Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Kwadoro Ka Nwoke Na Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Na Nwanyị Lụwa Onwe ha?

Chineke Ọ̀ Kwadoro Ka Nwoke Na Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Na Nwanyị Lụwa Onwe ha?

 Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Kwadoro Ka Nwoke Na Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Na Nwanyị Lụwa Onwe ha?

MGBE a nọ na-agba ha akwụkwọ na chọọchị, ụmụ nwoke abụọ ahụ ejiri onwe ha aka guzoro n’ihu otu bishọp Episcopal a ma ama. Ha agbaa “ndụ . . . n’ihu Chineke na n’ihu chọọchị.” Bishọp ahụ, bụ́ onye yi ọmarịcha uwe mwụda ọcha e ji ákwà na-acha edo edo chọọ mma, anọrọ n’ihu ọha na eze gọzie njikọ ha. Ka e mesịrị, mmadụ abụọ ahụ amakụọ onwe ha ma susuo onwe ha ọnụ, ndị mmadụ ejirikwa ọṅụ bilie ọtọ na-akụrụ ha aka. Dị ka bishọp a si kwuo, nwoke na nwoke ịlụ onwe ha “bụ ihe dị nsọ na ihe e kwesịrị ịgọzi, . . . o kwesịrị ka a kpọọ ya ihe ọ bụ: ihe dị nsọ.”

Otú ọ dị, ndị ndú okpukpe ndị ọzọ na-ekwusi okwu ike megide nwoke ịlụ nwoke ibe ya. “Ihe [bishọp a] kwuru wutere anyị,” ka Cynthia Brust kwuru, bụ́ ọnụ na-ekwuchitere Kansụl Anglịkan nke America, bụ́ òtù ndị Episcopalian na-ahụ na e jigidesịrị omenala chọọchị ike. “Ịgọzi nwoke ịlụ nwoke megidere ozizi doro anya dị na Bible banyere alụmdi na nwunye na mmekọahụ.” Ọ gara n’ihu ikwu na “mmekọahụ . . . kwesịrị ịbụ ihe dịịrị nanị nwoke na nwanyị e jikọrọ n’ụzọ dị nsọ.”

Ọkụ isiokwu a mụnyere abụghị nanị ndị okpukpe ka ọ gbasara. N’ụwa nile, ndị ọchịchị

 na-arụrịta ụka n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ banyere ya, n’ihi na ụgwọ ezumike nká, nlekọta ahụ́ ike nke mmadụ abụọ ahụ, na ụtụ isi ha na-emetụta ọha na eze, ọchịchị, na ọnọdụ akụ̀ na ụba n’ụzọ dị nnọọ njọ.

Okwu ndị metụtara ihe ndị ruuru mmadụ na nke irite uru n’iwu gọọmenti na-adịkarị mgbagwoju anya ma na-akpata arụmụka n’etiti ọha na eze. Ezi Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachapụ anya ịhụ na ha nọgidere na-anọpụ iche site n’izere arụmụka n’ihe ndị metụtara ọchịchị. (Jọn 17:16) * Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-akwanyere Bible ùgwù na-enwe mgbagwoju anya banyere nwoke ịlụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ịlụ nwanyị nakwa banyere ndina ụdị onwe. Olee otú i si ele nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị ịlụ onwe ha anya? Gịnị bụ ụkpụrụ Chineke setịpụrụ maka alụmdi na nwunye? Olee otú echiche gị si emetụta mmekọrịta gị na Chineke?

Onye Okike Anyị Setịpụrụ Ụkpụrụ

Onye Okike anyị setịpụrụ ụkpụrụ ndị na-achịkwa alụmdi na nwunye eri ogologo oge tupu ndị ọchịchị amalite inye iwu ga na-achịkwa alụmdi na nwunye. Akwụkwọ mbụ nke Bible na-agwa anyị, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) Dị ka akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of Biblical Words si kwuo, okwu Hibru bụ́ “nwunye,” “na-enye echiche nke onye bụ́ nwanyị.” Jizọs gosikwara na ndị e jikọtara ịbụ di na nwunye kwesịrị ịbụ “nwoke na nwanyị.”—Matiu 19:4.

Ya mere, Chineke zubere ka alụmdi na nwunye bụrụ nkekọ ga-adịgide adịgide ma chie anya n’etiti nwoke na nwanyị. E kere ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ịbụrịtara ibe ha ndị inyeaka, ka ha wee nwee ike igborịtara ibe ha mkpa mmetụta uche, nke ime mmụọ, na nke mmekọahụ.

Akụkọ ahụ a maara nke ọma dị na Bible banyere Sọdọm na Gọmọra na-eme ka anyị mara otú Chineke si ele ndina ụdị onwe anya. Chineke kwuru, sị: “Iti mkpu Sọdọm na Gọmọra, o hiri nne n’ezie, mmehie ha kwa, ọ dị arọ nke ukwuu n’ezie.” (Jenesis 18:20) Ókè mmehie ha haruru n’oge ahụ pụtara ìhè mgbe ndị ọbịa abụọ bịara n’ụlọ Lọt bụ́ onye ezi omume. “Ndị ikom Sọdọm . . . gbara ụlọ ahụ gburugburu, ma okorobịa ma agadi, ndị ala ahụ nile site n’akụkụ ọ bụla; ha wee kpọọ Lọt òkù, sị ya, Olee ebe ha nọ, bụ́ ndị ikom ndị bakwutere gị n’abalị a? mee ka ha pụtakwute anyị, ka anyị wee mara ahụ́ ha.” (Jenesis 19:4, 5) Bible na-ekwu, sị: “Ndị Sọdọm bụ ndị ọjọọ na ndị mmehie megide Jehova nke ukwuu.”—Jenesis 13:13.

Ndị ikom ahụ bịara nwee “oké mkpali n’agụụ ihe ọjọọ ha n’ebe ibe ha nọ, ụmụ nwoke na ụmụ nwoke.” (Ndị Rom 1:27) Ha ‘gbasoro anụ ahụ́ n’ụzọ na-ekwekọghị n’okike.’ (Jud 7) Ná mba ebe ọtụtụ ndị na-akwado na mmadụ idina ụdị onwe ya bụ ihe ruuru ya, ụfọdụ nwere ike ghara ikwe ka e jiri okwu bụ́ “na-ekwekọghị n’okike” akọwa omume idina ụdị onwe. Ma, ọ́ bụghị Chineke bụ o kwuchaa o bie ma a bịa n’ihe banyere okike? O nyere ndị ya nke oge ochie iwu, sị: “Gị na nwoke edinala, dị ka nwoke na nwanyị na-edina: ihe arụ ka ọ bụ.”—Levitikọs 18:22.

Ị Ga-aza Chineke Ajụjụ

Ihe Bible kwuru banyere nke a doro anya: Chineke adịghị akwado ma ọ bụ na-anabata ndina ụdị onwe. Ọ na-ewesakwa ndị “na-ekwenyere ndị na-eme” omume ahụ iwe. (Ndị Rom 1:32) Na nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị “lụrụ” onwe ha apụghịkwa ime ka ndina ụdị onwe dị ùgwù. Ntụziaka Chineke nyere ka “alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile” agụnyeghị nwoke ịlụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ịlụ nwanyị, bụ́ nke Chineke weere dị ka ihe arụ.—Ndị Hibru 13:4.

Otú ọ dị, site n’enyemaka Chineke, ọ dịghị onye na-apụghị ịmụta ‘ịsọ ịkwa iko asọ,’ bụ́ nke gụnyere mmadụ idina ụdị onwe ya, ma “mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3, 4) N’eziokwu, nke a anaghị adịcha mfe mgbe nile. Nathan *, bụ́ nwoke na-edinabu nwoke ibe ya kwuru, sị: “Echere m na apụghị m ịkwụsị ya ma ọlị.” Ma o mesịrị kwụsị ya site n’enyemaka nke “mmụọ nke Chineke anyị.” (1 Ndị Kọrint 6:11) Dị ka Nathan chọpụtara, ọ dịghị nsogbu karịrị Jehova, bụ́ onye pụrụ inye anyị ume na enyemaka dị anyị mkpa iji gbasoo ụkpụrụ Ya ma nweta ngọzi Ya.—Abụ Ọma 46:1.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọbụna mgbe iwu obodo megidere akọ na uche ha e ji Bible zụọ, Ndịàmà Jehova anaghị esonye ná ngagharị iwe ma ọ bụ n’ụdị ihe ọ bụla ọzọ a na-eme iji manye ndị ọchịchị ịgbanwe iwu ndị dị otú ahụ.

^ par. 15 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Foto si n’aka Chris Hondros/Getty Images