Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nwoke na Nwaanyị Na-akpa Maka Ọlụlụ

Mgbe Nwoke na Nwaanyị Na-akpa Maka Ọlụlụ

 Echiche Baịbụl

Mgbe Nwoke na Nwaanyị Na-akpa Maka Ọlụlụ

Esta na Maịkel na-akpa, ha abụọ kpebikwara na ha agaghị eme omume rụrụ arụ. * Ma n’otu mgbede, mgbe ọ bụ naanị ha abụọ nọ n’ụlọ, agụụ inwe mmekọahụ malitere gụwa ha. Ihe ọma merenụ bụ na ha abụọ mechara ghọta onwe ha ma ọ́ bụghị ya, ha gaara eme mmehie dị oké njọ.

IFE Chineke ezi ofufe karịrị naanị ịga chọọchị n’ụbọchị ụka ọ bụla. O kwesịrị imetụta otú mmadụ si ebi ndụ na otú o si akpa àgwà kwa ụbọchị. Jizọs Kraịst kwuru na ọ bụ naanị ndị “na-eme uche” Chineke ka Chineke ga-agụ ná ndị ezi omume. (Matiu 7:21) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na onye anyị na ya na-akpa maka ọlụlụ emeghị omume ọ bụla rụrụ arụ.

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-akpa maka ọlụlụ na-eme omume rụrụ arụ taa, olee ihe i nwere ike ime iji hụ na gị na onye gị na ya na-akpa emeghị omume rụrụ arụ? Nke mbụ, cheta na Chineke bu ọdịmma anyị n’uche nye anyị iwu ndị o nyere. Nke abụọ, buru n’uche na ị bụ mmadụ na-ezughị okè. Nke atọ, gị na onye gị na ya na-akpa buru ụzọ kpebie ihe ndị unu ga-eme ka unu ghara ime omume rụrụ arụ. Nke anọ, kpebisienụ ike ịbịaru Chineke nso. Ka anyị lebara ihe ndị a anya otu otu.

Iwu Ndị E Nyere Maka Ọdịmma Anyị

N’Aịzaya 48:17, 18, anyị na-agụ, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso. A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.”

N’eziokwu, iwu na ụkpụrụ ndị e dere n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl bụ maka ọdịmma anyị. (2 Timoti 3:16, 17) Ha na-egosi na Onye kere anyị na-eche banyere anyị nakwa na ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ ma na-eme nke ọma n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ. (Abụ Ọma 19:7-10) Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ewere iwu Chineke? Ọ bụrụ na ị na-ewere ya otú ahụ, ị maara ihe.

Buru n’Uche na I Zughị Okè

Dị nnọọ ka ezigbo enyi na-anaghị ezoro enyi ya ọnụ, Jehova anaghị ezoro anyị ọnụ, ọ na-agwa anyị eziokwu banyere onwe anyị. Dị ka ihe atụ, Okwu ya gwara anyị na “obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?” (Jeremaya 17:9) Baịbụl kwukwara, sị: “Onye tụkwasịrị obi n’obi nke ya dị nzuzu, ma onye na-eje ije n’amamihe ga-alanahụ.”—Ilu 28:26.

Olee otú nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ nwere ike isi gosi na ha tụkwasịrị obi n’obi nke ha? Otu ụzọ ha nwere ike isi mee ya bụ ịnọ n’ebe ga-eme ka inwe mmekọahụ gụwa ha agụụ, otú ahụ mmadụ abụọ ahụ anyị kọrọ akụkọ ha ná mmalite isiokwu a si mee. Ụzọ ọzọ bụ ịjụ ige ntị na ndụmọdụ dị mma nne na nna ha ndị na-atụ egwu Chineke na-enye ha. Ndị nne na nna dị otú ahụ maara na mgbe mmadụ ka na-eto eto, agụụ mmekọahụ nwere ike ịdị ka ọkụ a mụnyere n’ọhịa n’oge ọkọchị bụ́ nke e kwesịrị ilebara anya.

N’ihi ya, ndị na-eto eto ndị ‘na-eje ije n’amamihe nke Chineke’ na-eji ndụmọdụ ndị mụrụ ha akpọrọ ihe. N’ezie, ha anaghị eji ndụmọdụ ndị mụrụ ha egwuri egwu, n’ihi na ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya nke na ha anaghị ezo ọnụ agwa ha ihe ga-abara ha uru. Ma o doro anya na onye kacha hụ unu n’anya bụ Nna unu nke eluigwe bụ́ Jehova Chineke, bụ́ onye na-agwa unu ka unu ‘wepụ ihe na-enye nsogbu n’obi unu, nakwa ka unu ghara ikwe ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ unu.’ (Ekliziastis 11:9, 10) Olee otú unu ga-esi eme ya? Ọ bụ site n’ịgbara omume ọ bụla rụrụ arụ ọsọ.

 Burunụ Ụzọ Kpebie Otú Unu Ga-esi Na-akpa Àgwà

“Ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” (Ilu 13:10) Otú nwoke na nwaanyị maara ihe si eme ihe a Baịbụl kwuru bụ ibu ụzọ kpebie otú ha ga-esi na-egosi ibe ha ịhụnanya n’ụzọ na-agaghị emebi iwu Chineke. Ha na-ahụkwa na ha mere ihe ahụ ha kpebiri. Imewe ibe ha ihe nwere ike iduba ha n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ ichewe na o nweghị ihe ga-eme ka ha mee omume rụrụ arụ dị ka mmadụ ịnya ụgbọala ara ara. Mgbe dị mma onye ahụ ime mkpebi na ya ga na-akpachara anya n’okporo ụzọ abụghị mgbe a na-adọpụta ya n’ụgbọala kpọkasịrị akpọkasị!

Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” (Ilu 22:3) Nwoke na nwaanyị nwere ike ịgbara nsogbu ọsọ ma ọ bụrụ na ha na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke esoro mgbe ha na-eme mkpapụ ma ọ bụ ha enwee onye kwesịrị ekwesị ga-eme ha onye nke atọ. Ọ bụrụ na gị na onye ị chọrọ ịlụ ezuzuo nzuzu mgbe unu na-akpa, o nwere ike imebi akọnuche unu, unu eree ùgwù unu, ma menye ndị ezinụlọ unu na ndị ọzọ ihere. N’ihi ya, mara ihe; kpebie ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ma hụ na i mere ihe i kpebiri!

Mee Jehova ‘Ụdọ nke Atọ’

Alụmdi na nwunye yiri ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ. E nwere ike iji Chineke tụnyere ụdọ nke kasị sie ike. Ekliziastis 4:12 sịrị, “Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.” Ihe ahụ amaokwu Baịbụl ahụ kwuru nwekwara ike ịbara nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ uru. Ndị chọrọ ka Chineke gọzie adịm ná mma ha ga-enweta ngọzi ya ma onye ọ bụla n’ime ha nọrọ Chineke nso. Abụ Ọma 1:1-3, kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume . . . Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị . . .  ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”

N’ezie, ihe na-agara nwoke na nwaanyị nke ọma ná ndụ, ma n’oge ha ka na-akpa ma n’oge ha lụchara, ma ọ bụrụ na ha mere ihe otú Jehova si chọọ. A sị ka ekwuwe, ọ bụ Ya kere anyị, alụmdi na nwunye na ịhụnanya nwoke na nwaanyị bụkwa onyinye si n’aka ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iji ihe ndị a gwurie egwu.—Jems 1:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee otú anyị si mara na Chineke bu ọdịmma anyị n’uche?—Aịzaya 48:17, 18.

● Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’uche banyere onwe anyị?—Jeremaya 17:9.

● Olee ihe nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ ga-eme ka ihe gaara ha nke ọma, ma mgbe ha ka na-akpa ma mgbe ha mechara lụọ?—Abụ Ọma 1:1-3.

[Foto dị na peeji nke 13]

Nwoke na nwaanyị maara ihe na-ebu ụzọ ekpebi otú ha ga-esi na-egosi ibe ha ịhụnanya n’ụzọ na-agaghị emebi iwu Chineke, ha na-ahụkwa na ha mere ihe ahụ ha kpebiri