebi ma ị̀ ga-adị ka akwụkwọ kpọrọ nkụ nke ikuku na-ebugharị ka ị̀ ga-adị ka osisi gwunyesiri ike n’ala nke oké ifufe na-agaghị emeli ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na i kpebisie ike na ị ga-abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ, ị ga-adị ka osisi ahụ. O nweghịkwa ihe ga-eme ka mmadụ gbanwee gị.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Ugbu a m toliterela, m chọọ ime ihe ọ bụla, m na-ebu ụzọ chebara ya echiche nke ọma tupu m mewe ya, ma ihe ahụ ọ̀ bụ obere ihe ma ọ̀ bụ nnukwu ihe. M na-akpachakwara anya ka m ghara ime ihe ọ bụla ga-ewute Chineke.”

“Mgbe m ka dị obere, m hụ onye ọ bụla na-anaghị eme otú m na-eme, ya adị m ka onye ahụ ò nwere nsogbu. Ma, ugbu a, ọ naghịzi adị m otú ahụ, anaghịkwa m eleda ndị mmadụ anya.”

[Foto]

Jeremiah

Jennifer

[Igbe dị na peeji nke 12]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

Olee ihe ndị unu chọpụtara na m ma eme? Olee àgwà unu chere m kwesịrị ịgba mbọ kwụsị ịna-akpa? Olee ihe ndị mere obi ji sie unu ike na iwu ndị Chineke nyere ụmụ mmadụ bara ezigbo uru?

[Foto dị peeji nke 12]

I kpebisie ike ịbụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ, ị ga-adị ka osisi gwunyesiri ike n’ala, nke oké ifufe na-agaghị emeli ihe ọ bụla