Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Azụlite Mmasị Maka Ịmụ Ihe

Otú E Si Azụlite Mmasị Maka Ịmụ Ihe

 Otú E Si Azụlite Mmasị Maka Ịmụ Ihe

“Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”—ILU 22:6.

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe ị nwara ime ka ụmụaka hie ụra ka a na-eme ihe na-adọrọ mmasị? N’agbanyeghị na ike gwụrụ ha, ha ana-ebe ákwá, ọbụnakwa bụrụ ndị ahụ́ na-agbakasị, ha ga-agbasi mbọ ike ịmụ anya ma sonye na ya. “Mkpa [ha] nwere ịghọta ụwa ha nọ na ya na inwe nkà n’ime ihe nke ọma, miri emi ma sie nnọọ ike dị ka mkpa ha nwere maka nri ma ọ bụ izu ike ma ọ bụ ihi ụra. Mgbe ụfọdụ, ọ pụdịrị isi ike karịa,” ka onye edemede bụ́ John Holt na-ede.

Ihe ịma aka a na-enwe bụ ka ụmụaka nọgide na-enwe ọchịchọ ịmụ ihe ná ndụ ha nile, gụnyekwara oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụ ezie na e nweghị usoro e ji n’aka na ọ ga-agarịrị nke ọma, e nwere usoro ndị a nwapụtaworo anwapụta bụ́ ndị ndị nne na nna, ndị nkụzi, na ụmụaka pụrụ itinye n’ọrụ. Otú ọ dị, ihe dị mkpa karịa usoro ọ bụla bụ ịhụnanya.

Ka Ịhụnanya Wepụta Ihe Kasị Mma

Ụmụaka na-achọsi ịhụnanya nke ndị mụrụ ha ike. Ọ na-eme ka ahụ́ ruo ha ala, na-eme ka ha na-adịkwu njikere ikwu okwu, ịjụ ajụjụ, na ịchọpụta ihe. Ịhụnanya na-eme ka ndị nne na nna soro ụmụ  ha na-ekwurịta okwu mgbe nile ma na-enwe mmasị n’agụmakwụkwọ ha. Nnyocha e mere na-egosi na “o yiri ka ndị nne na nna hà na-enwe mmetụta bụ́ isi n’ịkpali nwatakịrị ịmụ ihe,” ka e mere ka ọ pụta ìhè n’akwụkwọ bụ́ Eager to Learn—Helping Children Become Motivated and Love Learning (Ịdị Njikere Ịmụ Ihe—Inyere Ụmụntakịrị Aka Ịbụ Ndị A Kpaliri na Ndị Nwere Mmasị Ịmụ Ihe). Mmetụta ahụ na-adịkwu irè mgbe ndị nne na nna so ndị nkụzi na-arụkọ ọrụ. “Ọ dịghị ihe dị ike n’ime ka nwatakịrị nweghachi mkpali ịmụ ihe karịa nne ma ọ bụ nna na onye nkụzi ịrụkọ ọrụ,” ka akwụkwọ ahụ na-ekwu.

Ndị nne na nna na-enwekwa mmetụta n’ikike ụmụ ha na-enwe ịmụta ihe. N’otu nnyocha were ogologo oge nke e mere n’ebe ezinụlọ 43 dị, bụ́ nke a kọrọ n’akwụkwọ bụ́ Inside the Brain, ndị nnyocha “chọpụtara na ụmụaka ndị a kasị kwunyere okwu [n’ime afọ atọ mbụ nke ndụ ha] nwere ọgụgụ isi dị mma karịa ụmụaka ndị nne na nna ha na-ekwunyeghịrị okwu hie nne.” Akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye na “ndị nne na nna bụ́ ndị kasị ekwunyere ụmụ ha okwu na-adịkarị eto ụmụ ha maka ihe ndị ha mere nke ọma, na-aza ajụjụ ndị ha jụrụ, na-enye ha ntụziaka kama inye ha iwu, ma na-eji okwu dị iche iche eme ihe n’ịgwa ha okwu.” Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-ekwunyere ụmụ gị okwu mgbe nile n’ụzọ rijuru afọ?

Ịhụnanya Nwere Obiọma na Nghọta

Ikike ụmụaka abụghị otu. Dị ka o kwesịrị ịdị, ndị nne na nna ekwesịghị ikwe ka ndịrịta iche a metụta ịhụnanya ha na-egosipụta. Otú ọ dị, n’ụwa taa, a na-elekarị ndị mmadụ anya dabere n’ikike ha nwere, bụ́ nke pụrụ ime ka ụfọdụ ụmụaka “na-eche na uru ha bara dị ka mmadụ na-adabere n’ime ihe nke ọma karịa ndị ọzọ,” dị ka akwụkwọ bụ́ Thinking and Learning Skills (Nkà nke Iche Echiche na Ịmụta Ihe) si kwuo. E wezụga na ọ na-eme ka ụmụaka ndị a “na-atụkarị nnọọ ụjọ ọdịda,” nkwenkwe a pụkwara ime ka ha na-enwe nchekasị na nrụgide na-enweghị isi. Magazin bụ́ India Today na-ekwu na e weere ya na isi ihe mere igbu onwe onye nke ndị  nọ n’afọ iri na ụma ji rịa elu okpukpu atọ n’India n’ime afọ 25 gara aga bụ nchekasị ha na-enwe n’ihi nrụgide nke ịgbata ihe n’ule nakwa enwetaghị nkwado ezinụlọ.

Ụmụaka pụkwara inwe nsogbu mmetụta uche ma ọ bụrụ na a na-akpọ ha “itibọrịbọ” ma ọ bụ “ndị iberibe.” Okwu ọjọọ ndị dị otú ahụ na-akụda mmụọ mmadụ kama ịgba ya ume ịmụ ihe. Otú ọ dị, ịhụnanya nke nne ma ọ bụ nna kwesịrị inwe obiọma mgbe nile, na-akwado ikike ebumpụta ụwa nke nwatakịrị nwere ịmụta ihe—otú ike kwekwara ya, n’emeghị ka ọ tụwa ụjọ na a ga-eweda ya ala. (1 Ndị Kọrint 13:4) Ọ bụrụ na nwatakịrị nwere nsogbu n’ịmụta ihe, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-agbalị inyere ya aka, n’emeghị mgbe ọ bụla ka o nwee mmetụta nke ịbụ onye iberibe ma ọ bụ onye na-abaghị n’ihe. N’eziokwu, nke ahụ pụrụ ịchọ ndidi na akọ, ma o ruru mgbalị ọ bụla e meere ya. Olee otú mmadụ si azụlite ịhụnanya dị otú ahụ? Ile ihe anya n’ụzọ ime mmụọ bụ nzọụkwụ mbụ dị mkpa.

Ile Ihe Anya n’Ụzọ Ime Mmụọ Na-eme Ka E Meruo Ihe n’Ókè

Ọnọdụ ime mmụọ nke dabeere na Bible bara uru karịsịa n’ihi ọtụtụ ihe. Nke mbụ, ọ na-enyere anyị aka idebe ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ n’ọnọdụ kwesịrị ya, na-ele ya anya dị ka ihe dị mkpa ma ọ bụghị dị ka ihe kasị mkpa. Dị ka ihe atụ, mgbakọ na mwepụ pụrụ ịba uru n’ọtụtụ ụzọ, ma ọ pụghị ime ka mmadụ bụrụ onye na-eme omume ọma ma na-agbaso ụkpụrụ.

Bible na-agbakwa anyị ume imeru ihe n’ókè ma a bịa n’oge anyị na-etinye n’ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ, na-asị: “Ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ; ọtụtụ mmụta bụkwa ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ́.” (Eklisiastis 12:12) N’eziokwu, ọ dị ụmụaka mkpa inweta ezigbo agụmakwụkwọ bụ́ isi, ma nke a ekwesịghị iwekọrọ oge ha. Ọ dịkwa ha mkpa inwe oge maka ihe omume ndị ọzọ na-ewuli elu, karịsịa ndị nke metụtara ihe ime mmụọ, bụ́ ndị na-azụlite àgwà mmadụ.

Akụkụ ọzọ nke ọnọdụ ime mmụọ dabeere na Bible bụ obi umeala. (Maịka 6:8) Ndị dị obi umeala na-ama ebe ike ha ruru, ha adịghịkwa abụ ndị a rabanyere n’oké ọchịchọ na asọmpi ọnwụ na ndụ ndị a na-ahụ n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ. Àgwà ndị a na-adịghị mma “na-akpata ịda mbà n’obi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ India Today na-ekwu. Ma ànyị ka na-eto eto ma anyị emeela agadi, ihe na-akara anyị nnọọ mma mgbe anyị gbasoro ndụmọdụ Bible a sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.” “Ma ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”—Ndị Galeshia 5:26; 6:4.

Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi tinye nke a n’ọrụ n’agụmakwụkwọ ụmụ ha? Otu ụzọ bụ site n’ịgba nwa nke ọ bụla ume isetịpụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ na iji onwe ya na-atụnyere onwe ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị nwoke lere ule ná mgbakọ na mwepụ ma ọ bụ ná nsụpe okwu na nso nso a, mee ka o jiri akara o nwetara n’ule ahụ tụnyere ndị nke o nwetara n’ule ndị bu ụzọ. Mgbe ahụ, jaa ya mma ma ọ bụ gbaa ya ume n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ụzọ dị otú a, ị na-enyere ya aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọ pụrụ iru, ịmata mgbe ọ na-enwe ọganihu, na ilebara adịghị ike ọ bụla o nwere anya, n’ejighị ya tụnyere ndị ọzọ.

Otú ọ dị, n’oge ndị a, ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ga-emeli nke ọma adịghị ekwe eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ n’ihi ịtụ ụjọ na a ga-akwa ha emo. “Ịbụ ezigbo nwa akwụkwọ bụ nnọọ ‘okwu na ụka,’” bụ echiche ụfọdụ ndị ntorobịa na-enwe. Ile ihe anya n’ụzọ ime mmụọ ọ̀ pụrụ inye aka na nke a? Eenụ! Tụlee Ndị Kọlọsi 3:23, bụ́ nke na-asị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, tinyenụ obi unu dum na ya, dị ka unu na-emere ya Onyenwe anyị, ọ bụghịkwa mmadụ.” (The New English Bible) Ọ̀ dị ihe ọzọ ị pụrụ icheta ga-akasị akpali mmadụ ịrụsi ọrụ ike ma ọ́ bụghị ime ka obi dị Chineke mma? Ile ihe anya n’ụzọ dị mma otú ahụ na-eme ka mmadụ nwee ume iguzogide nrụgide ndị ọgbọ na-adịghị mma.

Kụziere Ụmụaka Inwe Mmasị n’Ịgụ Ihe

Ịgụ ihe na ide ihe bụ isi sekpụ ntị ná mmụta bụ́ ịgba—nke ụlọ akwụkwọ na nke ime mmụọ. Ndị nne na nna pụrụ ime ka ụmụ ha zụlite mmasị n’ịgụ ihe site n’ịdị na-agụrụ ha ihe site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ. Daphne, bụ́ onye na-arụ ọrụ dị ka onye ngụgharị, nwere obi ụtọ na ndị mụrụ ya gụụrụ ya ihe mgbe nile n’oge ọ bụ nwata. “Ha mere ka m zụlite mmasị maka ịgụ ihe,” ka ọ na-akọwa. “N’ihi ya, abịara m nwee ike ịgụ ihe tupu m banye ụlọ akwụkwọ. Ndị mụrụ m kụzikwaara m ime nnyocha ka m wee nwee ike ịchọta azịza nye ajụjụ m. Ọzụzụ a abaworo m uru dị ukwuu ruo taa.”

 N’aka nke ọzọ, Holt, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, dọrọ aka ná ntị na ịgụrụ ụmụaka ihe “abụghị ọgwụ a ṅụọ ọ laa.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na ọgụgụ ihe ahụ abụghị ihe na-atọ ụtọ nye ma nne ma ọ bụ nna na nwatakịrị, ọ ga-emebi ihe karịa ka ọ ga-emezi. . . . Ọbụna ụmụaka ndị na-enwe mmasị ka a na-agụpụtara ha ihe agụpụta . . . adịghị enwe mmasị na ya ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha enweghị mmasị na ya.” N’ihi ya, Holt na-atụ aro ka ndị nne na nna na-ahọrọ akwụkwọ ha onwe ha nwere mmasị na ya, na-eburu n’uche na ụmụaka pụrụ ịchọ ka a gụọrọ ha akwụkwọ ahụ ọtụtụ ugboro! Akwụkwọ abụọ ọtụtụ nde ndị nne na nna n’ụwa nile na-enwe mmasị ịgụrụ ụmụ ha bụ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na Akwukwọm nke Akukọ Bible, bụ́ ndị Ndịàmà Jehova bipụtara. N’ịbụ ndị e dere kpọmkwem maka ụmụaka, akwụkwọ ndị a nwere ọtụtụ ihe osise, na-akpali iche echiche, na-akụzikwa ụkpụrụ Chineke.

Timoti, bụ́ Onye Kraịst nke narị afọ mbụ, bụ onye e ji nne na nne ochie ndị nwere mmasị dị ukwuu n’agụmakwụkwọ ya gọzie, karịsịa agụmakwụkwọ ime mmụọ ya. (2 Timoti 1:5; 3:15) Timoti tolitere ma bụrụ onye ji ihe akpọrọ ihe n’ụzọ na-enweghị atụ na onye a pụrụ ịtụkwasị obi—àgwà ndị ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ nanị na-apụghị ime ka e nwee. (Ndị Filipaị 2:19, 20; 1 Timoti 4:12-15) Taa, n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, e nwere ọtụtụ ezigbo ụmụaka ndị dị ka Timoti—ndị nwoke na ndị nwanyị—n’ihi ndị nne na nna na-ahụ n’anya, bụ́ ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe.

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ezi Ihe!

Nye onye nkụzi nke chọrọ ime ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ịmụ ihe, “okwu [atọ] chịkọtara ihe nile a chọrọ—ịnụ ọkụ n’obi,” ka akwụkwọ bụ́ Eager to Learn na-ekwu. “Nanị  n’ọnụnọ ha nọ n’ebe ahụ, ndị nkụzi na-anụ ọkụ n’obi na-eme ka ụmụ akwụkwọ ha mara na ha nwere mmasị n’ihe ha na-akụzi, àgwà a na-apụtakwa ìhè nke ọma n’ihe ha na-akụzi.”

Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị nne na nna ma ọ bụ ndị nkụzi nile na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi. N’ihi ya, ụmụ akwụkwọ maara ihe na-agbalị iji aka ha na-akwali onwe ha ịmụ ihe, ile ọmụmụ ihe anya dị ka ibu ọrụ ha. E kwuwerị, ka akwụkwọ ahụ e hotara na mbụ na-ekwu, “ọ dịghị onye gaje ịnọ ụmụ anyị n’akụkụ n’afọ ndụ ha fọdụrụnụ ma nyere ha aka ịmụ ihe, ịrụ ọrụ bụ́ ịgba, iche echiche, na imekwu mgbalị ndị ga-eme ka ha nwee nkà ndị magburu onwe ha.”

Ọzọkwa, nke a na-eme ka ọ pụta ìhè na ebe obibi dị mkpa karịa ụlọ akwụkwọ n’ihe banyere ụkpụrụ omume ụmụaka na-amụta na ya. Ndị nne na nna, ùnu na-enwe ịnụ ọkụ n’obi banyere ịmụ ihe? Ebe obibi unu ọ̀ bụ ebe dị mma maka ịmụ ihe, ebe a na-emesi ụkpụrụ ime mmụọ ike? (Ndị Efesọs 6:4) Chetanụ, ma ihe nlereanya unu ma ihe unu na-ezi ga-enwe mmetụta n’ebe ụmụ unu nọ ruo ogologo oge mgbe ha gụsịrị akwụkwọ ma hapụ ụlọ.—Lee igbe bụ́ “Ezinụlọ Ndị Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịmụ Ihe,” na peeji nke 7.

Ghọta na Ndị Mmadụ Na-amụta Ihe n’Ụzọ Dịgasị Iche Iche

Ụbụrụ abụghị otu; onye nke ọ bụla nwere ụzọ nke ya o si amụta ihe. Ihe dị irè n’ebe otu onye nọ nwere ike ọ  gaghị adị irè otú ahụ n’ebe onye ọzọ nọ. N’ihi ya, Dr. Mel Levine, na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ A Mind at a Time, sị: “Imeso ụmụaka nile n’otu ụzọ bụ imeso ha n’ụzọ na-ahaghị nhata. Ụmụaka dị iche iche nwere mkpa dịgasị iche nke ịmụta ihe; ọ bụ ihe ruuru ha ịhụ na e gboro mkpa ha.”

Dị ka ihe atụ, ụfọdụ mmadụ na aka-aghọta ma na-echeta ihe mgbe ha hụrụ ebe e sere ya ese. Ndị ọzọ na-ahọrọ ka e deere ha ya ede ma ọ bụ ka a gwa ha ya n’ọnụ—ma ọ bụkwanụ, ma eleghị anya, ngwakọta nke ụzọ abụọ ahụ. “Ụzọ kasị mma isi cheta ihe bụ ịgbanwe ya, ịgbanwe ihe ọmụma ahụ n’ụzọ ụfọdụ,” ka Levine na-ekwu. “Ọ bụrụ na a na-ahụ ya anya, kwuo ya n’ọnụ, ọ bụrụ na e kwuru ya n’ọnụ, see ya ese.” Usoro a na-eme ka ịmụ ihe bụrụ, ọ bụghị nanị ihe na-akwụghachi ụgwọ, kamakwa ihe na-atọ ụtọ.

N’ezie, ọ pụrụ ịdị mkpa na ị ga-eme nnwale iji chọpụta usoro ndị ga-akasị adị irè nye gị. Hans, bụ́ Onye Kraịst na-eje ozi oge nile, duziiri George, bụ́ agadi nwoke nke nwetara nanị agụmakwụkwọ bụ́ isi, ọmụmụ Bible. Ọ na-esiri George ike ịghọta ihe na icheta ha. N’ihi ya, Hans gbalịrị ịdị na-akọwara ya ihe ndị bụ́ isi site n’ise ihe osise ndị dị mfe. “Mgbe ahụ ka George bidoro matawa ihe a na-akọ,” ka Hans kwuru. “N’ezie, ọ malitere ịghọta na icheta ihe nke ọma nke na ọ tụrụ ya onwe ya n’anya! Ozugbo m chọpụtara otú ụbụrụ ya si arụ ọrụ, achọpụtara m na ụbụrụ ya na-aghọ nnọọ nkọ karịa ka m cheburu. N’oge na-adịghị anya, ọ bịara nwekwuo obi ike n’ebe ya onwe ya nọ, ọ malitekwara ịtụ anya oge ọzọ anyị ga-amụ ihe karịa ka ọ na-emebu.”

I Tofebeghị Ịmụta Ihe

“Ihe ụbụrụ pụrụ ime na-adabere ma è ji ya eme ihe ma ọ bụ na e jighị ya eme ihe,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Inside the Brain na-ekwu. “Ọ bụ nke kasịnụ ná ngwá ọrụ ndị ọ ga-abụ ị haa ha, ha ahaa gị, ọ dịkwa njikere ịmụta nkà ndị ọhụrụ.” Akwụkwọ ahụ na-ekwukwa, sị: “Dị nnọọ ka mmega ahụ́ si eme ka ahụ́ gbasie ndị mmadụ ike n’oge ha nọ n’afọ ndị nke iri asaa na iri asatọ ha, ndị nchọpụta na-egosipụta na ime ka ụbụrụ na-arụsi ọrụ ike pụrụ ime otu ihe ahụ n’ebe ụbụrụ nke onye karala nká dị. Ọ dịwo anya e chewere na ịka nká na-akpaghasị ụbụrụ n’ụzọ na-enweghị mmekwata. Ma nchọpụta ọhụrụ e mere na-egosi na [nke a] na-eme n’ihi na a tụrụ anya na ọ ga-eme, ihe na-akpatakarị ya bụ ejighị ụbụrụ eme ihe. Ọzọkwa, mkpụrụ ndụ ndị na-adị n’ụbụrụ adịghị anwụ nnọọ n’ụba kwa ụbọchị ka mmadụ na-emewanye agadi, dị ka e cheburu.”  Ndalata dị ukwuu n’ikike ụbụrụ nwere ịrụ ọrụ na-abụkarị ihe mgbaàmà nke ọrịa, gụnyere ọrịa obi.

N’ezie, ikike ụbụrụ nwere ịrụ ọrụ pụrụ ibelata ma a kawa nká ma ọ bụchaghị n’ụzọ ndị dị oké njọ. Ụbụrụ nke na-arụ ọrụ, ka ndị nchọpụta na-ekwu, na-eguzogide mmebi—karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ nwere usoro dị mma nke mmega ahụ́. “Ka mmadụ na-ekerekwu òkè n’ịmụ ihe, otú ahụ ka ikike o nwere ịmụta ihe na-amụbakwu. Ndị na-anọgide na-amụ ihe na-aka amụta ihe,” ka akwụkwọ bụ́ Elderlearning—New Frontier in an Aging Society na-ekwu.

E gosipụtara eziokwu a n’Australia ná nnyocha were afọ 20 e mere n’ebe ndị dị afọ 60 ruo afọ 98 nọ. Ọ bụ nanị 1 pasent ka ike ụbụrụ nke ọtụtụ ndị keere òkè ná nnyocha ahụ ji dalata n’afọ. Otú ọ dị, ọgụgụ isi nke “ụfọdụ ndị, gụnyere [nke] ndị nọ n’afọ ndị iri itoolu ha, adalataghị ma ọlị,” ka nnyocha ahụ na-egosi. “Nke a bịara bụrụ ndị keere òkè ná nnyocha ndị ahụ e ji ihe ọmụmụ na-achọ mmadụ itipụta ahụ́ ya ọnyá bụ́ nke metụtara ịmụ asụsụ ala ọzọ nakwa/ma ọ bụ ịkpọ ngwa egwú, mee.”

George, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, nọ n’afọ ndị nke 70 ya mgbe ọ malitere ịmụ Okwu Chineke. N’otu aka ahụ, Virginia, bụ́ onye nọ n’afọ ndị nke 80 ya ugbu a, na di ya nwụrụla anwụ, bụ́ Robert, malitekwara ịmụ Bible mgbe ha merela agadi. Virginia na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị na ọ fọrọ nke nta ka o kpuchaa ìsì, Robert kwuru okwu ndị dị nkenke dabeere na Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze site n’ihe ndepụta o bu n’isi. Ma mụ onwe m, ọ dịghị mgbe ịgụ ihe tọrọ m ụtọ, ma ugbu a, ịgụ ihe na-amasị m. N’ezie, n’isi ụtụtụ a, agụchapụrụ m otu mbipụta Teta!”

George, Robert, na Virginia bụ nanị ihe atụ atọ nke ọtụtụ ndị agadi bụ́ ndị gosipụtara na ihe ahụ e kweere banyere ndị agadi agbasaghị ha ma jiri ụbụrụ ha na-eme ihe n’ụzọ dị mma. Nnyocha e mere na-egosi na, nye ụbụrụ, ịmụ ihe ruo afọ 70 ma ọ bụ afọ 80 na-adị ka ịwụnye otu ngaji mmiri n’ime drọm—ọ naghịdị adị ka ọ dị ihe a wụnyere. N’ihi gịnị ka ụbụrụ ji nwee ikike dị ukwuu otú ahụ?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4, 5]

Intanet na TV—Hà Na-enye Aka Ka Hà Na-emebi Ihe?

“Iji Intanet eme ihe na-eweta ma uru ma ọghọm,” ka akwụkwọ bụ́ A Mind at a Time na-ekwu. Ịmụta otú e si enweta ihe ọmụma pụrụ ịba nnọọ uru, ma ụfọdụ ụmụ akwụkwọ, ka akwụkwọ ahụ na-akọwa, “na-ewere ihe ọmụma na kọmputa n’aghọtaghị ya n’ezie ma ọ bụ jiri ya tụnyere ihe ndị ha dị mbụ mara. N’ihi ya, ọ pụrụ ịghọ ụzọ ọhụrụ e si amụ ihe n’etinyeghị uche na ya ma ọ bụ ikekwe ọbụna ghọọ ụzọ nke isi jiri ihe onye ọzọ dere mee ihe dị ka à ga-asị na ọ bụ ha dere ya.”

Iji oge dị ukwuu na-ekiri TV, ka ndị nnyocha na-ekwu, pụrụ ibelata nkà nke idozi nsogbu na nke ige ntị, mee ka ikike nchepụta ghara ịdị nkọ, ọ dịghịkwa ewulite omume. “Dị ka a na-eme n’ebe siga dị, e kwesịrị ide okwu ịdọ aka ná ntị n’ahụ́ telivishọn banyere ihe ize ndụ ndị ọ pụrụ inwe n’ebe mmadụ nọ,” ka akwụkwọ bụ́ Eager to Learn na-ekwu.

Ihe kasị dị ụmụaka mkpa, ka akwụkwọ ọzọ na-atụ aro ya, bụ “ime ka ha mara asụsụ (ịgụ ihe na mkparịta ụka), igosi ha ịhụnanya, na ịmakụ ha ugboro ugboro n’ụzọ na-ekpo ọkụ.”

 [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ezinụlọ Ndị Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịmụ Ihe

Àgwà na omume ndị na-esonụ pụrụ inyere ezinụlọ gị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịmụ ihe:

▪ Iji ịhụnanya na-agwa ụmụaka mgbe nile na a na-atụ anya n’aka ha ịdị na-eme ihe ndị dị mma, bụ́ ndị ezi uche dị na ha

▪ Ile ịrụsi ọrụ ike anya dị ka isi ihe na-eweta ihe ịga nke ọma

▪ Ụzọ ndụ nke ịrụsi ọrụ ike, ọ bụghị nke ịnọ nkịtị

▪ Ụmụaka iji ọtụtụ awa na-amụ ihe n’ụlọ kwa izu nakwa ime ihe omume ndị na-agụnye ihe omume ụlọ akwụkwọ a na-eme n’ụlọ, iji ịgụ ihe atụrụ ndụ, igwuri egwu, ịrụ ọrụ ezinụlọ, na inweta ọzụzụ banyere ọrụ a na-arụ n’ụlọ

▪ Ile ezinụlọ anya dị ka ebe a na-enyerịta nkwado na ebe a na-edozi nsogbu

▪ Ime ka iwu ndị na-achịkwa ebe obibi doo anya, na ịhụ na a na-agbaso ha mgbe nile

▪ Iso ndị nkụzi na-ekwurịta okwu mgbe nile

▪ Ikwusi okwu ike banyere uto ime mmụọ

[Foto]

Ndị nne na nna, ùnu na-akụziri ụmụ unu ịnụ ụtọ ịgụ ihe?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ Eager to Learn—Helping Children Become Motivated and Love Learning.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ụzọ Ndị E Si Eme Ka Ịmụ Ihe Ka Mma Ma Dị Ụtọ Karị

Na-enwe Mmasị na Ya Ọ bụrụ na i tinye uche gị n’ihe, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịmụta ya. Akwụkwọ bụ́ Motivated Minds—Raising Children to Love Learning na-ekwu ihe na-esonụ: “Ndị nnyocha egosiwo n’ụzọ na-ehieghị ụzọ na mgbe ụmụaka na-amụ ihe n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ, ha na-aka amụ ihe n’ụzọ miri emi, n’ụzọ nwere nzube, nakwa n’ụzọ na-adịte aka. Ha na-akakwa anọgidesi ike na ya, na-echepụta ihe karị, na-enwekwu ọchịchọ ịrụ ọrụ ndị na-ama aka.”

Jiri Ihe Ị Na-amụ Tụnyere Ihe Ndị Na-eme Eme Onye edemede na ọkà nkụzi bụ́ Richard L. Weaver nke Abụọ na-ede, sị: “Mgbe i ji ihe ndị ị na-amụ na klas atụnyere ihe ndị ị hụworo ná ndụ gị, ọ na-adị ka mkpake ọkụ eletrik ò mere ka bọlb nwuo, ọ na-eme ka ị ghọta ya.”

Gbalịa Ịghọta Ya Mgbe ndị mmadụ gbalịrị ịghọta ihe, ha na-akpali ma ikike iche echiche ha ma ikike ncheta ha. Ikwughachi ihe ugboro ugboro iji na-echeta ya dịkwa mma n’ụzọ nke ya, ma a gaghị eji ya dochie anya ịghọta ihe. “Were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Tụkọba ya elu, ọ ga-ebulikwa gị,” ka Ilu 4:7, 8 na-ekwu.

Na-etinye Uche Gị na Ya “Itinye uche n’ihe bụ isi sekpụ ntị n’ịmụta ihe,” ka akwụkwọ bụ́ Teaching Your Child Concentration na-akọwa. “[Ọ] dị nnọọ mkpa nke na a kpọwo ya isi sekpụ ntị n’inwe ọgụgụ isi, ọbụna e kwuwo na ya na ọgụgụ isi hà nhata.” A pụrụ ịmụta itinye uche n’ihe amụta. Otu ụzọ bụ́ isi e si eme ya bụ iji mkpirikpi oge na-amụ ihe ná mmalite ma jirizie nke nta nke nta na-agbatị ya.

Kwuo Ya n’Ụzọ Ọzọ “Ụmụ akwụkwọ ndị kasị eme nke ọma bụ ndị nke kasị mara ụzọ ọzọ ha ga-esi kwuo ihe ha mụrụ,” ka Dr. Mel Levine na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ A Mind at a Time. Ikwu ihe n’ụzọ ọzọ na-eme ka ihe ọmụma bụrụ nke e gbubilatara n’ụzọ ndị dị nkenke, bụ́ ndị dị mfe ncheta. Ndị na-edetu ihe nke ọma na-eji ụkpụrụ a eme ihe site n’ịghara idetu ihe nile e kwuru n’ụzọ ahụ e si kwuo ya.

Jiri Ihe Ị Mụrụ Tụnyere Ihe Ị Dị Mbụ Mara N’akwụkwọ bụ́ The Brain Book, Peter Russell ji ikike ncheta tụnyere nkò ndị e kokwasịrị n’ihe ndị a dị mbụ mara. N’ikwu ya n’ụzọ dị nkenke, ị na-aka echeta ihe mgbe i ji nnọọ ihe ndị ị mụrụ ọhụrụ tụnyere ihe ndị ị dị mbụ mara. Ka ị na-ejikwu ihe ndị ị mụrụ atụnyere ihe ndị ị dị mbụ maara, otú ahụ ka ị ga na-echeta ihe nke ọma karị.

See Onyinyo Ya Ọ na-ara ahụ́ ichefu ihe e ji anya nke uche hụ. N’ihi ya, jiri anya nke uche see onyinyo ihe n’ebe o kwere mee. Ndị na-eme nnyocha banyere ikike ncheta na-eji usoro a eme ihe, ha na-ejikarị anya nke uche ha ese onyinyo ihe ndị gabigara ókè ma ọ bụ ndị na-atọ ọchị iji nyere ha aka icheta ihe.

Tụleghachi Ya N’ime awa 24, anyị pụrụ ichefu ihe ruru pasent 80 nke ihe anyị mụrụla. Site n’ịtụleghachi ihe n’ụzọ dị mkpirikpi ozugbo anyị mụsịrị ya, tụleghachikwa ya ọzọ otu ụbọchị, otu izu, otu ọnwa, na ọbụna ọnwa isii mgbe anyị mụsịrị ya, anyị ga-eme ka ikike ncheta anyị ka nnọọ mma, ọbụna na-eme ka ọ fọ obere ka anyị na-echeta ihe nile ahụ anyị mụrụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ndị nne na nna na ndị nkụzi kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji nyere ụmụntakịrị aka ịmụta ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ịka nká ekwesịghị igbochi mmadụ ịmụ ihe