Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchụso Udo n’Ebe Ọrụ

Ịchụso Udo n’Ebe Ọrụ

 Ịchụso Udo n’Ebe Ọrụ

N’ IHI gịnị ka ụfọdụ mmadụ na-eji amaja ndị ọzọ? Bible na-eme ka anyị ghọta ihe kpatara ya. Ọ na-akọwa na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a nakwa na ọ bụ ya mere anyị ji na-enwe “oge pụrụ iche nke siri ike obibi.” Ọtụtụ mmadụ bụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” (2 Timoti 3:1-5) N’oge a jupụtara ná nsogbu, àgwà dị otú ahụ jupụtara ebe nile, imekpọ mmadụ ọnụ sokwa n’ihe ndị dị ilu ọ na-akpata. Oleezinụ otú ị pụrụ isi na-achụso udo n’ebe ọrụ?

Idozi Esemokwu

Mmaja na-amalitekarị mgbe onye ọrụ na ibe ya nwere esemokwu ha na-edozighị. N’ihi ya, n’abụghị onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ, mee ihe ozugbo iji dozie nghọtahie ndị gbasara gị. Jiri akọ na nkwanye ùgwù mee ka obi dajụọ onye na-ewesa gị iwe. Na-emeso ndị ọrụ ibe gị ihe n’otu n’otu, ọ bụghị dị ka otu ìgwè. Ọ bụrụ na o yiri ka ọ dị onye na-ewesa gị iwe, gbalịa idozi nsogbu ahụ. Buru n’uche ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Na-adị njikere idozi okwu ọsọ ọsọ n’etiti gị na onye na-eme mkpesa megide gị.”—Matiu 5:25.

Ọzọkwa, onye ọ bụla na-erite uru site n’ime ka ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe. N’ihi ya, gbalịa ịdị na-eso onyeisi gị enwe nkwurịta okwu dị mma n’enyeghị echiche na ị na-anwa irite ihe n’aka ya. Chetakwa na isoro  ndị ọgbọ gị na ndị nọ n’okpuru gị na-enwe ezi nkwurịta okwu ga-arụ ọrụ dị ka ihe na-akwụsị nrụgide. Eze Solomọn dere, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị: ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.”—Ilu 15:22.

Ya mere, mee mgbalị nile i nwere ike ime iji soro ndị ọrụ ibe gị na-adị ná mma. Nke a apụtaghị ịbụ “onye na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ,” na-ekwenye nnọọ n’ihe ọ bụla a sịrị gị mee ma na-emebi ụkpụrụ gị nanị iji mee ka udo dịrị. Ma àgwà enyi pụrụ idozi ọnọdụ na-adịghị mma. Kpachara anya, ọ bụghị nanị banyere ihe ị na-agwa ndị ọzọ kamakwa banyere otú i si agwa ha ya. Ọzọkwa, Bible na-enye ndụmọdụ ezi uche dị na ya: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.” (Ilu 15:1) “Ire nke na-agwọ mmadụ bụ osisi na-enye ndụ.” (Ilu 15:4) “Site n’eweghị iwe ọsọ ọsọ ka a na-aranye onyeisi.” (Ilu 25:15) “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

‘Ka Inwe Ezi Uche Unu Bụrụ nke A Maara’

Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst nọ na Filipaị ọdụ, sị: “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara.” (Ndị Filipaị 4:5) N’ịgbaso ụkpụrụ a, setịpụrụ onwe gị ụkpụrụ omume ezi uche dị na ya. Zere inwebiga obi ike ókè ma ọ bụ ime ihere gabiga ókè. Ọ bụrụ na ndị ọrụ ibe gị achọọ gị okwu, anwala ime ka a mara mbe abụọ nke bụ́ oké site n’ịchọgwara ha okwu. Ọ dịghị uru ị ga-erite site n’ịgwagbu ókè dị n’etiti àgwà ọma na àgwà ọjọọ. Jiri ùgwù na nsọpụrụ na-emeso ndị ọzọ ihe, o yikarịkwara ka à ga-esi otú ahụ emeso gị ihe.

Chebara, ọ bụghị nanị omume gị echiche kamakwa ejiji gị. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú a na-esi ele uwe m anya? Ọdịdị m ọ̀ na-akpali agụụ mmekọahụ? M̀ na-adị gháá ghàà gháá n’anya? Ọ̀ ga-adị mma ka m na-agbaso ụkpụrụ ezi uche dị na ya n’ihe banyere uwe ọrụ?’

N’ọtụtụ obodo, a na-akwanyere ndị na-arụ ọrụ nke ọma ùgwù ma na-eji ha akpọrọ ihe nke ukwuu. N’ihi ya, gbalịa inweta ùgwù site n’ịdị na-arụ ọrụ bụ́ ọkpọka. Bụrụ onye a pụrụ ịdabere na ya na onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Nke a apụtaghị ịchọ ịrụ ọrụ nile n’ụzọ zuru okè. Otu nwanyị nke a majara mesịrị kweta na ya so kpata ọdịda ya. “Achọrọ m izu okè,” ka ọ na-ekwu. Nwanyị a bịara ghọta na izu okè bụ ihe mgbaru ọsọ na-agaghị ekwe omume: “Abụ m ezigbo onye ọrụ, ma ọ dịghị m mkpa ime ihe nile n’ụzọ zuru okè.”

Abụla onye na-ewekarị iwe mgbe ọ bụla a gwara gị okwu ọjọọ. Ọ bụghị okwu ọjọọ nile bụ mmaja. N’ime Bible, Eze Solomọn dere, sị: “Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị . . . Ọzọ, atụkwasịla obi gị n’okwu nile a na-ekwu; . . . n’ihi na ọtụtụ mgbe obi gị mawooro na gị onwe gị akọchawo ndị ọzọ.”—Eklisiastis 7:9, 21, 22.

 N’ezie, ịgbaso ụkpụrụ ndị ahụ ezi uche dị na ha adịghị eme ka i jide n’aka na ọ dịghị mgbe a ga-amaja gị. N’agbanyeghị mgbalị ndị kasị mma ị na-eme, ụfọdụ ndị ọrụ ibe gị ka pụkwara ịmaja gị. Gịnịzi ka ị ga-eme?

Chọọ Nkwado

“Mgbe a na-atụpụghịrị m ọnụ ruo ọtụtụ ọnwa, ọ kpataara m nchegbu dị ukwuu,” ka Gregory na-ekweta. Ahụmahụ ya yiri nke ndị a na-emegbu, bụ́ ndị na-enwe mmetụta ndị na-egbu mgbu—iwe, obi amamikpe, ihere, uche mkpasasị, tinyere mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe. Nrụgide nke ịbụ onye a na-amaja pụrụ ime ka ọbụna onye ahụ́ dị mma nwee nkụda mmụọ. N’ezie, Bible na-ekwu na “mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) Ya mere, gịnị ka a pụrụ ime?

Nnyocha e mere na-egosi na ọ kasị mma mmadụ ịghara idozi nsogbu nke mmaja nanị ya. Olee ebe onye a na-amaja pụrụ inweta nkwado? Ụfọdụ nnukwu ụlọ ọrụ eguzobewo ụzọ ha si enyere ndị ọrụ ha aka bụ́ ndị na-eche na a na-amaja ha. Ụlọ ọrụ dị otú ahụ maara na ikpochapụ mmaja ga-abara ha onwe ha uru dị ukwuu. Dị ka otu atụmatụ e mere si dị, ndị ọrụ bụ́ ndị na-amaja ndị ọrụ ibe ha na-enwe ihe ndọpụ uche ruo pasent 10 nke oge ọrụ. N’ebe ọ bụla e nwere ndokwa dị otú ahụ, onye a na-amaja pụrụ ịchọ enyemaka n’ebe ahụ. Onye ndụmọdụ na-akwụghị n’akụkụ nke ọ bụla—ma ò si n’ụlọ ọrụ ahụ ma ò si n’ebe ọzọ—pụrụ ime ka ndị nile okwu ahụ metụtara nwee ohere ikwurịta ọnọdụ ahụ ma tụpụta ụkpụrụ omume ndị a ga na-agbaso n’ebe ọrụ.

Ọ Dịghị Ihe Ngwọta Zuru Okè

N’ezie, a ghaghị ikweta na e nweghị ihe ngwọta zuru okè maka mmaja. Ọbụna ndị na-etinye ụkpụrụ Bible ndị e depụtara n’isiokwu a n’ọrụ pụrụ ịchọpụta na a ka na-emegbu ha n’ebe ọrụ. Ndị dị otú ahụ pụrụ ijide n’aka na Jehova Chineke na-ahụ ntachi obi ha na mgbalị ndị ha na-eme igosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke n’oge ihe isi ike.—2 Ihe E Mere 16:9; Jeremaịa 17:10.

Dabere n’ókè mmegbu ahụ haruru na ugboro ole a na-eme ya, ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ a na-ahọrọ ịchọrọ ọrụ ebe ọzọ. Ndị ọzọ enwechaghị ihe ha pụrụ ime, ebe ọ bụ na ọrụ pụrụ ịdị ụkọ, ebe ndị a pụrụ inweta enyemaka pụkwara ịdị ole na ole. Monika, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bụ ụzọ, chọpụtara na, ka oge na-aga, nsogbu ahụ kwụsịrị mgbe otu n’ime ndị bụ́ isi sekpụ ntị ná mmaja ahụ hapụrụ ụlọ ọrụ ahụ. N’ihi ya, a bịara nwetụ udo n’ụlọ ọrụ ahụ, ọ mụchapụkwara ọrụ ahụ ọ na-amụ tupu ya ekpebie ịga chọrọ ọrụ ebe ọzọ.

Peter, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu nke mbụ, nwetara ahụ́ efe zuru ezu site n’ịla ezumike nká n’oge. Otú ọ dị, ọbụna mgbe Peter nọ na-edi mmaja, o ritere uru ná nkwado nke nwunye ya nyere ya. “Ọ maara ihe mụ na ya nọ na-alụ, o nyekwara m nkwado dị ukwuu,” ka Peter na-ekwu. Mgbe ha na-edi ọnwụnwa ha, Monika na Peter nwetara nkasi obi pụrụ iche site n’okwukwe ha dị ka Ndịàmà Jehova. Ikere òkè n’ozi ha na-eje maka ọha mere ka ha nwekwuo ùgwù onwe onye, ebe iso ndị kwere ekwe ibe ha na-akpakọrịta mesighachiri ha obi ike na ọbụbụenyi ha kwụ chịm.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ọnọdụ gị, mee ihe nile ị pụrụ ime iji hụ na gị na ndị ọzọ dị ná mma n’ebe ọrụ. Ọ bụrụ na a majaa gị, gbalịsie ike ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo. . . . Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17-21.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Àgwà enyi pụrụ idozi ọnọdụ na-adịghị mma

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.”—NDỊ ROM 12:18

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Na-edozi nghọtahie nke dị n’etiti gị na mmadụ ozugbo