Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Isi Ike nke Kpara Ụwa Aka Ọjọọ

Ihe Isi Ike nke Kpara Ụwa Aka Ọjọọ

Ihe Isi Ike nke Kpara Ụwa Aka Ọjọọ

E NWERE otu akwụkwọ ọkọwa okwu dị n’Ịntanet nke kwuru gbasara ihe isi ike kpara ụwa niile aka ọjọọ na nso nso a. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “E nwetụbeghị mgbe ihe siiri ụwa niile ike otú a.” Ihe isi ike a malitere n’Amerịka n’afọ 2007, o menyụkwara ọtụtụ mba anya. O chetaara ndị mmadụ otú imi na anya dị ụwa n’ihe dị ka afọ iri asaa na abụọ gara aga.

Gịnịdị kpatara ya? Otu magazin kwuru, sị: “Ọ bụ maka na ndị mmadụ nọ na-ebiri ego aghara aghara.” Ma, olee ihe mere ndị mmadụ ji na-ebiri ego otú ahụ, na-azụrụ ihe ndị ha na-agaghị akwụli ụgwọ ha?

Ị manụ na ụwa a na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-enwe anyaukwu, ka ha na-agbaziri ego n’agbanyeghị na ha agaghị akwụli ya. Ihe a nọ na-agwa ndị mmadụ mgbe ahụ bụ: “Bịa zụrụ nke a, bịa zụrụ nke ọzọ.” Ha achọghịdị ịma ma onye ahụ ọ̀ ga-akwụli ụgwọ ihe ahụ. Otu ọkà n’ihe gbasara azụmahịa, aha ya bụ Chris Farrell, kwuru n’akwụkwọ o dere, sị: “Ihe ahụ merenụ kụziiri ndị mmadụ na ịgbaziri ego aghara aghara adịghị mma.”

Ihe isi ike ahụ kpara akụnụba ọtụtụ mba aka ọjọọ. Otu akụkọ gbara n’ihu akwụkwọ akụkọ ndị Saụt Afrịka n’afọ gara aga kwuru, sị: “N’agbanyeghị na o yiri ka ihe ọ̀ dịwala mma, ọ ka na-esiri ọtụtụ ndị ike ịkpata ihe ha riri.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na “ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ nde mmadụ atọ [na Saụt Afrịka] ka ji ụgwọ karịrị ụgwọ ọnwa atọ.” O kwukwara na “ihe dị ka narị puku mmadụ abụọ na puku iri ise, ndị a na-akwụtụ ezigbo ego, enweghịzi ọrụ kemgbe afọ abụọ.”

N’afọ ole na ole a gara aga, a chụọla ọtụtụ nde mmadụ n’ọrụ. Ọ bụ eziokwu na kemgbe Jun afọ 2009, ndị mmadụ na-eche na ihe adịtụwala mma n’Amerịka, ma, otu akwụkwọ kwuru ihe gosiri na otu abụghị n’ezi. Akwụkwọ ahụ kwuru na ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ka ji ụgwọ ga-ewe ọtụtụ afọ tupu ha akwụchaa ya, o nweghị uru ihe a sị na ọ dịwala mma ga-abara ha. N’ihi ụgwọ ahụ ha na-akwụ, ha agaghịzi enwe ego ha ga-eji na-azụ ihe otú ha si azụbu.

Ọ bụrụ na ihe isi ike a zuru ụwa ọnụ kpara gị aka ọjọọ, i nwere ike ikweta ihe David Beart, onye na-ede ihe n’Ịntanet, kwuru. Nwoke a kwuru, sị: “O yiri ka ndị mmadụ hà ekwuola ọtụtụ ihe gbasara ihe isi ike a zuru ụwa ọnụ, ma, o nwebeghị onye chọrọ ikwu ihe e nwere ike ime ka ihe katụ mma.”

Isiokwu ndị so isiokwu a ga-akọwa ihe ndị ji ụgwọ nwere ike ime. Ọ ga-aza ajụjụ atọ ndị a: Olee uru ọ bara mmadụ ịna-echekwa ego ya? Gịnị ka mmadụ nwere ike ime ma ọ bụrụ na o ji ndị mmadụ ụgwọ? Olee otú mmadụ ga-esi jiri ego ya na-eme ihe bara uru?