Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nchegbu Na-akpa Aka Ọjọọ!

Ndị Nchegbu Na-akpa Aka Ọjọọ!

 Ndị Nchegbu Na-akpa Aka Ọjọọ!

“NKE Mbụ n’Ime Nsogbu Ahụ́ Ike Ndị America.” Ihe a bụ isiokwu gbara n’otu obere akwụkwọ akụkọ Ụlọ Ọrụ America nke Na-ahụ Maka Nchegbu bipụtara. Isiokwu ahụ kwuru na ihe kasị eyi ndụ mmadụ egwu taa abụghị ọrịa cancer ma ọ bụ ọrịa AIDS. O kwuru, sị: “E kwuwo na ihe dị ka pasent iri asaa na ise ruo iri itoolu nke ndị na-aga ahụ ndị dọkịta na-adịghị agwọ nanị otu ụdị ọrịa na-aga n’ihi nsogbu ndị nchegbu kpatara.”

Ikwu na nchegbu na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ taa abụghị itinye okwu nnu na ose. Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Ọdịmma Ndị Ọrụ si kwuo, “ọrụ bụ ihe kasị akpatara ndị okenye nwere nsogbu na nrụgide ná ndụ ha nchegbu (pasent 39), ihe na-esote ya bụ ezinụlọ (pasent 30). Ihe ndị ọzọ na-akpatara ha nchegbu bụ ahụ́ ike (pasent 10), ọnọdụ akụ̀ na ụba (pasent 9), na esemokwu mba na mba nakwa iyi ọha egwu (pasent 4).”

Ọ bụghị nanị ndị nọ na United States na-enwe nchegbu. Otu nnyocha e mere na Britain n’afọ 2002 kwuru na ‘ihe karịrị ọkara nde mmadụ na Britain kweere na, n’afọ 2001 na 2002, na ọrụ kpataara ha nchegbu ruo n’ókè nke mere ka ha rịawa ọrịa.’ A kọrọ na, na Britain, e nwere ‘ihe dị ka nde ụbọchị iri na atọ na ọkara nke ndị mmadụ na-adịghị arụli ọrụ na ha kwa afọ’ n’ihi “nchegbu, ịda mbà n’obi, ma ọ bụ nchekasị ọrụ kpatara.”

Ihe akaghị mma n’ala Europe. Dị ka Ụlọ Ọrụ Europe nke Na-ahụ Maka Nchebe na Ahụ́ Ike n’Ebe Ọrụ si kwuo, “e gosiwo na ọrụ na-akpatara ọtụtụ nde ndị Europe nọ n’ụdị ọrụ dịgasị iche iche nchegbu.” Otu nnyocha e mere gosiri na “ihe dị ka nde iri anọ na otu nke ndị ọrụ [Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe] na-enwe nchegbu kwa afọ n’ihi ọrụ ha.”

Gịnị banyere Eshia? N’otu akụkọ ndị gara nzukọ ezumezu e nwere na Tokyo dere, e kwuru, sị: “Nchegbu ọrụ na-akpata bụ nsogbu zuru ọtụtụ mba ụwa ọnụ, ma ndị ka na-emepe emepe ma ndị nke meperela emepe.” Akụkọ ahụ kọrọ na “ọtụtụ mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia, bụ́ ndị gụnyere China, Korea, na Taiwan emepeela ngwa ngwa, akụ̀ na ụba ha amụbakwaala. Mba ndị a na-echegbuzi onwe ha banyere nchegbu ọrụ na-akpata na mmetụta ọjọọ ọ na-enwe n’ahụ́ ndị ọrụ.”

Ọ dịghị mkpa na ị ga-ahụ ihe e metere ná nnyocha tupu ị mara na ndị mmadụ na-enwe nchegbu. Ikekwe, nchegbu na-akpakwu gị onwe gị aka ọjọọ! Olee mmetụta ọjọọ nchegbu pụrụ inwe n’ahụ́ gị nakwa n’ahụ́ ndị ị hụrụ n’anya? Olee otú ezinụlọ pụrụ isi mụta ịchịkwa ya? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ọrụ bụ ihe kasị akpatara ọtụtụ ndị nchegbu