Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Niile E Dere na Baịbụl Hà Ka Bara Uru?

Ihe Niile E Dere na Baịbụl Hà Ka Bara Uru?

 Echiche Baịbụl

Ihe Niile E Dere na Baịbụl Hà Ka Bara Uru?

“O nwechaghị uru Baịbụl baara ụmụ mmadụ taa ma ọ́ bụghị iji akụkọ ndị a kọrọ na ya eme egwuregwu gwa m gwa m gwa m ma ọ bụkwanụ iji ya zaa ajụjụ ọnụ mmadụ ga-erite ihe na ya.”

“Na Baịbụl, ebe ndị ahụ e depụtara ezinụlọ dị iche iche ndị mmadụ si, ihe ndị e kwuru banyere ịbụ nwa okoro n’amaghị nwaanyị ma ọ bụ nwa agbọghọ n’amaghị nwoke, na ihe ndị e kwuru gbasara ịtụ egwu Chineke, baara ndị nọ n’oge e dere Baịbụl uru ọ bụghị ndị oge anyị a.”

“Baịbụl ghọrọ ihe mgbe ochie tupu e bipụtadị nke mbụ ya.”

NA NSO nso a ka e si n’Ịntanet nweta ihe ndị a ndị mmadụ kwuru mgbe a jụrụ ha ihe ha chere n’isiokwu bụ́ “Baịbụl ọ̀ bụ ihe mgbe ochie na ihe na-abaghịzi uru?” Olee ihe i chere n’ihe ndị ahụ ha zara? Ì kwetara ihe ha kwuru?

O nwere ike i kwetaghị n’otú ahụ ha si kwuo na Baịbụl abakwaghị uru, ma i nwere ike ka na-eche ma ihe niile e dere na Baịbụl hà ka bara uru. A sị ka e kwuwe, e kere Baịbụl ọtụtụ chọọchị na-agụ ụzọ abụọ, a na-akpọ nke mbụ Agba Ochie, kpọọ nke ọzọ Agba Ọhụrụ, ya adịzie ka à ga-asị na ihe karịrị ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ihe ndị e dere na Baịbụl emeela ochie, ghọzie ihe na-abaghị uru.

Taa, o nweghị onye na-eji ụmụ anụmanụ achụ àjà otú ahụ Iwu Mozis kwuru ka a na-eme. Oleezi uru ọ bara na a hapụrụ ihe niile ahụ e dere gbasara ịchụ àjà n’akwụkwọ Levitikọs? (Levitikọs 1:1-7:38) Oleekwa uru ọ baara anyị ịgụ akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ, isi mbụ ruo isi itoolu, bụ́ ebe ọ fọrọ obere ka naanị ihe ndị e dere na ha bụrụ aha ndị mụrụ ndị ha mụrụ? (1 Ihe E Mere 1:1–9:44) Ọ bụrụ na o nweghị onye n’ime anyị ga-ejili aha ndị ahụ chọpụta kpọmkwem ezinụlọ nke yanwa si pụta, olee uru aha ndị ahụ baara anyị taa?

Ka e were ya na ị tụtụtara ụdara n’okpuru osisi ụdara. Ị̀ ga-asị na osisi ụdara ahụ abaghịzi uru ebe ọ bụ na ị tụtụtala ụdara ị na-achọ? Mbanụ, n’ihi na ị ma na i nwere ike ịtụtụta ụdara ọzọ ebe ahụ! E nwere ike iji Baịbụl tụnyere osisi ụdara ahụ. Ebe ụfọdụ na Baịbụl, dị ka akwụkwọ Abụ Ọma ma ọ bụ ebe ndị ahụ e dere ozizi Jizọs ziri n’elu ugwu, nwere ike ịdịrị gị mfe ịsapeta ma na-atọ gị ụtọ ọgụgụ. Ọ bụ eziokwu na akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ na-atọ anyị ụtọ ọgụgụ otú ahụ ụdara nwere ike isi tọọ anyị ụtọ, ànyị kwesịziri ileghara akwụkwọ Baịbụl ndị nke ọzọ anya? Gịnị ka Baịbụl nwere ikwu n’okwu a?

N’ihe dị ka afọ 65 Oge Anyị, Pọl onyeozi degaara Timoti akwụkwọ ozi nke abụọ ma chetara ya, sị: “Malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.” Pọl kwuziri, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:15, 16) Mgbe Pọl dere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,” ọ̀ bụ naanị Agba Ọhụrụ ka ọ na-ekwu?

Ị̀ chọpụtara na Pọl kwuru na Timoti maara “ihe odide ndị ahụ dị nsọ” malite n’oge ọ bụ “nwa ọhụrụ”? Ọ bụrụ na Timoti dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise oge Pọl detaara ya akwụkwọ ozi a, dị ka ụfọdụ ndị chere, ọ pụtara na n’oge Jizọs nwụrụ, Timoti ka bụ nwa ọhụrụ. N’oge ahụ, e nwebeghị Agba Ọhụrụ, ya bụ Akwụkwọ Nsọ Grik, ọ bụla e derela. Mama Timoti bụ onye Juu, n’ihi ya, ọ ga-abụrịrị Agba Ochie, ya bụ Akwụkwọ  Nsọ Hibru, bụ ihe odide ndị ahụ dị nsọ ọ kụziiri nwa ya. (Ọrụ 16:1) O doro anya na Agba Ochie, bụ́ ebe e dere aha ezinụlọ dị iche iche ndị mmadụ si na iwu gbasara ịchụ àjà, socha ‘n’Akwụkwọ Nsọ dum’ Pọl kwuru okwu ya.

Ọ karịala otu puku afọ na narị afọ itoolu e dere akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ, ma a ka nwere ọtụtụ uru ha na-abara anyị. Nke mbụ bụ na anyị agaraghị enwe Baịbụl ma a sị na Chineke ahọpụtaghị ndị mmadụ ka ha dee ya ma hụ na ọ dịgidere ruo taa. (Ndị Rom 3:1, 2) N’Izrel oge ochie, Iwu ahụ Chineke si n’aka Mozis nye ha abụghị ihe dị nsọ a chọrọ ka ha dowere ọgbọ ha ndị ga-abịa n’ihu kama ọ bụ iwu dị mkpa Chineke nyere ka ọ na-eduzi ha. Ihe ụfọdụ ndị e kwuru n’iwu ahụ, bụ́ ndị anyị nwere ike iche na ha abaghị uru taa, dị ezigbo mkpa n’oge ahụ, n’ihi na o chebere ha ma nyere ha aka ime nke ọma. Ihe ọzọkwa bụ na ebe ndị ahụ e dere aha ezinụlọ dị iche iche bara uru iji mata onye Mesaya ahụ bụ, bụ́ onye e buru amụma na ọ ga-esi n’agbụrụ Eze Devid.—2 Samuel 7:12, 13; Luk 1:32; 3:23-31.

Ọ bụ eziokwu na iwu ejighị Ndị Kraịst idebe Iwu Mozis, ọ dị mkpa na ha ga-enwe okwukwe na Mesaya ahụ e buru n’amụma, bụ́ Jizọs Kraịst. Ebe ndị ahụ e dere aha ezinụlọ dị iche iche na Baịbụl nyere aka mee ka anyị mata na Jizọs bụ n’ezie “nwa Devid” ahụ e buru n’amụma. Ihe ndị ahụ e kwuru banyere ịchụ àjà na-enyere anyị aka iji àjà dị oké ọnụ ahịa Jizọs chụrụ maka anyị kpọrọkwuo ihe, na-enyekwara anyị aka inwe ezigbo okwukwe n’àjà ahụ.—Ndị Hibru 9:11, 12.

N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Rom na narị afọ mbụ, o kwuru sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Amaokwu Baịbụl a na-echetara anyị na e dere Baịbụl ka ọ baara anyị uru, ma ọ bụghị naanị anyị ka ọ baara uru. Kemgbe ihe karịrị puku afọ atọ na narị afọ ise, e jirila okwu ndị a e ji ike mmụọ nsọ dee duzie ndị Chineke, kụziere ha ihe ma dọọ ha aka ná ntị—ma n’ala ịkpa Saịnaị, ma n’Ala Nkwa ahụ, ma mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn, ma mgbe ndị Rom na-achị ha. Ọ ka na-abakwara ndị Chineke nọ n’ụwa niile taa uru. O nweghị akwụkwọ ọzọ ga-emeli ihe ndị a niile. Otú ahụ o nwere ike isi ike ịhụ uru mgbọrọgwụ osisi ụdara bara, otú ahụkwa ka o nwere ike isi ike ná mbụ ịhụ uru akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ bara. Iji mata uru akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ bara, ọ ga-adị mkpa na anyị ga-elebakwu anya n’ime Baịbụl. Anyị ga-eritekwa uru buru ibu ma anyị gbalịa mee ya!

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee mgbe Timoti ji mara “ihe odide ndị ahụ dị nsọ”?—2 Timoti 3:15.

● Olee akwụkwọ Baịbụl ndị e dere n’ike mmụọ nsọ, ha abakwaa uru?—2 Timoti 3:16.

● Olee otú anyị ga-esi erite uru n’ihe “niile e dere n’oge gara aga”?—Ndị Rom 15:4.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ihe ndị ahụ e kwuru banyere ịchụ àjà na-enyere anyị aka iji àjà dị oké ọnụ ahịa Jizọs chụrụ maka anyị kpọrọkwuo ihe