Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngọzi Ndị Karịrị Akụnụba

Ngọzi Ndị Karịrị Akụnụba

 Ngọzi Ndị Karịrị Akụnụba

JON, bụ́ onye bi na United States nwere ezigbo ọrụ ọ na-arụ. Mgbe ọ ka bụdị nwa okorobịa, ọ gara ọtụtụ ebe n’ụwa, kpatakwa ezigbo ego. Ya na nwunye ya nwere ọmarịcha ụlọ ma na-ebi nnọọ ndụ na-atọ ha ụtọ. Ọtụtụ ndị weere na ha bụ ndị a gọziri agọzi.

Ka anyị tụleekwa banyere onye ọzọ. N’ihe karịrị puku mmadụ ise tinyere akwụkwọ ka e wee ha n’ọrụ, Kostas * so na mmadụ iri asatọ a họọrọ ka ha mụọ ọrụ n’otu ụlọ akụ̀ a ma ama na Yurop. N’ime afọ ole na ole, e buliri ya n’ọkwà ugboro ugboro ma mesịa mee ya onyeisi nke otu ngalaba dị ezigbo mkpa n’ụlọ akụ̀ ọzọ. Tupu ya ahapụ ọrụ ahụ ma mepee ụlọ ọrụ nke ya, ego ọ na-akpata n’otu afọ karịrị ihe a kwụtụrụla ọtụtụ ndị ná ndụ ha niile. O weere na ya bụ onye a gọziri agọzi.

Ma ụmụ nwoke abụọ a kwetara na e nwere ngọzi ndị karịrị ego. Dị ka ihe atụ, taa Jon na-eji oge ya akụziri ndị mmadụ Baịbụl ma na-enyere ha aka ịbịa marakwuo Chineke. Jon sịrị: “Achọpụtala m n’onwe m na ịbụ aka ji akụ̀ abụghị ya na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ịchụ ego anaghị ekwe mmadụ mee ihe ndị ọzọ. Ma, ime ihe Baịbụl kwuru  na-eweta ọtụtụ ngọzi ndị dị ka obi iru ala, ezi akọ na uche, na di na nwunye inwe ezigbo obi ụtọ.”

Kostas kwukwara ihe yiri nke ahụ mgbe ọ sịrị: “Chineke achọghị ka anyị jiri ndụ anyị niile na-achụ akụnụba. Obi m na-agwa m na mgbe ọ bụla o nyere anyị ihe karịrị ihe ndị dị anyị mkpa ná ndụ, iwu ji anyị iji ya mee uche ya.” N’oge na-adịchabeghị anya, Kostas na ezinụlọ ya malitere ịmụ asụsụ ọzọ iji nwee ike ịkụzikwuru ndị mmadụ Baịbụl. Ọ sịrị, “Anyị achọpụtala na inye ihe na-eme anyị obi ụtọ karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

N’eziokwu, ma Jon ma Kostas achọpụtala na ngọzi ndị a na-enweta n’ime uche Chineke na-aba nnọọ uru karịa nke a na-enweta n’akụnụba. Daniel Gilbert, onye bụ́ prọfesọ n’ụlọ akwụkwọ Harvard, kwuru na ndị ọkachamara n’ihe metụtara ọrịa ụbụrụ “ejirila ọtụtụ iri afọ na-amụ ihe iji mata ma è nwere ihe jikọrọ akụnụba na obi ụtọ, ha achọpụtakwala na mgbe akụnụba na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mgbe o mere ka ogbenye ọnụ ntụ rijuwe afọ.” Prọfesọ ahụ mechaziri sị, “Ọ karịhaala otú ahụ, ọ naghị eme ka mmadụ nwekwuo obi ụtọ.”

Mmakwaara Ọtụtụ Ndị Na-emecha Kwaa

Otu ọkachamara kwuru, sị: “Ọ bụ ihe na-atụ n’anya ịmata na mmadụ isi n’ogbenye pụọ ma nwetakwuwe ego anaghị eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ.” N’ihe dị ka iri afọ itoolu gara aga, otu onye nta akụkọ chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu mgbe ọ gbara Andrew Carnegie, onye so ná ndị mepere ụlọ ọrụ na-emepụta ígwè, bụrụkwa otu n’ime ndị kasị nwee ego n’ụwa n’oge ahụ, ajụjụ ọnụ. Carnegie gwara ya, sị: “Onye achọkwala ịdị ka m. Akụnụba m ọ̀ ga-enyeliri m aka? Adị m afọ iri isii ma nri m na-eri anaghị agbari agbari. Adị m njikere inye ihe niile m nwere iji dịghachi ka nwa okorobịa, ahụ́ esiekwa m ike.”

Onye nta akụkọ ahụ kwuziri, sị: “Maazị  Carnegie tụgharịrị ozugbo ma jiri obi ilu na mwute takwunyere m, sị, ‘Obi ga-adị m ụtọ ire ihe ọ bụla m nwere iji nwetaghachi ndụ m.’” Nnukwu aka ji akụ̀ ọzọ bụ́ J. Paul Getty, onye ji mmanụ a na-egwute n’ala eri, kwukwara ihe yiri ya mgbe ọ sịrị: “Ego enwekarịghị ihe ọ bụla nke jikọtara ya na obi ụtọ. Eleghị anya, e nwere ihe jikọtara ya na enweghị obi ụtọ.”

I nwere ike ikweta n’ihe a otu onye so dee Baịbụl kwuru mgbe ọ rịọrọ Chineke, sị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Ka m rie nri e kenyere m, ka afọ ghara iju m, m wee gọnahụ gị, sị: ‘Ònye bụ Jehova?’ ka m gharakwa ịda ogbenye, m wee zuo ohi ma metọọ aha Chineke m.”—Ilu 30:8, 9.

Eze Sọlọmọn nke Izrel oge ochie sịrị: “Aghọrọ m onye ukwu, baakwa ọgaranya karịa onye ọ bụla dịrị ndụ na Jeruselem tupu mụ onwe m.” Ma, o kwukwara, sị: “Ihe niile bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.” Sọlọmọn sịkwara: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”—Ekliziastis 2:9-11; 5:12, 13; Ilu 10:22.

Ihe Na-eweta Ngọzi Ndị Na-adịru Ebighị Ebi

O doro anya na naanị otú anyị nwere ike isi nweta ezigbo obi ụtọ, nke na-adịtekwa aka bụ ma anyị na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Chineke bute ụzọ ná ndụ anyị, anyị ga-ahụ na ndụ anyị ga-akakwu mma ma na-abakwukwara anyị uru.

Ọ bụ ihe obi ụtọ ikwu na ego agaghị anọgide na-akpatara anyị nchegbu. Baịbụl na-ekwe anyị nkwa na oge na-abịa mgbe azụmahịa anyaukwu na nke nrigbu ga-akwụsị kpamkpam. (1 Jọn 2:15-17) Ọ bụ ezi omume ga-achị eze n’ụwa ọhụrụ Chineke. A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs dị nnọọ ka Chineke chọrọ ka ọ dị mgbe o kere di na nwunye mbụ ahụ ma mee ka ha biri na ya. Ọ ga-abụ nnọọ ngọzi ịhụ ka obi ụtọ, udo, na ịhụnanya jupụtara n’ụwa niile!—Aịzaya 2:2-4; 2 Pita 3:13; 1 Jọn 4:8-11.

N’oge ahụ, ndụ agaghị na-agbụ anyị agbụ ma ọ bụ na-agwụ ike. Mgbe Chineke ga-emezu nzube mbụ ya, nke bụ́ ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ụwa, ọ bụghị naanị na anyị na Ya ga-adị ná mma, ọ ga-ejikwa ihe onwunwe gọzie anyị. O mere ka obi sie anyị ike na nri, ụlọ, na ezigbo ọrụ ga-abụ atụrụ tawa. O nweghịzi onye ga-abụ ogbenye.—Abụ Ọma 72:16; Aịzaya 65:21-23; Maịka 4:4.

Onye ọ bụla ji obi ya niile tụkwasị Jehova, bụ́ Chineke nke Baịbụl, agaghị akwa mmakwaara. (Ndị Rom 10:11-13) N’ihi ya, anyị ga-abụ ndị maara ihe ma anyị bido ugbu a chọwa ngọzi ndị ahụ karịrị akụnụba!—1 Timoti 6:6-10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Chineke bute ụzọ ná ndụ anyị, ndụ anyị ga-abakwu uru

[Foto dị na peeji nke 8]

Ịhazi ihe ị ga-eji ego gị na-eme nwere ike ime ka ndụ na-atọkwu gị ụtọ