Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmanụ Ala—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-agwụ?

Mmanụ Ala—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-agwụ?

 Mmanụ Ala—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-agwụ?

“Ọ bụrụ na e nweghị [ihe na-enye ígwè ọrụ ike], ụlọ ọrụ apụghị ịrụ ọrụ . . . A pụghị ịrụpụta obere ụgbọala, gwongworo, ụgbọ okporo ígwè, ụgbọ mmiri ma ọ bụ ụgbọelu . . . Ọ bụrụ na e nweghị ihe na-enye ígwè ọrụ ike, ụlọ dị iche iche ga-ajụ oyi, ọkụ eletrik agaghịkwa adị na ha, a gaghị na-eji ígwè e ji esi nri eme ihe. . . . Ọ bụrụ na e nweghị ebe e si enweta ihe ndị na-enye ígwè ọrụ ike, ọ ga-eme ka anyị laghachi nnọọ n’Oge Ụwa Nọ n’Ìsì.”—Site na “U.S. Geological Survey World Petroleum Assessment 2000.”

NDỊ ọkachamara banyere ihe na-enye ígwè ọrụ ike na-eme atụmatụ na mmanụ ala pụrụ imesị gwụ. Ụfọdụ ndị na-eme atụmatụ na mmanụ ndị e nwere n’ime ala ga-adịru site n’afọ 63 ruo afọ 95 n’ihu. Ka ọ dịgodị, a nọwo na-eji ihe ndị ọzọ na-enye ígwè ọrụ ike eme ihe, bụ́ ndị e jiworo ụfọdụ n’ime ha mee ihe ruo ọtụtụ iri afọ. Ihe ndị na-esonụ so n’ihe ndị na-enye ígwè ọru ike, bụ́ ndị a pụrụ inweta ngwa ngwa ma e jirisịa nke dị adị mee ihe: ike si n’anyanwụ, ike si n’ikuku, ike si n’ebili mmiri, ike eletrik nke e si ná mmiri enweta, na uzuzu ọkụ nke oké osimiri. Ma ka ọ dị ugbu a, a ka nwere nsogbu dị ukwuu banyere imepụta ha na ikesa ha.

Atụmanya nke iji ihe ndị na-enye ígwè ọrụ ike, bụ́ ndị a pụrụ inwetaghachi na-eme ihe nanị mgbe ndị nke a na-apụghị inwetaghachi gwụrụ, bụ n’ezie ọnọdụ na-enweghị isi. Ụlọ ọrụ ndị na-egwu mmanụ dị njikere iji obere oge ha sị na e mere atụmatụ na mmanụ ga-adịru mee ihe n’ụzọ ga-abara ha onwe ha uru. N’ụzọ dị mwute, e nwere ezi ihe mere a ga-eji tụọ anya na nsogbu ndị metụtara ọha na eze na gburugburu ebe obibi bụ́ ndị ha na mmanụ ala na-agakọ, ga-adịru ogologo oge mmanụ ala ga-adịru. Ọ baghị uru ikwu na isi ihe na-akpata nsogbu ndị a abụghị mmanụ n’onwe ya. Ihe nyere mmanụ aha ọjọọ bụ anyaukwu nke ụmụ mmadụ na oké ọchịchọ a na-enwe maka ịnọ n’isi.

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọdịnihu nke mmanụ—nakwa n’ezie nke ihe nile ọzọ na-enye ígwè ọrụ ike—adịghị n’aka mba dị iche iche. Mee elu mee ala, ọ dị n’aka Onye Okike na Onye Nlekọta ụwa, bụ́ Jehova Chineke, bụ́ onye kweworo nkwa na, n’oge na-adịghị anya, nsogbu nile metụtara gburugburu ebe obibi na ọha na eze, bụ́ ndị a na-enwe n’ihi iji ihe ndị dị n’ụwa eme ihe nakwa imetọ ha, ga-akwụsị. (Mkpughe 4:11) Dị ka Bible si kwuo, oge Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa’ eruwela. Ọchịchị ezi omume nke Chineke ga-eme ka e nwee “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” bụ́ ụwa nke mmadụ na-agaghị eji anyaukwu na-erigbu ibe ya nakwa nke ikpe na-ezighị ezi na-agaghị adị, ụwa nke a ga-eji ihe ndị dị na ya na-eme ihe n’ụzọ ga-abara ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi uru, n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị.—Mkpughe 11:18; 21:1-4.

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ihe ndị ọzọ e si na ha enweta ihe na-enye ígwè ọrụ ike na-agụnye ígwè ọrụ e ji adọta ike si n’anyanwụ na ígwè ọrụ e ji adọta ike si n’ikuku