Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ikpegara Vegin Meri Ekpere?

Ì Kwesịrị Ikpegara Vegin Meri Ekpere?

 Echiche nke Bible

Ì Kwesịrị Ikpegara Vegin Meri Ekpere?

I HE ka ọtụtụ ná ndị nwere ihe ha ma banyere Iso Ụzọ Kraịst maara banyere Meri. Akwụkwọ Nsọ na-akọ na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile gọziri nnọọ nwa agbọghọ a site n’ịhọrọ ya ka ọ bụrụ nne Jizọs. Ọmụmụ Jizọs pụrụ iche n’ihi na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mgbe ọ tụụrụ ime Jizọs. Ọ dịla anya ụfọdụ chọọchị Krisendọm malitere inye Meri nsọpụrụ pụrụ iche. N’afọ 431 O.A., Kansụl nke Efesọs kwupụtara na ọ bụ “Nne nke Chukwu,” taakwa, a na-akụziri ọtụtụ mmadụ ka ha na-ekpegara ya ekpere. *

Ndị ji ezi obi na-efe Chineke maara na ha aghaghị ikpegara onye kwesịrị ekwesị ekpere. Gịnị ka Bible na-akụzi banyere nke a? Ndị Kraịst hà kwesịrị ikpegara Vegin Meri ekpere?

“Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”

N’Oziọma Luk, e dekọrọ na otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” N’ịzaghachi ya, Jizọs malitere ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, kwuonụ, sị, ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ.’” Mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya, o nyekwara ụmụazụ ya ntụziaka ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Luk 11:1, 2; Matiu 6:9.

Ya mere, ihe mbụ anyị na-amụta bụ na ekpere kwesịrị ka ọ bụrụ Nna Jizọs, bụ́ Jehova, ka a ga na-ekpegara ya. Ọ dịghị ebe Bible nyere anyị ikike ikpegara onye ọ bụla ọzọ ekpere. Nke a kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na Jehova bụ “Chineke ekworo,”  ma ọ bụ Chineke nke na-adịghị anabata ofufe e kewara ekewa, dị ka a gwara Mozis mgbe ọ natara Iwu Iri ahụ.—Ọpụpụ 20:5.

Gịnị Banyere Iji Chaplet Ekpe Ekpere?

A kụziworo ọtụtụ ndị na-ekpegara Meri ekpere na a pụrụ inweta ngọzi site n’ịgụ ekpere e bu n’isi ugboro ugboro—ekpere ndị dị ka Ekele Marịa, Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, na ndị ọzọ. Nye ndị Katọlik, “obi abụọ adịghị ya na ụzọ a kasị mara ama e si enye Meri nsọpụrụ pụrụ iche bụ site n’iji chaplet ekpegara ya ekpere,” ka akwụkwọ bụ́ Symbols of Catholicism na-ekwu. Ekpere e ji chaplet ekpe bụ ihe omume okpukpe nke e ji enye Vegin Meri nsọpụrụ. Chaplet bụ ákà a gara aga e ji agụ ekpere ahụ. Otu akwụkwọ ahụ kọwara sị: “E jiri chaplet nwere ákà iri ákà iri ụzọ ise, bụ́ ndị e ji otu mkpụrụ ákà kebie na-agụ ekpere, ọ na-apụta na a ga-agụ ekpere ‘Ekele Marịa’ ugboro iri ise, gụọ ‘Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe’ ugboro ise, gụọkwa ‘Otito Dịrị Nna’ ugboro ise.” Ekpere nke ndị ji obi ha nile na-agụ chaplet ọ̀ na-atọ Chineke ụtọ?

Ọzọkwa, ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya zara ajụjụ ahụ nke ọma. O kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị nnọọ ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.” (Matiu 6:7) Ya mere, Jizọs gwara ụmụazụ ya hoo haa ka ha zere ikwu otu ihe ugboro ugboro n’ekpere ha.

Mmadụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ̀ bụ na Jizọs akụzighịrị ndị na-eso ụzọ ya ịdị na ekpeghachi ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, nke bụ́ otu n’ime ekpere ndị e ji chaplet ekpe?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe Jizọs kụziri bụ ekpere nlereanya, bụ́ nke a maara ugbu a dị ka ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị. Ma, anyị kwesịrị ịrịba ama na ọ kụziri ekpere a ozugbo ọ dọsịrị aka ná ntị banyere ‘ikwughachi otu ihe ugboro ugboro.’ A pụkwara ịhụ ihe ọzọ na-egosi na Jizọs ebughị n’obi ka e buru ekpere nlereanya a n’isi ma na-ekpeghachi ya ugboro ugboro site n’ọdịiche e nwere n’okwu ndị o ji mee ihe n’ebe abụọ e dekọrọ na ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere. (Matiu 6:9-15; Luk 11:2-4) Ihe ndị Jizọs kwuru n’oge abụọ ahụ yiri ibe ha, ma okwu ndị o ji mee ihe na ha abụghị otu. Nke a na-eme ka anyị mara na ihe Jizọs mere bụ nanị inye ụmụazụ ya ihe nlereanya ma ọ bụ ihe atụ nke ụzọ ha pụrụ isi na-ekpe ekpere nakwa nke ihe ha kwesịrị ikpe ekpere banyere ya. Nke kasị mkpa bụ na okwu ya gosiri onye anyị kwesịrị ikpegara ekpere.

Inye Meri Nsọpụrụ

Na Akwụkwọ Nsọ akụzighịrị Ndị Kraịst ka ha na-ekpegara Meri ekpere apụtaghị na e kwesịghị inye Meri nsọpụrụ maka ọrụ ọ rụrụ n’ịhụ na e mezuru nzube Chineke. Ngọzi si n’aka Ọkpara ya ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi uru ruo mgbe ebighị ebi. Meri n’onwe ya kwuru, sị: “Ọgbọ nile ga-akpọ m onye obi ụtọ dịịrị.” Nwa nwanne nne ya bụ́ Elizabet kwukwara na Meri bụ “onye a gọziri agọzi . . . n’etiti ndị inyom.” N’ezie, ọ bụ onye a gọziri agọzi. Ọ bụ ihe ùgwù magburu onwe ya na a họọrọ Meri ịbụ onye ga-amụ Mezaịa ahụ.—Luk 1:42, 48, 49.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị Meri bụ nwanyị Akwụkwọ Nsọ kpọrọ onye a gọziri agọzi. N’ihi ihe Jael mere maka ọdịmma nke mba Izrel oge ochie, e kwukwara na ya onwe ya bụ “onye ngọzị dịịrị karịchaa n’etiti ụmụnwanyị niile.” (Ndị Ikpe 5:24, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Jael bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, Meri, na ọtụtụ ndị inyom na-asọpụrụ Chineke a kpọtụrụ aha na Bible bụ n’ezie ndị anyị kwesịrị iṅomi—ma ha abụghị ndị anyị kwesịrị inye nsọpụrụ pụrụ iche.

Meri bụ onye na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi. O so Jizọs nọrọ ọtụtụ mgbe n’oge ọ na-eje ozi elu ala ya nakwa n’oge ọ nwụrụ. Mgbe Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, Meri so ụmụnne Jizọs “na-anọgide n’ekpere.” Nke a na-eme ka anyị kwere na ya onwe ya so ná ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na Pentikọst 33 O.A., sikwa otú ahụ bụrụ onye nwere olileanya nke iso n’òtù nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe.—Matiu 19:28; Ọrụ 1:14; 2:1-4; Mkpughe 21:2, 9.

Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nke nyere anyị ikike ikpegara Meri ekpere. Ekpere si n’obi bụ akụkụ dị mkpa nke ofufe, a gbakwara Ndị Kraịst ume ka ha ‘nọgidesie ike n’ekpere.’ (Ndị Rom 12:12) Otú ọ dị, ọ bụ nanị Jehova ka e kwesịrị ikpegara ekpere, e kwesịkwara ime nke a site n’aka Jizọs Kraịst.—Matiu 4:10; 1 Timoti 2:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Echiche bụ́ na Meri bụ nne nke Chukwu dabeere n’ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke na-ekwu na Jizọs bụ Chineke.