Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị

Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị

 Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i chere echiche banyere ihe ndụ ọtụtụ ndị gaara adị ka ya ma ọ bụrụ na e nweghị mmanụ ala na ihe ndị a na-eji ya emepụta? * A na-esi na mmanụ ala emepụta mmanụ a na-atụ n’ụgbọala, n’ịnyịnya ígwè, n’ihe ndị e ji akwagharị ụmụaka, nakwa n’ígwè ọrụ ndị ọzọ. Mmanụ na-eme ka akụkụ dị iche iche nke ígwè ọrụ ghara ịdị na-echi echi mgbe ha na-emetụ n’ahụ́ ibe ha, si otú ahụ na-eme ka ọ ghara imebi ngwa ngwa. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu gwụrụ.

A na-esi na mmanụ ala emepụta mmanụ ụgbọelu, nke ụgbọala, na nke a na-agbanye n’ígwè ndị e ji eme ka ụlọ kporo ọkụ. Imerime ihe ntecha, ágbá, ink, ọgwụ, fatịlaịza, na plastik nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ, nwere ihe ndị e si na mmanụ ala nweta. Ndụ ọtụtụ ndị ga-adị nnọọ iche ma ọ bụrụ na e nweghị mmanụ ala. Ka a sịkwa ihe mere otu akwụkwọ ji kwuo na ‘a na-eji mmanụ ala na ihe ndị e si na ya emepụta eme ọtụtụ ihe karịa ma eleghị anya, ka a na-eji ihe ọ bụla ọzọ dị n’ụwa eme ihe.’ Olee otú anyị si enweta mmanụ ala? Ebee ka e si enweta ya? Ogologo oge ha aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ jiworo ya mee ihe?

Bible na-agwa anyị na n’ihe karịrị puku afọ abụọ tupu Kraịst abịa n’ụwa, Noa, site n’irube isi ná ntụziaka Chineke nyere ya, wuru otu akatamkpo ụgbọ ma jiri bitumen—ikekwe ihe e si na mmanụ ala nweta—mee ka mmiri ghara ịba n’ime ya. (Jenesis 6:14) Ndị Babilọn ji ihe ndị e si na mmanụ ala nweta mee brik ndị ha na-aṅa n’ọkụ, ndị Ijipt ji ya mee ihe n’ịgbasi ozu, ndị ọzọ biri n’oge ochie jikwa ya mee ihe n’ịgwọ ọrịa.

Ònye gaara echetụwo n’echiche na mmanụ ala ga-abịa dị mkpa otú a n’ụwa taa? Ọ dịghị onye pụrụ ịrụ ụka na mmepeanya a na-enwe n’oge a n’usoro mmepụta ihe na-adabere na mmanụ ala.

Ọ bụ ojiji e ji mmanụ ala mụọ ọkụ mere ka ọ malite iwu ewu. Laa azụ na narị afọ nke 15, e ji mmanụ e nwetara n’egwumighị ala egwumi mụọ oriọna na Baku, nke bụ́zi isi obodo Azerbaijan. N’afọ 1650, e gwutere mmanụ n’egwumighị ala egwumi na Romania, bụ́ ebe e ji mmanụ dị n’ụdị kerosin mụọ ọkụ. Ka ọ na-erule n’etiti narị afọ nke 19, mba ahụ na mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe enweelarị ụlọ ọrụ na-egwupụta mmanụ bụ́ ndị na-enwe ọganihu.

Na United States, ọ bụ ọchịchọ a chọrọ ihe na-enye ọkụ nke ọma n’afọ ndị 1800 mere n’ụzọ bụ́ isi ka otu ìgwè ndị ikom tinye mgbalị n’igwupụta mmanụ. Ndị ikom a kwubiri n’ụzọ ziri ezi na iji nweta kerosin ga-ezuru ha ire n’ahịa, ha aghaghị igwu ala iji nweta mmanụ. Ya mere, n’afọ 1859, a gbapuru mmanụ na Pennsylvania. Ịchụ mmanụ aghara aghara ebiri ọkụ. Gịnị meziri?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Mgbe ụfọdụ, mmanụ ala na-esi n’ebe ala gbawatụrụ agbawa na-erupụta. E wezụga ịdị goro goro, ọ pụkwara ịdị n’ụdị rọrọ arọ dị ka asphalt, pitch, bitumen, ma ọ bụ tar.

[Igbe dị na peeji nke 3]

MMANỤ ALA—GỊNỊ KA Ọ BỤ?

A na-akọwa mmanụ ala dị ka ihe rọrọ arọ, na-enwu ọkụ, ma na-eji oji, nke ihe ndị mejupụtara ya bụ hydrocarbon na-ekupụ ekupụ, nke dị goro goro, na nke kpụkọtara akpụkọta, bụ́ nke na-adị n’ime ala. A pụrụ ịza ya iji nweta ihe dịgasị iche iche gụnyere gas, mmanụ petrol, naphtha, kerosin, mmanụ a na-atụ n’ígwè, paraffin wax, na asphalt, a na-ejikwa ya emepụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ.