Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ dị njọ izo ihe ụfọdụ ezo?

Ọ̀ dị njọ izo ihe ụfọdụ ezo?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ,

Ọ̀ dị njọ izo ihe ụfọdụ ezo?

Kanye n’ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a a kọrọ ebe a emee.

1. Ị nọ n’ime ụlọ ị na-arahụ, mechie ụzọ, ozugbo ahụ nwanne gị agbabata n’ebughị ụzọ kụọ aka.

‘Nsogbu adịghị . . . ana m emekwa nwanne m ụdị ihe ahụ.’

‘Nwa a enweghị nsọpụrụ! Ya bụrụkwanụ na m na-eyiri uwe?’

2. Gị na otu enyi gị na-akparịta ụka n’ekwe ntị, mama gị anọrọ n’otu akụkụ, o dokwara anya na ọ na-ege ihe niile unu na-ekwu.

‘Nsogbu adịghị . . . o nweghị ihe m na-ezo ezo.’

‘Lekwanụ m nsogbu! Ọ dị m ka a na-enyo ihe ọ bụla m na-eme enyo!’

3. I si esi bata, ozugbo ahụ ndị mụrụ gị amalite ịjụkasị gị ajụjụ ahụ́. “Ebee ka ị gara? Gịnị ka ị gara ime ebe ahụ? Olee ndị gị na ha so gaa?”

‘Nsogbu adịghị . . . m na-akọrọ ha ihe ọ bụla m na-eme.’

‘Ụdị ihe a na-ewe m iwe! Ndị mụrụ m atụkwasịdịghị m obi!’

MGBE ị dị obere, o nwere ike o nweghị ihe ị na-ezo ezo. Ọ bụrụ na nwanne gị ị tọrọ agbabata n’ime ụlọ ị na-arahụ n’ebughị ụzọ kụọ aka, iwe anaghị ewe gị. Ndị mụrụ gị jụọ gị ajụjụ, ị naghị egbu oge aza ya. N’oge ahụ, onye ọ bụla ma ihe niile ị na-eme. Ma ugbu a, e nwere oge ndị ị na-anaghị achọ ka mmadụ mara ihe ị na-eme. Otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ, aha ya bụ Andru, sịrị: “Ọ na-amasị m ma e nwee ihe ụfọdụ m na-eme ndị ọzọ na-amaghị. *

Gịnịzi mere i ji bido zowe ihe ụfọdụ ezo? Otu ihe kpatara ya bụ na i towela. Dị ka ihe atụ, mgbanwe ndị ị na-enwe n’ahụ́ gị n’ihi na ị ghọwala okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa nwere ike na-eme gị  ihere, o nwedịrị ike ime ka ahụ́ ghara irucha gị ala ma gị na ndị ezinụlọ unu nọrọ. Ihe ọzọkwa bụ na ka ị na-etokwu, ị ga na-achọ inwe oge naanị gị ga-anọ tụgharịa uche n’ihe ụfọdụ. Nke a na-egosi na i nwewela “ikike iche echiche,” nke bụ́ àgwà Baịbụl kwuru na onye na-eto eto kwesịrị inwe. (Ilu 1:1, 4; Diuterọnọmi 32:29) Jizọs n’onwe ya gadịrị “n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị” ka ọ nọrọ ebe ahụ tụgharịa uche.—Matiu 14:13.

Nke bụ́ eziokwu bụ na gị na ndị mụrụ gị ka bi, ha kwesịkwara ịma ihe ndị ị na-eme. (Ndị Efesọs 6:1) Ma, ọ bụrụ na ị naghị agwa ha ihe ị na-eme n’ihi na i chere na i towela, gị na ha ga-enwe nsogbu. Olee ihe ị ga-eme ka gị na ha ghara ise okwu? Ka anyị leba anya n’ihe abụọ nwere ike isere unu okwu.

Mgbe Ị Chọrọ Ịnọrọ Onwe Gị

E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka ị chọọ ịnọrọ onwe gị. O nwere ike bụrụ na ị chọrọ ‘izurutu ike.’ (Mak 6:31) Ma ọ bụkwanụ ị chọọ ikpe ekpere, i nwere ike ‘ịbanye n’ọnụ ụlọ gị, mechie ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị ekpere’ otú ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme. (Matiu 6:6; Mak 1:35) Ma nsogbu bụ na ị banye n’ọnụ ụlọ nke gị (ma ọ bụrụ na i nwere ọnụ ụlọ nke gị), mechie ụzọ, o nwere ike ndị mụrụ gị agaghị echewe na ị na-ekpe ekpere! O nwekwara ike ụmụnne gị agaghị aghọta na ị chọghị mmadụ inye gị nsogbu n’oge ahụ.

Ihe I Nwere Ike Ime. Kama gị na ha isewe okwu, mee ihe ndị a.

● Ọ bụrụ na ụmụnne gị anaghị ekwe gị zuru ike, gbalịa gwa ha oge ị na-agaghị achọ ka mmadụ nyewe gị nsogbu. Ya dị mkpa, i nwedịrị ike ịgwa ndị mụrụ gị ka ha nyere gị aka hụ na ụmụnne gị na-eme ihe a ị gwara ha.

● Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-enyochakarị gị, gbalịa ghọta otú ha si ele ihe anya. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii, aha ya bụ Ribeka, sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị mụrụ m na-achọ ịma ihe ndị m na-eme. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na m bụrụ nne nwere nwa dị afọ iri na isii, m ga-emekwa otu ihe ahụ, karịchaa ma m cheta ọtụtụ ọnwụnwa na-abịara ndị na-eto eto n’oge a!” Ì nwere ike ime ka Ribeka, ma gbalịa ghọta ihe mere ndị mụrụ gị ji achọ ịma ihe ndị ị na-eme?—Ilu 19:11.

● Gwa onwe gị eziokwu ka ị na-aza ajụjụ ndị a: ‘Mgbe m nọ n’ọnụ ụlọ nke m gbachie ụzọ, ò nwere otú m si eme nke na-eme ka ndị mụrụ m chewe na e nwere ihe na-adịghị mma m na-eme? Àna m ezokarị ihe ndị m na-eme ezo nke na ndị  mụrụ m ga-achọwazi ụzọ ọzọ ha ga-esi amata ihe m na-eme?’ Ya bụrụ na ị naghị ezo ihe ị na-eme ezo, ndị mụrụ gị agaghị na-enyo gị enyo. *

Ihe Ị Ga-eme. N’okpuru ebe a, dee otú i nwere ike isi kwulite nsogbu a mgbe gị na ndị mụrụ gị na-ekwurịta okwu.

․․․․․

Ụdị Ndị Gị na Ha Na-akpa

I topụtawa agbọghọbịa ma ọ bụ okorobịa, ọ dịghị njọ ma i nwee ndị enyi. Ọ dịghịkwa njọ ma ndị mụrụ gị chọọ ịma ndị bụ́ ndị enyi gị nakwa ihe gị na ha na-eme. Ndị mụrụ gị maara nke ọma na ọ bụ ọrụ ha. Ma gịnwa na-ewere ya na ha anaghị atụkwasị mmadụ obi. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Rut, sịrị: “Ọ naghị amasị m ma ndị mụrụ m jụọ m onye mụ na ya na-ekwu n’ekwe ntị m ma ọ bụ ma ha jụọ m onye ziteere m ozi iimeel m na-agụ.”

Ihe I Nwere Ike Ime. Kama ikwe ka ndị gị na ha na-akpa mee ka ị na-agbara ndị mụrụ gị ọsọ, gbalịa mee ihe ndị a.

● Gwa ndị mụrụ gị ndị bụ́ ndị enyi gị, hụkwa na ha na ha matara. A sị ka e kwuwe, ị gaghị achọ ka ndị mụrụ gị si n’azụ mata ndị enyi gị, ma ha ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ị naghị agwa ha ndị bụ́ ndị enyi gị. Chetakwa na ndị mụrụ gị ma na ụdị ndị gị na ha na-akpa ga-emetụta àgwà gị. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị mata ndị gị na ha na-akpa, ha agaghị na-achọkarị ka ị gwa ha ndị bụ́ ndị enyi gị.

● Jiri nkwanye ùgwù gwa ndị mụrụ gị okwu ya. Agwakwala ha na ha na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha. Kama, i nwere ike kwuo ihe dị ka, “Ọ na-adị m ka è nwere onye na-anọ n’akụkụ na-ege ihe ọ bụla mụ na ndị enyi m na-ekwu. Ọ na-esiziri m ike mụ na ndị enyi m ịkparịta ihe ọ bụla.” Ọ bụrụ na ị gwa ya ndị mụrụ gị, o nwere ike ime ka ha na-enyetụ gị ohere ma gị na ndị enyi gị na-ekwurịta okwu.—Ilu 16:23.

● Gwa onwe gị eziokwu: Ọ̀ bụ naanị na ị chọghị mmadụ inye gị nsogbu, ka è nwere ihe ị na-ezo ezo? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Britini kwuru, sị: “Ọ bụrụ na gị na ndị mụrụ gị bi, ya abụrụkwa na o nwere ihe ha na-amachaghị banyere gị, ihe i kwesịrị iche bụ, ‘Ebe ọ bụ na o nweghị ihe ọjọọ m na-eme, o nweghị ihe m kwesịrị izo ezo.’ Ma, ọ bụrụ na o nwere ihe ị na-ezo ezo, mara na o nwere ihe ị na-eme na-adịghị mma.”

Ihe Ị Ga-eme. N’okpuru ebe a, dee ihe i nwere  ike ikwu ma ị chọọ ka gị na ndị mụrụ gị kwurịta nsogbu a.

․․․․․

Otú Ị Ga-esi Edozi Nsogbu Gị na Ndị Mụrụ Gị Na-enwe

Ugbu a, ị ga-enwezi ike ịma ihe ị ga-eme ná nsogbu nke ọ bụla gị na ndị mụrụ gị na-enwe ma a bịa n’okwu gbasara izo ihe ụfọdụ ezo.

Nke mbụ: Chọpụta ebe gị na ha na-enwe nsogbu.

Olee ihe gbasara gị ị na-agaghị achọ ka ndị mụrụ gị na-etinyekarị anya na ya?

․․․․․

Nke abụọ: Chọpụta ihe bụ́ ụjọ ha.

Gịnị ka ọ dị gị ka ọ̀ bụ ya bụ ụjọ ndị mụrụ gị?

․․․․․

Nke atọ: Gbalịa dozie nsogbu gị na ha na-enwe.

(a) Gbalịa cheta otu ihe ị na-akpachaghị anya na-eme, nke nwere ike ịbụ ya na-eme ka ndị mụrụ gị na-enyo gị enyo, detuokwa ya n’okpuru ebe a.

․․․․․

(b) Olee ihe ị ga-eme iji kwụsị nsogbu ahụ i chetara?

․․․․․

(ch) Olee ihe ị ga-achọ ka ndị mụrụ gị mee gbasara ihe ndị ahụ ị gwara ha na-ewe gị iwe?

․․․․․

Nke anọ: Gị na ha kwurịta ya.

Gị na ndị mụrụ gị kwurịta ihe ndị a i dere n’oge ga-adabara unu.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 21 Ọ bụrụ na i mechaa ihe ndị a, ya adị gị ka ndị mụrụ gị hà ka na-enyo gị enyo, wetuo obi ma jiri nkwanye ùgwù gwa ha otú obi dị gị. Gee ha nnọọ ntị mgbe ha na-agwa gị ụjọ ha, hụkwa na o nweghị otú gịnwa si eme ka ha nyowa gị enyo.—Jems 1:19.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka ndị mụrụ gị mara ihe ọ bụla ị na-eme?

● Olee otú mbọ ị gbara ịhụ na gị na ndị mụrụ gị kwurịtara nsogbu unu na-enwe ga-esi abara gị uru n’ọdịnihu ma gị na ndị ọzọ torola eto nwee nghọtahie?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Ọ bụrụ na ndị na-eto eto anaghị ezoro ndị mụrụ ha ihe, ndị mụrụ ha agaghị na-achọkarị ịgụ ozi iimeel na ozi ndị e ziteere ụmụ ha n’ekwe ntị iji mara ihe ndị ha na-eme.”

“Iwe agaghị ewe m ma ndị mụrụ m gụọ ozi iimeel e ziteere m. Ọ bụrụ na ọ bụghị ihe ọjọọ ma onyeisi ọrụ gụọ ozi iimeel e ziteere ndị ọrụ ya, ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ndị mụrụ ụmụ gụọ ozi iimeel ụmụ ha.”

“Ndị mụrụ gị achọghị ka ihe ọ bụla mee gị, mgbe ụfọdụ o nwere ike ịdị gị ka ha anaghị ekwe gị megharịa ahụ́. Echeghị m na ọ dị mma. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na m mụta nwa, enwekwara m ike ime otu ihe ahụ.”

[Foto ndị]

Iden

Kevin

Alana

[Igbe dị na peeji nke 23]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

● Nwa gị nwoke nọ n’ime ụlọ ọ na-arahụ, mechie ụzọ. Ì kwesịrị ịbata n’ebughị ụzọ kụọ aka?

● Nwa gị nwaanyị chefuru ekwe ntị ya n’ụlọ gawa akwụkwọ. Ọ̀ dị mma ma i were ekwe ntị ahụ, mepee ebe a na-edebe ozi ma gụwa ozi ndị ọzọ ziteere ya?

Ajụjụ ndị a adịghị mfe ọzịza. Ma ọ dịnụ mkpa na ị ga-ama ihe nwa gị na-eto eto na-eme, ọ bụkwa ọrụ gị ịhụ na ọ banyeghị ná nsogbu. I kwesịkwara icheta na ị gaghị anọli ebe niile nwa gị nọ iji hụ na ọ banyeghị ná nsogbu, ị gaghị enwekwa ike ịma ihe niile nwa gị na-eme. Gịnịzi ka ị ga-eme ka ị ghara imefe ihe ókè?

Nke mbụ, cheta na ọ bụrụ na nwa na-eto eto ezochiere ndị mụrụ ya ihe ụfọdụ ọ na-eme, ọ bụghị mgbe niile ka ọ pụtara na o nwere ihe ọjọọ ọ na-eme. Ọtụtụ mgbe, ụdị ihe ahụ na-egosi na nwa ahụ etowela. Izochi ihe ụfọdụ na-enyere ndị na-eto eto aka ịmata ma hà ga-anọli nke onwe ha. Ọ na-enyekwara ha aka iji “ike iche echiche” ha na-echebara nsogbu ndị ha na-enwe echiche. (Ndị Rom 12:1, 2) Izochi ihe ụfọdụ na-enyekwara ndị na-eto eto aka inwe ikike iche echiche, nke bụ́ àgwà dị ezigbo mkpa na ha ga-enwe ma ọ bụrụ na ha ga-abụ ndị toro eto na-eche echiche nke ọma. (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Ọ na-enyekwara ha aka ịmụta ibu ụzọ chebara okwu siri ike echiche tupu ha azaghachi.—Ilu 15:28.

Nke abụọ, cheta na ị chọọ ka ọ bụrụ gị ga na-agwa nwa gị ihe ọ bụla ọ ga-eme, o nwere ike ịkpasu ya iwe, meekwa ka o nupụwara gị isi. (Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21) Nke a ọ̀ pụtaziri na ị ga-ahapụ ya ka o mewe otú ọ bụla dị ya mma? Mbanụ, ọ bụ gị mụrụ ya. Ihe dị mkpa bụ inyere nwa gị aka ka o nwee akọnuche a zụrụ azụ. (Diuterọnọmi 6:6, 7; Ilu 22:6) N’ikpeazụ, ị ga-achọpụta na inyere nwa gị aka ịzụ akọnuche ya ka mma karịa inyochawa ihe ọ bụla ọ na-eme.

Nke atọ, gị na nwa gị kwurịta ihe bụ́ ụjọ gị. Gee ya ntị mgbe ọ na-ekwu ihe ndị na-ewe ya iwe. Lee ma è nwere mgbanwe ụfọdụ ị ga-eme. (Ndị Filipaị 4:5) Gwa nwa gị na ị gaghị na-enyochakarị ya ma ọ bụrụ na ọ gaghị emenye gị ihere. Gwa ya ntaramahụhụ ị ga-enye ya ma ọ bụrụ na o meghị ihe gị na ya kpebiri, hụkwa na i mere ihe ahụ i kwuru ma ọ daa iwu ahụ. Ka obi sie gị ike na ịhapụ nwa gị na-eto eto ka o nwee ihe ụfọdụ ọ na-anaghị akọrọ gị agaghị eme ka ị ghara ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna.

[Foto dị na peeji nke 22]

Mmadụ ịbụ onye a tụkwasịrị obi dị ka ụgwọ ọnwa a na-akwụ onye ọrụ, ọ bụkwa naanị onye rụrụ ọrụ ka a na-akwụ ya