Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị E Kere Ịmụta Ihe Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Ndị E Kere Ịmụta Ihe Ruo Mgbe Ebighị Ebi

 Ndị E Kere Ịmụta Ihe Ruo Mgbe Ebighị Ebi

“N’isi ọ bụla, e nwere isi injin dị egwu, akụkụ ahụ́ jikọrọ ejikọ nke na-arụ ọrụ nke ọma bụ́ nke ikike ya yiri ka ọ̀ na-agbasapụ n’ụzọ na-enweghị nsọtụ ka anyị na-amụkwu banyere ya.”—TONY BUZAN NA TERENCE DIXON, BỤ́ NDỊ NA-EDE IHE NDỊ METỤTARA SAYENSỊ.

ÓKÈ há aṅaa ka ụbụrụ mmadụ pụrụ ịmụtaru ihe? Ajụjụ ahụ anọgidewo na-akpali mmasị ndị nchọpụta ma na-agbagwoju ha anya. N’akwụkwọ bụ́ The Brain Book, Peter Russell na-ede, sị: “Ka a na-amụkwu banyere ụbụrụ mmadụ, otú ahụ ka a na-achọpụtakwu na ikike ya na ihe ndị ọ pụrụ ime karịrị nnọọ ihe ndị e kwuru na mbụ.”

Dị ka ihe atụ, a bịa n’icheta ihe, ụbụrụ anyị nwere ikike dị ukwuu. “Ike ncheta adịghị ka ite mmiri nke na-eji nwayọọ nwayọọ eju,” ka Russell na-ekwu, “ọ dịwagara ka osisi nke na-epupụtagasị alaka ndị nwere  nkò bụ́ ndị a na-ekonye ikike ncheta. Ihe ọ bụla i chetara bụ usoro nkò ndị ọzọ a pụrụ ikokwasị ikike ncheta ndị ọzọ. N’ihi ya, ikike ncheta na-anọgide na-eto eto. Ka ị na-amatakwu ihe, otú ahụ ka ikike ịmata ihe gị pụrụ ịsawanyekwa mbara.” Nke a na-eme ka anyị jụghachi ajụjụ ahụ anyị jụrụ mbụ, N’ihi gịnị ka ụbụrụ mmadụ ji nwee ikike dị ukwuu otú ahụ bụ́ nke a na-akpabedịghị aka?

Ozizi evolushọn adịghị enye azịza ezi uche dị na ya. N’ịbụ nke dabesiiri ike n’echiche nke agwọ ike kwere loo ibe ya, evolushọn na-eme ka ndị na-eche echiche nọgide ná mgbagwoju anya banyere ihe mere ụbụrụ mmadụ ji nwee nnọọ ikike dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, n’ihi gịnị ka ị ga-eji rụpụta nnukwu tipa ma ọ bụrụ na nanị ihe ị ga-eji ya buo bụ nnọọ otu shọvel ájá?

Otú ọ dị, Bible na-enye nkọwa dị mfe n’ụzọ na-enye ume ọhụrụ ma bụrụkwa nke ezi uche dị na ya. Nke mbụ, ọ na-agwa anyị na e kere nne na nna mbụ anyị—Adam na Iv—n’onyinyo Chineke, ka ha nwee ike igosipụta àgwà ndị dị ebube nke Chineke. Nke abụọ, ọ na-akọwa na e kere ha ịdị ndụ—nakwa ịmụta ihe—ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 1:27; 2:16, 17) Ụbụrụ mmadụ na-egosipụta nzube Chineke ahụ, n’agbanyeghị na, ka ọ dị ugbu a, ọ na-eme nke ahụ n’ụzọ n’ezughị okè n’ihi mbata mmehie batara n’ezinụlọ mmadụ.—Ndị Rom 5:12.

Ma, a ga-emezu nzube mbụ nke Chineke nke bụ́ na ụmụ mmadụ zuru okè ma na-atụ egwu Chineke, ga-ejupụta n’ụwa Paradaịs. N’ezie, Jehova nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị ka àjà mgbapụta n’ihi anyị ka anyị wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28; Jọn 3:16.

Nri Uche nke Kasị Mma

Jehova nyekwara anyị Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ. (2 Timoti 3:16; 2 Pita 1:21) Ebe ọ bụ na akwụkwọ a nke dị oké ọnụ ahịa sitere n’ike mmụọ nsọ, ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ikwu na o bu nri uche na nke ime mmụọ kasị mma nye ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 19:7-10) N’ezie, Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.”—Matiu 4:4.

Ya mere, ma ị̀ bụ nwata ma ị̀ bụ agadi, gịnị ma i wepụta obere oge kwa ụbọchị iji na-agụ ‘okwu’ dị oké ọnụ ahịa nke Chineke? Ndị na-eme otú ahụ ma na-etinye ihe ha na-amụta n’ọrụ ga-erite uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Ee, ha pụrụ inwe atụmanya nke ịdị ndụ na ịmụta ihe ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka Chineke zubere na mbụ. Lee olileanya magburu onwe ya nke ahụ bụ!—Eklisiastis 3:11; Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 11]

N’ịbụ nke na-egosipụta nzube Chineke, e kere ụbụrụ mmadụ ịmụta ihe ruo mgbe ebighị ebi

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Bible bu nri kasị mma maka uche gị