Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ezinụlọ Ga-atụle

Ihe Ezinụlọ Ga-atụle

 Ihe Ezinụlọ Ga-atụle

Olee Ihe Ndị Na-ekwesịghị Ịdị n’Ihe Osise A?

Gụọ Ọpụpụ 12:1-8, 17-20, 24-27; Mak 14:12, 22-26; Jọn 13:1, 21-30. Ugbu a, lee anya n’ebe ahụ e sere ndị na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Olee ihe ndị i hụrụ n’ihe osise ahụ nke a na-ekwughị n’akụkọ ahụ? Dee ihe ndị ị chọpụtara n’okpuru ebe a.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị mere Jizọs ji jiri achịcha na-ekoghị eko dochie anya ahụ́ ya? IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:6-8; Ndị Hibru 4:14, 15.

GỊNỊ KA Ị MAARA BANYERE EZE SỌLỌMỌN?

4. Ònye bụ mama Sọlọmọn?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 2 Samuel 12:24.

․․․․․

5. E wezụga Sọlọmọn, ụmụ nwoke ole ka mama Sọlọmọn mụtaara Devid?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 2 Samuel 11:26, 27; 1 Ihe E Mere 3:5.

․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị mere Sọlọmọn ji nwee amamihe otú ahụ o nwere?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Ndị Eze 3:5-14.

Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ghọọ onye maara ihe?

SITE NA MAGAZIN A

Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.

PEEJI NKE 14 Gịnị ka ‘ihe odide ndị dị nsọ’ dị na Baịbụl nwere ike ime? 2 Timoti 3:․․․․․

PEEJI NKE 15 Gịnị ka “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ” nwere ike ime ka anyị nwee? Ndị Rom 15:․․․․․

PEEJI NKE 21 Ịnọ naanị gị tụgharịa uche n’ihe ụfọdụ na-egosi na i nwewela gịnị? Ilu 1:․․․․․

PEEJI NKE 26 Nwoke na nwaanyị lụọ, gịnị ka ha na-aghọ? Jenesis 2:․․․․․

AZỊZA

1. O kwesịrị ịbụ naanị ndịozi 11 nọ ya, ọ bụghị 12.

2. Achịcha ahụ kwesịrị ịbụ nke na-ekoghị eko.

3. Anụ ahụ kwesịrị ịbụ anụ nwa atụrụ, ọ bụghị anụ ézì.

4. Bat-shiba.

5. E wezụga Sọlọmọn, Bat-shiba mụtaara Devid ụmụ nwoke anọ ọzọ.