Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbalị Inye Ijeri Mmadụ Nri

Ịgbalị Inye Ijeri Mmadụ Nri

Ịgbalị Inye Ijeri Mmadụ Nri

KWA ụbọchị, otu ijeri mmadụ anaghị eriju afọ. Ma, dị ka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ọnọdụ ọjọọ a ekwesịghị ịdị.

“Unu ekwuwo na ihe mbụ unu ga-eme bụ ikpochapụ ogbenye ọnụ ntụ.” Ihe a ka Odeakwụkwọ Ukwu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Kofi Annan, gwara ìgwè ndị ikom na ndị inyom nọ n’ọkwá kasị elu n’ụwa, na September 8, 2000. Ha gbakọtara maka nzukọ ezumezu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke a kpọrọ Millennium Summit, bụ́ oge ọtụtụ n’ime ndị isi ọchịchị ahụ kwuru okwu n’ezoghị ọnụ banyere nsogbu nke ndị ogbenye nọ n’ụwa. “Ogbenye ọnụ ntụ bụ mkparị nye ihe a kpọrọ mmadụ,” ka osote president Brazil kwuru. Praịm minista nke Great Britain mere ọbụna ka ọnọdụ ahụ dokwuo anya mgbe o kwuru, sị: “Mba ndị mepere emepe akụwo nnọọ afọ n’ala ma a bịa n’idozi nsogbu e nwere n’Africa. Nke a bụkwa ihe ihere na ihe na-awụ akpata oyi nye anyị onwe anyị mepere anya.”

Ndị isi ọchịchị abụọ ahụ mere ka o doo anya na mba ụwa emenyewo onwe ha ihere n’ihi emeghị ihe ha pụrụ ime iji nyejuo ụmụ mmadụ agụụ na-egbu afọ. Iji gosi ọchịchọ ha nwere ime ka ọnọdụ ibi ndụ nke ndị nile nọ n’ụwa dịkwuo mma, ndị gara nzukọ ahụ kwenyere ime ihe banyere ya site n’ịbịanye aka n’ihe asatọ ha kwekọrịtara, bụ́ nke ihe ndị na-esonụ so n’ime ha: “Anyị ga-eme ihe nile anyị pụrụ ime iji mee ka ụmụ nwoke, ụmụ nwanyị, na ụmụaka nwere onwe ha pụọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya ogbenye ọnụ ntụ tinyeworo ha na ya, bụ́ nke ihe karịrị otu ijeri n’ime ha nọ na ya ugbu a. . . . Ihe ọzọ anyị kpebikwara bụ: Ime ka ọnụ ọgụgụ nke ndị nọ n’ụwa bụ́ ndị na-adịghị akpataru otu dollar n’ụbọchị na ọnụ ọgụgụ nke ndị agụụ na-agụgbu jiri ọkara belata ka ọ na-erule afọ 2015.”

Olee ọganihu e nweworo n’ihe mgbaru ọsọ a magburu onwe ya, bụ́ nke e setịpụrụ kemgbe September 2000?

Omume Ka Okwu Ọnụ Ike

N’afọ 2003, Òtù Na-ahụ Maka Ịgbaso Ụkpụrụ Mba Ụwa Tụpụtara, bụ́ nke Òtù Na-ahụ Maka Akụ̀ na Ụba Ụwa guzobere, malitere ime nnyocha iji mara ihe ndị e meworo iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu setịpụrụ. Ihe ha chọpụtara, bụ́ nke ha wepụtara na January 15, 2004, na-ekwu, sị: “Ụwa na-akụ nnọọ afọ n’ala n’itinye mgbalị a chọrọ iji ruo nke ọ bụla n’ime ihe mgbaru ọsọ ya ndị kasị mkpa.” A bịa n’ihe banyere agụụ, akụkọ ahụ kwuru, sị: “Ihe bụ́ nsogbu abụghị na nri kọrọ kpamkpam n’ụwa—e nwere nri ga-ezuru onye ọ bụla. Ihe bụ́ nsogbu bụ na nri dịnụ na nri ndị na-enye ezigbo ihe n’ahụ́ adịghị eru ndị na-ejighị ego aka.”

A bịa ná nsogbu nke ịda ogbenye, akụkọ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ gọọmentị nke mba ndị bara ọgaranya na nke mba ndị dara ogbenye ka afọ a a kụrụ n’ala n’iru ihe mgbaru ọsọ a dị n’isi karịsịa. Ma, usoro mba ndị bara ọgaranya tụpụtara ka a na-agbaso n’ihe metụtara ọnọdụ akụ̀ na ụba na-abụkarị nkata aghụghọ a kpara iji megbuo mba ndị kasị daa ogbenye. N’agbanyeghị na mba ndị bara ọgaranya na-ekwukarị okwu banyere ịgbanwe usoro a ma ọ bụ inyekwuru mba ndị kasị daa ogbenye aka inwe ọganihu, ha adịchaghị egosi na ha nwere mmasị ime otú ahụ.” N’agbanyeghị nkatọ a a katọrọ ha, ndị ọchịchị ụwa ka nọgidere na-arụrịta ụka kama ime ihe, gọọmenti dị iche iche ka nọgidekwara na-awụgharị, nke ọ bụla na-achọ ebe ọ ga-adịrị ya mma. Ka ọ dị ugbu a, ndị ogbenye nọ n’ụwa ka nọ n’agụụ.

Otu obere akwụkwọ Òtù Na-ahụ Maka Akụ̀ na Ụba Ụwa dere nke isiokwu ya bụ “Site n’Inwe Ọchịchọ Gaa n’Ime Eme,” dọrọ aka ná ntị na “agụụ ọtụtụ ógbè nọ na ha ga-anọgide na-amụba, ọ gwụla ma mba ụwa hà gbanwere iwu ha na-agbaso n’azụmahịa, mba ọ bụla elekwasị anya n’ikpochapụ agụụ ná mba nke ha, ọchịchị ime obodo ana-etinyekwukwa ihe ná mbọ ha na-agba n’akụkụ a.” Ole ndị ka ọ dịkwa n’aka ime atụmatụ ka mma na ime ka ‘ọchịchị ime obodo na-agbakwu mbọ’? Ọ bụkwa gọọmenti ndị ahụ kwupụtara mkpebi ha n’ihu ọha n’afọ 2000 na ha ga-emeziwanye ọnọdụ ibi ndụ nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.

Otu nkwa a na-emezughị pụrụ ime ka e nwee nkụda mmụọ; ọtụtụ nkwa a na-emezughị na-eme ka a ghara ịtụkwasị mmadụ obi. N’ihi emezulighị nkwa ha kwere ilekọta ndị ogbenye, ndị ọchịchị ụwa aghọziela ndị a na-adịghị atụkwasị obi. Otu nne ji ụmụ ise, bụ́ onye bi n’otu obodo dara ogbenye n’ógbè Caribbean bụ nanị otu ugbo ka ọ na-enwe ike inye ụmụ ya nri n’ụbọchị. O kwuru, sị: “Nanị ihe dị m mkpa bụ ma ànyị ga-enwekwa ike inweta ihe anyị ga-eri. Onye ọ sọrọ ya nọrọ n’ọchịchị, ọ gbasaghị m. Anyị enwetatụbeghị ihe ọ bụla n’aka onye nọ n’ọchịchị.”

Otu onye so dee Bible bụ́ Jeremaịa kwuru, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọdịda ọchịchị ụmụ mmadụ dara n’igbo mkpa ndị ogbenye na-egosi na ihe ahụ Bible kwuru bụ eziokwu.

Ma e nwere Onye Ọchịchị nke nwere ma ike ma ọchịchọ a chọrọ iji gboo mkpa ụmụ mmadụ, Bible mekwara ka a mara onye ọ bụ. Mgbe Onye Ọchịchị ahụ ga-amalite ọchịchị, ọ dịghị onye ga-anọ agụụ ọzọ.

Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya

“Anya ihe nile na-ele anya Gị; Gị onwe gị na-enyekwa ha ihe oriri ha na mgbe ya.” (Abụ Ọma 145:15) Ònye bụ Onye a nwere mmasị n’igboro ụmụ mmadụ mkpa ihe oriri ha? Ọ bụ Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. Ọ bụ ezie na ihe a kpọrọ mmadụ ahụsiwo anya n’ihi ụkọ nri nakwa nsogbu ndị ọzọ ruo ọtụtụ puku afọ, Jehova anọgidewo na-enwe mmasị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ọ nọwo na-ahụ otú ọchịchị ụmụ mmadụ si na-akụ afọ n’ala, Okwu ya nke na-adịghị agha agha, bụ́ Bible, na-egosikwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eji ọchịchị nke ya dochie ya.

Jehova na-ekwu, sị: “Ma mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.” (Abụ Ọma 2:6) Okwu a onye kasị ukwuu n’eluigwe na ala kwuru kwesịrị ime ka anyị nwee olileanya. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị bụ́ mmadụ adawo ọtụtụ mgbe n’inyere ndị ha na-achị aka, Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Chineke họpụtara, ga-eweta ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha bụ́ ndị ndị kasị daa ogbenye n’ụwa na-ahụtụbeghị ụdị ha.

Site n’aka Eze a, Jehova ga-enyeju ndị nile agụụ na-agụ afọ. “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba,” ka Aịsaịa 25:6 na-ekwu. N’Alaeze Chineke, bụ́ nke dị n’aka Kraịst, ezigbo nri agatụghị akọ ndị mmadụ, na-agbanyeghị ebe ha bi. Banyere Jehova, Bible na-ekwu, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“Mba ndị mepere emepe akụwo nnọọ afọ n’ala ma a bịa n’idozi nsogbu e nwere n’Africa. Nke a bụkwa ihe ihere na ihe na-awụ akpata oyi nye anyị onwe anyị mepere anya.”—Praịm Minista nke Britain bụ́ Tony Blair

[Foto dị na peeji nke 10]

ETIOPIA: Ná mba a, ihe dị ka nde mmadụ iri na atọ na-adabere n’enyemaka iji nweta ihe oriri. Nwatakịrị a e gosiri n’elu bụ otu n’ime ha

[Foto dị na peeji nke 10]

INDIA: Ụmụ akwụkwọ ndị a na-enweta ihe oriri n’ụlọ akwụkwọ

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 10]

N’elu: © Sven Torfinn/Panos Pictures; n’ala: © Sean Sprague/Panos Pictures