Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Ozu Ọkụ?

Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Ozu Ọkụ?

 Echiche Baịbụl

Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Ozu Ọkụ?

Ụfọdụ ndị na-eche na ịkpọ ozu ọkụ bụ ịkparị ozu ahụ na ime ka a ghara inwe ihe a ga-eji na-echeta ya. Ha na-asị na ‘ịkpọ ozu ọkụ si n’aka ndị ọgọ mmụọ, n’ihi ya kwa, ndị sị na ha na-efe Chineke ekwesịghị ime ya.’ Ndị ọzọ kweere na ịkpọ ozu ọkụ dị mma ma kwesị ekwesị. Olee ihe i chere n’okwu a?

N’OGE Baịbụl, a na-elikarị ozu eli. Dị ka ihe atụ, Ebreham liri nwunye ya bụ́ Sera n’ọgba. E liri Jizọs n’ili e gwuru n’oké nkume. (Jenesis 23:9; Matiu 27:60) Baịbụl ò kwuru na naanị ihe dị mma ime ozu bụ ili ya eli? Ò kwuru na ndị ohu Chineke n’oge ochie weere na ịkpọ ozu ọkụ bụ ihe ọjọọ?

Ọ̀ Na-egosi na Ihe Ha Adịghị Chineke Mma?

E lee ya anya elu elu, e nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl yiri ka hà na-egosi na ọ bụ naanị ndị ihe ha na-adịghị Chineke mma ka a na-akpọ ozu ha ọkụ. Dị ka ihe atụ, Iwu Mozis kwuru na ọ bụrụ na nwa nwaanyị nke onye nchụàjà Jehova aghọọ onye akwụna, “a ga-akpọ ya ọkụ” ma e gbuchaa ya. (Levitikọs 20:10; 21:9) Mgbe Ekan na ezinụlọ ya zukwara ohi nke mere ka e merie ndị Izrel n’agha na E-aị, ndị Izrel ibe ha ji nkume tụgbuo ha, mesịakwa “gbaa ha ọkụ.” (Jọshụa 7:25) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ọ bụ ndị nwụrụ ọnwụ ihere ka a na-akpọ ozu ha ọkụ, nakwa na ọ na-eme ka a ghara ili onye ahụ nwụrụ anwụ ezigbo olili.

Ọzọkwa, mgbe Eze Josaya chọrọ ime ka ikpere arụsị kwụsị na Juda, o mepere ebe e liri ndị  nchụàjà Bel, kporo ọkpụkpụ ha kpọọ ha ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ha. (2 Ihe E Mere 34:4, 5) Ihe atụ ndị a hà na-egosi na ọ bụ ndị ihe ha na-adịghị Chineke mma ka a na-akpọ ozu ha ọkụ? Mba, dịkwa ka akụkọ ọzọ dị na Baịbụl na-egosi.

Mgbe ndị Filistia meriri Eze Sọl nke Izrel n’agha, ha kparịrị ozu ya na ozu ụmụ ya ndị nwoke atọ site n’ịkwụba ha ná mgbidi Bet-shan. Ma, mgbe ndị Izrel bi na Jebesh-gilied nụrụ ihe e mere ozu ndị ahụ, ha gara bupụta ozu ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ ma lizie ọkpụkpụ ha. (1 Samuel 31:2, 8-13) Ozugbo mmadụ gụrụ akụkọ a, o nwere ike iche na ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ndị ihe ha na-adịghị Chineke mma ka a na-akpọ ozu ha ọkụ. A sị ka e kwuwe, Sọl bụ ajọ mmadụ; o busoro Devid bụ́ onye Jehova tere mmanụ agha ma nwụọ n’ihi na ihe ya adịghị Chineke mma.

Ma, ị̀ chọputara onye ọzọ ya na Sọl so nwụọ? Otu n’ime ụmụ ya e mekwara ozu ya ihe e mere nke Sọl bụ Jọnatan. Ọ bụghị ajọ mmadụ. Jọnatan bụ ezigbo enyi Devid nakwa onye na-enyere Devid aka. Ndị Izrel kwuru banyere Jọnatan, sị: “Ya na Chineke rụrụ ọrụ.” (1 Samuel 14:45) Mgbe Devid nụrụ ihe ndị Jebesh-gilied mere, ọ jara ha mma ma kelee ha, ma kwuo, sị: “Ka Jehova gọzie unu, n’ihi na unu gosiri onyenwe unu, bụ́ Sọl, obiọma.” O doro anya na ozu Sọl na nke Jọnatan a kpọrọ ọkụ ewuteghị Devid.—2 Samuel 2:4-6.

Ọ Gaghị Egbochi Ịkpọlite Onye ahụ n’Ọnwụ

Baịbụl mere ka o doo anya na Jehova Chineke ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Ekliziastis 9:5, 10; Jọn 5:28, 29) Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Mkpughe, nke a na-akpọkwa Apọkalips, buru amụma banyere oge ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” (Mkpughe 20:13) Ma è liri onye nwụrụ anwụ eli, ma à kpọrọ ya ọkụ, ma mmiri ò riri ya, ma anụ ọhịa ọ̀ dọgburu ya, ma ọ bụkwanụ na bọmbụ gbarisịrị ya, o nweghị nke ga-eme ka o siere Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ike ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ.

Baịbụl ekwughị kpọmkwem ihe e kwesịrị ime ozu ndị nwụrụ anwụ. Jehova akatọghị ịkpọ ozu ọkụ. Ma, ihe ọ bụla a chọrọ ime ozu mmadụ, e kwesịrị ka e mee ya n’ụzọ dị ùgwù.

Ma, otu ihe nwere ike inyere mmadụ aka ikpebi ihe ọ ga-eme ozu onye nwụrụ anwụ bụ otú ndị bi n’ógbè ahụ si eme. Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru agaghị achọ ịkpachara anya mee ihe ndị agbata obi ha ga-eji wewe iwe na-enweghị isi. Ọ gaghị adịkwa mma ka ha mee ihe ọ bụla ga-eme ka o yie ka hà kweere n’ozizi ụgha, dị ka ozizi bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ. E wezụga ihe ndị a a kpọrọ aha, ihe ọ bụla mmadụ kpebiri na a ga-eme ozu ya ma ọ bụ ozu onye ọzọ, dịịrị naanị onye ahụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ onye ahụ.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee onye na-efe Chineke e kwuru okwu ya na Baịbụl nke a kpọrọ ozu ya ọkụ?—1 Samuel 31:2, 12.

▪ Olee ihe Devid gwara ndị kpọrọ ozu Sọl ọkụ?—2 Samuel 2:4-6.

▪ Gịnị gosiri na e nwere ike ịkpọlite onye a kpọrọ ozu ya ọkụ?—Mkpughe 20:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Baịbụl ekwughị kpọmkwem ihe e kwesịrị ime ozu ndị nwụrụ anwụ