Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Gị Dị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna

Ọrụ Gị Dị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna

Ọrụ Gị Dị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna

“Ọ BỤRỤ na i mee ka nwatakịrị nwee mmetụta nke ịbụ onye a hụrụ n’anya, onye so biri, meekwa ka o nwee nzube na ọchịchọ nke ịmata ihe, mgbe ahụ ụbụrụ ya ga-eto nke ọma,” ka Peter Gorski nke Ụlọ Akwụkwọ Ahụ́ Ike nke Harvard na-ekwu. “Ọrụ anyị dị ka ndị nne na nna abụghị ime ka ụbụrụ na-arụ ọrụ n’ụzọ zuru okè, kama ọ bụ inyere ụmụ anyị aka itolite ma ghọọ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị isi zuru okè, na ndị na-eche banyere ndị ọzọ.”

Lee ihe na-akwụghachi ụgwọ ọ bụụrụ gị bụ́ nne ma ọ bụ nna ịhụ ka nwa gị tolitere ma bụrụ onye na-akpa ezi àgwà na onye na-eche banyere ndị ọzọ! Ka i wee nwee ihe ịga nke ọma dị otú ahụ, ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’otú i si ebute ụzọ n’isetịpụ ihe nlereanya, n’ịbụ enyi, onye nkwurịta okwu, na onye nkụzi. Ọ bụ ezie na a mụrụ ụmụaka nile inwe ikike bụ́ isi nke ime omume ọma, ndị nne na nna aghaghị iji nwayọọ nwayọọ na-akụziri ụmụ ha ụkpụrụ omume ọma ka ha na-etolite.

Ònye Na-akpụzi Ụmụaka?

Echiche ndị nchọpụta nwere banyere onye na-ekere òkè kasịnụ n’ịkpụzi ụmụaka, dịgasị iche iche. Ụfọdụ kweere na ndị bụ́ isi n’ịkpụzi ụmụaka bụ

ndị ọgbọ ha. Ma, ndị dọkịta bụ́ T. Berry Brazelton na Stanley Greenspan, bụ́ ndị ọkachamara n’ọzụzụ ụmụaka, kweere na òkè nne ma ọ bụ nna na-ekere n’iji mmetụta ọmịiko azụlite nwata site n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ, dị oké mkpa.

Ahụmahụ ndị nwatakịrị na-enweta ná ndụ ya ka oge na-aga na mmetụta nke ndị ọgbọ ya na-esokwa ekere òkè n’uto ya. Ọ dị mkpa ka a na-egosi ụmụaka ọmịiko na nghọta n’ime ezinụlọ. Ọ dịkwa mkpa ịkụziri ha otú ha ga-esi na-anagide mmetụta ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ụmụaka ndị nwetara enyemaka dị otú ahụ na-akakarị adị njikere iji ọmịiko soro ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ.

Inye ụmụaka ọzụzụ site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ bụ ọrụ tara akpụ. Ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma—karịsịa ma ọ bụrụ na unu ka malitere ọhụrụ ịbụ nne na nna—ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchọ nduzi site n’aka ndị ka unu nwee ahụmahụ na ịgbasozi usoro ime ihe a kapịrị ọnụ. Ndị ọkachamara edewo ọtụtụ akwụkwọ banyere otú a ga-esi na-enye ụmụaka ọzụzụ. Mgbe mgbe, ihe ha na-ekwu na-eyi ndụmọdụ ndị a pụrụ ịdabere na ha bụ́ ndị dị na Bible. Mgbe e ji ha mee ihe, ezi ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke enyeworo ndị nne na nna aka inye ụmụ ha ọzụzụ n’ụzọ dị irè. Tụlee nduzi ndị dị irè na-esonụ.

Na-emesapụ Aka n’Igosipụta Ịhụnanya

Ụmụaka yiri ihe ọkụkụ ndị ka na-epupụta epupụta, bụ́ ndị na-eto ma na-eme nke ọma mgbe e ji ịhụnanya lekọta ha mgbe nile. Mmiri na anwụ na-enyere ihe ọkụkụ aka, na-eme ka ha na-eto nke ọma ma gbasie ike. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị nne na nna bụ́ ndị ji okwu ọnụ na omume egosi ụmụ ha ịhụnanya mgbe nile ga-eme ka ụbụrụ na mmetụta uche nke ụmụ ha na-eto nke ọma ma mee ka ha gbasie ike.

Bible na-ekwu n’ụzọ dị mfe, sị: “Ịhụnanya na-ewuli elu.” (1 Ndị Kọrint 8:1) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị nne na nna bụ́ ndị na-emesapụ aka n’igosipụta ịhụnanya n’ebe ụmụ ha nọ na-eṅomi Onye Okike ha, bụ́ Jehova Chineke. Bible na-ekwu na mgbe e mere Jizọs baptizim, ọ nụrụ olu Nna ya ka ọ na-ekwu na ya nwapụtara ma hụ ya n’anya dị ka Ọkpara Ya. Lee nnọọ ihe na-emesi obi ike ọ bụ, ọbụna nye Jizọs, n’agbanyeghị na o toola!—Luk 3:22.

Mmetụta ịhụnanya ị na-egosi, oge gị na nwa gị ji anọkọ tupu ya alakpuo ụra, na ọbụna egwuregwu unu na-egwu, bụ ihe ndị dị mkpa ga-eme ka nwa gị too nke ọma. ‘Ihe ọ bụla nwata na-eme,’ ka Dr. J. Fraser Mustard na-ekwu, ‘na-eme ka o nwekwuo ahụmahụ. Ọ bụrụ na nwata na-amụ igbe igbe, otú i si agba ya ume ma na-emeghachi omume dị mkpa.’ Ịhụnanya na nlebara anya nke nne ma ọ bụ nna na-atọ ntọala siri ike n’ime ka nwa ha too nke ọma ma ghọọ okenye nke a pụrụ ịdabere na ya.

Bụrụ Enyi na Onye Nkwurịta Okwu

Iwepụta oge iso ụmụ gị nọkọọ na-eme ka gị na ha nwee mmekọrịta chiri anya. Ọzọkwa, ọ na-akwalite nkà nkwurịta okwu. Akwụkwọ Nsọ gbara ume ka a na-enwe mmekọrịta chiri anya dị otú a—n’ebe obibi na n’ebe ọ bụla ọzọ nakwa n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị.—Deuterọnọmi 6:6, 7; 11:18-21.

Ndị ọkachamara n’ọzụzụ ụmụaka kweere na oge nne na nna na-eji eso ụmụ ha anọkọ dị nnọọ mkpa karịa ihe ngwuri egwu ndị mara mma ma ọ bụ ihe omume ọ bụla kpọmkwem. Ihe omume ndị na-adịghị eri oké ego na ndị a na-eme kwa ụbọchị pụrụ inye gị ohere dị otú ahụ nke iso ụmụ gị nọkọọ. Dị ka ihe atụ, nanị ịkpọ ha gaa n’ogige ntụrụndụ iji kirie ihe ndị e kere eke pụrụ ime ka ndị nne na nna nwee ohere iji jụọ ụmụ ha ajụjụ ndị bara uru ma kwalite nkwurịta okwu.

Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na e nwere “mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:1, 4) Ee, ụmụaka igwuri egwu n’onwe ha dị oké mkpa n’ime ka ha zụlite nkà nke iche echiche, nke igosipụta mmetụta, na nke iso ndị ọzọ na-emekọ ihe. Dị ka Dr. Mustard si kwuo, egwuregwu abụghị nanị na ọ bara uru, kama ọ dị nnọọ mkpa. Ọ na-ekwu, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ site n’egwuregwu ka ụmụaka si azụlite njikọ nke akwara ozi ụbụrụ ha ịrụ ọrụ dịgasị iche iche.” Ihe ụmụaka na-eji egwuri egwu n’onwe ha pụrụ ịbụ nke dị nnọọ mfe, dị ka katọn ihe na-adịghị na ya. Ngwá ụlọ ndị na-adịghị emerụ ahụ́, bụ́ ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị, na-adọrọ nnọọ mmasị ụmụaka otú ihe ngwuri egwu ndị bụ́ ọkpọka si adọrọ mmasị ha. *

Ndị ọkachamara kweere na iji imirikiti ọrụ ndị torurula ogo mmadụ na-eduzi na-ebogbu ụmụaka, pụrụ ime ka ha ghara inwe ike ichepụta ihe. A tụrụ aro imeru ihe n’ókè n’akụkụ a. Nye nwa gị ohere ịchọpụta ihe ndị gbara ya gburugburu ma nwalee ókè ọ dịruru nkọ n’ichepụta ihe. Mgbe mgbe, nwatakịrị ga-achọtarịrị ihe ọ ga-eme iji mee onwe ya obi ụtọ. Otú ọ dị, nke a adịghị anapụ gị ibu ọrụ nke ịmara ihe nwa gị na-eme na ebe ọ nọ na-egwuri egwu ka o wee ghara imerụ onwe ya ahụ́.

Wepụta Oge Maka Ya

Izi ihe bụ akụkụ dị mkpa nke ịzụlite ụmụaka ịghọ ndị na-akpa ezi àgwà. Ọtụtụ ndị nne na nna na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji na-agụrụ ụmụ ha ihe n’olu dara ụda. Nke a na-eme ka e nwee ohere maka ịkụziri nwata àgwà ọma, nakwa ịkụnye ụkpụrụ omume ọma ndị dabeere n’ihe Onye Okike anyị na-ekwu n’obi ya. Bible na-ekwu na Timoti, bụ́ onye nkụzi kwesịrị ntụkwasị obi nakwa onye ozi ala ọzọ, ‘maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ.’—2 Timoti 3:15.

Ịgụrụ nwa ọhụrụ gị ihe pụrụ ịkpali njikọ nke akwara ozi ya ịrụ ọrụ. Ihe dị mkpa bụ ka onye ga-agụ ihe ahụ bụrụ onye na-etinye uche n’ihe ma na-eche banyere ndị ọzọ. Linda Siegel, bụ́ prọfesọ na-ahụ maka agụmakwụkwọ, na-adọ aka ná ntị banyere ihe a ga-agụrụ ha, sị: “O kwesịrị ịbụ ihe ụmụaka ga-enwe mmasị na ya.” Ọzọkwa, gbalịa ịdị na-agụchi ya anya na inwe otu oge a kapịrị ọnụ ị ga na-agụ ya kwa ụbọchị. N’ụzọ dị otú ahụ, nwa ahụ ga-amalite ịdị na-atụ anya ya.

Izi ihe na-agụnye ịdọ aka ná ntị. Ụmụaka pụrụ irite uru n’ịdọ aka ná ntị sitere n’ịhụnanya. “Nwa nke maara ihe na-anụ ịdọ aka ná ntị nna ya,” ka Ilu 13:1 na-ekwu. Otú ọ dị, cheta na ịdọ aka ná ntị na-agụnye ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị n’ụdị iji okwu ọnụ gbazie nwata ma ọ bụ ịnapụ ya ihe ùgwù ụfọdụ ma ọ bụkwanụ ụdị ndị ọzọ nke inye ntaramahụhụ. Dr. Brazelton, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu na ịdọ aka ná ntị bụ “ịkụziri nwatakịrị otú ọ ga-esi na-achịkwa mmetụta ya na ụzọ ọ ga-esi na-ezere ịkpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị. Nwatakịrị ọ bụla na-atụsi nnọọ anya ike ka a gwa ya ókè ọ ga-emeru ihe. E wepụ ịhụnanya, ịdọ aka ná ntị bụ ihe kasị mkpa ị ga-enye.”

Dị ka nne ma ọ bụ nna, olee otú ị pụrụ isi chọpụta ma ịdọ aka ná ntị gị ọ̀ dị irè? Otu ụzọ ị ga-esi eme ya bụ ime ka ụmụ gị ghọta ihe mere i ji adọ ha aka ná ntị. Mgbe ị na-agbazi ha, mee ya n’ụzọ ga-eme ka ụmụ gị ghọta na ị bụ nne ma ọ bụ nna hụrụ ha n’anya ma na-akwado ha.

Mgbalị Ndị Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma

Fred bụ nna nke mere ka ịgụrụ nwa ya nwanyị ihe tupu ya alakpuo ụra, site n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ, bụrụ ihe ọ na-eme kwa ụbọchị. Ka oge ụfọdụ gasịrị, Fred chọpụtara na o buruwo ọtụtụ n’ime akụkọ ndị ahụ ọ na-agụrụ ya n’isi ma na-eso ya agụ ya, na-amata okwu na ụda okwu dị iche iche. Chris bụ nna ọzọ dị uchu n’ịgụrụ ụmụ ya ihe. O mere mgbalị ịgụrụ ụmụ ya ihe ndị dịgasị iche iche. Mgbe ụmụ ya ka dị nnọọ obere, o ji ihe osise ndị dị n’akwụkwọ ndị dị ka Akwukwọm nke Akukọ Bible mee ihe n’ịkụziri ha ụkpụrụ omume ọma na ihe ime mmụọ. *

Ndị nne na nna ndị ọzọ na-agbalịsi ike ikegasị oge ha iji hụ na ọ bụghị nanị na ha na-agụrụ ụmụ ha ihe kamakwa ha na ụmụ ha na-eme ihe omume ndị ọzọ—ise ihe, ịgụ egwú, ime mkpapụ, ma ọ bụ ịga nleta n’ebe ndị dị ka ogige ụmụ anụmanụ. A pụrụ iji oge ndị a eme ihe dị ka ohere iji kụziere ụmụaka ihe na nke iji kụnye ụkpụrụ omume na àgwà ọma n’obi na n’uche ha nke na-anabata ihe ngwa ngwa.

Ihe a nile ò ruru mgbalị e meere ya? Ndị nne na nna bụ́ ndị na-eme ike ha n’itinye ụkpụrụ nduzi ndị e kwuru n’elu n’ọrụ n’ezinụlọ nke dị n’udo ma kwụsie ike, yikarịrị nnọọ ka hà ga-ahụ ụmụ ha ka ha zụlitere àgwà kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na i mee ka ụmụ gị zụlite nkà nke iche echiche nakwa nke nkwurịta okwu mgbe ha ka dị obere, ị ga-ekere òkè dị ukwuu n’ime ka ha zụlite ụkpụrụ omume ọma ma jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.

Ọtụtụ narị afọ gara aga, Bible kwuru n’ụzọ doro anya n’Ilu 22:6, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” N’ezie, ndị nne na nna na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’inye ụmụaka ọzụzụ. Na-emesapụ aka n’igosipụta ịhụnanya gị n’ebe ụmụ gị nọ. Wepụta oge iso ha na-anọkọ, na-enye ha ọzụzụ, ma na-akụziri ha ihe. Ime otú ahụ ga-ewetara gị na ha obi ụtọ.—Ilu 15:20.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Lee isiokwu bụ́ “Ihe Egwuregwu Ụmụaka Ndị Africa na Nkịtị,” nke dị ná mbipụta July 8, 1993 nke magazin a.

^ par. 24 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Akwụkwọ ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara bụ́ nke e ji na-eme ihe n’ụzọ dị irè n’ịkụziri ụmụaka ihe bụ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 17]

Iso Nwa Ọhụrụ Gị Na-egwuri Egwu

▪ Ụmụ ọhụrụ adịtụghị etinye uche n’ihe ruo ogologo oge, n’ihi ya, soro ha gwuo egwu nanị mgbe o yiri ka ọ̀ na-atọ ha ụtọ.

▪ Ọ bụrụ na unu ji ihe ụmụaka ji egwuri egwú na-eme ihe, hụ na ha bụ ihe ndị na-agaghị emerụ nwa ahụ ahụ́ na ihe ndị ga-akpali ya iche echiche.

▪ Na-egwunụ egwuregwu ndị ga-eme ka unu na-emegharị ahụ́. Ọ na-atọ ụmụ ọhụrụ ụtọ ime ka ị na-eme ihe ugboro ugboro, dị ka iwetara ha ihe ngwuri egwu ha tụpụrụ n’ala.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Clinical Reference Systems

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

Aro Ndị A Tụrụ Banyere Ịgụrụ Nwa Gị Ihe

▪ Na-ekwu ma na-akpọpụta okwu n’ụzọ doro anya. Nwatakịrị na-amụta asụsụ site n’ịnụ ka nne na nna ya na-ekwu okwu.

▪ Mgbe ị na-agụrụ obere ụmụaka ihe, na-egosi ha ma na-akpọrọ ha aha ndị mmadụ na ihe ndị e kwuru banyere ha n’akwụkwọ ahụ.

▪ Mgbe nwa ahụ tolitetụrụ, họrọ akwụkwọ ndị e dere ihe ndị na-amasị ya n’oge ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Pediatrics for Parents

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Wepụta oge iso ụmụ gị na-enwe ntụrụndụ dị ụtọ