Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eti Mkpu Maka Mgbanwe Hà Ga-agwọta Nsogbu Ndị E Nwere?

Ndị Na-eti Mkpu Maka Mgbanwe Hà Ga-agwọta Nsogbu Ndị E Nwere?

 Ndị Na-eti Mkpu Maka Mgbanwe Hà Ga-agwọta Nsogbu Ndị E Nwere?

IGWU wayo n’azụmahịa, ikpe mkpegbu, mmegbu, usoro na-adịghị mma e si elekọta ahụ́ ike, usoro agụmakwụkwọ na-erijughị afọ, irigbu ndị mmadụ n’aha okpukpe, na ibibi gburugburu ebe obibi n’ihi uru ego—ndị a bụ ihe ndị na-eme ka ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-ama sọ ọsụ. Ha bụkwa ihe ndị na-akpali ndị mmadụ iti mkpu maka mgbanwe.

A na-ahụ ndị na-eti mkpu maka mgbanwe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’obodo nile, bụ́ ebe ha na-agba ume ka e mee mgbanwe n’ụzọ dị n’usoro ma kwekọọ n’iwu. N’ozuzu, ha abụghị ndị na-akpali ọgba aghara megide ọchịchị ma ọ bụ ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ha adịghị agabiga ihe iwu kwuru, ha na-ezerekwa ime ihe ike. Mmadụ ole na ole n’ime ndị na-eti mkpu maka mgbanwe nọ n’ọkwá ndị dị elu n’obodo, ha na-ebutekwa ụzọ n’iweta mgbanwe. Ndị ọzọ na-anwa inweta obi ndị ọchịchị na ịgba ha ume ime ihe ụfọdụ.

Ndị na-eti mkpu maka mgbanwe na-agbalị ime ka ọha na eze chebaghachi echiche n’ụzọ ha si elebara okwu ụfọdụ anya. Ha adịghị eme nanị mkpesa; ha na-enwe echiche ụfọdụ banyere otú a ga-esi mee ka ihe ka mma. Iji mee ka a mara nchegbu ha, ha pụrụ ịrịọ ọha na eze arịrịọ maka nkwado ha, mee ngagharị iwe n’okporo ámá, ma ọ bụ jiri usoro mgbasa ozi kpọsaa echiche ha. Otu n’ime ihe ndị kasị njọ bụ́ ndị pụrụ ime onye na-eti mkpu maka mgbanwe bụ ọha mmadụ ileghara ya anya.

Ndị Mgbanwe n’Akụkọ Ihe Mere Eme

E nwewo ọtụtụ mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme. Bible na-agwa anyị na n’ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, otu ọkà okwu  ihu ọha ji okwu ndị a jaa Filiks, bụ́ onye ọchịchị nke ógbè Rom bụ́ Judia, mma: “Mgbanwe dị iche iche [na-ewere] ọnọdụ ná mba a site n’echiche ị na-echepụ n’ihu.” (Ọrụ 24:2) N’ihe dị ka afọ 500 tupu Filiks, otu onye so ná ndị omeiwu Gris bụ́ Solon mere ka e mee mgbanwe ụfọdụ iji mee ka ọnọdụ ụmụ ogbenye ka mma. Solon “wetara ihe ọjọọ kasịnụ, bụ́ ịda ogbenye, ná njedebe” n’Atens oge ochie, ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-akọwa.

A kọrọ banyere ọtụtụ ndị tiri mkpu maka mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe. Dị ka ihe atụ, Martin Luther nwara ịgbanwe Chọọchị Roman Katọlik, ihe ndị o mere nyekwara aka mee ka e guzobe okpukpe Protestant.

Ókè A Na-ekwu Ka E Meruo Mgbanwe

Ndị na-eti mkpu maka mgbanwe pụkwara ịnwa ịgbanwe ihe nkịtị na ihe ndị na-adịghị ihe ha bụ. Ụfọdụ ndị na-eti mkpu ka e mee mgbanwe gaa n’ụdị ndụ dịwagara nnọọ iche. Otú ahụ ka òtù Lebensreform (mgbanwe nke ụzọ ndụ), bụ́ nke e nwere na Germany ná mmalite narị afọ nke 20, mere. Ka obodo dị iche iche na-emepewanye anya, ọtụtụ ndị bịara chee na ndụ aghọọla nke a na-adịghị echebara mmetụta ndị mmadụ echiche na nke na-eme ka mmadụ na-eche na ọ dịghịzi ihe ya bụ. Ndị na-eti mkpu maka mgbanwe bịara na-ekwu ka a maliteghachi ibi ụdị ndụ e bu pụta ụwa. Ha kwalitere inwe ezi ahụ́ ike, mmadụ ịpụ gaa chụrụ afọ ya, iji ihe ndị sitere n’okike agwọ ọrịa, na iri nanị ihe ndị e nwetara n’ugbo.

Ndị ọzọ na-eti mkpu maka mgbanwe na-agba ikpe na-ezighị ezi n’anwụ ma na-afụ gọọmenti ọkụ n’ikè idozi ọnọdụ ahụ. Kemgbe mmalite afọ ndị 1970, ìgwè ndị na-akwalite ọdịmma nke gburugburu ebe obibi emewo mkpesa megide mmetọ a na-emetọ gburugburu ebe obibi na mmebi ọ na-emebi. Ụfọdụ n’ime òtù ndị a etoola kemgbe ma ghọọ òtù ndị zuru ụwa ọnụ. Ndị nọ na ha na-eme ihe karịrị ime ngagharị iwe na ime mkpesa megide ihe ndị na-emebi gburugburu ebe obibi. Ha na-atụkwa aro banyere ụzọ a ga-esi dozie ọnọdụ ahụ. Ha enyewo aka mee ka a gbanwee iwu ndị metụtara ịwụnye ihe ndị na-egbu egbu n’oké osimiri na igbu azụ̀ whale, nakwa iwu ndị metụtara ihe ndị ọzọ.

N’afọ ndị 1960, Nzukọ Vatican nke Abụọ malitere ime mgbanwe na Chọọchị Roman Katọlik. N’afọ ndị 1990, ụfọdụ ndị aghasa nke Chọọchị Katọlik ghọkwara ndị na-achọ ka e mee mgbanwe. Dị ka ihe atụ, ha tụrụ aro ka e mee mgbanwe n’okwu metụtara ọnọdụ nke ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ndị na-eti mkpu maka mgbanwe n’ime Chọọchị England, mere ka e mee mgbanwe bụ́ nke kwere ka a na-echi ụmụ nwanyị ụkọchukwu.

Ọ Bụghị Onye Ọ Bụla Nwere Mmasị na Ya

A rụpụtawo ọtụtụ ihe ndị dị mma ná mgbanwe ụfọdụ ndị e mere. Dị ka ihe atụ, n’ime Bible, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe atụ nke ndị ọchịchị obodo na ndị ọzọ bụ́ ndị mere ka e mee mgbanwe ndị dị mma. Mgbalị ndị dị otú ahụ mere ka a maliteghachi iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, mee ka ọnọdụ ọha mmadụ ka mma, meekwa ka e nweta ihu ọma Chineke. (2 Ndị Eze 22:3-20; 2 Ihe E Mere 33:14-17; Nehemaịa, isi nke 8 na nke 9) N’oge na-adịchabeghị anya, okwu a na-ekwusiwanye ike banyere nnwere onwe ndị bụ́ isi, ihe ndị ruuru ụmụ amaala, na ihe ndị ruuru mmadụ, emewo ihe dị ukwuu n’ichebe nakwa n’ịgbachitere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị a na-akpagbu akpagbu.

Otú ọ dị, ozugbo a malitere ime mgbanwe, ọ na-arụpụtakarị ihe ndị a na-atụghị anya ha. John W. Gardner, bụ́ onye rụụrụ ọha na eze ọrụ na narị afọ nke 20, kwuru, sị: “Ọ bụ otu n’ime ihe ndị na-ekwekọghị ekwekọ n’akụkọ ihe mere eme na ndị na-eme mgbanwe adịghị aghọtakarị ihe ndị ga-esi ná mgbanwe ha na-eme pụta.” Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Malite ná mbido afọ ndị 1980, Ógbè Europe malitere ime mgbanwe n’usoro ọrụ ugbo bụ́ nke e bu n’uche na ọ ga-abara ala ahịhịa na ala ndị na-adịchaghị eme nri, uru. Ụkpụrụ iwu ndị ọhụrụ metụtara ọrụ ugbo mere ka a kwụsị ịkọ ihe n’ala dị ihe karịrị hekta 300,000 na Germany nakwa n’Ịtali ma mee ka ha ghọọ ala ahịhịa. N’agbanyeghị ezi ebumnobi e ji mee ha, e nwere ihe ndị dị njọ a na-atụghị anya ha bụ́ ndị ha rụpụtara. “Ọ bụ ezie na a nabatara ya na mbụ dị ka ihe ga-eme ka ebe ndị ahụ dị mma ma bakwuo uru,” ka Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka  Gburugburu Ebe Obibi na-ekwu, “usoro a nke ‘ịmawapụta ala’ pụkwara ịrụpụta ihe ndị na-adịghị mma—ime ka ndị mmadụ gbahapụ usoro ịkọ ugbo ọdịnala ma nakwere usoro na-ekwesịghị ekwesị nke inwe oké ọhịa ma ọ bụ ichekwa ha.”

Banyere mgbalị ndị a na-eme iji nyere ndị ogbenye aka, òtù na-ahụ maka Akpa Ego Mba Ụwa Maka Ịkwalite Ọrụ Ugbo kwuru, sị: “Mgbalị nile a na-eme iji mee ihe ga-abara ndị ogbenye uru site n’ime mgbanwe n’ụlọ ọrụ dị iche iche, na-enwe nsogbu dị ukwuu. A na-eguzobekarị ụlọ ọrụ dị iche iche maka ọdịmma nke ndị dị ike. . . . O yiri ka ‘ndị ukwu’ hà ji ụlọ ọrụ ndị dị n’ógbè ha eme ihe maka ọdịmma ha.”

Ihe atụ ọzọ bụ òtù ụmụ nwanyị, bụ́ nke gbanwere ndụ ndị inyom nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa site n’ime ka ha nweta ihe ndị dị ka ikike nke ịtụ vootu na ohere ka ukwuu nke inweta agụmakwụkwọ ka elu na ịnọ n’ọkwá ndị dị elu. Ma ọbụna ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-akwado nnwere onwe ụmụ nwanyị na-ekweta na òtù ụmụ nwanyị doziri nsogbu ụfọdụ ma mee ka ndị ọzọ ka njọ. Onye edemede bụ́ Susan Van Scoyoc jụrụ, sị: “Ànyị emewo n’ezie ka ọnọdụ ụmụ nwanyị ka mma, ka ànyị emewo ka ha na-ahụsi anya site n’ịtụ anya ka ha na ụmụ nwoke hara nhata n’ebe ọrụ, n’emeghị ihe ọ bụla iji tie ha aka n’obi maka ọrụ ha na-arụ n’ụlọ?”

Mgbanwe Ndị Na-enweghị Isi

E bowo ụfọdụ ndị na-eti mkpu maka mgbanwe ebubo na ha na-eme ya nanị ka a sịkwa na e mere mgbanwe. N’ịkọwa ihe ọ kpọrọ mgbanwe na-enweghị isi, Frederick Hess, bụ́ onye nyochaworo mgbanwe ndị e mere n’ihe banyere ụlọ akwụkwọ, kwuru, sị: “Ihe mere mgbalị dị ukwuu a na-eme iji mee mgbanwe ji akụ afọ n’ala bụ n’ihi otú mgbanwe ndị ahụ dị n’onwe ha. Kama idozi nsogbu, mgbalị ndị a a na-eme iji mee mgbanwe aghọwo ihe ndọpụ uche ndị meworo n’ezie ka [nsogbu ndị e bu n’uche ka ha dozie] ka njọ.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ebe ọ bụ na ọchịchị nke ọ bụla na-emekarị mgbanwe ndị ọhụrụ, usoro ahụ nile na-amaliteghachi n’isi n’ime afọ ole na ole ọ bụla.”

A pụkwara imesị jiri mgbanwe ndị a na-eme kwalite ihe dị iche, nakwa mgbe ụfọdụ, ihe ga-enwe mmetụta dị njọ. Òtù Lebensreform nke dị na Germany nyere aka n’iwulite ihe ọmụmụ nke ụzọ isi meziwanye ọdịdị nke agbụrụ mmadụ site n’ịhọta ndị nne na nna ga-amụ ụmụ ahụ́ gbasiri ike karị. Otú ọ dị, ndị isi na-anụ ọkụ ji ihe ọmụma a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji kwadoo Ọchịchị Ndị Nazi ná mgbalị ha ikepụta agbụrụ mmadụ nke gbasiri ike.

Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị nọ na-etisi mkpu ike maka mgbanwe na-abụ ndị ihe ndị si ná mgbanwe ndị ahụ pụta na-adịghị eju afọ. Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù UN, bụ́ Kofi Annan, mere mkpesa, sị: “Echere m na ihe kasị akpasu iwe na ya bụ na anyị nile maara ihe na-adịghị agazi agazi na ihe ọ dị mkpa ka e mee, ma mgbe mgbe, anyị adịghị eme ihe banyere ya. Mgbe ụfọdụ, a na-enye òtù nke odeakwụkwọ ukwu nọ n’isi ya ikike ime ihe banyere ya, ma a dịghị eweta ihe ndị dị mkpa iji mee ihe ndị ahụ  a sịrị ka e mee. Mgbe ụfọdụ, mgbe ihe ndị dị egwu na-eme, anyị achọọkwa ime ka ụwa mara banyere ya, ọ dịghị onye na-achọ ime ihe banyere ya n’ihi ahụmahụ na-adịghị mma ndị e nwere n’oge ndị gara aga.”

Ndị na-eti mkpu maka mgbanwe apụghị ịtụ anya na ọha mmadụ ga-anabata ha, n’ihi na ka ha na-agbalị ka e leba anya n’ihe mgbaru ọsọ ha, ha na-eme ka ihe na-esiri ndị ọzọ ike. “Onye na-eti mkpu maka mgbanwe anọwo na-abụ ogwu n’anụ ahụ́,” ka Jürgen Reulecke kwuru, bụ́ prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme nke oge a, bụrụkwa ọkachamara n’ihe banyere ndị na-eme mgbanwe, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Die Zeit. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eti mkpu maka mgbanwe adịghị agabiga ihe iwu kwuru ma na-ezere ime ihe ike, ụfọdụ adịghị enwe ndidi ma ọ bụrụ na a dịghị enwe ọganihu ngwa ngwa. N’ọnọdụ  ndị dị otú ahụ, òtù na-eme mgbanwe pụrụ ịzụlite ndị agha nnupụisi bụ́ ndị na-agabiga ihe iwu kwuru.

Imerime mgbanwe ndị e mere n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ò mewo ka ndị mmadụ n’ozuzu nwekwuo afọ ojuju ná ndụ? O yighị ka ọ dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, na Germany, njụta echiche e mere na-egosi na n’ime afọ 35 gara aga, ma ọ bụ ihe yiri ya, ọ̀tụ̀tụ̀ nke afọ ojuju a na-enwe ná ndụ agbanwebeghị. Gịnị banyere okpukpe? Mgbanwe ndị a na-eme n’okpukpe, ò mewo ka e nwekwuo ndị na-efe ofufe? Ndị na-efe ofufe hà enwekwuola afọ ojuju n’ebe okpukpe dị? Ee e, dị ka a na-ahụ n’eziokwu ahụ bụ́ na ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-aghọwanye ndị na-ejighịzi okpukpe akpọrọ ihe, ndị mmadụ ana-aghọwanyezikwa ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe bụ́ isi.

Jizọs Kraịst Ọ̀ Bụ Onye Na-eme Mgbanwe?

Ụfọdụ ndị pụrụ ikwu na Jizọs Kraịst bụ onye na-eme mgbanwe. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ajụjụ a dị mkpa nye onye ọ bụla chọrọ ịbụ ezigbo ohu Chineke, ebe ọ bụ na nke ahụ na-agụnye ịbụ onye na-agbasochi nzọụkwụ Kraịst anya.—1 Pita 2:21.

Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Jizọs nwere ikike nke ime mgbanwe. Dị ka nwoke zuru okè, o nwere ikike nke ibutewo ụzọ n’ime mgbanwe ndị ọhụrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ sara mbara. Otú ọ dị, Kraịst amaliteghị ime mkpọsa nke ga-eme ka e kpochapụ ndị ọchịchị na-arụrụ aka n’ụwa ma ọ bụ ndị ọchụ ntá ego na-adịghị eme ihe n’eziokwu. Ọ kpọrọghị ndị mmadụ mee ngagharị iwe n’okporo ámá megide ikpe na-ezighị ezi, n’agbanyeghị na ya onwe ya gaje ịbụ onye aka ya dị ọcha nke a ga-ekpe ikpe mkpegbu. Mgbe ụfọdụ, Jizọs adịghị enwe “ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, o guzobeghị òtù na-eti mkpu iji mee ka a mara banyere mkpa nke ndị na-enweghị ebe obibi. “Unu na ndị ogbenye nọ mgbe nile,” ka ọ kọwara mgbe ụfọdụ ndị kwupụtara nchegbu ha banyere ego. Jizọs nọpụrụ iche n’esemokwu dị iche iche nke ụwa.—Matiu 8:20; 20:28; 26:11; Luk 12:13, 14; Jọn 6:14, 15; 18:36.

N’ezie, Jizọs abụghị onye nsogbu ndị dị ka ịda ogbenye, nrụrụ aka, na ikpe na-ezighị ezi e nwere na-agbasaghị. Bible na-egosi nnọọ na ọnọdụ ọjọọ ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya were ya ezigbo iwe. (Mak 1:40, 41; 6:33, 34; 8:1, 2; Luk 7:13) Ma ihe o kwuru na ọ ga-eweta bụ ngwọta pụrụ iche. Ihe Kraịst bu n’uche abụghị ime mgbanwe nkịtị, kama ọ bụ ime mgbanwe zuru ezu n’ụzọ e si achịkwa ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ. Alaeze eluigwe, bụ́ nke Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, guzobere, bụ́kwa nke Jizọs Kraịst ga-achị dị ka Eze ya, ga-eweta mgbanwe a. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Ọ bụ otu n’ime ihe ndị na-ekwekọghị ekwekọ n’akụkọ ihe mere eme na ndị na-eme mgbanwe adịghị aghọtakarị ihe ndị ga-esi ná mgbanwe ha na-eme pụta.”—John W. Gardner

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

“Echere m na ihe kasị akpasu iwe na ya bụ na anyị nile maara ihe na-adịghị agazi agazi na ihe ọ dị mkpa ka e mee, ma mgbe mgbe, anyị adịghị eme ihe banyere ya.”—Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù UN bụ́ Kofi Annan

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

“Etinyere M Ndụ M n’Ihe Ize Ndụ Iji Chebe Gburugburu Ebe Obibi”

Hans rụrụ ọrụ n’oké osimiri ruo afọ 48, gụnyere ihe karịrị afọ 35 ọ rụrụ ọrụ dị ka onyeisi ụgbọ mmiri. Ka ọ na-erule oge ọ na-achọ ịla ezumike nká, ọ rụrụ ọrụ dị ka onyeisi ụgbọ mmiri bụ́ nke otu òtù nke na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, ji eme ihe. Ọ na-akọwa, sị:

“Ọ dịla anya m kweere na ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ịdị na-akwanyere gburugburu ebe obibi na ihe ndị e kere eke ùgwù. Ya mere, mgbe e nyere m ọrụ nke ịbụ onyeisi ụgbọ mmiri nke òtù na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, anakweere m ya ozugbo. Ọrụ anyị bụ ime ka a mara banyere ihe ndị na-emebi gburugburu ebe obibi. Ozugbo anyị mere ndokwa ịga n’oké osimiri, anyị na-eme ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi soro anyị iji mee ka ọha na eze mara banyere ya. Anyị na-aga n’oké osimiri ma na-eme ihe iji gbochie ndị mmadụ ịwụnye kemikal ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu na nsí, n’ime ha. N’oge ọzọ anyị gara n’oké osimiri, anyị gbalịrị ime ka a kwụsị ogbugbu a na-egbu anụ seal na ụmụ ha.

“Nke a abụghị ọrụ ndị ụjọ. Etinyere m ndụ m n’ihe ize ndụ iji chebe gburugburu ebe obibi. N’otu n’ime ihe omume ndị anyị mere iji gosi mkpesa anyị, atụrụ m onwe m ịgà n’aka ma kogide ya n’arịlịka ụgbọ mmiri, achọtaziri m onwe m n’ala mmiri. N’oge ọzọ, anọ m n’ụgbọ epeepe e ji rọba rụọ bụ́ nke nọ na-agba n’akụkụ nnukwu ụgbọ mmiri. Otu onye tụbatara drọm ígwè dị nnọọ arọ n’ime ụgbọ epeepe anyị, o wee kpuo. Emerụrụ m ezigbo ahụ́.”

Hans mesịrị ghọta na ọ bụ ezie na ebumnobi nke òtù ahụ dị mma, ọ na-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihe omume nke olileanya na-adịchaghị na ọ ga-eme ka gburugburu ebe obibi ka mma n’ụzọ na-adịgide adịgide. (Eklisiastis 1:9) N’oge na-adịghị anya ọ hapụsịrị òtù ahụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, o sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma ghọọ Onyeàmà e mere baptizim. Taa, ọ bụ onye ozi oge nile. “Bible nyeere m aka ịghọta na nanị olileanya bụ́ ezie e nwere na a ga-elekọta gburugburu ebe obibi anya nke ọma bụ site n’Alaeze Mezaịa nke Chineke.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

Ọ Lụrụ Ọgụ Maka Mgbanwe

A mụrụ Sara (ọ bụghị ezigbo aha ya) n’Eshia n’etiti afọ ndị 1960. Ọ dị afọ iri na ụma mgbe nkwatu ọchịchị e nwere ná mba ya mere ka e nwee ọchịchị ọhụrụ, bụ́ nke kwere nkwa ime mgbanwe n’usoro ọchịchị nakwa n’ọnọdụ ọha mmadụ. Ná mmalite, ụmụ amaala nke mba ya nwere obi ụtọ maka mgbanwe ahụ, ma n’ime otu afọ, gọọmenti ọhụrụ ahụ malitere ịkpagbu ndị na-emegide ya, dị nnọọ ka gọọmenti nke ochie ahụ nọ na-eme. Ewu na ọkụkọ nwere ndakpọ olileanya, Sara banyekwara n’òtù na-emegide gọọmenti ọhụrụ ahụ. Ọ na-akọwa, sị:

“Òtù ndị mmegide m nọ na ya nwere nzukọ ugboro ugboro, anyị mekwara mkpesa n’ihu ọha. Anọ m n’okporo ámá ndị dị n’isi obodo ahụ na-amapawa akwụkwọ ma na-eke akwụkwọ nta mgbe ndị agha nwụchiri m. N’ikpeazụ, ha hapụrụ m. Ọ gazirighị ndị ọzọ nọ n’òtù ahụ. E jidere ma gbuo mmadụ abụọ n’ime ndị enyi m nwanyị. Ndụ m bịara dịrị n’ihe ize ndụ, n’ihi ya, papa m gbara m ume isi ná mba ahụ pụọ.”

Ozugbo Sara ruru Europe, ọ mụrụ Bible, e meekwa ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Taa, ọ bụ onye ozi oge nile. N’ileghachi anya azụ, Sara na-ekwu, sị:

“Ihe m nọ na-achọsi ike bụ ikpe ziri ezi na ihe ngwọta nye nsogbu nke ndị obodo m na-enwe. Ahụrụ m na gọọmenti ọhụrụ e guzobere ná mba anyị bu ihe mgbaru ọsọ ndị a n’obi wee malite, ma ọ bịara dị nnọọ aka ike nke na o chefuru ihe mgbaru ọsọ ahụ ma malite imekpọ ndị mmadụ ọnụ. Abịakwara m chọpụta na òtù ahụ m nọ na ya enweghị ihe ngwọta nye ihe isi ike mba anyị na-enwe. (Abụ Ọma 146:3, 4) Ugbu a, aghọtala m na ihe ga-agwọta nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ Alaeze Mezaịa nke Chineke.”

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbidi Berlin dara n’afọ 1989

[Foto dị na peeji nke 26]

Mgbanwe ndị a na-eme n’okpukpe ò mewo ka e nwekwuo ndị na-efe ofufe?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

N’elu elu aka nri: Foto e nwetara n’aka Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma na United States

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Kofi Annan: Foto e nwetara n’aka UN/DPI nke Evan Schneider sere (Feb97); n’azụ azụ: WHO/OXFAM