Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụrụ Ọrụ Ịgwọ Ọrịa?

Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụrụ Ọrụ Ịgwọ Ọrịa?

 Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-abụrụ Ọrụ Ịgwọ Ọrịa?

AJỤJỤ a na-ajụ banyere ihe ọdịnihu ga-abụrụ ndị dọkịta na-emekarị ka a na-akọ nkọ banyere ọganihu ndị a ka ga-enwe na nkà na ụzụ. Ọ na-emekwa ka a na-ajụ ma nke a ọ̀ ga-eme ka ndị dọkịta nwere onwe ha pụọ n’ọrụ ndị ha na-arụ mgbe nile ka ha wee nwee ike iwepụtakwu oge iji soro ndị ọrịa na-anọkọ. N’ezie, ihe ọdịnihu ga-abụrụ ndị dọkịta na ihe ọdịnihu ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ nwere njikọ chiri anya. Akwụkwọ Bible abụọ ndị mere ka a mata ihe ọdịnihu ga-abụrụ ha kọrọ banyere Jizọs na ndịozi ya. Ọ bụ dọkịta dere ha abụọ.

N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-akpali mmasị karịsịa ịchọpụta ihe onye dọkịta chere banyere akụkọ ndị ahụ? Olee ihe gbasara ha na ọdịnihu ndị dọkịta na nke ndị ọrịa? N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị dọkịta ji atụ anya oge ọrụ ha na-agaghị adịkwa mkpa?

Ọtụtụ ndị dọkịta na-eleru anya ala. Ọ bụ Luk, bụ́ onye a kpọrọ “dibịa a hụrụ n’anya,” dere akwụkwọ Bible abụọ ndị ahụ. O nyekwara nkọwa zuru ezu banyere ụfọdụ n’ime ndị ọrịa Jizọs na ndịozi ya gwọrọ. (Ndị Kọlọsi 4:14) N’ihi ya, Luk na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a: Ihe ndị a hà mere eme n’ezie? Ọ bụrụ na ha mere eme, gịnị ka nke a pụtara nye ndị dọkịta na ndị ọrịa taa?

E Nyochaa Ihe Akaebe Banyere Ọrịa Ndị A Gwọrọ

Luk nwere ohere nke ịchọpụta ụzọ ọrụ ebube e si gwọọ ọrịa ndị ahụ site n’ịgba ndị ji anya ha hụ ha ajụjụ ọnụ. Ọzọkwa, ya na Pọl onyeozi so gaa ọtụtụ ebe. Ihe àmà gosiri na Pọl gwọrọ ọtụtụ mmadụ n’ụzọ ọrụ ebube n’ihu Luk. Ka anyị na-atụle ihe dọkịta a dere banyere abụọ n’ime ọrịa ndị ahụ a gwọrọ, rịba ama otú o si kọwaa ha n’ụzọ zuru ezu.

Tụlee ihe atụ a. Luk kwuru oge, ụbọchị, na ebe a nọ rụọ ọrụ ebube a na-esonụ: Ọ bụ n’ime abalị, n’ụbọchị mbụ n’izu, otu ìgwè Ndị Kraịst nọ n’okpukpu nke abụọ n’otu ụlọ elu dị na Troas, nke dị n’ógbè Rom dị n’Eshia. (Ọrụ 20:4-8) Ka anyị gụọ akụkọ ahụ n’ozuzu ya: “Otu nwa  okorobịa aha ya bụ Yutikọs nọ ọdụ na windo, oké ụra bukwaara ya ka Pọl nọgidere na-ekwu okwu, n’ịbụ onye ụra buturu, o sikwa n’okpukpu ụlọ nke abụọ daa, e wee bulite ya n’ozu.” Site n’ike Chineke, Pọl kpọlitere nwa okorobịa ahụ n’ọnwụ ma gwọọ ebe ndị o merụrụ ahụ́. Mgbe o risịrị nri, “ha kpọọrọ nwa okoro ahụ ná ndụ pụọ, bụrụkwa ndị a kasịrị obi n’ụzọ na-enweghị atụ.”—Ọrụ 20:9-12.

Luk kọrọ na ya sokwa Pọl gaa Mọlta. Pọl rụkwara ọrụ ebube ọzọ n’ụlọ Pọbliọs, bụ́ “onyeisi” nke agwaetiti ahụ, mgbe ọ na-ele ha ọbịa n’ụlọ ya. Onye ọ gwọrọ bụ onye ọrịa ya pụrụ ịbụwo ọrịa na-egbu mmadụ n’oge ahụ, bụ́ oge a na-enwebeghị ọgwụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji egbu nje. Luk kọrọ, sị: “Nna Pọbliọs dina ala, ahụ́ ọkụ na ọnyụnyụ ọbara na-enyekwa ya nsogbu, Pọl wee bakwuru ya ma kpee ekpere, bikwasị ya aka n’isi ma gwọọ ya. Mgbe nke a mesịrị, ihe fọdụrụ n’ime ndị bi n’agwaetiti ahụ bụ́ ndị na-arịa ọrịa dị iche iche malitekwara ịbịakwute ya, e wee gwọọ ha.”—Ọrụ 28:7-9.

Gịnị Mere Ka Dọkịta ahụ Kwere?

Luk dere ihe ndị ahụ n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi n’oge ndị na-agụ akụkọ ndị ahụ ka nwere ike ịga jụọ ndị ahụ a gwọrọ ọrịa otú ihe ndị a si mee. Banyere ihe ndị o dere n’akwụkwọ Bible nke bú aha ya,  Luk dere, sị: “Esitewo m ná mmalite tụleghachi ihe nile n’ụzọ ziri ezi, ka i wee mara n’ụzọ zuru ezu ịbụ eziokwu nke ihe ndị a.” (Luk 1:3, 4) Ihe dọkịta a hụrụ ma chọpụta mere ka o kwenyesie ike na ihe Jizọs kụziri bụ eziokwu. Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ so na ha, na-eme ka e nwee ihe a ga-agbakwasị ụkwụ na ha wee kwere n’amụma Bible bụ́ na Chineke ga-ewepụ ọrịa n’ikpeazụ. (Aisaia 35:5, 6) Dị ka dọkịta nke na-ahụkarị ndị na-ata ahụhụ, obi aghaghị ịtọwo Luk ụtọ nke ukwuu ịtụgharị uche banyere oge ọrụ ya na-agaghị adịkwa mkpa. Atụmanya dị otú ahụ ọ̀ masịrị gị?

Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na nke a bụ ihe ọdịnihu ga-abụrụ ndị hụrụ Chineke n’anya, na-agbanyeghị ebe ha bi n’ụwa. Bible na-ekwe nkwa na n’Alaeze Chineke, “onye obibi ya agaghị asị, ‘Ana m arịa ọrịa.’” (Aisaia 33:24) Ọtụtụ ndị dọkịta nke oge a ekwuwo na e nwere ihe ezi uche dị na ya mere a ga-eji kwere ná nkwa Bible.

‘Ọ Masịrị M nke Ukwuu’

“Dị ka ọ dị n’ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị dọkịta nọ, ihe mere m ji bụrụ dọkịta bụ iji nyere ndị ọrịa aka,” ka Dr. Jon Schiller, bụ́ dọkịta na-adịghị agwọ nanị otu ụdị ọrịa nke nọ n’Ebe Ugwu America, na-ekwu. “Olileanya maka ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya masịrị m. Amalitere m ịga nzukọ Ndịàmà Jehova mgbe m nwetasịrị ọzụzụ na mahadum banyere otú Europe si mepee anya. Ọzụzụ ahụ gosiri na okpukpe bụ isi sekpụ ntị nke ọtụtụ nsogbu. Ọ bịakwara yie m ka hà jikwu ihu abụọ eji Bible eme ihe. N’ihi ya, anọ m na-eche, sị, ‘Gịnị ka Bible na-ekwu n’ezie?’

“N’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova,  ihe dọọrọ mmasị m ná mmalite bụ omume enyi nke ndị nọ na ya, bụ́ nke dị nnọọ iche n’omume nke ọtụtụ ndị enyi m. Otu Onyeàmà bịakwutere m ma jụọ m ka ọ̀ bụ ya bịa na nke m iji mụwara m Bible. Ihe kasị masị m bụ na, ihe ọ bụla m jụrụ ya, o gosiri m azịza ya na Bible.

“Ka m na-akatakwu ahụ́, otú ahụ ka m na-ejikwu ọbụbụ m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova akpọrọ ihe. Mgbe ị ka malitere ọhụrụ dị ka dọkịta, ị na-enwe olileanya ịrụpụta ihe bara uru. Ma ana m ahụkarị ọtụtụ ndị nwere nkụda mmụọ, bụ́ ndị chere na ọ dịbeghị nnọọ ihe ha rụpụtara ná ndụ. Echere m na otu n’ime ihe ndị kasị magbuo onwe ya banyere ịbụ Onyeàmà Jehova bụ na anyị nwere olileanya maka ọdịnihu, nweekwa nzube ná ndụ. Ma ànyị bụ ndị dọkịta, ndị na-arụzi ụgbọala, ma ọ bụ ndị na-edozi ụlọ, anyị maara na ihe anyị na-arụ n’ozi Chineke bụ ihe bara uru; ọ bụ Jehova ka anyị na-arụrụ ya. Nke ahụ na-enye anyị afọ ojuju.”

“Itinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ Mere Ka Ezinụlọ Anyị Ka Mma”

Otu dọkịta aha ya bụ Krister Renvall na-arụ ọrụ na Finland, ọ na-enwekwa mmasị mgbe nile iso ụmụaka na-ekwurịta okwu. O kwuru, sị, “Otu ụbọchị, mụ na otu nwatakịrị nwanyị dị afọ iri na abụọ bụ́ onye na-arịa ọrịa cancer nke ga-egbu ya kwurịtara okwu. O nyere m otu akwụkwọ aha ya bụ True Peace and Security—From What Source? * Otú o si kwupụta okwukwe ya n’oge ọ na-arịa ọrịa a masịrị m nke ukwuu, ma enweghị m oghere iji gụọ akwụkwọ ahụ. N’ezie, n’oge ahụ, ọrụ juru m aka n’otu ụlọ ọgwụ dị na Helsinki nke na enweghị m oge iso ezinụlọ m nọkọọ.

“Otú ọ dị, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, nwunye m wepụtara akwụkwọ ahụ na shelf anyị ma malite ịgụ ya. O kwenyere ozugbo na ihe ọ na-agụ bụ eziokwu ahụ. Otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị ma malite ịmụrụ ya Bible. Ná mmalite, ụjọ tụtụrụ nwunye m ịgwa m banyere ya. Ma mgbe ọ gwara m, ekwuru m, sị, ‘Ihe ọ bụla nke ga-enyere ezinụlọ anyị aka dị mma.’ Amalitekwara m isonyere ha n’ọmụmụ ihe ahụ. Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ mere ka ezinụlọ anyị ka mma, meekwa ka anyị lewe ndụ anya n’ụzọ dị iche. Obi tọrọ m ụtọ ịmata banyere olileanya maka ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya; o yiri m ka ọ̀ bụ ihe kwesịrị ekwesị na Chineke ga-enwe nzube dị otú ahụ maka ihe a kpọrọ mmadụ. N’oge na-adịghị anya, e mere mụ na nwunye m baptizim, mgbe oge na-aga, e mekwara ụmụ anyị. Nwatakịrị nwanyị ahụ nke gwara m okwu na mbụ nwụrụ, ma okwukwe ya ka na-arụ ọrụ.”

Ndị dọkịta na-enwewanye nrụgide n’ụwa anyị a nke na-agbanwe n’ike n’ike, nke a na-emekwa ka àjà ndị ha na-achụ n’inyere ndị ọrịa aka bụrụ ihe kwesịrị ịja mma n’ezie. Ma mgbanwe kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụtụbeghị ụdị ya ga-abịakwasị anyị n’isi nso. Ọtụtụ ndị dọkịta taa ji obi ike na-atụ anya ọdịnihu nke Okwu Chineke na-ekwe nkwa ya—ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya! (Mkpughe 21:1-4) Nke a ruru ihe mmadụ kwesịrị iji aka ya mee nchọpụta banyere ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

“ABỊARA M GHỌTA NA NDỤ NWERE NZUBE”

“Mgbe m na-elekọta ụmụ akwụkwọ nwere nkwarụ, achọpụtara m na ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova gbapụrụ iche. O yiri ka hà ka enwe ike ịnagide ọnọdụ nke inwe nwa nwere nkwarụ karịa ndị nne na nna ndị ọzọ nọkwa n’ọnọdụ ahụ. Achọpụtakwara m na ha ma akwụkwọ karịa otú mmadụ ga-atụ anya ya ma e lewe ụdị ọrụ ha na-arụ. Okwukwe ha masịrị m. Ọ fọrọ nke nta ka ndị nkụzi evolushọn bibie okwukwe m. Ma, ihe ndị m mụtara banyere ọgwụ na ahụ́ ike emewo ka m nwee mmasị n’otú ndụ si dị ebube.

“N’otu mgbe ahụ, amalitere m ịghọta na amaghị m otú m ga-esi zụlite ụmụ m. Olee ihe ndị m kwesiri ịkụziri ha izere? Olee ihe ndị m kwesịrị ịgba ha ume ịdị na-eme? Olee ihe m pụrụ inye ha iji mee ka ndụ ha nwee nzube? Ndụ nke m enweghị nzube. O ruru n’ókè nke na ekpere m ekpere maka enyemaka.

“Mgbe ahụ ka Ndịàmà Jehova wetaara m otu magazin kwuru banyere ụzọ a pụrụ isi jiri ịhụnanya na-agbazi ma na-adọ ụmụntakịrị aka ná ntị. Achọpụtara m na ụkpụrụ Bible ndị dị na magazin ahụ bụ ihe enyemaka n’ezie, n’ihi ya, ekwetara m ka mụ na ha na-amụ Bible. Ka m matara ihe mere Jehova ji nye anyị ndụ na ihe mere Jizọs ji nwụọ, abịara m ghọta na ndụ nwere nzube. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:12, 18, 19) Ozizi evolushọn akpaghasịwo echiche m. Lee nnọọ ka ahụ́ si ruo m ala mgbe m matara na ọrịa na ọnwụ esoghị ná nzube Chineke! Taa, ana m enwe ezigbo afọ ojuju n’ịkụziri ndị nwere obi eziokwu ụzọ Chineke ga-esi gwọọ ọrịa nile n’isi nso.”

[Foto]

Helena Bouwhuis rụrụ ọrụ dị ka dọkịta na-agwọ ụmụ akwụkwọ na Netherlands

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Luk, bụ́ dọkịta na onye so dee Bible, so Pọl na njem o mere mgbe onyeozi ahụ gwọrọ nna Pọbliọs ma kpọlite Yutikọs n’ọnwụ

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Dọkịta aha ya bụ Jon Schiller, nke nọ na United States

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Dọkịta aha ya bụ Krister Renvall, ọ nọ na Finland