Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị n’Ezie Ka Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ịghara Ịgba n’Èzí Pụtara?

Gịnị n’Ezie Ka Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ịghara Ịgba n’Èzí Pụtara?

 Echiche Baịbụl

Gịnị n’Ezie Ka Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ịghara Ịgba n’Èzí Pụtara?

Ọtụtụ ndị kweere na di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị inwe onye ọzọ ya na ya na-enwe mmekọahụ. Nke a dabara n’ihe Baịbụl kwuru, sị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ.”—Ndị Hibru 13:4.

IHE ga-eme ka e kwuo na di ma ọ bụ nwunye anaghị agba n’èzí ọ̀ bụ naanị mgbe ya na nwaanyị ọzọ ma ọ bụ nwoke ọzọ na-adịghị enwe mmekọahụ? Oleekwanụ maka di ma ọ bụ nwunye ịnọ na-eche obi ụtọ ọ ga-enwe ma ya na onye ọzọ nwee mmekọahụ? È nwere ike iwere na di ma ọ bụ nwunye nke nwere nwaanyị ma ọ bụ nwoke ọzọ ya na ya na-akpachi anya dị ka onye na-agba n’èzí?

Ọ̀ Dị Njọ Iche Obi Ụtọ Ị Ga-enwe Ma Gị na Onye Ọzọ Nwee Mmekọahụ?

Baịbụl kwuru na mmekọahụ bụ ihe dị mma Chineke mere maka di na nwunye, nke na-enyekwa ha abụọ ọṅụ na afọ ojuju. (Ilu 5:18, 19) Ma, ọtụtụ ndị ọkachamara nke oge a na-ekwu na o nweghị ihe o mere, nakwa na ọ bụdị ihe ahụ́ mmadụ chọrọ ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye enwee onye ọzọ ọ na-adị na-eche obi ụtọ ọ ga-enwe ma ya na ya nwee mmekọahụ. Mmadụ iche ụdị ihe a ọ̀ dị mma ma ọ bụrụhaala na onye ahụ emeghị ya eme?

Ihe na-adịkarị onye na-eche ụdị ihe a mkpa bụ igbo naanị agụụ nke onwe ya. Ndụmọdụ Baịbụl nyere ndị di na nwunye katọrọ mmadụ iche naanị maka ọdịmma onwe ya. Okwu Chineke kwuru banyere inwe mmekọahụ, sị: “Ọ bụghị nwunye na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ di ya; otú ahụkwa, ọ bụghị di na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ nwunye ya.” (1 Ndị Kọrịnt 7:4) Ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ ghara iwere mmekọahụ dị ka ihe e ji egbo agụụ mmekọahụ ndị onye ahụ malitere inwe mgbe ọ na-eche ebe ya na onye ọzọ na-enwe mmekọahụ. Ọ bụrụ na di na nwunye na-ezere ụdị ihe a, ha ga-enwekwu obi ụtọ.—Ọrụ 20:35; Ndị Filipaị 2:4.

Ọ bụrụ na mmadụ ana-eche obi ụtọ ọ ga-enwe ma ya na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ, ihe ọ na-eme bụ iche ihe ga-agbawa di ma ọ bụ nwunye ya obi ma o mechaa mee ya. Mmadụ iche ụdị ihe a, ò nwere ike ime ka onye ahụ na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya kwaa iko? À na-ajụkwa ajụ? Baịbụl kọwara otú ihe mmadụ na-eche si agbasa ihe ọ na-eme, mgbe ọ sịrị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”—Jems 1:14, 15.

Jizọs sịrị: “Ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:28) Ọ bụrụ na i zere ichewe otú gị na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị ga-esi enwe mmekọahụ, ‘ị ga-echebe obi gị” meekwa ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị nọgide na-ebi nke ọma.—Ilu 4:23.

Ihe Mere Obi Gị Ga-eji Dịrị Naanị n’Ebe Di ma Ọ Bụ Nwunye Gị Nọ

Di na nwunye ga na-ebi nke ọma ma ọ bụrụ na ha ‘anaghị ekwe’ ka onye ọzọ bata. (Abụ Sọlọmọn 8:6; Ilu 5:15-18) Gịnị ka nke a pụtara? Ọ bụ eziokwu na i nwere ike inwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọzọ gị na ya dị ná mma, ma, ọ bụ di ma ọ bụ nwunye gị ka ị ga-akacha na-enye oge gị, na-ekwunyere okwu, ma na-akọrọ  otú obi dị gị. E nwee onye ọzọ ị na-enye ihe ruuru naanị di ma ọ bụ nwunye gị, ihe ọ pụtara bụ na ị na-agba n’èzí, ọ sọgodị ya ya bụrụ na gị na onye ahụ enweghị mmekọahụ. *

Olee otú o si ebido? O nwere ike ịdị gị ka nwoke na-abụghị di gị ma ọ bụ nwaanyị na-abụghị nwunye gị ọ́ mara mma ma ọ bụ nwee obi ebere karịa di ma ọ bụ nwunye gị. Ọ bụrụ na gị na onye ahụ na-anọkarị n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọ bụ ná nnọkọ ọhaneze, o nwere ike ime ka gị na ya kpawa ihe ndị na-eme ná ndụ unu, gị amalite ịkọrọ ya nsogbu ndị gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-enwe. I nweziri ike na-akọrọ ya ihe na-enye gị nsogbu n’obi, yanwa ana-agwa gị okwu ga-emeda gị obi. Mmadụ nwere ike isi ná nkata ya na onye ọzọ na-akpa ihu na ihu, n’ekwe ntị, ma ọ bụ na kọmputa, kọọrọ onye ahụ ihe kwesịrị ịdịrị naanị ya na di ma ọ bụ nwunye ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma di ma ọ bụ nwunye buru n’obi na e nwere okwu ndị dịịrị naanị ha abụọ, nakwa na onye ọzọ ekwesịghị ịnụ “okwu nzuzo” ha.—Ilu 25:9.

Kpachara anya ka ị ghara ịsị na ị naghị anwụrụ onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị ebe ọ bụkwanụ na ị na-anwụrụ ya! Jeremaya 17:9 kwuru na ‘obi dị aghụghọ.’ Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị na-akpachi anya, jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m agọ na o nweghị ihe na-aga n’etiti mụ na onye ahụ ma ọ bụkwanụ mụ na ya ezoro ezo na-akpa? Obi ọ̀ ga-eru m ala ma di ma ọ bụ nwunye m nụpere ụdị nkata mụ na onye ahụ na-akpa? Olee otú obi ga-adị m ma di m ma ọ bụ nwunye m na nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ na-akpa otú ahụ mụ na onye ahụ si akpa?’—Matiu 7:12.

Di na nwunye nwere ike itisa ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha enwee onye ọzọ ọ na-akọrọ otú obi dị ya, n’ihi na o nwere ike isi n’ịkọrọ ya otú obi dị ya ya na ya enwezie mmekọahụ. Dị ka Jizọs dọrọ aka ná ntị, “n’obi ka . . . ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, . . . si apụta.” (Matiu 15:19) Ma, ọ bụrụgodị na di ma ọ bụ nwunye akwaghị iko, ọ ga-esi ezigbo ike tupu di ma ọ bụ nwunye nke aka ya dị ọcha atụkwasịwa onye nke aka ya na-adịghị ọcha obi otú ọ tụkwasiburu ya. Otu nwaanyị a lụ alụ bụ́ Karen * sịrị: “Mgbe m chọpụtara na Mark na-ezo ezo akpọ nwaanyị ọzọ na fon ugboro ugboro n’ụbọchị, nke ahụ gbawara m obi. O siiri m ike ikweta na ha anaghị enwe mmekọahụ. Amaghị m ma m nwere ike ịtụkwasị ya obi ọzọ.”

Gị na nwoke na-abụghị di gị ma ọ bụ nwaanyị na-abụghị nwunye gị adịfela ná mma ókè. E nwee ka obi gị si dịwa n’ebe onye ọzọ nọ, agbala nkịtị ma ọ bụ na-agwa onwe gị na ọ dịghị ihe o mere. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ò nwere otú adịm ná mma gị na onye ọzọ nwere ike isi butere gị na di ma ọ bụ nwunye gị nsogbu, mee ihe banyere ya ozugbo ma ọ bụ gị na onye ahụ kwụsịchaa ịkpa. Baịbụl sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.”—Ilu 22:3.

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Tisaa Unu

Onye kere anyị bu n’obi na di na nwunye kwesịrị ịdị ná mma karịa otú mmadụ abụọ ọ bụla ọzọ nwere ike ịdịru ná mma. O kwuru na di na nwunye “ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) Ihe mere ha abụọ ji bụrụ otu anụ ahụ́ abụghị naanị ka ha na-enwe mmekọahụ. Ha kwesịrị ime ka ịhụnanya ha sie nnọọ ike site n’ịtụkwasị ibe ha obi, onye nke ọ bụla ana-akwanyekwara ibe ya ùgwù n’achọghị ọdịmma onwe ya naanị. (Ilu 31:11; Malakaị 2:14, 15; Ndị Efesọs 5:28, 33) Ime ihe ndị a ga-enye aka mee ka ị ghara iwere obi gị nye onye ọzọ ma ọ bụ chewe otú gị na onye ọzọ na-abụghị di ma ọ bụ nwunye gị ga-esi nwee mmekọahụ, bụ́kwa ihe nwere ike itisa gị na di ma ọ bụ nwunye gị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ma ọ dị mkpa iburu n’obi na naanị ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro nwere ike ime ka mmadụ gbaa di ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm bụ mgbe ọ kwara iko.—Matiu 19:9.

^ par. 14 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Di ma ọ bụ nwunye ịnọ na-eche obi ụtọ ọ ga-enwe ma ya na onye ọzọ nwee mmekọahụ, ò nwere ike ime ka ọ kwaa iko?—Jems 1:14, 15.

▪ Gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọzọ ịkpachi anya, ò nwere ike ibute nsogbu n’etiti gị na di ma ọ bụ nwunye gị?—Jeremaya 7:9; Matiu 15:19.

▪ Olee otú i nwere ike isi mee ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị dịrịkwuo ná mma? —1 Ndị Kọrịnt 7:4; 13:8; Ndị Efesọs 5:28, 33.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

“Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.”—Matiu 5:28