Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?

Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?

 Echiche Baịbụl

Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?

Baịbụl kwuru na Chineke ‘ewepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe.’ (Ọrụ 17:31) Ọtụtụ ndị anaghị achọ iji ntị anụ na a ga-ekpe ha ikpe, ụdị ọ sọkwara ya ya bụrụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?

YA BỤRỤ otú ahụ, obi ga-eru gị ala ma ị nụ na Ụbọchị Ikpe bụ oge Chineke ga-egosi ụmụ mmadụ na ya hụrụ ha n’anya. Ọ ga-agọzi ụmụ mmadụ n’oge ahụ otú ha na-atụghị anya ya, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-esokwa. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Gịnị mere o ji dị mkpa ka e nwee Ụbọchị Ikpe? Gịnịdị ga-eme “n’ụbọchị” ahụ?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka E Nwee Ụbọchị Ikpe?

Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ dewe ha n’ụwa, o bughị n’obi ka ụwa bụrụ ebe a ga-anọ lee ha ule iji mara ma hà ruru eru ibi ndụ n’ebe ọzọ. O kere ha ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. N’agbanyeghị na di na nwunye mbụ Chineke kere zuru okè ma n’ahụ́ ma n’uche, ha nupụụrụ Chineke isi. N’ihi ya, ha enweghịzi ike ịdị ndụ ebighị ebi, ha wetakwaara ụmụ ha mmehie na ọnwụ.—Jenesis 2:15-17; Ndị Rom 5:12.

Ụbọchị Ikpe ga-ewe otu puku afọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ụmụ mmadụ ga-enwe ike inweta ihe niile Adam na Iv mere ka ha ghara inweta. * Cheta na ná mmalite isiokwu a, e kwuru na Ọrụ 17:31 sịrị na Ụbọchị Ikpe ga-agbasa ndị bi ‘n’elu ụwa mmadụ bi.’ Ndị a na-amaghị ikpe ga-ebi n’ụwa ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị nsogbu ọ bụla. (Mkpughe 21:3, 4) N’ihi ya, Chineke ga-emezu nzube ya maka ụwa a na ụmụ mmadụ n’Ụbọchị Ikpe.

Onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ Onyeikpe bụ Jizọs Kraịst. Baịbụl kwuru na Jizọs ‘ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.’ (2 Timoti 4:1) Olee ndị bụ “ndị dị ndụ” a ga-ekpe ikpe? Olee otú ndị nwụrụ anwụ ga-esi adị ndụ ọzọ ‘n’elu ụwa mmadụ bi’?

Jizọs Ga-ekpe “Ndị Dị Ndụ” Ikpe

Oge e buru n’amụma na a ga-ebibi ụwa Setan a eruwela nso, bụ́ mgbe Chineke ga-ebibi ihe niile gbasara ụwa ọjọọ a ma kpochapụ ndị  ajọ mmadụ. “Ndị dị ndụ” a ga-ekpe ikpe bụ ndị a na-agaghị ebibi ma e bibie ụwa ọjọọ a.—Mkpughe 7:9-14; 19:11-16.

N’oge ikpe ahụ, bụ́ nke ga-ewe otu puku afọ, Kraịst Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ndị nwoke na ndị nwaanyị a kpọlitere n’ọnwụ ha agaa eluigwe, ga-achị ụwa. Ha ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà, mee ka ụmụ mmadụ rite uru n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, ma si otú ahụ jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi zuo okè ma n’ahụ́ ma n’uche.—Mkpughe 5:10; 14:1-4; 20:4-6.

N’Ụbọchị Ikpe ahụ, a gaghị ekwe ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya megharịa ụmụ mmadụ anya. (Mkpughe 20:1-3) Ma, ná ngwụcha Ụbọchị Ikpe ahụ, a ga-ahapụ Setan ka ọ nwaa ụmụ mmadụ ndị dị ndụ n’oge ahụ ọnwụnwa iji mara ma hà ga-enupụrụ Chineke isi. Ndị rubeere Chineke isi bụ ndị a ga-ewere na ha agafeela ule ahụ Adam na Iv dara. A ga-agụ ha na ndị kwesịrị inweta ndụ ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ ghọọ Paradaịs. A ga-ebibi ndị họọrọ inupụrụ Chineke isi, ha na Setan na ndị mmụọ ọjọọ.—Mkpughe 20:7-9.

Ikpe “Ndị Nwụrụ Anwụ” Ikpe

Baịbụl kwuru na n’Ụbọchị Ikpe, ndị nwụrụ anwụ “ga-ebili.” (Matiu 12:41) Jizọs kwuru na “oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28, 29) Ebe a anaghị ekwu banyere mkpụrụ obi ndị si n’ahụ́ ndị nwụrụ anwụ pụọ. Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha enweghịkwa mkpụrụ obi nke na-adịrị ndụ gawa ma mmadụ nwụọ. (Ekliziastis 9:5; Jọn 11:11-14, 23, 24) Jizọs ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịrị ndụ ọzọ n’ụwa.

Ihe a ga-eji ekpe ndị a kpọlitere n’ọnwụ ikpe ọ̀ bụ ihe ha metara tupu ha anwụọ? Mba. Ihe Baịbụl na-akụzi bụ na “a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.” (Ndị Rom 6:7) N’ihi ya, a ga-ekpe ndị a kpọlitere n’ọnwụ ikpe “dị ka omume ha” mere n’Ụbọchị Ikpe si dị, otú ahụ a ga-esikwa ekpe ndị fọrọ ndụ mgbe e bibiri ụwa ọjọọ a. (Mkpughe 20:12, 13) Ọ bụzi otú ha si mee omume n’ikpeazụ ga-ekpebi ma mbili e bilitere ha n’ọnwụ ọ̀ ga-abụ nke inwe ndụ ebighị ebi ka ọ̀ ga-abụ nke mbibi. Ná ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, e nwere ọtụtụ ndị ọ ga-abụ nke mbụ ha ịma onye Jehova Chineke bụ na ihe ọ chọrọ ka ha mee iji dị ndụ ebighị ebi. A ga-enye ha ohere ime uche Chineke ma dị ndụ ebighị ebi n’ụwa.

Ọ Dịghị Mkpa Ịtụwa Ụjọ

Ụbọchị Ikpe agaghị abụ naanị oge a ga-akụziri ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ha n’aka, kama, ọ bụkwa oge ndị mmadụ ga-eme ihe ndị a kụziiri ha ma nweta ngọzi ndị so ya. Chegodị otú obi ga-adị gị mgbe gị na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-ahụ ọzọ, nakwa otú ọ ga-adị mgbe gị na ha ji nwayọọ nwayọọ zuo okè!

Ụbọchị Ikpe gwụchaa, Chineke ga-ahapụ Setan ka o lee ụmụ mmadụ ule iji mara ma hà ga-enupụrụ Chineke isi. Ma i kwesịghị ichegbuwe onwe gị ma ọ bụ tụwa ụjọ, n’ihi na tupu Ụbọchị Ikpe ahụ agwụchaa, ndị niile dị ndụ ga-ejikere nke ọma maka ule ikpeazụ ahụ. N’ihi ya, Ụbọchị Ikpe bụ otu ụzọ Chineke ga-esi emezu nzube ya nke bụ́ iwepụ nsogbu niile isi ahụ e nupụụrụ ya n’ogige Iden kpataara ụmụ mmadụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Na Baịbụl, okwu bụ́ “ụbọchị” nwere ike ịbụ ogologo oge karịrị otu mkpụrụ ụbọchị. Dị ka ihe atụ, gụọ Jenesis 2:4.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Gịnị bụ Ụbọchị Ikpe?—Ọrụ 17:31.

● Ònye ka a ga-ekpe ikpe?—2 Timoti 4:1.

● Afọ ole ka Ụbọchị Ikpe ga-ewe?—Mkpughe 20:4-6.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Chegodị otú obi ga-adị gị mgbe gị na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-ahụ ọzọ

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

N’oge Kraịst ga-achị ụwa, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ na paradaịs n’ụwa