Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Esemokwu n’Isi Mozis

Esemokwu n’Isi Mozis

 Esemokwu n’Isi Mozis

MGBE mgbe, ndị Juu, Ndị Kraịst, na ndị Alakụba abụwo ndị na-enweghị nkwekọrịta banyere ọtụtụ ihe. Ma, n’agbanyeghị ndịrịta iche ha, e nwere, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ihe okpukpe ndị a nwechara: nkwanye ùgwù miri emi maka otu nwoke a maara dị ka Mozis. Ndị Juu maara ya dị ka “onye ozizi kasịnụ n’ime ndị ozizi Juu nile”—onye malitere mba ndị Juu. Ndị Kraịst na-ele ya anya dị ka onye obu ụzọ nke Jizọs Kraịst. Ndị Alakụba na-ele Mozis anya dị ka otu n’ime ndị amụma mbụ kasị ukwuu ha nweworo.

N’ihi ya, Mozis bụ otu n’ime ndị ikom kasị dee ude n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’agbanyeghị nke ahụ, kemgbe ihe karịrị nnọọ otu narị afọ, ma ndị ọkà mmụta ma ndị ụkọchukwu esewo okwu n’isi Mozis. Ọ bụghị nanị nkwenkwe bụ́ na Mozis rụrụ ọrụ ebube ma kpọpụta ụmụ Izrel n’Ijipt ka ọtụtụ n’ime ha na-agbagha, kamakwa ha na-ekwu na ọ dịghị ọbụna mgbe ọ dịrị ndụ. Akwụkwọ bụ́ Moses—A Life (Mozis—Ndụ Ya), nke Jonathan Kirsch dere, na-ekwubi, sị: “Nanị ihe anyị pụrụ ikwu banyere Mozis ahụ a kọrọ n’akụkọ ihe mere eme bụ na onye dị ka nwoke ahụ a kọwara na Bible pụrụ ịdịwo ndụ n’oge nakwa n’ebe a na-amaghị ama n’oge dị anya gara aga, nakwa na obere ike ndị ọ kpara pụkwara ịbụwo nnọọ ebe a gbakwasịrị ụkwụ wee tinye nnu na ose ndị mere ka ọ ghọọ onye ahụ a ma ama nke a na-ese okwu n’isi ya bụ́ onye anyị na-agụ banyere ya n’ime Bible.”

N’ile ya anya mbụ, arụmụka dị otú ahụ pụrụ iyi ihe kwesịrị nlebara anya. Dị ka ihe atụ, ndị nkatọ na-ekwu na a chọtawo ihe mgbe ochie ndị na-egosi na ndị a kpọrọ aha na Bible dị ka Eze Jihu nke Izrel, dịrị ndụ ma ọ dịghị ihe mgbe ochie ọ bụla a chọtaworo nke na-egosi na Mozis dịrị ndụ. Otú ọ dị, nke a abụtụghị ihe akaebe na-egosi na Mozis bụ onye a kọrọ n’akụkọ ifo. Ndị na-arụ ụka kwuburu na ndị ọzọ a kpọtụrụ aha n’ime Bible, ndị dị ka Eze Belshaza nke Babilọn na Eze Sagọn nke Asiria, bụkwa ndị a kọrọ n’akụkọ ifo—ruo mgbe ihe mgbe ochie ndị a chọtara mesịrị gosi na ha dịrị ndụ.

Onye edemede bụ́ Jonathan Kirsch na-echetara anyị, sị: “Ihe ndị fọdụrụ n’ihe mgbe ochie ndị e nwetara banyere Izrel nke Bible dị nnọọ nta nke na ọhụhụ a na-ahụtụghị Mozis n’ebe ọ bụla ọzọ ma e wezụga na Bible abụghị ihe ijuanya ma ọ bụ ihe a ga-agbakwasị ụkwụ na ya wee ruo ná nkwubi okwu.” N’ihi ya, dị ka Kirsch si kwuo, ụfọdụ ndị na-ekwu na o yighị ka Mozis ọ̀ bụ onye mmadụ chepụtara n’echiche, ebe ọ bụ na “akụkọ ndụ mmadụ nke a kọrọ n’ụzọ zuru ezu, nke a kọkwara banyere ọtụtụ mkparịta ụka ndị o nwere, bụ́ ndị nwere nnọọ nkwekọ . . . , apụghị ịbụwo ihe e chepụtara echepụta.”

Ma ị̀ bụ onye kwere ekwe ma ọ bụ na ị bụghị, ma eleghị anya, ị matụụrụ ihe ndị bụ́ isi mere ná ndụ Mozis: nzute o zutere Chineke n’ọhịa na-ere ọkụ, Ọpụpụ ụmụ Izrel pụrụ n’ohu n’Ijipt, nkewa nke Oké Osimiri Uhie. Ma è nwere ihe mere a ga-eji kwere na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mere eme n’ezie? Ka Mozis ọ̀ bụ nanị onye a kọrọ n’akụkọ ifo? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a na-adọrọ mmasị.