Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị mere mụ na ndị mụrụ m ji esekarị okwu?

Gịnị mere mụ na ndị mụrụ m ji esekarị okwu?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ,

Gịnị mere mụ na ndị mụrụ m ji esekarị okwu?

N’ihe a a kọrọ n’okpuru ebe a, e nwere ihe atọ Rechel mere nke mere ka ya na mama ya sewe okwu. Ì nwere ike ịchọpụta ha? N’okpuru akụkọ ahụ, dee ihe atọ ị chọpụtara, gazie n’igbe e dere “Azịza,” nke dị ná ngwụcha isiokwu a, ma lee ma ị̀ zatara ha.

N’otu abalị Wenezdee, Rechel, onye dị afọ iri na asaa, arụchaala ọrụ o kwesịrị ịrụ n’ụlọ, gazie izurutụ ike na palọ ha! Ọ gbanyere tiivi ma nọdụ n’otu oche na-amasịkarị ya ịnọ.

Ozugbo ahụ ọ sị ka ya zuru ike, mama ya apụta, ihu mama ya gbarụkwara agbarụ. Ihe Rechel nụziri bụ: “Rechel! Ị̀ nọ ebe ahụ na-ele tiivi mgbe i kwesịrị inyere nwanne gị nwaanyị aka rụọ ihe onye nkụzi ha nyere ya ka ọ rụọ n’ụlọ? Ò nwedịkwara mgbe ị na-eme ihe a gwara gị mee?”

Rechel amalite ịtamu, “Ọ bịakwala ọzọ.” Ma mama ya nụrụ ihe o kwuru.

Mama ya abịa ya nso, sị ya, “Bịa, ị̀ sị gịnị?”

Rechel arọọ mama ya anya, maa ọsụ sị, “O nweghị.”

Ugbu a ezigbo iwe abịala mama ya. Ya asị ya, “Esikwala otú ahụ agwa m okwu!”

Rechel asị ya: “Otú ahụ gịnwa si gwa m okwu ọ̀ dị mma?”

Esemokwu ebirila ọkụ . . . Rechel ezughịzikwa ike ọ chọrọ izu.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

ỤDỊ ihe a a kọrọ ò metụla gị? Gị na ndị mụrụ gị ùnu na-esekarị okwu? Ọ bụrụ na unu na-esekarị okwu, chebara ihe ndị na-akpata ya echiche. Olee ihe ndị na-esekarịrị unu okwu? N’aka nri ebe a, kanye ihe n’ihe ndị ị ma na-esekarịrị unu okwu ma ọ bụkwanụ dee ihe ọzọ na-esere unu okwu n’ebe ahụ e dere “Ihe ọzọ.”

◯ Àgwà m

◯ Ọrụ ụlọ

◯ Ejiji m

◯ Oge m ji alọta n’abalị

◯ Ihe ndị m ji atụrụ ndụ

◯ Ndị enyi m

◯ Onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m

◯ Ihe ọzọ ․․․․․

 Iseokwu anaghị adị ma gị ma ndị mụrụ gị mma n’ahụ́, ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ ya kpatara ya. N’eziokwu, i nwere ike ijide ọnụ gị ma mee ka à ga-asị na i kwetara ihe niile ndị mụrụ gị kwuru. Ma, Chineke ọ̀ chọrọ ka ị na-eme otú ahụ? Mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru ka ị “sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ma o kwukwara na i kwesịrị ịzụ “ikike iche echiche” gị, jirikwa ya na-arụ ọrụ. (Ilu 1:1-4; Ndị Rom 12:1) Ọ bụrụ na ị na-eji ikike iche echiche gị arụ ọrụ, o doro anya na a ga-enwe ihe ndị ị ga-ekwenyesi ike na ha dị mma, ma o nwere ike ndị mụrụ gị agaghị ekwe na ụfọdụ n’ime ha dị mma. Ma, n’ezinụlọ ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru, ndị nne na nna na ụmụ ha ndị na-eto eto na-ekwurịta ihe ọ bụla ha chọrọ ikwu n’udo, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ha enweghị otu olu n’ihe ahụ.—Ndị Kọlọsi 3:13.

Olee otú i nwere ike isi kwuo uche gị, ya aghara isewere unu okwu? Ihe i nwere ike ikwu ozugbo bụ: “Ọ bụ ndị mụrụ m ka o si n’aka. N’ihi na, ọ bụ hanwa na-ekwutekarị ihe na-esere anyị okwu!” Ma chegodị: Ọ bụrụ na a gụnye ndị mụrụ gị, mmadụ ole ka i nwere ike ime ka ha kwụsị ime ihe ha na-eme? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ naanị onwe gị ka i nwere ike ịgbanwe. Ọ bụrụkwa na i mee ihe ndị i kwesịrị ime iji hụ na gị na ndị mụrụ gị eseghị okwu, ndị mụrụ gị agaghị na-abakarịrị gị mba, ha ga-akakwa ege gị ntị mgbe i nwere ihe ị chọrọ ikwu.

Ugbu a, ka anyị lee ihe nwere ike ime iji hụ na gị na ndị mụrụ gị eseghị okwu. I mee ihe ndị a anyị na-aga ikwu ugbu a, otú gị na ndị mụrụ gị ga na-esizi akparịta ụka ga-adị iche nke na ọ ga-eju ma gị ma ndị mụrụ gị anya.

(Aro: Kanye ihe na nke i kwesịrị ịrụ ọrụ na ya.)

Chee echiche tupu ị sawa ha okwu. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ezi omume na-eche eche tupu o kwuo.” (Ilu 15:28, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ọ bụrụ na a gwa gị ihe were gị iwe, ekwupụla ihe mbụ batara gị n’obi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mama gị asị gị: “Gịnị mere ị saghị efere ndị ahụ? Ò nwekwara mgbe ị na-eme ihe a gwara gị mee?” Ihe mbụ nwere ike ịbata gị n’obi ikwu bụ, “Ò nwedịkwara mgbe ị na-ekwe m zuru ike?” Kama ikwu ya, jiri ikike iche echiche gị rụọ ọrụ. Gbalịa ka ị chọpụta ihe mere mama gị ji gwa gị okwu otú ahụ. Ọ bụrụ na mama gị ekwuo ihe dị ka, “ị na-emekarị ihe dị otú a” ma ọ bụ “ò nwedịkwara mgbe ị na-eme ihe a sị gị mee,” ihe mere o ji kwuo ya abụghị na ọ bụ ihe ị na-emekarị, kama, ọ na-egosi na o nwere ihe na-ewe ya iwe. Gịnị ka o nwere ike ịbụ?

O nwere ike obi adịghị mama gị mma n’ihi na ọ na-adị ya ka à hapụụrụ ya ọrụ niile dị n’ụlọ. O nwere ike, naanị ihe ọ chọrọ bụ ka i mesie ya obi ike na ị ga na-enyere ya aka. O nwekwara ike bụrụ eziokwu na ị na-agbara ọrụ ụlọ ọsọ. Ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ, ịsị  mama gị, “Ò nwedịkwara mgbe ị na-ekwe m zuru ike?” agaghị abara gị uru ọ bụla. Naanị ihe o nwere ike ịkpata bụ esemokwu. Kama ikwu ụdị ihe ahụ, í cheghị na ọ ga-aka mma ka i mee ka obi ruo ya ala? Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịsị: “Mama, ka m gaa saa efere ndị ahụ ozugbo, achọghị m ka i wee iwe.” Ihe ị na-ekwesịghị ime: Ekwukwala okwu ka ị̀ na-akparị ya. Ikwu ihe gosiri na ị ghọtara otú obi dị ya ga-aka eme ka gị na ya ghara ise okwu.

N’okpuru ebe a, dee ihe ọ ga-abụ mama gị ma ọ bụ papa gị kwuo, ya akpasuo gị iwe ma ọ bụrụ na i kwere ka ọ kpasuo gị iwe.

․․․․․

Ugbu a, chee okwu ọma i nwere ike ịgwa ya nke ga-eme ka obi dajụọ ya.

․․․․․

Sọpụrụ ha mgbe ị na-agwa ha okwu. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Mishel si n’ihe ndị mere mbụ mụta na ọ dị mkpa ịkpachara anya n’otú o si agwa mama ya okwu. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla mụ na mama m nwere okwu, ọ na-agwakarị m na otú m si agwa ya okwu adịghị ya mma.” Ọ bụrụ na mama gị na-agwakarị gị ụdị ihe a, mụta iji nwayọọ agwa ya okwu, wetuo olu mgbe ị na-agwa ya okwu, hụkwa na ị naghị arọ ya anya ma ọ bụ na-ama ọsụ mgbe gị na ya na-ekwu okwu. (Ilu 30:17) Ọ bụrụ na ọ dị gị ka iwe ejuwela gị obi, kpee ekpere n’obi gị. (Nehemaya 2:4) Ihe mere ị ga-eji kpee ekpere ahụ abụghị ka Chineke mee ka ndị mụrụ gị kwụsị inye gị nsogbu kama ọ bụ ka Chineke nye gị ike ijide onwe gị ka ị ghara ime ka okwu ka njọ.—Jems 1:26.

N’okpuru ebe a, dee okwu na omume ụfọdụ ndị ị na-ekwesịghị ime.

Ihe ndị m na-ekwesịghị ikwu:

․․․․․

Omume ndị m na-ekwesịghị ime:

․․․․․

Gee ntị. Baịbụl sịrị: “Onye na-ekwu okwu mgbe o kwesịrị imechi ọnụ ga-adaba ná mmehie.” (Ilu 10:19, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) N’ihi ya, hụ na i nyere mama gị ma ọ bụ papa gị ohere ikwu okwu, geekwa ya ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu okwu. Ya bụrụ na o nwere egwú ị na-akpọ, gbanyụọ ya, ya bụrụkwa na ị na-agụ akwụkwọ ma ọ bụ magazin, dewe ya, nọrọkwa jii gewe ya ntị. Anapụla ha okwu n’ọnụ iji gọrọ ọnụ gị. Naanị ihe ị ga-eme bụ ige ha ntị. Ha kwuchaa, ị ga-enwe ohere ịjụ ha ajụjụ ma ọ bụ ịgwa ha ihe i chere. Ma ọ bụrụ na i sie ọnwụ kwuwe otú ọ dị gị n’obi ozugbo ahụ, ị ga-eme ka ihe ka njọ. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ị ka chọrọ ikwu, oge ahụ yiri ka ọ̀ bụ “oge ịgbachi nkịtị.”—Ekliziastis 3:7.

Jikere ịrịọ mgbaghara. Ọ dị mma ịsị “ewela iwe” mgbe ọ bụla i mere ihe kpatara esemokwu. (Ndị Rom 14:19) I nwedịrị ike ịrịọ  mgbaghara maka okwu unu sere. Ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi gakwuru ndị mụrụ gị rịọ ha mgbaghara, i nwere ike ide ihe ị chọrọ ikwu ede nye ha. Hụkwa na ị kwụsịrị ime ihe ọ bụla na-akpatara gị na ha esemokwu iji gosi na ị chọrọ ka ihe ka mma. (Matiu 5:41) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe mere unu ji see okwu bụ n’ihi na ị naghị arụ ọrụ ụlọ, malite ịrụ ihe ahụ ka ị hụ ma obi ọ́ gaghị adị ndị mụrụ gị mma. Ọ bụrụgodị na ịrụ ọrụ ụlọ ahụ anaghị amasị gị, ọ́ gaghị aka mma ịrụ ya karịa gị na ndị mụrụ gị isewekwa okwu ọzọ n’ihi na i meghị ya?—Matiu 21:28-31.

N’ikpeazụ, ị ga-achọpụta na ịkwụsị ime ihe ọ bụla na-akpata esemokwu ma ọ bụ igbochidị gị na ha ise okwu, ga-eme ka ihe kara gị mma. Baịbụl kwudịrị na onye “obiọma na-emeso mkpụrụ obi ya mmeso ọma.” (Ilu 11:17) N’ihi ya, cheta uru ndị ị ga-erite ma ọ bụrụ na ị gbalịa mee ihe ndị i kwesịrị ime iji hụ na gị na ndị mụrụ gị eseghị okwu.

Esemokwu na-adapụta n’ezinụlọ ndị na-enwe obi ụtọ, ma ha na-ama otú ha si edozi ya. Gbalịa mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a, ị ga-ahụkwa na gị na ndị mụrụ gị agaghị na-esezi okwu mgbe ha na-agwa gị ihe ndị ị na-eme na-adịghị ha mma n’obi!

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Gịnị mere o ji adị ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị ka ọ̀ dị mma ka ha na ndị mụrụ ha na-ese okwu?

● Gịnị mere Jehova ji were onye na-esekarị okwu ka onye nzuzu? —Ilu 20:3.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Abịara m ghọta na n’agbanyeghị na arụwala m ọrụ ma na-akpata ego, m ka kwesịrị ige mama m ntị n’ihi na m ka bi n’ụlọ anyị. Ọ bụ ya lekọtara m kemgbe m dị obere, n’ihi ya, ya kwuo ihe ụfọdụ, dị ka ịgwa m mgbe m kwesịrị ịlọta n’ụlọ n’abalị, ọ naghị esiri m ike ịghọta ihe mere o ji nye m ụdị iwu ahụ.”

“O nwee ihe mụ na ndị mụrụ m na-enweghị otu olu na ya, anyị na-ekpe ekpere banyere ya, mee nchọnchọ n’akwụkwọ ụfọdụ, ma kwurịta ya. Anyị mechaa ihe ndị a, anyị na-ekwekọrịtazi n’otú anyị ga-esi edozi nsogbu ahụ. Mgbe ọ bụla anyị mere ka Jehova bata n’ihe ọ bụla anyị na-eme, ihe ahụ na-aga nke ọma.”

[Foto ndị]

Daniel

Kamerọn

[Igbe dị na peeji nke 19]

AZỊZA

1. Ịgwa mama ya okwu mkparị (dị ka, “Ọ bịakwala ọzọ”) ga-eme ka iwe wekwuo mama ya.

2. Ịrọ mama ya anya na ịma ọsụ bụ ịchọ nsogbu.

3. Ịsa mama ya okwu (dị ka ịsị, “Otú ahụ gịnwa si gwa m okwu ọ̀ dị mma?”) ga-eme ka mama ya wekwuo iwe.

[Igbe dị na peeji nke 19]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Gaghachigodị n’ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a. Ì nwere ike ịchọpụta ihe ụfọdụ mama Rechel mere, nke so kpata esemokwu ahụ? Olee ihe i nwere ike ime iji hụ na gị na nwa gị na-eto eto eseghị okwu? Lee ụfọdụ ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche:

Ị gwawa nwa gị ebe o mejọrọ, ekwula ihe ndị dị ka, “Ị na-emekarị ihe dị otú a” ma ọ bụ “Ò nwedịkwara mgbe ị na-eme ihe a sị gị mee?” I kwuhaala ụdị ihe ahụ, nwa gị ga-achọ ịgọrọ ọnụ ya. O nwedịrị ike ya abụrụ na ihe ndị ahụ i kwuru abụchaghị eziokwu, nwa gị makwa na ha abụchaghị eziokwu. O nwekwara ike nwa gị ma na ọ bụ iwe mere i ji kwuo ihe ndị ahụ i kwuru, ọ bụghị n’ihi na ya emeghị ihe ya kwesịrị ime.

Kama ikwu ihe ga-akpasu nwa gị iwe, dị ka ịsị, “Ị na-emekarị ihe dị otú a,” mee ka nwa gị mara otú ihe o mere si ewute gị. Dị ka ihe atụ, kwuo ihe dị ka, “Mgbe ọ bụla i mere ihe dị otú a, ọ na-ewute m.” Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị chọrọ ka obi na-adị gị mma. I mee ka nwa gị mara otú obi dị gị, ọ ga-aka emetụ ya n’obi, ọ ga na-emekwa ihe ị gwara ya.

Ọ bụ eziokwu na ijide onwe gị mgbe iwe ji gị nwere ike isiri gị ike, gbalịa na-ejide onwe gị. (Ilu 10:19) Ọ bụrụ na ihe na-esere unu bụ ọrụ ụlọ, gị na nwa gị kparịta ya. Detuo ihe ndị ị chọrọ ka nwa gị mee, ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, gwa ya ntaramahụhụ ị ga-enye ya ma ọ bụrụ na ọ meghị ha. Gee nwa gị ntị ma o kwuwe uche ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ na i kwetaghị n’ihe ọ na-ekwu. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-aka ege onye na-ege ha ntị ntị karịa onye na-anaghị achọ ka ha tinye ọnụ.

Tupu gị ekpebie na nwa gị aghọọla onye nnupụisi, cheta na ihe ụfọdụ nwa gị na-eme na-egosi na o towela. Ihe mere nwa gị ji na-asa gị okwu n’ihe ụfọdụ bụ iji gosi gị na ya aghọwala dimkpa. Gbalịa ka gị na ya ghara ịna-esekarị okwu. Cheta na nwa gị ga-amụta otú i si eme omume ma a kpasuo gị iwe. N’ihi ya, mụta inwe ndidi na ogologo ntachi obi, ị ga-ahụkwa na nwa gị ga-amụta ime otú ahụ.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

[Foto dị na peeji nke 18]

Gị na ndị mụrụ gị ise okwu dị ka mmadụ ịnọ otu ebe na-agba ọsọ—ike ga-agwụ onye ahụ, ma e nweghị ebe ọ ga-agbaru