Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nrụgide Ndị Ntorobịa nke Oge A Na-enwe

Nrụgide Ndị Ntorobịa nke Oge A Na-enwe

 Nrụgide Ndị Ntorobịa nke Oge A Na-enwe

OGE UTO—ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị mma—pụrụ ịbụ oge isi na-agba mmadụ ghara ghara. N’oge uto, ndị mmadụ na-enwewanye mmetụta na echiche ndị ha na-adịbughị enwe. Ha na-enwe nrụgide site n’aka ndị nkụzi na ndị ọgbọ ha kwa ụbọchị. Ọtụtụ ihe ndị ha na-ahụ mgbe nile na TV, vidio, Intanet, na ndị a na-akụ n’egwú, na-enwe mmetụta n’ahụ́ ha. N’ihi ya, otu akụkọ e si n’aka òtù UN nweta kọwara oge uto dị ka “oge mgbanwe, bụ́ nke e ji nnọọ nchegbu na nchekasị mara.”

N’ụzọ dị mwute, ndị na-eto eto adịkarịghị enwe ezi uche, ma ọ bụ ahụmahụ, iji chịkwaa nrụgide na nchegbu ha n’ụzọ dị mma. (Ilu 1:4) Ọ bụrụ na e nyeghị ha ezigbo nduzi, ọ pụrụ ịdịrị ha mfe ịmalite ime omume ndị ga-etinye ha ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, akụkọ ahụ e si n’aka òtù UN nweta na-ekwu, sị: “Nnyocha e mere na-egosi na ọ bụ n’oge uto ma ọ bụ n’oge ntorobịa ka a na-amalitekarị ịṅụ ọgwụ ike.” A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere omume ọjọọ ndị ọzọ, dị ka ime ihe ike na inwe mmekọahụ aghara aghara.

Ndị nne na nna bụ́ ndị na-ewere ya na ọ bụ nanị n’etiti “ndị ogbenye” ma ọ bụ ndị si n’agbụrụ ụfọdụ ka a na-ahụ àgwà ndị dị otú ahụ na-achọpụtakarị na echiche ha hiere ụzọ. Nsogbu ndị ntorobịa na-enwe taa zuru ndị ntorobịa nile ọnụ, n’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ akụ̀ na ụba ha, ọkwá ha, na agbụrụ ha. “Ị mabeghị nke a na-akọ ma ọ bụrụ na ndị ị na-ewere dị ka ‘ndị ntorobịa na-akpa aghara’ bụ nanị ndị dị afọ 17 si n’ime obodo, bụ́ ndị nne ha dara ogbenye ma na-enweta enyemaka n’aka ndị ọrụ ebere nke gọọmenti,” ka otu onye edemede bụ́ Scott Walter dere. “Taa, nwata na-enye nsogbu pụrụ ịbụ onye ọcha, ọ pụrụ isi n’ezinụlọ a ma ama ma ọ bụ nke a na-amaghị ama, ọ pụrụ ịbụ onye na-erubeghị (na-erutụdịghị) afọ 16, ọ pụkwara ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.”

Ma, n’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ntorobịa ji nọrọ n’ihe ize ndụ? Ọ̀ bụ na ndị ntorobịa nke oge ochie enwetaghị ihe isi ike na ọnwụnwa? Ha nwetara, ma anyị na-ebi n’oge Bible kọwara dị ka “oge pụrụ iche nke siri ike obibi.” (2 Timoti 3:1-5) E nwere ọnọdụ na nrụgide ndị ntorobịa nke oge a nọ na ha, nke ndị nke oge ọ bụla ọzọ na-anọtụbeghị. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Mgbanwe A Na-enwe n’Ezinụlọ

Dị ka ihe atụ, tụlee mgbanwe a na-enwe ná ndụ ezinụlọ. Akwụkwọ bụ́ Journal of Instructional Psychology na-ekwu, sị: “Tupu ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị ntorobịa nọ n’America eruo afọ 18, ha na-ahụ ka ndị mụrụ ha gbara alụkwaghịm.” A  pụkwara inweta ihe ndekọ yiri nke ahụ ná mba ndị ọzọ mepere emepe. Ka nne na nna gbara alụkwaghịm, ụmụ ha aghaghị ịmụta ịchịkwa obi mgbawa nke ahụ na-akpatara ha. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “N’ozuzu, ọ na-esiri ụmụaka ndị mụrụ ha gbara alụkwaghịm na nso nso a ike ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ na iso ndị ọzọ na-emekọ ihe karịa ka o si esiri ụmụaka ndị ezinụlọ ha na-enweghị nsogbu ma ọ bụ ndị si n’ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụkwanụ ndị nke si n’ezinụlọ nkuchi . . . Ọzọkwa, nne na nna ịgba alụkwaghịm na-emetụtakarị otú obi si eru nwata ala na otú o si ele onwe ya anya.”

Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị inyom na-arụ ọrụ ego emewokwa ka ọnọdụ ezinụlọ gbanwee. Otu nnyocha e mere banyere mpụ ndị ntorobịa na-eme na Japan gosiri na ọ na-esiri ezinụlọ nne na nna na-arụ ọrụ ego ike ilekọta ụmụ ha anya karịa ka o si esiri ezinụlọ nke nanị nne ma ọ bụ nna na-arụ ọrụ ego.

N’eziokwu, n’ọtụtụ ezinụlọ, ọ dị mkpa na nne na nna ga na-arụ ọrụ ego nanị ka ezinụlọ ha wee na-eriju afọ. Nne na nna ịrụ ọrụ ego pụkwara ime ka ụmụ ha na-ekpori ndụ karị. Ma e nwere ọghọm dị na ya: Ọtụtụ nde ụmụaka na-esi akwụkwọ alọta ma hụ na ọ dịghị onye nọ n’ụlọ. Mgbe nne ha na nna ha lọtara ọrụ, ike na-agwụkarị ha, obi ha na-adịkwa ná nsogbu ndị ha na-enwe n’ebe ọrụ. Gịnị ka nke a na-akpata? Ọ na-eme ka ọtụtụ ndị ntorobịa bụrụ ndị nne ha na nna ha na-enyeghị ọzụzụ nke ọma. Otu onye ntorobịa kwara arịrị, sị, “Ezinụlọ anyị adịghị ewepụta oge iji nọkọọ.”

Ọtụtụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ kweere na ọnọdụ a anaghị adị ndị ntorobịa mma n’ahụ́. “Ekweere m na ụdị ọzụzụ ndị nne na nna na-enye ụmụ ha kemgbe iri afọ atọ gara aga emewo ka e nwee ụmụaka ndị ọ na-anaghị adị ka hà so biri, ndị ha na ezinụlọ ha na-adịghị ekwurịta okwu, ndị ịmụta ihe na-esiri ike, na ndị na-adịghị ekwe nchịkwata,” ka Dr. Robert Shaw na-ekwu. “Ụwa a nke na-agba ndị mmadụ ume ịhụ ihe onwunwe n’anya na ịnọ n’ọkwá ukwu amatawo ndị nne na nna n’ọnyà site n’ime ka ha na-etinye ọtụtụ awa n’ọrụ ma na-emefu nnukwu ego nke  na ha adịtụghị enwe oge ha ga-eji mee ihe ndị ha kwesịrị ime iji soro ụmụ ha na-akpachi anya.”

Ihe ọzọ na-eyi ọdịmma ndị ntorobịa egwu bụ: Ụmụaka ndị nne ha na nna ha na-arụ ọrụ ego na-enwekarị oge dị ukwuu ha ji anọ nanị ha n’enweghị onye na-elebara ha anya. Ndị nne na nna elebaraghị ụmụ ha anya pụrụ ime ka ha daba ná nsogbu.

Echiche Na-agbanwe Agbanwe A Na-enwe Banyere Ịdọ Aka ná Ntị

Echiche na-agbanwe agbanwe a na-enwe banyere otú ndị nne na nna ga-esi na-adọ ụmụ ha aka ná ntị enwewokwa mmetụta n’ebe ndị ntorobịa nke oge a nọ. Dị ka Dr. Ron Taffel si ghewe ọnụ oghe kwuo ya, ọtụtụ ndị nne na nna “adịghị eji ikike ha eme ihe.” Mgbe ọ dị otú a, iwu ma ọ bụ ụkpụrụ ndị na-achịkwa akparamàgwà ụmụaka ka ha na-etolite na-adị ole na ole, ma ọ bụrụkwarị na e nwere nke na-achịkwa ha.

N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ na-eyi ka ahụmahụ ọjọọ ndị nne na nna nwetara mgbe ha dị obere ọ̀ na-emetụta ụzọ ha si ele ịdọ ụmụ ha aka ná ntị anya. Ha chọrọ ịbụ enyi ụmụ ha—ọ bụghị ndị na-enye ha ntaramahụhụ. “Ana m agba nwa m nkịtị ka o mewe ihe masịrị ya,” ka otu nne na-ekweta. “Ndị mụrụ m dị nnọọ aka ike; achọghị m iji otú ahụ zụọ nwa m. Ma, echiche m ahụ adabaghị.”

Olee nnọọ ókè ụfọdụ ndị nne na nna ruworo n’ịhapụ ụmụ ha ka ha mewe ihe masịrị ha? Akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kọrọ, sị: “Nnyocha ọhụrụ e ji ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị ndị ntorobịa isii na-anara ọgwụgwọ na New York, Texas, Florida, na California n’ihi ịṅụ ọgwụ ike, mee, gosiri na pasent 20 n’ime ha esorowo ndị nne na nna ha ṅụkọọ ọgwụ ike. Ihe dịkwa ka pasent 5 n’ime ha bụ nne ha ma ọ bụ nna ha nyere ha ọgwụ ike—nke ka nke wii wii—mbụ ha ṅụrụ.” Olee ihe ga-eme ka nne ma ọ bụ nna kpaa àgwà iberibe dị otú ahụ? Otu nne kwuru, sị: “Agwara m nwa m nwanyị na ọ kaara m mma na ọ nọ n’ụlọ, bụ́ ebe anya m ga na-ahụ ya, na-aṅụ ọgwụ ike.” O yiri ka ndị ọzọ hà na-eche na ha na ụmụ ha ịṅụkọ ọgwụ ike bụ ụzọ ha na ha pụrụ isi “dị ná mma.”

Mmetụta Ọjọọ Usoro Mgbasa Ozi Na-enwe

Ihe ọzọ na-enwe mmetụta siri ike n’ahụ́ ndị ntorobịa bụ usoro mgbasa ozi. Dị ka onye nchọpụta bụ́ Marita Moll si kwuo, otu nnyocha e mere gosiri na, ná nkezi, ụmụaka nọ na United States na-eji awa anọ na minit iri anọ na asatọ n’ụbọchị ekiri TV ma ọ bụ na-achọ ihe na kọmputa.

Nke ahụ ọ̀ dị njọ n’onwe ya? Otu isiokwu e bipụtara na magazin bụ́ Science kwuru na “òtù isii a ma ama na United States,” gụnyere Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke America, ji otu olu kwere na ihe ike a na-egosi n’usoro mgbasa ozi so eme “ka ụfọdụ ụmụaka na-eme ihe ike ike.” Magazin ahụ kwukwara na “n’agbanyeghị ihe ahụ ndị ọkachamara ji otu olu kwere, o yiri ka ndị nkịtị adịghị aghọta ihe a na-eme ka ọha na eze mara n’usoro mgbasa ozi, nke bụ́ na ime ihe ike a na-egosi na TV nakwa vidio so eme ka ndị mmadụ na-emekwu ihe ike.”

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere vidio egwú. Ọ na-awụ ndị nne na nna akpata oyi n’ahụ́ ịhụ otú ụfọdụ vidio ndị a si egosipụta omume mmekọahụ n’ezoghị ihe ọ bụla. Hà pụrụ n’ezie imetụta ụzọ ụfọdụ ndị ntorobịa si akpa àgwà? Dị ka otu nnyocha e ji narị ụmụ akwụkwọ kọleji ise mee gosiri, “egwú ndị e ji olu ike agụ na-emewanye ka ndị ntorobịa na-enwe echiche na mmetụta nke ime ihe ike ike.” Dị ka nnyocha ọzọ e mere na nso nso a gosiri, “ndị ntorobịa bụ́ ndị na-ekirikarị mmekọahụ na ihe ike  a na-egosi na . . . vidio egwú rap ‘ndị òtù ọjọọ’ tiri, yiri ka hà ga na-eme omume ndị ahụ karịa ndị na-adịghị ekirikarị ya.” Nnyocha a e ji ihe karịrị narị ụmụ agbọghọ ise mee gosiri na ndị na-ekirikarị vidio egwú rap ndị òtù ọjọọ tiri yiri ka hà ga-abụ ndị ga-eti ndị nkụzi ha ihe, ndị ndị uwe ojii ga-ejide, na ndị ha na ọtụtụ ụmụ nwoke ga na-enwe mmekọahụ karịa ndị na-adịghị ekirikarị ya.

Ndị Ntorobịa na Kọmputa

N’oge na-adịbeghị anya gara aga, kọmputa esonyewokwa n’isi sekpụ ntị na-emetụta ụzọ ndị ntorobịa si eche echiche. “Ọnụ ọgụgụ kọmputa ndị mmadụ nwere n’ebe obibi ha amụbawo nke ukwuu n’iri afọ ndị gara aga,” ka magazin bụ́ Pediatrics na-ekwu. “N’ebe nile [na United States], ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ezinụlọ ndị nwere ụmụaka nọ n’ogo ịga akwụkwọ (afọ 6 ruo afọ 17) nwere kọmputa . . . Ọnụ ọgụgụ ụmụaka dị afọ 3 ruo 17 bụ́ ndị ezinụlọ ha nwere kọmputa na United States, mụbara site na pasent 55 n’afọ 1998 ruo pasent 65 n’afọ 2000.” Ọnụ ọgụgụ ndị na-eji kọmputa eme ihe amụbawokwa n’ọtụtụ mba ndị ọzọ.

Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa na nwatakịrị ga-enwe kọmputa tupu ya amalite iji ya na-eme ihe. N’ihi ya, otu onye na-eme nchọpụta na-ekwu na “ihe dị ka pasent 90 nke ụmụaka dị afọ 5 ruo afọ 17 na-eji kọmputa eme ihe, ihe dị ka pasent 59 na-ejikwa Intanet eme ihe.” Nke a na-eme ka ndị na-eto eto na-enweta ihe ọmụma ruo n’ókè ha na-enwetatụbeghị—nke a bara uru ma ọ bụrụ na ha na-eji ya eme ihe n’ụzọ ziri ezi, ma nwee okenye nke na-elebara ha anya. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị nne na nna ahapụwo ụmụ ha iji kọmputa na-eme ihe otú o si masị ha.

Dị ka ihe atụ, onye nchọpụta bụ́ Moll dere na magazin bụ́ Phi Delta Kappan na, dị ka otu nnyocha e mere na 2001 banyere iji Intanet eme ihe gosiri, “pasent 71 nke ndị nne na nna chere na ha ‘maara nnọọ ma ọ bụ na ha matụụrụ’ ihe ụmụ ha na-eme n’Intanet. Ma mgbe a jụrụ ụmụ ha otu ajụjụ ahụ, pasent 70 n’ime ha kwuru na ndị mụrụ ha ‘matụụrụ  ma ọ bụ amaghị’ ihe ndị ha na-eme n’Intanet.” Dị ka nnyocha a gosiri, “pasent 30 nke ụmụaka ndị dị afọ 9 ruo 10 kwuru na ha agatụla n’ebe ndị e mere maka mkparịta ụka nzuzo nakwa ebe ndị e mere nanị maka ndị okenye n’Intanet. Nsogbu ahụ na-akawanye njọ, ebe ọ bụ na pasent 58 nke ndị dị afọ 11 ruo 12, pasent 70 nke ndị dị afọ 13 ruo 14, na pasent 72 nke ndị dị afọ 15 ruo 17 kwuru na ha agatụla n’ebe ndị a. . . . N’otu nnyocha e mere na Britain banyere iji Intanet eme ihe n’ebe obibi, otu onye n’ime nne na nna asaa ọ bụla kwetara na ha amatụghị ihe ụmụ ha na-eme n’Intanet.”

Ịhapụ ụmụaka ka ha na-eji Intanet eme ihe n’enweghị onye na-elebara ha anya pụrụ ime ka ha na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ma, ihe ize ndụ ndị dị na ya agwụghị ebe ahụ. Taffel, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kwara arịrị, sị: “Ụmụ anyị na-eme enyi n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’Intanet—n’ihi ya kwa, ha na ụmụaka ndị anyị na-adịkebeghị ahụ na-akpa.”

N’ụzọ doro anya, ndị ntorobịa nke oge a na-enwe ọtụtụ nrụgide na nsogbu, bụ́ ndị a na-amaghị banyere ha n’ọgbọ ndị gara aga. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ntorobịa ji akpa àgwà ndị na-enye ndị mmadụ nsogbu n’obi! Ọ̀ dị ihe ọ bụla a pụrụ ime iji nyere ndị ntorobịa nke oge a aka?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ekweere m na ụdị ọzụzụ ndị nne na nna na-enye ụmụ ha kemgbe iri afọ atọ gara aga emewo ka e nwee ụmụaka ndị ọ na-anaghị adị ka hà so biri, ndị ha na ezinụlọ ha na-adịghị ekwurịta okwu, ndị ịmụta ihe na-esiri ike, na ndị na-adịghị ekwe nchịkwata.”—DR. ROBERT SHAW

[Foto dị na peeji nke 6, 7]

Ọrụ ego ọtụtụ ndị inyom na-arụzi emewo ka ọnọdụ ezinụlọ gbanwee

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị ntorobịa a na-adịghị elebara anya pụrụ ịdaba ná nsogbu ngwa ngwa

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị nchọpụta ekwuwo na ime ihe ike ndị a na-egosi na vidio egwú so akpata àgwà ime ihe ike ike

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ maara ihe ụmụ gị na-ekiri n’Intanet?