Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?

“Mgbe ụfọdụ, ana m eche ma inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye ọ̀ dị njọ otú ahụ n’ezie, karịsịa mgbe ọ dị m ka m gbapụrụ iche ebe m na-amabeghị nwanyị.”—Jordon. *

“Ọ na-adị m ka m chọpụta otú inwe mmekọahụ na-adị. Echere m na anyị nile nwere mmetụta ebumpụta ụwa nke ịchọ ịmata otú ọ na-adị,” ka Kelly na-ekwu. “Ebe ọ bụla ị gara,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “ihe ị na-ahụ bụ ihe metụtara mmekọahụ!”

Ọ̀ NA-ADỊ gị otú ahụ ọ dị Jordon na Kelly? E kwuwerị, omenala na ụkpụrụ oge ochie bụ́ ndị katọburu inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, emichawala ala. (Ndị Hibru 13:4) Otu nnyocha e mere n’otu mba dị n’Eshia kpughere na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ikom dị afọ 15 ruo 24 chere na inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye abụghị nanị na ọ bụ ihe a na-anakwere kamakwa na ọ bụ ihe a na-atụ anya n’aka ha. Ka a sịkwa ihe mere na n’ụwa nile, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto enwewo mmekọahụ tupu ha eruo afọ 19.

E nwekwara ndị ntorobịa na-ezere inwe mmekọahụ ma na-eme ihe ndị ọzọ iji na-emejụ agụụ mmekọahụ ha, dị ka ịpị ma ọ bụ ịrụnye ibe ha aka n’akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Otu akụkọ na-enye nsogbu n’obi nke gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekpughe na “iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aghọwo ụzọ e sikarị amalite inwe mmekọahụ, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-eto eto na-ele anya dị ka nke na-agamighị agami na nke na-adịrughị ize ndụ ka mmekọahụ. . . [nakwa] dị ka ụzọ isi zere ibute ime na ụzọ isi nọgide bụrụ ndị na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị.”

Olee nnọọ otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-ele mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye anya? Gịnịkwanụ banyere ihe ndị a sị na ha bụ ihe e ji edochi anya mmekọahụ? Chineke ọ̀ na-anabata ha? Hà bụ ndị na-adịghị ize ndụ? Hà na-eme n’ezie ka mmadụ bụrụ onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị?

Ihe Ịkwa Iko Na-agụnye

Ebe a pụrụ isi nweta azịza bụ́ ịgba nye ajụjụ ndị a bụ nanị site n’aka Onye Okike anyị—Jehova Chineke. N’Okwu ya kwa, ọ na-agwa anyị ka anyị ‘gbanahụ ịkwa iko.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Gịnị kpọmkwem ka nke ahụ pụtara? Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ịkwa iko” apụtaghị nanị mmekọahụ kama ọ na-agụnye ụdị dịgasị iche iche nke omume rụrụ arụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye na-apịtụgharị ibe ha aka n’akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ma ọ bụkwanụ jiri ọnụ na-amị ya, ikpe ịkwa iko amala ha.

Ma à ka pụrụ ịnọgide na-ele ha anya dị ka ndị na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị—ya bụ, n’anya Chineke? N’ime Bible, a na-eji okwu ahụ bụ́ “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke” eme ihe dị ka ihe nnọchianya nke ịdị ọcha n’omume. (2 Ndị Kọrint 11:2-6) Ma, a na-ejikwa ya eme ihe n’ụzọ anụ ahụ́. Bible na-akọ banyere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ribeka. Ọ na-ekwu na ọ bụ “nwanyị nke aka-amaghị nwoke, nwoke amaghịkwa ahụ́ ya.” (Jenesis 24:16)  Ọ dị mma ịmara na n’asụsụ Hibru mbụ, ihe àmà na-egosi na okwu e ji eme ihe maka “mmekọahụ” gụnyere ihe ndị ọzọ ma e wezụga mmekọahụ nke nwoke na nwanyị. (Jenesis 19:5) Ya mere, dị ka Bible si kwuo, ọ bụrụ na onye ntorobịa etinye aka n’ụdị ọ bụla nke ịkwa iko, a gaghị ele ya anya dị ka onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị.

Bible na-agba Ndị Kraịst ume ịgbanahụ, ọ bụghị nanị ịkwa iko n’onwe ya kamakwa, ụdị nile nke omume na-adịghị ọcha bụ́ ndị pụrụ iduba mmadụ na ya. * (Ndị Kọlọsi 3:5) Ndị ọzọ pụrụ ịkwa gị emo maka iwere nguzo dị otú ahụ. “‘Ị maghị ihe na-akwa gị!’ bụ ihe m nọ na-anụ n’oge nile m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị,” ka otu onye ntorobịa bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Kelly na-ekwu. Otú ọ dị, inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye abụghị ihe ọzọ karịa “ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.” (Ndị Hibru 11:25) Ọ pụrụ ịkpata mmerụ ahụ́ na-adịgide adịgide n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị Oké Njọ

Bible na-agwa anyị na, n’otu oge, Eze Solomọn hụrụ otu nwa okorobịa nke a na-araba n’ịkwa iko mgbe ọ na-alụbeghị nwunye. Solomọn ji nwa okorobịa ahụ tụnyere ‘ehi nke na-abịa n’ogbugbu ya.’ Ehi a na-aga igbu egbu na-eyi ka ọ naghịdị ama ihe na-aga ime ya. Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-akpakarị àgwà n’ụzọ yiri nke ahụ—ọ na-eyi ka ha anaghị ama na e nwere ihe ndị dị oké njọ omume ha ga-arụpụta! Solomọn kwuru banyere nwa okorobịa ahụ, sị: “Ọ maghị na imegide ndụ ya ka ọ bụ.” (Ilu 7:22, 23) Ee, ndụ gị nọ n’ihe ize ndụ.

Dị ka ihe atụ, kwa afọ, ọtụtụ nde ndị ntorobịa na-ebute ọrịa site ná mmekọahụ. “Mgbe m chọpụtara na m bu ọrịa herpes, achọrọ m ịgbafu,” ka Lydia na-ekwu. Ọ kwara arịrị, sị, “Ọ bụ ọrịa na-egbu mgbu nke na-agaghị ala ala.” Ihe karịrị ọkara nke ndị ọhụrụ na-ebute nje HIV n’ụwa nile (mmadụ 6,000 kwa ụbọchị) bụ ndị nọ n’agbata afọ 15 na afọ 24.

Ọtụtụ nsogbu ndị ha na inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye so aga na-aka emetụta ụmụ nwanyị. N’ezie, ohere nke ibute ọrịa (gụnyere nje HIV) site ná mmekọahụ na-adị elu n’ebe ụmụ nwanyị nọ karịa n’ebe ụmụ nwoke nọ. Ọ bụrụ na nwa agbọghọ adị ime, ọ na-etinye onwe ya na nwa o bu n’afọ n’ọnọdụ dịkwu ize ndụ. N’ihi gịnị? N’ihi na nwa agbọghọ nwere ike o tozubeghị ruo n’ókè nke ịmụ nwa n’enweghị nsogbu.

Ọ bụrụgodị na nne nọ n’afọ iri na ụma enwetaghị nsogbu ahụ́ ike dị njọ, ọ ghaghị iche oké  ibu ọrụ ndị ịzụlite nwa na-eweta, ihu. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-achọpụta na ịkpa afọ ha na nke nwa ha mụrụ ọhụrụ siri nnọọ ike karịa ka ha cheburu.

E nwekwara nsogbu ime mmụọ na nke mmetụta uche ha na-akpata. Mmehie ịkwa iko nke Eze Devid mebiri ọbụbụenyi ya na Chineke ma fọ nke nta ka ọ laa ya n’iyi n’ụzọ ime mmụọ. (Abụ Ọma nke 51) N’agbanyeghịkwa na Devid gbakere n’ụzọ ime mmụọ, ọ tara ahụhụ maka ihe si ná mmehie ya pụta ruo afọ ndụ ya fọdụrụnụ.

Ndị na-eto eto taa pụrụ ịta ahụhụ yiri nke ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Cherie dị nanị afọ 17, ọ bịara soro otu nwa okorobịa na-enwe mmekọahụ. O chere na nwa okorobịa ahụ hụrụ ya n’anya. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, ọ ka na-akwa ụta maka omume ya. Ọ na-akwa arịrị, sị: “Ejighị m eziokwu Bible kpọrọ ihe, atakwara m ahụhụ ihe si na ya pụta. Ihu ọma Jehova funahụrụ m, nke ahụ bụkwaara m ọdachi.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Trish na-ekweta n’ụzọ yiri nke ahụ, sị: “Inwe mmekọahụ mgbe m na-alụbeghị di bụ nke kasịnụ n’ihe ndị m mehiere ná ndụ m. Aga m eme ihe ọ bụla nanị iji bụrụghachi nwanyị na-amaghị nwoke.” Ee, obi amamikpe pụrụ ịdịgide ruo ọtụtụ afọ, na-akpata nchekasị na obi mgbawa.

Ịmụta Inwe Njide Onwe Onye

Nwa agbọghọ bụ́ Shanda jụrụ otu ajụjụ dị mkpa, “Gịnị mere Chineke ji kenye ndị na-eto eto ọchịchọ nke inwe mmekọahụ, ebe ọ maara na ha ekwesịghị imejụ ya, ọ gwụla ma hà lụrụ di ma ọ bụ nwunye?” Ọ bụ eziokwu na agụụ mmekọahụ pụrụ ịka njọ karịsịa ná “ntoju ntorobịa.” (1 Ndị Kọrint 7:36) N’ezie, ndị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ inwe agụụ mmekọahụ na mberede n’enweghị ihe a maara kpatara ya. Ma nke a adịghị njọ. Ọ bụ akụkụ nke uto dị otú kwesịrịnụ nke akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. *

Ọ bụkwa eziokwu na Jehova mere ka mmekọahụ bụrụ ihe na-atọ ụtọ. Nke a kwekọrọ ná nzube mbụ ya bụ́ ka ụmụ mmadụ mụọ ọmụmụ jupụta ụwa. (Jenesis 1:28) Otú o sina dị, ọ dịghị mgbe Chineke zubere ka anyị jiri ikike ọmụmụ anyị mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ,” ka Bible na-ekwu. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:4) N’otu echiche, imejụ agụụ mmekọahụ ọ bụla i nwere ga-abụ nzuzu dị nnọọ ka iti mmadụ ihe mgbe ọ bụla iwe were gị bụ nzuzu.

Mmekọahụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, onyinye nke e kwesịrị ịnụ ụtọ ya mgbe oge ya ruru—mgbe mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Olee otú ọ na-adị Chineke mgbe anyị nwara inwe mmekọahụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye? Were ya na ị zụtaara otu enyi gị onyinye. Tupu i nye ya onyinye ahụ, ya ezuru ya! Ọ́ gaghị ewe gị iwe? Mgbe ahụ, chegodị echiche otú ọ na-adị Chineke mgbe mmadụ na-enwe mmekọahụ n’oge ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, na-eji onyinye Chineke nyere ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

Gịnị ka i kwesịrị ime banyere agụụ mmekọahụ ị na-enwe? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, mụta ịchịkwa ya. Chetara onwe gị na ‘Jehova agaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ.’ (Abụ Ọma 84:11) “Mgbe m malitere iche na inwe mmekọahụ tupu m lụọ nwanyị agaghị adịcha njọ otú ahụ,” ka otu nwa okorobịa aha ya bụ Gordon na-ekwu, “ana m atụgharị uche n’ọdachi ime mmụọ ndị ọ na-akpata ma na-echeta na ọ dịghị mmehie ruru iji maka ya mebie mmekọrịta mụ na Jehova.” Inwe njide onwe onye nwere ike ghara ịdị mfe. Ma dị ka nwa okorobịa bụ́ Adrian na-echetara anyị, “ọ na-eme ka i nwee akọ na uche dị ọcha ma soro Jehova na-enwe ezi mmekọrịta, gị enwere onwe gị ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa, n’abụghị onye na-enwe obi amamikpe ma ọ bụ na-akwa ụta maka ihe ndị i mere n’oge gara aga.”—Abụ Ọma 16:11.

E nwere ọtụtụ ezi ihe mere ị ga-eji “na-asọ ịkwa iko asọ” n’ụdị ya nile. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) Nke bụ́ eziokwu bụ na nke a anaghị adị mfe mgbe nile. Isiokwu na-abịa n’ihu ga-atụle ụzọ ndị dị irè ị pụrụ isi ‘chebe ịdị ọcha gị.’—1 Timoti 5:22.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.

^ par. 11 Iji nweta ebe a tụlere banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, na agụụ ịkwa iko, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Ebee Ka A Ga-eru Ya Abụrụ na ‘A Gafeela Ókè’?” bụ́ nke pụtara ná mbipụta Teta! (Bekee) nke October 22, 1993.

^ par. 20 Lee “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka nke a Ji Na-eme n’Ahụ M?” ná mbipụta anyị nke July 8, 1991.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Ọ bụrụ na onye ntorobịa etinye aka n’ụdị ọ bụla nke ịkwa iko, Chineke ọ̀ pụrụ ile ya anya dị ka onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị?

[Foto dị na peeji nke 15]

Inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye pụrụ imebi akọ na uche nke onye ntorobịa na-atụ egwu Chineke

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndị na-enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ibute ọrịa site ná mmekọahụ