Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu Ndị Dị N’ịchọ Mma

Nsogbu Ndị Dị N’ịchọ Mma

 Nsogbu Ndị Dị N’ịchọ Mma

OLEE ihe e ji amata onye mara ezigbo mma? Ndị Igbo na-asị na mma dị n’anya n’anya. N’ezie, a na-ewere ya n’ebe nile na mma dabeere n’otú onye si hụ ya. Ọzọkwa, ihe ọtụtụ mmadụ weere dị ka mma adịgasịwo nnọọ iche site n’obodo ruo n’obodo nakwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

Jeffery Sobal, bụ́ osote prọfesọ ná ngalaba a na-amụ banyere nri na-edozi ahụ́ na Mahadum Cornell, U.S.A., na-ekwu, sị: “N’ime narị afọ nke 19 dum, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile weere ibu dị ka ihe e ji ama onye ukwu. E lere ibu anya dị ka ihe e ji ama ọgaranya na onye ahụ́ dị, ebe mmadụ ịdị gịrịgịrị pụtara na ọ dagidere ogbenye ruo n’ókè nke akpatalighị afọ ya.” Ihe ọtụtụ ndị omenkà nọ n’oge ahụ sere ma kpụọ gosipụtara echiche dị otú ahụ, ebe ọ bụ na ndị bụ́ ndị nlereanya ha—ndị ọnụ ọgụgụ ha kasị bụrụ ụmụ nwanyị—nwere ogwe aka, ogwe ụkwụ, azụ, na úkwù buru ibu. Ọtụtụ n’ime ha bụ ihe osise na ihe ọkpụkpụ nke ndị dịrị ndụ n’ezie bụ́ ndị e weere na ha bụ asa.

Echiche ahụ ka dị taa, ọ bụ ezie na mma na-agụnye ihe karịrị ibu ibu ma ọ bụ ịdị gịrịgịrị. Ụfọdụ obodo ndị dị n’Ebe Ndịda Pacific ka ji ibu akpọrọ oké ihe. N’ebe ụfọdụ n’Africa, ụmụ nwanyị a chọrọ ịlụ alụ na-anọ mgbèdè, bụ́ ebe a na-enye ha nri mara abụba n’ụba, na-eburu n’uche na ọ ga-eme ka ha makwuo mma. Otu onye nwere ụlọ oriri na nkwari abalị na Nigeria, na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ nwanyị Africa buru ibu . . . Nke ahụ bụ mma ha. Ọ bụ ihe ndị obodo anyị weere dị ka mma.” N’ọtụtụ obodo ndị na-asụ Spanish, a na-ewerekwa ibu dị ka ihe e ji ama onye bara ọgaranya na onye nwere ihe ịga nke ọma.

Otú ọ dị, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ. N’ihi

 gịnị? Ụfọdụ na-ekwu na ka azụmahịa bịara na-agbasa n’etiti mba dị iche iche, ụlọ ọrụ mmepụta ihe ana-emepụtakwu ma na-ekesa nri n’ebe nile, ndị nọ n’ọkwá “dị ala” bịaziri nwee ike iri nri e jibu mara ndị ọgaranya. N’ihi ya, ndị mmadụ bịaziri jiri nke nta nke nta kwụsị inwe mmasị n’ibu. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ nkwenkwe okpukpe na-ekwu na ọ bụ iribiga nri ókè na-akpata ibu ibu, nke a emewokwa ka a na-ele ibu anya ọjọọ. Ọzọkwa, ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara banyere ọrịa ndị oké ibu na-akpata sokwa mee ka a na-ele ya anya ọjọọ. Ihe ndị a na ndị ọzọ emewo ka echiche ndị mmadụ banyere ihe e ji amata onye mara mma gbanwee. Kemgbe ọtụtụ iri afọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa na-ekwuzi na ịdị gịrịgịrị ka e ji ama ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba.

Ụlọ ọrụ mgbasa ozi emewo ihe dị ukwuu n’ime ka echiche a gaa n’ihu. Ndị a na-ese na bọọdụ e ji akpọsa ngwa ahịa na ndị e ji akpọsa ngwá ahịa na telivishọn na-abụkarị ndị dị gịrịgịrị ma nwee ahụ́ ndị na-eme egwuregwu. Nzube e ji eji ụdị ndị a akpọsa ngwá ahịa bụ iji mee ka ndị mmadụ chee na ha ga-anọ ná nchebe ma nwee ihe ịga nke ọma ma ha jiri ngwa ahịa ndị ahụ na-eme ihe. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ndị e ji eme ihe nkiri vidio na nke TV nọ.

Olee otú echiche a si na-emetụta ndị nkịtị, gụnyere ndị ntorobịa? Otu isiokwu e dere na nso nso a banyere ọdịdị ahụ́ na-egosi na “tupu nwa agbọghọ nkịtị nọ n’America apụta n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ ga-ejiwo ihe karịrị awa 22,000 kirie telivishọn.” N’ihe ka ọtụtụ n’oge ndị ahụ, ọ na-ahụ imirikiti ụmụ nwanyị ndị mara mma bụ́ ndị a sị na ahụ́ ha zuru okè. Isiokwu ahụ kwukwara, sị: “Mgbe ndị inyom kiriri ụmụ nwanyị ndị a ugboro ugboro, ha na-ewere ya na inwe ọdịdị ahụ́ dị otú ahụ na-eme ka mmadụ nwee ùgwù, obi ụtọ, bụrụ onye a hụrụ n’anya, ma nwee ihe ịga nke ọma.” Ọ bụtụghị ihe ijuanya na mgbe ụmụ agbọghọ ụfọdụ kirisịrị foto nke ndị e ji egosi ejiji n’otu magazin, a kpaliri pasent iri anọ na asaa n’ime ha ifelata, n’agbanyeghị na ọ bụ nanị pasent iri abụọ na itoolu n’ime ha buru ibu.

Ụlọ ọrụ na-emepụta uwe na-enwekwa mmetụta siri ike n’echiche ndị mmadụ na-enwe banyere mma. Jennifer, bụ́ onye Venezuela e ji egosi ejiji, nke na-arụ ọrụ na Mexico City, na-ekwu, sị: “Ọrụ gị bụ ịdị mma n’anya, n’ụwa taa, nke ahụ pụtakwara na ị ga-adị gịrịgịrị.” Onye France e ji egosi ejiji, bụ́ Vanessa, na-ekwu, sị: “Ọ bụchaghị na ha chọrọ ka ị dị gịrịgịrị, kama ọ bụ gị onwe gị ga-achọ ya. Ọ bụ ihe na-ewuzi n’ụwa nile.” N’otu ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ ụmụ agbọghọ, pasent iri isii na itoolu n’ime ha kwetara na ndị e ji egosi ejiji, bụ́ ndị e sere na magazin, so mee ka ha nwee ụdị echiche ha nwere banyere ihe bụ́ ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba.

Ma, ọ bụghị nanị ndị inyom na-achọ inwe “ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba.” Akwụkwọ akụkọ ndị Mexico bụ́ El Universal, na-ekwu, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ihe ndị ikom ji achọ mma jupụtara n’ahịa karịa ka ha jupụtara taa.”

“Ọdịdị Ahụ́ Bụ́ Ịgba” —Ọ̀ Na-eme Ka Ị Bụrụ Ịgba?

Ná mgbalị ha inwe “ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba” ma ọ bụ iji maa nnọọ mma, ọtụtụ ndị na-awa ahụ́. Ụdị ịwa ahụ́ a anọwo na-adịwanye ọnụ ala, a nọgidewokwa na-awa ya n’ụzọ dịgasị iche iche. Olee otú ahụ́ a na-awa iji makwuo mma si malite?

Dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica si kwuo, ahụ́ a na-awa n’oge a iji makwuo  mma malitere mgbe Agha Ụwa Mbụ biri, bụ́ mgbe e mere mgbalị ime ka ahụ́ nke ndị e merụrụ ahụ́ n’agha ahụ dịghachi otú ha dịbu. Kemgbe ahụ, ụdị ịwa ahụ́ a bịara baa nnọọ uru n’ime ka ahụ́ nke ndị ọkụ kwarụrụ, ndị merụrụ nnukwu ahụ́, na ndị bu nkwarụ pụta ụwa, dịghachi otú ha kwesịrị ịdị. Otú ọ dị, dị ka akwụkwọ ahụ bụ́ Britannica si kwuo, a na-awakarị ụdị ahụ́ a “nanị iji meziwanye ọdịdị ahụ́ nke ndị ahụ́ dị.” Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịwa ụdị ahụ́ a iji dozigharịa imi, iji wepụ akpụkpọ ahụ́ karịrị akarị n’ihu nakwa n’olu, iji mee ka ntị dịkwuo obere, iji wepụ abụba dị n’afọ nakwa n’úkwù, iji mee ka akụkụ ahụ́ ụfọdụ bukwuo ibu, na ọbụna iji mee ka otubo “makwuo mma.”

Otú ọ dị, gịnị banyere ndị ahụ́ dị, bụ́ ndị na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ iji makwuo mma? Olee ihe ize ndụ ndị ha pụrụ iche ihu? Angel Papadopulos, bụ́ odeakwụkwọ nke Òtù Mexico nke Na-ahụ Maka Ahụ́ A Na-awa Iji Makwuo Mma na Iji Mee Ka Ahụ́ Dịghachi Otú O Kwesịrị Ịdị, na-akọwa na mgbe ụfọdụ, ndị dọkịta na-amachaghị ọrụ na-awa ụdị ahụ́ a, nke a na-etinyekwa ndị mmadụ ná nsogbu dị ukwuu. E nwere ụlọ ọgwụ ndị na-enye ndị chọrọ inwe ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba ọgwụ ndị dị ize ndụ iji mee ka ahụ́ ha dịkwuo mma. Ná mmalite afọ 2003, otu akwụkwọ akụkọ kwuru na a nụrụ akụkọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ihi ọnọdụ na-adịghị mma e nwere n’ebe ndị a na-anọ achọ mma na Canary Islands, bụ́ ebe ahụ́ a wara ọtụtụ narị ndị inyom buteere ha nsogbu. *

Ndị ikom n’onwe ha pụkwara ịchọsi ike inwe “ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba.” Ụfọdụ na-anọ ọtụtụ awa n’ebe a na-anọ emega ahụ́, na-eji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ oge ha kwesịrị iji zuru ike na-eme ka ọdịdị ahụ́ ha dịrị otú ha chọrọ. “N’ikpeazụ,” ka magazin bụ́ Milenio na-ekwu, “mkpa ọ dị ha imega ahụ́ na-eme ka ha na ndị ọzọ ghara ịdị na-emekọ ihe otú kwesịrịnụ.” Ọchịchọ siri ike ọtụtụ ndị na-enwe ime ka ahụ́ ha fụọ afụ na-eme ọbụna ka ha na-aṅụ ọgwụ ike ndị pụrụ imebi ihe n’ahụ́  ha, nke gụnyere ọgwụ a na-akpọ steroid.

Ịbụ ndị ọdịdị ahụ́ ha na-echu ụra emewo ka ụfọdụ ụmụ agbọghọ daba ná nsogbu iri ihe, dị ka iri nri ma gbọọ ya na erighị nri nke ọma, n’ihi ụjọ ha na-atụ ibu ibu. Ụfọdụ na-aṅụ ọgwụ ndị a sị na ha na-eme ka mmadụ dịrị gịrịgịrị ozugbo a ṅụsịrị ha, bụ́ ọgwụ ndị ụlọ ọrụ ahụ́ ike a ma ama na-akwadoghị. Ịṅụ ọgwụ ndị dị otú ahụ pụrụ imebi ọtụtụ ihe n’ahụ́ mmadụ.

Ihe ize ndụ a na-enwe n’ihi mmadụ ịbụ onye ọdịdị ahụ́ ya na-echu ụra abụghị nanị nke anụ ahụ́. Dr. Katherine Phillips nke Mahadum Brown, U.S.A., na-ekwu na ndị na-enwe nchegbu na-enweghị isi banyere ọdịdị ahụ́ ha pụrụ inwe nsogbu uche nke ga-eme ka ha na-echegbubiga onwe ha ókè n’ihi iche na e nwere ebe ndị ahụ́ ha na-adịzighị adịzi. Ihe ruru otu onye n’ime iri mmadụ ise ọ bụla pụrụ inwe nsogbu a. Ndị nwere nsogbu a “pụrụ ikwenyesi ike na ha jọrọ nnọọ njọ nke na ha ga-ekewapụ onwe ha n’ebe ndị enyi ha na ndị ha hụrụ n’anya nọ,” ka ọ na-ekwu. “Ha pụrụ ịda mbà n’obi ma malite iche banyere igbu onwe ha.” Phillips nyere ihe atụ nke otu nwatakịrị nwanyị mara mma, bụ́ onye nwetụrụ pịmpụl n’ihu, ma o kwenyesiri ike na pịmpụl juru ya n’ihu. N’ịbụ onye na-achọghị ka ndị mmadụ hụ ya, nwatakịrị ahụ kwụsịrị ịga akwụkwọ mgbe ọ nọ na klas nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.

Ọdịdị ahụ́ mmadụ ọ̀ dị oké mkpa n’ezie nke na ọ ga-achụrịrị ahụ́ ike nke uche na nke anụ ahụ́ ya n’àjà iji nweta “ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba”? È nwere mma ka mkpa nke mmadụ kwesịrị ịgbalịsi ike ịma?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 N’ebe Ndị Kraịst nọ, ịwa ahụ́ iji makwuo mma bụ mkpebi onwe onye. N’agbanyeghị nke ahụ, e kwesịrị ịtụle isi ihe ndị dị mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Teta! (Bekee) nke August 22, 2002, peeji nke 18-20.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

Ndị e ji egosi ejiji, bụ́ ndị e sere na magazin, so mee ka pasent iri isii na itoolu nke ụmụ agbọghọ nwee ụdị echiche ha nwere banyere ihe bụ́ ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba

[Foto dị na peeji nke 16]

Mkpọsa ngwá ahịa na-enwe mmetụta siri ike n’echiche ndị mmadụ na-enwe banyere mma elu ahụ́

[Foto dị na peeji nke 18]

Ụfọdụ emebiwo ihe n’ahụ́ ha n’ihi ahụ́ ha na-awa ugboro ugboro iji makwuo mma

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ụfọdụ na-eme mgbalị siri ike iji nweta ọdịdị ahụ́ ha chọrọ