Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ịmụta Ịchịkwa Nchegbu!

Ị Pụrụ Ịmụta Ịchịkwa Nchegbu!

 Ị Pụrụ Ịmụta Ịchịkwa Nchegbu!

“NDỌGA a na-adọga ịhụ na a na-edebe ọrụ, ezinụlọ, na ihe ndị ọzọ n’ọnọdụ kwesịrị ha esiela nnọọ ike n’afọ ndị na-adịbeghị anya.” Ihe a ka otu akwụkwọ nke na-ekwu banyere ndụ ezinụlọ bụ́ nke e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya kwuru. N’ezie, anyị bi n’oge tara akpụ. Ma, nke a adịtụghị atụ ndị mmụta Bible n’anya n’ihi na Bible buru amụma na oge a ga-abụ ‘oge pụrụ iche nke ga-esi ike obibi.’—2 Timoti 3:1-5.

Jesús, bụ́ nwoke ji ụmụ atọ kwuru, sị: “Nchegbu adịghị njọ. Ihe dị na ya bụ na ị ghaghị ịmụta ịchịkwa ya.” N’ezie, a bịa n’ịchịkwa nchegbu, ọ pụrụ ịdị mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme. Otú o sina dị, e nwere aro ndị dị mma na ụkpụrụ Bible ndị pụrụ inyere gị aka.

Ịmụta Ịchịkwa Nchegbu Ọrụ na-akpata

Ị̀ na-enwe nchegbu, ikekwe n’ihi ọnọdụ e nwere n’ebe ị na-arụ ọrụ? Nanị ihe ịnọgide na-ata ahụhụ n’akọsaraghị ya mmadụ pụrụ ime bụ ime ka nchegbu gị ka njọ. Dị ka Bible kwuru n’Ilu 15:22, “mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.”

Ndị meworo nnyocha banyere nchegbu a na-enwe n’ebe ọrụ na-atụ aro ka ị kọsara ya onye were gị n’ọrụ, n’ihi na o nwere ike inyere gị aka ma ọ mara banyere ya. Nke a apụtaghị na ị ga-eji iwe na ọnụma kọsara ya ya. “Ime nwayọọ na-eme ka mmehie ukwu dị iche iche kwụsị,” ka Eklisiastis 10:4 kwuru. Jide onwe gị aka ma zere iji iwe gwa ya okwu. Ikekwe, okwu gị pụrụ ime ka ọ ghọta na ị ga na-arụpụtakwu ihe ma nchegbu gị kwụsịlata.

Ị pụkwara ime otu ihe ahụ banyere nsogbu ndị ọzọ ị na-enwe n’ebe ọrụ, dị ka esemokwu gị na ndị ọrụ ibe gị na-enwe. Chọọ ụzọ ndị dị mma isi dozie esemokwu ndị dị otú ahụ . Ị pụrụ ime nnyocha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. E bipụtawo ọtụtụ isiokwu ndị pụrụ inye aka na Teta! * Ọ bụrụ na ọnọdụ gị eyie ihe na-agaghị ekwe mmete, ọ pụrụ ịkasị mma ka ị chọọ ọrụ ebe ọzọ.

Ịkwụsịlata Nchegbu Ego Na-akpata

Bible nwekwara ndụmọdụ ndị pụrụ inyere gị aka ịkwụsịlata nchegbu ị na-enwe n’ihi ego. Jizọs Kraịst gbara ume, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.” (Matiu 6:25) Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume? Ọ bụ site n’ịmalite inwe obi ike na Jehova Chineke ga-egbo mkpa gị ndị bụ́ isi. (Matiu 6:33) Nkwa Chineke abụghị nkwa elu ọnụ. Ọ na-enye ọtụtụ nde Ndị Kraịst taa ume.

N’ezie, ọ dịkwa gị mkpa inwe “nzube ihe,” ma ọ bụ ezi amamihe, ma a bịa  n’ihe metụtara ego. (Ilu 2:7; Eklisiastis 7:12) Bible na-echetara anyị, sị: “Ọ dịghị ihe anyị webataworo n’ime ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iburu pụọ na ya. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:7, 8) Ịmụta ịbụ onye obere ihe na-eju afọ bụ ihe kwere omume na ihe e kwesịrị ime eme. Ì chetara Leandro, bụ́ nwoke ahụ jizi oche nkwagharị aga n’ihi ihe ọghọm o nwere? Ya na nwunye ya mere ihe iji chekwaa ego ha. Leandro kọwara, sị: “Anyị na-agbalị ichekwa ego. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ dịghị ihe anyị ji ọkụ eletrik eme, anyị na-agbanyụ ya iji belata ego anyị ga-akwụ n’ụgwọ ọkụ. Mgbe anyị chọrọ ịga ihe, anyị na-ahazi ebe ndị anyị chọrọ ịga ma gakọta ha ọnụ iji belata ego anyị ga-emefu ná mmanụ ụgbọala.”

Ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka inwe echiche ziri ezi. Ada Leandro bụ́ Carmen kwetara, sị: “Ana m enwebu ọchịchọ ịzụ ihe ọ bụla gụrụ m, ma ndị mụrụ m enyerela m aka ịghọta ihe ndị dị mkpa n’ezie na ihe ndị na-adịghị mkpa. Ná mmalite, o siiri m ike ime mgbanwe. Ma, amụtara m ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe na-agụ m na ihe na-akpa m.”

Nkwurịta Okwu —Ihe Na-akwụsịlata Nchegbu

Ebe obibi kwesịrị ịbụ ebe ọ ga-abụ mmadụ lọta, nchegbu ya akwụsị. Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ ebe kasị akpata ya. N’ihi gịnị? Akwụkwọ bụ́ Survival Strategies for Couples kwuru, sị: “Ndị di na nwunye . . . bụ́ ndị obi na-adịchaghị eru ala, ma ọ bụ ndị nke na-ese okwu, na-ekwu na otu n’ime ihe ndị kasị eme ka ha na-esekarị okwu bụ enweghị nkwurịta okwu.”

Ụkpụrụ Bible pụrụ inyere ndị di na nwunye aka imeziwanye ụzọ ha si ekwurịta okwu. Bible na-ekwu na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu” nakwa na “okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” (Eklisiastis 3:1, 7; Ilu 15:23) Ịmara nke a pụrụ igbochi gị iwelite okwu na-akpasu iwe mgbe ike gwụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ọ́ kaghị mma ichere ruo oge kwesịrị ekwesị—mgbe o yiri ka di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ ga-aka adị njikere ige gị ntị?

N’ezie, ọ bụrụ na ụbọchị adịghịrị gị mma n’ebe ị na-arụ ọrụ, e nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ijide onwe gị ma ọ bụ inwe ndidi. Ma, gịnị pụrụ ime mgbe anyị ji olu ike mee ka di ma ọ bụ nwunye anyị mara ihe na-enye anyị nsogbu n’obi? Bible na-echetara anyị na “okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) N’aka nke ọzọ, “ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.” (Ilu 16:24) Ọ pụrụ ịchọ mkpebi siri nnọọ ike iji hụ na “obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị” abataghị ná mkparịta ụka di na nwunye. (Ndị Efesọs 4:31) Otú ọ dị, uru dị na ya ruru mgbalị e meere ya. Ndị di na nwunye bụ́ ndị na-ekwurịta okwu pụrụ ịbụrịtara ibe ha ndị nkasi obi ma na-akwadorịta ibe ha. “N’aka  ndị a dụworo ọdụ ka amamihe dị,” ka Ilu 13:10 kwuru. *

Ihe Ịma Aka nke Ndị Mụrụ Ụmụ na Ụmụ Ha Inwe Nkwurịta Okwu

Iso ụmụaka ekwurịta okwu bụ ihe ịma aka—nke ka nke ma ọ bụrụ na oge adịchaghị. Bible gbara ndị nne na nna ume ịdị na-agwa ụmụ ha okwu mgbe ọ bụla, dị ka mgbe ha ‘na-anọdụ n’ụlọ ha, na mgbe ha na-eje ije n’ụzọ.’ (Deuterọnọmi 6:6-8) Leandro kwuru, sị, “Mmadụ aghaghị ịchọ ohere iji soro ụmụ ya na-ekwurịta okwu. Mụ na nwa m nwoke nọrọ n’ụgbọala, ana m eji ohere ahụ eso ya akparịta ụka.”

N’ezie, ọ bụghị ndị nile mụrụ ụmụ ka ọ na-adịrị mfe iso ụmụ ha ekwurịta okwu. Alejandra, bụ́ nwanyị ji ụmụ atọ, kwetara, sị: “Amaghị m otú e si ege ntị. Amaghị otú e si enwe ezi nkwurịta okwu mere ka m nwewe obi ọjọọ na obi amamikpe.” Olee otú nne ma ọ bụ nna pụrụ isi meziwanye ihe n’akụkụ a? Malite site n’ịmụta “ịdị ngwa n’ịnụ ihe.” (Jems 1:19) “Ige ntị nke ọma bụ ụzọ kasị mma isi mee ka nchegbu kwụsịlata,” ka Dr. Bettie B. Youngs kwuru. Ị ghaghị ilebara otú i si ege ntị anya. Na-ele onye na-agwa gị okwu anya n’anya. Zere ime ka a ga-asị na nsogbu ụmụ gị na-enwe adịghị ihe ọ bụ. Gbaa ụmụ gị ume ịdị na-akọrọ gị obi ha. Na-ajụ ha ajụjụ ndị dabara adaba. Na-eme ka ha mara mgbe nile na ị hụrụ ha n’anya nakwa na obi siri gị ike na ha ga-eme ihe dị mma. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:4) Soro ụmụ gị na-ekpekọ ekpere.

Inwe ezi nkwurịta okwu chọrọ mgbalị. Ma, ime ya pụrụ inyere gị aka ịkwụsịlata nchegbu ị na-enwe n’ụlọ. Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu, ọ ga-enyere gị aka ịma ma hà na-enwe nchegbu. Ị ga-aka enwe ike inye ụmụ gị nduzi amamihe dị na ya ma ị ghọta otú obi dị ha na ọnọdụ ha nọ na ya. N’ikpeazụ, ụmụaka ndị a gbara ume ịdị na-ekwupụta nchegbu ha agachaghị enwe ọchịchọ iji àgwà ọjọọ mee ka a mara na ọ dị ihe na-enye ha nsogbu n’obi.

Imekọ Ihe Ọnụ—Isi Ihe Na-enye Aka n’Ịrụ Ọrụ Ndị Dị n’Ụlọ

Mgbe di na nwunye na-arụ ọrụ ego, ọrụ ndị dị n’ụlọ pụrụ ịghọ ihe ọzọ na-akpata nchegbu. Ụfọdụ ndị nne na-arụ ọrụ na-achịkwa ọnọdụ ahụ site n’iwebilata ọrụ ndị ha na-arụ n’ụlọ. Ha pụrụ ikpebi na ọ gaghị ekwe ha omume ma ọ bụ na ọ baghịrị ha uru ịdị na-esi ọtụtụ nri. Ì chetara ndụmọdụ Jizọs nyere otu nwanyị nọ na-esi ọtụtụ nri? Jizọs gwara ya, sị: “Ihe ole na ole, ma ọ bụ nanị otu ihe, dị mkpa.” (Luk 10:42) N’ihi ya, na-eme ka ihe dị mfe. Akwụkwọ bụ́ The Single-Parent Family tụrụ aro, sị: “Na-esi  ofe na nri ndị ọzọ e ji otu ite esi iji mee ka ihe ndị ị ga-asa mmiri ghara ihi nne.” Ee, iwebilata ọrụ ndị ị na-arụ n’ụlọ pụrụ ime ka nchegbu gị kwụsịlata.

I megodị ya otú ahụ, a pụrụ inwe ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa ka i mee. Otu nne na-arụ ọrụ ego kwetara, sị: “Mgbe m dị obere, apụrụ m ime ihe ọ bụla n’onwe m. Ugbu a m katarala ahụ́, ọ na-esiziri m ike. Ndụ gbalụ gbalụ m biri amalitela inye m nsogbu n’ahụ́. Ya mere, otú mmadụ nile nọ n’ụlọ anyị si emekọ ihe ọnụ na-egosi na ha na-echebara m echiche, o sokwa eme ka m ghara ịdị na-echegbu onwe m.” N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ezinụlọ agbakọọ aka na-arụ ọrụ ụlọ, ọ gaghị abụrụ onye ọ bụla oké ọrụ. Otu akwụkwọ na-ekwu banyere ịzụ ụmụ kwuru, sị: “Ikenye ụmụaka ọrụ ndị dị n’ụlọ bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi mee ka ha malite inwe . . . mmetụta nke ịbụ ndị ma arụ ọrụ. Ịrụchi ọrụ ndị dị n’ụlọ anya na-eme ka ha malite ịkpa àgwà ọma na ile ọrụ anya n’ụzọ dị mma.” Gị na ụmụ gị ịdị na-arụkọ ọrụ ndị dị n’ụlọ ọnụ pụkwara ime ka i nwee oge gị na ha ga-eji na-anọkọ.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Julieta kwuru, sị: “Ana m achọpụta na obi na-adị mama m ụtọ ma m nyere ya aka n’ọrụ. Nke ahụ na-enye m obi ụtọ ma na-eme ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Ọ na-enyere m aka iji ezinụlọ anyị kpọrọ ihe. Ịmụta otú e si arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ akwadebewo m maka ọrụ ndị dịịrị m n’ọdịnihu.” Mary Carmen kwukwara n’otu aka ahụ, sị: “Site n’oge anyị dị obere, ndị mụrụ anyị kụziiri anyị ilekọta onwe anyị. Nke a abaworo anyị uru dị ukwuu.”

Ụzọ Ndị Dị Mma Isi Chịkwaa Nchegbu

Nchegbu bụ ihe ya na ndụ nke oge a so aga; ị pụghị ịgbata ya n’ọsọ. Otú ọ dị, i nwere ike ịmụta otú ị ga-esi chịkwaa ya. (Lee igbe dị na peeji nke 10.) Ịgbaso ụkpụrụ Bible nwere ike inye aka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọnọdụ ụfọdụ ị nọ na ya adịghị enye gị ọnụ okwu, cheta na “onye na-ahụ n’anya dị nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Soro enyi gị tozuru okè ma ọ bụkwanụ di ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ya. Ronald L. Pitzer, bụ́ ọkà ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya kwuru, sị: “Anọla na-ebu nsogbu gị n’obi. Kọsara ya onye isi jụrụ oyi bụ́ onye o yiri ka ọ̀ ga-aghọta ọnọdụ gị ma chebara gị echiche.”

Bible na-ekwukwa banyere mmadụ ‘imeso mkpụrụ obi ya ezi ihe.’ (Ilu 11:17) Ee, ọ dị mma ilebara onwe gị anya. Bible kwuru, sị: “Ọ dị mma, bụ́ otu njuaka n’izu ike, karịa njuaka abụọ n’ịdọgbu onwe gị n’ọrụ na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:6) Iwepụtatụ oge iji zuru ike pụrụ ịbara gị uru dị egwu—ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị minit ole na ole n’isi ụtụtụ nke i ji tụrụ ndụ, gụọ akwụkwọ, kpee ekpere, ma ọ bụ tụgharịa uche n’udo!

Ọ bakwara uru ka ị na-emega ahụ́ ruo n’ókè kwesịrị ekwesị ma na-eri nri na-edozi ahụ́. Otu akwụkwọ na-ekwu banyere ịzụ ụmụ na-echetara anyị, sị: ‘Mgbe i ji ụfọdụ n’ime oge gị na ume gị lebara onwe gị anya, ihe ị na-eme bụ inwetaghachi ume. Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ mgbe nile, ị ghaghị ijide n’aka na ị na-ezu ike. Ma ọ́ bụghị ya, ike ga-agwụ gị, ma ọ bụrụkwa na ị kwụsịghị ọrụ kpamkpam.’

Tụkwasị na nke a, Bible na-enyere mmadụ aka ịzụlite àgwà ndị dị mkpa iji chịkwaa nchegbu, àgwà ndị dị ka “ịdị nwayọọ n’obi,” ndidi, na obiọma. (Ndị Galeshia 5:22, 23; 1 Timoti 6:11) Nke ka nke ahụ bụ na Bible na-enye olileanya—nkwa nke ụwa ọhụrụ na-abịanụ, nke ihe nile na-eme ka mmadụ na-ahụsi anya na-agaghị adị na ya! (Mkpughe 21:1-4) N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịmụta àgwà nke ịgụ Bible kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta enyemaka iji malite usoro ihe omume dị otú ahụ, obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka n’efu.

Ihe a na-ekwu ebe a abụghị na Onye Kraịst adịghị enwe nchegbu ná ndụ. Ma Jizọs kwuru na mmadụ pụrụ izere ịbụ onye ‘nchegbu nke ndụ na-anyịgbu.’ (Luk 21:34, 35) Ọzọkwa, ọ bụrụ na ị bịa mara Jehova Chineke dị ka enyi gị, ọ pụrụ ịbụrụ gị ezigbo ebe mgbaba! (Abụ Ọma 62:8) Ọ pụrụ inyere gị aka ịchịkwa nchegbu ndị ị na-enwe ná ndụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee usoro isiokwu bụ́ “E Mekpọọ Gị Ọnụ n’Ebe Ọrụ—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?” bụ́ ndị gbara na Teta! nke May 8, 2004.

^ par. 15 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“Mgbe m dị obere, apụrụ m ime ihe ọ bụla n’onwe m. Ugbu a m katarala ahụ́, ọ na-esiziri m ike. Ndụ gbalụ gbalụ m biri amalitela inye m nsogbu n’ahụ́”

 [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ụzọ Isi Mee Ka Nchegbu Kwụsịlata

▪ Na-ezu ike nke ọma kwa ụbọchị

▪ Na-eri ezigbo nri mgbe nile. Zere iribiga nri ókè

▪ Na-emega ahụ́ mgbe nile n’ụzọ kwesịrị ekwesị, dị ka ịgasi ije ike

▪ E nwee ihe na-enye gị nsogbu n’obi, kọsara ya enyi gị

▪ Na-ewepụtakwu oge iji soro ezinụlọ gị na-anọkọ

▪ Na-eke ọrụ ndị dị n’ụlọ eke

▪ Mara ihe ndị ị na-agaghị arụli na ndị ị na-agaghị edili

▪ Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ị pụrụ iru; emela ka i zuru okè

▪ Na-eme ihe n’usoro; nwee usoro ihe omume dị mma, nke ezi uche dịkwa na ya

▪ Mụta ịkpa àgwà kwesịrị Ndị Kraịst dị ka ịdị nwayọọ na inwe ndidi

▪ Na-ewepụta oge mgbe ụfọdụ iji na-anọrọ onwe gị

[Foto dị na peeji nke 7]

Iji nkwanye ùgwù kọsara onye were gị n’ọrụ nsogbu gị nwere ike ime ka nchegbu ọrụ na-akpatara gị kwụsịlata

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị nne na nna pụrụ iso ụmụ ha kwurịta ụzọ ndị a ga-esi na-echekwa ego

[Foto dị na peeji nke 8]

Dị ka onye ntorobịa, na-akọsara onye nwere ike inyere gị aka nchegbu ndị ị na-enwe

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Mmadụ nile pụrụ inye aka rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ