Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nchegbu Banyere Ọdịdị Ahụ́ Ghọrọ Ihe Na-echu Ụra

Mgbe Nchegbu Banyere Ọdịdị Ahụ́ Ghọrọ Ihe Na-echu Ụra

 Mgbe Nchegbu Banyere Ọdịdị Ahụ́ Ghọrọ Ihe Na-echu Ụra

MGBE ihe ka ọtụtụ n’ime anyị lere onwe anyị n’enyo, anyị na-ahụ ebe ndị anyị chere a pụrụ imeziwanye emeziwanye. Ya mere, anyị na-edozi uwe anyị ma ọ bụ ntutu anyị ma ọ bụ tee obere ihe ntecha tupu anyị amalite ọrụ dịịrị anyị n’ụbọchị. Nchegbu dị otú ahụ anyị na-enwe banyere ọdịdị ahụ́ anyị dị mma ma kwesị ekwesị. Ma nye ụfọdụ ndị, nchegbu ha na-enwe banyere otú ha dị n’ile anya na-agabiga ókè, na-eduga n’ọnọdụ ndị dọkịta na-ele anya dị ka ọrịa.

Akwụkwọ bụ́ The Merck Manual of Diagnosis and Therapy na-akọwa nsogbu a dị ka mmadụ “ichegbubiga onwe ya ókè banyere ebe na-adịzighị adịzi n’ahụ́ ya, bụ́ nke na-akpatara ya nchekasị dị ukwuu ma ọ bụ na-emetụta mmekọrịta ya na ndị ọzọ, ọrụ ya, ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ.” * Ebe ọ bụ na ndị nwere nsogbu ahụ nwere ike ichepụta echiche na e nwere ebe ndị na-adịzịghị adịzi n’ahụ́ ha, ma ọ bụ na-eme ka obere ntụpọ ha nwere n’ahụ́ ha yie oké ihe, otú ha si ele onwe ha anya abụwokwa nke a kpọrọ ịjọ njọ e chepụtara echepụta.

Prọfesọ J. Kevin Thompson bụ́ onye na-arụ ọrụ na Mahadum South Florida, nke dị na United States, na-ekwu na ikekwe a dịghị ahụkebe ọrịa a, “bụ́ nke na-emetụta ma eleghị anya 1 pasent ruo pasent 2 nke ndị na-arịa ọrịa uche nakwa pasent 10 ruo pasent 15 nke ndị ọrịa uche na-esi n’ụlọ abịa anara ọgwụgwọ.” Otú ọ dị, ọ na-agbakwụnye, sị: “Ụfọdụ ndị nchọpụta kweere na ndị nwere ọrịa a na-amụbawanye, ka usoro ndị e ji achọpụta ọrịa na-akawanye mma nakwa ka ọdịdị ahụ́ na-aghọ ọbụna ihe na-echuwanye ọha mmadụ ụra.” Ọ bụ ezie na ọnọdụ ahụ pụrụ imetụta ndị nọ n’afọ ndụ nile, ọ na-amalitekarị ná ndị nọ n’afọ iri na ụma. N’ebe ndị toworo eto nọ, o yiri ka ọ̀ na-emetụta ndị ikom na ndị inyom n’ụzọ há nhata. Nke a dị nnọọ iche n’ebe nsogbu iri ihe dị, bụ́ nke a na-ahụkarị nnọọ n’etiti ndị inyom.

Inwe oké nchegbu banyere ọdịdị ahụ́ n’ụzọ dị ize ndụ, bụ́ nke e ji mara ndị nwere nsogbu a, na-emekarị ka ha na-ele onwe ha n’enyo  mgbe nile, n’ọnọdụ ụfọdụ kwa, ọ na-eme ọbụna ka ha na-anọpụrụ onwe ha iche. Nke ka njọ bụ na “nchekasị na arụghị ọrụ nke ọma bụ́ ndị ha na nsogbu a na-agakọ pụrụ ime ka a na-enye mmadụ àkwà ugboro ugboro n’ụlọ ọgwụ, ọ pụkwara ime ka mmadụ na-eme omume ndị na-egosi na ọ chọrọ igbu onwe ya,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Merck Manual na-ekwu. Ọ bụghị ihe ijuanya na ụfọdụ ndị nwere nsogbu a na-achọ ka a waa ha ahụ́ iji mee ka ha makwuo mma. “Anaghị m atụrụ mmadụ aro ịwa ahụ́ iji mee ka ọ makwuo mma,” ka Dr Katharine Phillips, bụ́ onye deworo akwụkwọ banyere nsogbu a na-ekwu. “A pụghị imegharị ahụ́ a wara awa,” ka ọ na-akọwa, “ọ na-adịkarịkwa ihe ka ọtụtụ ná ndị nwere nsogbu a ka ọ dịghị ihe ahụ́ a wara ha rụrụ.” *

Mgbe ụfọdụ, nsogbu a na-apụtakarị ìhè mgbe mmadụ dị nnọọ obere. Akwụkwọ bụ́ George Street Journal * na-akọ banyere otu nwata nwoke dị afọ isii, “bụ́ onye kweere na ezé ya na-acha odo odo, na afọ ya ‘buru ibu,’ nakwa na ntutu ya adịghị mma. Ọ dịghị otu n’ime ebe ndị ahụ ‘na-adịzighị adịzi’ n’ahụ́ ya nke ndị ọzọ na-ahụ. Ọ na-eji ihe fọrọ nke nta ka o ruo otu awa abọ isi ya kwa ụtụtụ, ọ bụrụ na o dozighị ya otú ọ dị ya mma, o tinye isi ya na mmiri, malitekwa n’isi ịbọ ya, nke a na-emekarị ya ịga akwụkwọ n’azụ oge.” Otu ụbọchị, mgbe ọ bịarutere n’ọfịs onye dọkịta, ọbụna o hururu ala iji lee onwe ya n’otu ígwè na-egbuke egbuke nke dị n’elu oche.

Ekwela Ka Ụwa Na-achịkwa Àgwà Gị

A na-eji magazin ndị na-egbuke egbuke, akwụkwọ akụkọ, na mkpọsa ndị a na-eme na telivishọn egosigharị ndị mmadụ foto nke ndị ahụ́ ha bụ ịgba. Echiche ndị mkpọsa ngwá ahịa ahụ dị mfe: Gosi ndị mmadụ foto nke onye ahụ́ ya bụ ịgba, ha ga-amalite imefusị ego ha tara ahụhụ kpata iji nwee ụdị ahụ́ ahụ. Mgbe a tụkwasịrị ya nrụgide ndị ọgbọ na ikekwe okwu ole na ole ndị ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi na-echeghị eche kwuo, ọ naghị abụ ihe ijuanya na ụfọdụ ndị na-amalite inwe echiche na-ekwesịghị ekwesị banyere ọdịdị ahụ́ ha. * N’ezie, àgwà na-ekwesịghị ekwesị pụrụ ịdị nnọọ iche ná nsogbu uche nke na-aghọ ihe na-echu ụra.

Ọ bụ ma ụgha ma ihe na-adịghị otú kwesịrịnụ iche na ọ bụrụ na ị maghị mma, na ndị ọzọ agaghị enwe mmasị n’ebe ị nọ. Ndị mmadụ adịghị ahọrọkarị ndị enyi dabere n’ọdịdị ahụ́ ha. N’eziokwu, ọdịdị ahụ́ pụrụ ịdị mkpa ná mmalite, ma àgwà, ụkpụrụ omume, na ihe ndị e ji kpọrọ ihe bụ ihe ndị na-ejikọ ọbụbụenyi n’ezie. N’ụzọ ụfọdụ, a pụrụ iji onye nke ọ bụla n’ime anyị tụnyere akwụkwọ—akwụkwọ pụrụ inwe mkpo na-adọrọ mmasị, ma ọ bụrụ na ihe ndị dị n’ime ya adịghị adọrọ mmasị, ndị na-agụ ya ga-atọgbọ ya ozugbo. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú mkpo akwụkwọ dị, ọ bụrụ na ihe ndị dị n’ime ya na-atọgbu onwe ya, ndị mmadụ ga na-agụ ya. N’ihi ya, gịnị ma i lekwasị anya n’àgwà ndị i nwere dị ka mmadụ? Nke ahụ bụ ihe Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-agba gị ume ime.—Ilu 11:22; Ndị Kọlọsị 3:8; 1 Pita 3:3, 4.

N’ikwu ya n’ezoghị ọnụ, ọdịdị ahụ́ anyị na-agbanwe ka anyị na-emewanye okenye. Ọ bụrụ na ndụ, ọbụbụenyi, na obi ụtọ anyị dabeere n’ezigbo ọdịdị ahụ́ a na-enwe n’oge ntorobịa, lee nnọọ ọdịnihu dị mwute anyị nile ga-enwe! Ma, ọnọdụ anyị pụrụ ịdị nnọọ iche. Ọ̀ ga-esi aṅaa dị otú ahụ?

Mma nke Ga-adịgide Adịgide

Ilu 16:31 na-ekwu, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” N’anya Jehova Chineke—nakwa n’anya ndị nile nwere echiche ya—ndị nọgidere na-ejere Chineke ozi ruo n’agadi ha adịghị aghọ ndị na-adịkwaghị adọrọcha mmasị. N’eziokwu, n’ihi ihe ndekọ ịnụ ọkụ n’obi na nsọpụrụ Chineke ha nwere, a pụrụ iji isi awọ ha tụnyere okpueze nke mara mma. Ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa kwesịrị ka anyị hụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù miri emi.—Levitikọs 19:32.

Ọzọkwa, n’ụwa ọhụrụ nke Jehova kwere nkwa ya n’ọdịnihu, ọ ga-emezi ihe nile mmehie e ketara eketa mebiworo n’ahụ́ ndị ya nile na-eguzosi ike n’ihe, ndị nta na ndị ukwuu. N’ụbọchị ọ bụla gaferenụ, ha ga-ahụ ka ahụ́ ha na-akawanye mma ruo mgbe ha bịara zuo okè n’ụzọ anụ ahụ́ n’ikpeazụ. (Job 33:25; Mkpughe 21:3, 4) Lee nnọọ atụmanya na-akpali akpali nke ahụ bụ! Ọ̀ ga-amasị gị iso ná ndị ga-enweta ya? Ọ bụrụ otú ahụ, gbalịsie ike ilekwasị anya ná mma nke dị mkpa n’ezie, ekwekwala ka echiche na-enweghị isi na nke obi ọjọọ nke ụwa, na-achịkwa àgwà gị. Ị ga-abụ onye nwere obi ụtọ ka ukwuu na onye na-adọrọ mmasị karị, n’ihi ime otú ahụ.—Ilu 31:30.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 “Ichegbubiga onwe onye ókè banyere ọdịdị ahụ́ bụ ihe mgbaàmà bụ́ isi nke ọtụtụ nsogbu uche,” ka akwụkwọ bụ́ The Medical Journal of Australia na-ekwu. Ha na-agụnye ịda mbà n’obi, nsogbu nke mmadụ enweghị ike ịchịkwa echiche na àgwà ya, na nsogbu iri nri, dị ka erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu. N’ihi ya, ọrịa a pụrụ isi ike nchọpụta.

^ par. 5 Biko lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Na-ajụ Sị . . . Èkwesịrị M Ịwa Ahụ́ Iji Makwuo Mma?” ná mbipụta (Bekee) nke August 22, 2002, nke magazin a. N’ezie, ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye nwere ajọ nsogbu uche gaa hụ ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike uche maka enyemaka.

^ par. 6 Mbipụta nke Mahadum Brown, nke dị na Rhode Island, U.S.A.

^ par. 8 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko lee isiokwu bụ́ “Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọdịdị Dị Mkpa?” n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.