Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịrụ Ọrụ Ọkpụkpụ Aka?

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịrụ Ọrụ Ọkpụkpụ Aka?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịrụ Ọrụ Ọkpụkpụ Aka?

“O nwetụghị mgbe m na-eche na m ga-abịa rụwa ọrụ ọkpụkpụ aka. Ọ na-aka atọ m ụtọ iji kọmputa m eme ihe.”—Nathan.

“Ụfọdụ ụmụaka na-eleda anyị onwe anyị na-arụ ọrụ ọkpụkpụ aka anya, dị ka à ga-asị na anyị enweghị ọgụgụ isi ruo n’ókè nke imeli ihe ọ bụla ọzọ.”—Sarah.

ỌRỤ ỌKPỤKPỤ AKA —ọtụtụ na-ewere ya dị ka ihe na-agwụ ike, ihe na-eme ka mmadụ ruo unyi, na ihe e kwesịrị ịgbara ọsọ. Otu nwoke bụ́ prọfesọ n’ihe banyere akụ̀ na ụba kwuru banyere ọrụ ọkpụkpụ aka, sị: “Ọrụ ndị ahụ adịghị eme ka mmadụ nọrọ n’ọkwá dị elu n’ụwa a nke ndị mmadụ na-achọkarị ịnọ n’ọkwá dị elu.” Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ntorobịa na-ejighịdị achọ iji ntị anụ ebe a na-ekwu banyere ọrụ ọkpụkpụ aka.

Otú ọ dị, Bible na-agba ume ka e nwee echiche dị nnọọ iche na nke ahụ banyere ọrụ ọkpụkpụ aka. Eze Solomọn kwuru, sị: “Ọ dịghị ezi ihe dị n’ime mmadụ [karịa ka ọ] na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.” (Eklisiastis 2:24) N’oge Bible, mba Izrel bụ ndị ọrụ ugbo. Ịkọ ugbo, iwe ihe ubi, na ịzọcha ọka bụcha ọrụ ndị e ji nnọọ ọkpụkpụ aka arụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Solomọn kwuru na mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ pụrụ ime ka o nweta ezi ihe n’ụba.

Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, na-eji aka ya arụ ọrụ ọma.” (Ndị Efesọs 4:28) Pọl n’onwe ya rụrụ ọrụ ọkpụkpụ aka. N’agbanyeghị na ọ gụrụ oké akwụkwọ, mgbe ụfọdụ, ọ na-akpa ákwà ụlọikwuu iji kpata ihe o riri.—Ọrụ 18:1-3.

Olee otú i si ele ọrụ aka anya? Ma ị̀ ma, ma ọ bụ na ị maghị, ọrụ ọkpụkpụ aka pụrụ ịbara gị uru n’ụzọ dị ukwuu.

 Ọzụzụ nke Na-adịru Ogologo Ndụ

Ịrụ ọrụ ọkpụkpụ aka—ọ sọ ya ya bụrụ iji hama rụọ ọrụ ma ọ bụ ịsụchasị ahịhịa—pụrụ ime ka ahụ́ gbasikwuo gị ike. Uru ndị a na-erite na ya pụrụ ịkarị nanị ahụ́ ịdị gị mma. Ị̀ maara otú e si emezi taya ígwè dara afọ ma ọ bụ otú e si agbanwe mmanụ n’ụgbọala? Ị̀ pụrụ itinyeghachi ugegbe windo kụwara akụwa ma ọ bụ mezie paịpụ mmiri sụchiri asụchi? Ị̀ maara otú e si esi nri? Ị̀ ga-asali ụlọ mposi na ebe a na-asa ahụ́ ka ọ dị ezigbo ọcha? Ihe ndị a bụ ọrụ ndị na-eto eto ma ndị nwoke ma ndị nwanyị kwesịrị ịma, ọrụ ndị a pụkwara inyere gị aka ibi ndụ dị mma otu ụbọchị mgbe ị ga-ebiri onwe gị.

N’ụzọ na-akpali mmasị, o yiri ka Jizọs Kraịst n’onwe ya ọ̀ bụ aka ochie n’ịrụ ọrụ aka ụfọdụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ mụrụ ọrụ ịkwa nkà—obi abụọ adịghị ya na ọ bụ n’aka nna nkuchi ya, bụ́ Josef, ka ọ mụtara ya—ebe ọ bụ na a kpọrọ ya ọkwa nkà. (Matiu 13:55; Mak 6:3) Gị onwe gị pụkwara ịmụta ụdị ọrụ dị iche iche site n’iji aka gị na-arụ ọrụ.

Ịzụlite Àgwà Ndị Mara Mma

Ịrụ ọrụ aka pụkwara imetụta otú i si ele onwe gị anya. Ka Dr. Fred Provenzano na-edere Ụlọ Ọrụ Mba United States nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike Uche na Mmụta, ihe, o kwuru na ịmụta ọrụ aka pụrụ ime ka mmadụ nwekwuo “obi ike na mmụọ nke igboro onwe ya mkpa ya.” Ọ “pụkwara ime ka o nwee ike ịchịkwa onwe ya ma bụrụ onye na-akpakọ ihe ọnụ, bụ́ isi ihe ga-eme ka o nwee ike inweta ọrụ.” Otu nwa okorobịa aha ya bụ John kwuru, sị: “Ọrụ ọkpụkpụ aka na-enyere mmadụ aka ịmụta inwe ndidi. Ọ na-amụta otú e si edozi nsogbu.”

Sarah, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kọwara, sị: “Ịrụ ọrụ ọkpụkpụ aka kụziere m ịdị ike ọrụ na ịdị uchu. Amụtara m ịchịkwa onwe m ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ m si eche echiche.” Ọrụ aka ò kwesịrị ịbụ ihe na-agbụ agbụ? Nathan na-ekwu, sị: “Amụtara m inwe mmasị n’ọrụ aka. Ka m na-amụtakwu ọrụ, achọpụtara m na m bịara na-arụta ya nke ọma karị. Nke a mere ka onwe m jukwuo m afọ.”

Ọrụ aka pụkwara ime ka i nwee ọṅụ mmadụ na-enwe mgbe ọ rụpụtara ihe. Otu nwa okorobịa aha ya bụ James si otú a kwuo ya: “Ana m enwe mmasị n’ọrụ ịkwa nkà. Ọ bụ ezie na ọ na-agwụ ike mgbe ụfọdụ, ana m echetakarị ihe ndị m rụrụ ma nwee afọ ojuju n’ihi ihe ndị ahụ. Ọ na-enye afọ ojuju n’ezie.” Brian kwukwara ihe yiri nke ahụ. “Ịrụzi ụgbọala na-atọ m ụtọ. Ịmara na m nwere ike ịrụzi ihe mebiri emebi ma mee ya ka ọ dịkwa ka nke ọhụrụ, na-eme ka m nwee obi ike na afọ ojuju.”

Ozi Dị Nsọ

Nye Ndị Kraịst na-eto eto, inwe ike ịrụ ọrụ aka pụrụ inyere ha aka n’ozi ha na-ejere Chineke. Mgbe e nyere Eze Solomọn ọrụ nke ịrụrụ Jehova nnukwu ụlọ nsọ, ọ chọpụtara na ọrụ ahụ ga-achọ mgbalị dị ukwuu na nkà. Bible na-ekwu, sị: “Eze Solomọn wee ziga si na Taịa kupụta Haịram. Nwa nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ bụ, sitere n’ebo Naftali, ma nna ya bụ nwoke Taịa, bụ́ ọkpụ ọla; o jupụtara n’amamihe na nghọta na ihe ọmụma, ije ozi ọ bụla n’ọla. O wee bịakwute eze, bụ́ Solomọn, jee ozi ya nile.”—1 Ndị Eze 7:13, 14.

Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ Haịram iji nkà ya mee ka ofufe Jehova gaa n’ihu! Ahụmahụ Haịram na-eme ka eziokwu nke ihe Bible kwuru n’Ilu 22:29 pụta ìhè: “Ị̀ hụla onye na-arụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-akwụrụ n’ihu ndịeze, ọ gaghị akwụ n’ihu ndị a maghị ama.”—Baịbụl Nsọ nke Nhazi Katọlik.

Taa, ọbụna ndị ntorobịa matụụrụ otú e si ewu ihe owuwu ma ọ bụ ndị nke na-amatụghị otú e si ewu ihe owuwu, enwewo ihe ùgwù nke iso ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi na ha sonyere n’ọrụ ihe owuwu dị otú ahụ, ụfọdụ amụtawo aka ọrụ ndị bara uru dị ka itinye waya ọkụ eletrik n’ụlọ, ịrụzi paịpụ mmiri, ọrụ ido ụlọ, na ọrụ kapịnta. Ikekwe, gị na ndị okenye ọgbakọ unu pụrụ ikwurịta ma ọ̀ ga-ekwe omume ka i sonye n’ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.

 James, bụ́ onye soworo rụọ ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike ghara inwe oge ma ọ bụ ike ha ga-eji nye aka. Ya mere, site n’isonye na ya, ị na-enyere ọgbakọ ahụ nile aka.” Nathan, bụ́ onye mụrụ ọrụ ịwụ kọnkịrị, chọpụtara na ọrụ a mere ka o nwee ohere nke ijere Chineke ozi n’ụzọ ọzọ. Ọ na-echeta, sị: “Agara m Zimbabwe ma jiri nkà m nye aka n’ịrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Arụrụ m ọrụ n’ebe ahụ ruo ọnwa atọ, ọ bụkwa otu n’ime ahụmahụ kasịnụ m nwetụrụla ná ndụ m.” Ọchịchọ ndị ntorobịa ndị ọzọ nwere ịrụ ọrụ aka akpaliwo ha itinye akwụkwọ maka ịrụ ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’obodo ha.

Ịbụ aka ochie n’ọrụ ọkpụkpụ aka pụkwara ime ka ị na-egboro onwe gị mkpa ego ruo n’ókè ụfọdụ. Ọtụtụ ndị na-eto eto n’etiti Ndịàmà Jehova na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. Ọrụ aka ụfọdụ n’ime ha mụrụ enyeworo ha aka ịdị na-akpata ego ha ji egbo mkpa ha, n’emefughị oge na ego dị ukwuu n’ịga akwụkwọ.

Otú Ị Pụrụ Isi Mụta Ya

N’ezie, ma ị̀ chọrọ ịmụ ọrụ aka iji na-akpata ego ma ị̀ chọrọ ịmụ ya nanị iji na-arụziri onwe gị ihe n’ụlọ, ị pụrụ irite uru na ya. Ikekwe, a na-akụzi ọrụ aka ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ unu. Ma eleghịkwa anya, ị pụrụ ịmụta ya n’ụlọ unu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịmụta otú e si arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Dr. Provenzano, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, dere, sị: “Ọ dị ndị na-eto eto mkpa karịsịa ịdị na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ, n’ihi na ha na-eme ka ndị na-eto eto mụta ọrụ ụlọ ndị bụ́ isi ‘e ji alafere ná ndụ,’ bụ́ ndị ga-enyere ha aka inwe ọganihu ma na-eme nke ọma mgbe ha na ndị mụrụ ha na-ebighịzi.” N’ihi ya, na-eleru anya ala ịma ihe ndị e kwesịrị ime n’ụlọ unu. È nwere ahịhịa ndị e kwesịrị ịsụchasị ma ọ bụ oche mebiri emebi ọ dị mkpa ka a rụzie?

Kama ịbụ ihe na-ewetu mmadụ ala, ọrụ ọkpụkpụ aka pụrụ ịbara gị uru dị ukwuu. Agbarala ọrụ ọkpụkpụ aka ọsọ! Kama, gbalịa ‘ịhụ ezi ihe’ ná ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ, n’ihi na dị ka Eklisiastis 3:13 si kwuo, “onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

Ịmụ ọrụ aka enyeworo ọtụtụ ndị na-eto eto aka ịmụbawanye ozi ha na-ejere Chineke

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ọtụtụ mgbe ndị mụrụ gị pụrụ ịkụziri gị ọrụ ndị bụ́ isi