Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme ka Ndị Mmadụ Lewe M Anya Ọma Mgbe Mbụ Ha Hụrụ M?

Gịnị Ka M Ga-eme ka Ndị Mmadụ Lewe M Anya Ọma Mgbe Mbụ Ha Hụrụ M?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Ka M Ga-eme ka Ndị Mmadụ Lewe M Anya Ọma Mgbe Mbụ Ha Hụrụ M?

“Ihe niile na-aga nke ọma n’ajụjụ ọnụ a m bịara taa! O nweghị ihe ga-eme ka nwa amadị a chọrọ iwe m n’ọrụ chewe na ụjọ ji m. Kemgbe m bịara, m na-akpọ ya aha ya. O nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara iwe m n’ọrụ!”

“Ọ̀ bụkwadị nwatakịrị a dere ihe niile a n’akwụkwọ o ji achọ ọrụ? Agaghị m anwa anwa wee ụdị onye a n’ọrụ! Ya na-eme otú a ugbu a m na-ewebeghị ya n’ọrụ, m wezie ya n’ọrụ, ebelebe ga-egbu.”

Buru ụzọ lee foto a e sere ebe a tupu ị gụọ ihe e dere n’elu. Ị̀ hụrụ ụzọ ihe atọ ga-eme ka e lewe nwa okorobịa a bịara ịchọ ọrụ anya ọjọọ?

1 ․․․․․

2 ․․․․․

3 ․․․․․

● Azịza ha dị n’okpuru ebe a

1. Ọ bụghị ụdị ejiji ahụ ka o kwesịrị iji gaa ịchọ ọrụ. 2. Otú o si kwuo okwu adịghị mma (ọ na-akpọ onye ga-ewe ya n’ọrụ aha ya). 3. Otú o si eme gosiri na o nweghị nsọpụrụ.

 KA E WERE ya na e nyere gị nri ị na-eritụbeghị. Awa ole ka i chere ọ ga-ewe gị iji mara ma nri ahụ ọ̀ ga-adị gị mma? O nwere ike ịbụ naanị ọnụ i detụrụ ya ga-eme ka ị mara ma e nye gị ya mgbe ọzọ ị̀ ga-eri ya. Ọ bụkwa ya ga-ekpebi ma ị̀ ga-erichadị nke e nyere gị enye.

Ọ bụ ụdị ihe ahụ na-eme mgbe mbụ gị na mmadụ hụrụ. Naanị tịnkọm tịnkọm ole na ole gị na onye ahụ nọrọ, ị ga-ama ụdị mmadụ onye ahụ bụ. Ihe ọzọ ị ga-ama bụ na ọ bụkwa mgbe ahụ ka onye ahụ ga-amata ụdị onye ị bụ.

Ị̀ na-achọ ọrụ? Ị̀ na-achọ onye ị ga-emete enyi ma ọ̀ bụ onye ị ga-alụ? Ihe nwere ike ikpebi ma ị̀ ga-enweta ihe ị na-achọ bụ otú i si kpaa àgwà mgbe mbụ gị na mmadụ hụrụ. Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe atọ ị ga elerukwu anya ma gị na ndị ọzọ nọrọ, ka ị ghara ime ihe a ga-eji lewe gị anya ọjọọ.

1. Ejiji Gị

Ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe nwere ike iso ekpebi otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya ma ha hụ gị bụ ejiji gị. Ọtụtụ ndị anaghị achọ ịma otú ndị ọzọ ga-esi ele ejiji ha anya mgbe mbụ ha na ha hụrụ. Otu nwa agbọghọbịa aha ya bụ Clarissa, * sịrị: “Taa, ndị mmadụ na-eyi ihe sọrọ ha aga ebe a na-ere nri, ha anaghịkwa achọ ịma otú ndị ọzọ si ele ha anya.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mma ka i yiri ákwà kwesịrị ihe ị na-aga. Dị ka ihe atụ, ụdị ákwà i yi gaa ịchọ ọrụ abụghị ụdị nke ị ga-eyi aga igwu mmiri. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị maghị ụdị ákwà i kwesịrị iyi aga ihe ị na-aga? Ihe dị mkpa ị ga-eburu n’uche bụ na i kwesịghị ịna-emefe ihe ọ bụla ókè. Ọ bụrụ na ụdị ị ga-eyi edoghị gị anya, yiri nke ị ma nwere ike ikwesị ihe ọ bụla a na-aga aga.

IHE Ị GA-EBURU N’OBI. Ejiji ị na-eji na-agwa ndị mmadụ ụdị onye ị bụ.

“M gaa ememme ọ bụla ma hụ ndị jiri ejiji iberiibe, anaghị m achọ ịga ha nso. Naanị ihe m na-echeta banyere ha mgbe ahụ bụ ejiji ahụ ha jiri, ọ na-emekwa ka m lewe ha anya ọjọọ.”—Diane.

Baịbụl kwuru na i kwesịrị ịna-eyi “uwe dị mma n’anya,” nke ga-egosi na ị ‘na-emeru ihe n’ókè, nweekwa uche zuru okè.’—1 Timoti 2:9.

Jụọ onwe gị, sị: ‘Ákwà m yi ọ̀ dị mma n’anya ka m̀ dị ghara ghara ghara? Otú m dị ọ̀ ga-eme ka onye chọrọ iwe m n’ọrụ, onye m chọrọ imete enyi ma ọ bụ onye m chọrọ ịlụ lewe m anya ka onye na-enweghị “uche zuru okè”?’

Aro: Ọ bụrụ na e nwere onye ị ma maara otú e si eji ejiji nke ọma, gwa ya ka ọ tụọrọ gị aro otú ị ga-esi na-eji ejiji dị mma.

2. Okwu Ọnụ Gị

Ihe si gị n’ọnụ apụta ka mmadụ ga-eji ama ma ị̀ bụ onye okomoko ka ị̀ bụ onye obi ruru ala, ọ bụkwa ya ka a ga-eji ama ma ị̀ bụ onye na-esiri ihe ọnwụ ka ị̀ bụ onye na-anaghị achọ nsogbu. Ihe a  ka ị ga-eburu n’obi ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ onye na-abụghị nwaanyị ibe gị lewe gị anya ọma mgbe mbụ gị na ya hụrụ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ, aha ya bụ Valerie, kwuru, sị: “Ọ na-ewe m ezigbo iwe ma mụ na nwa okorobịa na-akpa nkata, ya ana-ekwu naanị gbasara onwe ya. E nwere ndị nke ọ na-abụ gị na ha na-akpa nkata, ha achọọ ka ị gwachaa ha ihe niile gbasara onwe gị ozugbo ahụ gị na ha hụrụ. Ụdị ihe ahụ nwere ike ịgbakasị nwa agbọghọbịa ahụ́, ya esi ebe ahụ pụọ.”

IHE Ị GA-EBURU N’OBI. Ndị mmadụ na-eji ihe i kwuru ama ụdị onye ị bụ, n’ihi ya, gbalịa hụ na ihe ha ga-ama banyere gị bụ ihe dị mma.

“Mụ na nwa okorobịa nọrọ, ana m achọ ka ọ kpaa àgwà otú o si akpa. Ụbọchị mbụ ahụ mụ na ya hụrụ dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na mụ na nwa okorobịa na-akpa nkata, ya ana-achọ ihe ọ ga-ekwu achọ, ọ pụtara na ihe ọ chọrọ ikwu abụghị eziokwu.”—Selena.

Baịbụl kwuru, sị: “Ị ga-ekwu ihe na-adịghị mma ma i kwuwe oké okwu—n’ihi ya mara ihe, kpacharakwa anya n’ihe ị na-ekwu.”—Ilu 10:19, Contemporary English Version.

Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m ga-eme ka m ghara ịna-ekwu oké okwu ma ọ bụkwanụ na-agbachikarị nkịtị? Otú m si ekwu okwu ọ̀ na-eme ka ahụ́ ghara ịna-eru ndị mụ na ha nọ ala ma ọ bụkwanụ na-eme ka iwe na-ewe ha?’

Aro: Leruo anya ala mata ndị ma otú e si akpa nkata. Olee otú ha si eme ka nkata ha na ndị mmadụ na-akpa na-aga were were? Ì nwere ike ime otú ahụ ha si eme?

3. Otú I Si Eme

Ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu na ya na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, ndị ọzọ ga-ama ma ihe ahụ ọ na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. Ihe a bụ ihe ọzọ ị ga-eburu n’obi ma ị na-achọ onye ị ga-alụ. Nwa agbọghọ aha ya bụ Carrie, sịrị: “Ọ bụrụ na onye ahụ na-emere ndị ọzọ ụmụ obere ihe, ndị dị ka inyere onye bu ibu aka, ọ na-egosi na onye ahụ na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ụmụ obere ihe ndị ahụ ka e ji ama onye na-asọpụrụ ndị ọzọ.”

IHE Ị GA-EBURU N’OBI. Otú i si akpa àgwà ga-eme ka ndị mmadụ mara ụdị mmadụ ị bụ. (Ilu 20:11) Olee ụdị onye ndị mmadụ ga-asị na ị bụ ma ha na-ahụ otú i si eme?

“A sị m kwuo, m ga-asị na ọ dị mkpa ka mmadụ na-ege ntị nke ọma. Onye na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù anaghị anapụ mmadụ okwu n’ọnụ, ọ gwụkwala ma ọ̀ dị ezigbo mkpa na onye ahụ ga-eme otú ahụ.”—Natalia.

Baịbụl kwuru, sị: “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.”—Luk 6:31.

Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù? Otú m si emeso ndị mmadụ ihe ọ̀ na-egosi na m hụrụ ha n’anya? Ndị ọzọ hà nwere ike ịtụkwasị m obi? M̀ na-eji oge akpọrọ ihe?’

Aro: Gị na ndị ọzọ yie agba, gbalịa gawa ihe ahụ n’oge ka ọ ga-abụ e nwee otú ihe si mee, ị gaghị abịa n’azụ oge. Ekwela ka ndị mmadụ jiri ịbịa n’azụ oge mara gị n’ụbọchị mbụ gị na ha yiri agba!

Ma, e nwere ihe ị na-ekwesịghị ichefu: Na a sị gị mee ka ndị mmadụ lewe gị anya ọma mgbe mbụ ha hụrụ gị apụtaghị na ị ga-akpawa àgwà n’abụghị àgwà gị, ka a sịkwa na ị bụ ezigbo mmadụ. (Abụ Ọma 26:4) Kama, kpebie àgwà ọma ndị ị chọrọ ịna-akpa, gbalịakwa na-akpa ha, ka e jiri ha mara gị. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Echefukwala na ọ bụ otú ị chọrọ ka ndị mmadụ si na-ele gị anya ka ha ga-esi na-ele gị anya. Ọ bụrụ na ilebara ejiji gị anya, lebakwara otú i si ekwu okwu na otú i si akpa àgwà anya, ọ ga-eme ka ndị mmadụ lewe gị anya ọma ma mgbe mbụ gị na ha hụrụ ma n’oge ndị ọzọ.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 30]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Mmadụ kwesịrị ilezi anya ma a bịa n’ime enyi. Achọpụtara m na otú ndị enyi m si akpa àgwà ka m si akpa àgwà. Ọ bụ ya mere m ji emete ndị ga-akụziri m ịkpa ezigbo àgwà enyi.”

“Ọ bụghị ego i nwere ma ọ bụ mma ị mara ga-eme ka ndị ọzọ bụrụ enyi gị, kama ọ bụ àgwà gị. Nke a bụ n’ihi na ọ bụ gị ga-ekpebi ụdị àgwà ị ga-enwe, ma ọ bụghị gịnwa ga-ekpebi ma ị̀ ga-ama mma ma ị̀ ga-enwe ego.”

[Foto]

Seir

Ashley

[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA . . .

● Ịmụmụ ọnụ ọchị

● Ikwe mmadụ n’aka nke ọma (ọ bụghị ịpịji onye ahụ aka)

● Ịdị ọcha

● Ile onye ị na-agwa okwu anya

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

EMEFEKWALA YA ÓKÈ!

Na-ekwu okwu MA ekwuchila ndị ọzọ ọnụ

Jụọ ajụjụ MA ajụla ihe na-agbasaghị gị

Gị na ndị mmadụ dịrị ná mma MA achụla nwoke ma ọ bụ nwaanyị

Obi sie gị ike MA etula ọnụ

[Igbe dị na peeji nke 31]

IHE Ị GA-AJỤ NDỊ MỤRỤ GỊ

Mgbe unu hà ka m, olee ihe ndị unu na-eme ka ndị mmadụ lewe unu anya ọma mgbe mbụ ha hụrụ unu?

․․․․․