Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

Obere Ụgbọala nke Na-eji Ihe Mkpofu Arụ Ọrụ

Otu onye nwere ugbo na Finland nwere ugbu a otu obere ụgbọala nke na-eji gas sitere n’ihe mkpofu rere ere arụ ọrụ. “A na-agbanye ụgbọala ahụ gas sitere n’ihe mkpofu e mere ka ọ dị ọcha, nke a fọnyejuru n’arịa na-eme ka o ree ngwa ngwa, bụ́ nke dị n’ugbo onye nwe obere ụgbọala ahụ,” ka magazin a na-ebipụta na Finland bụ́ Suomen luonto na-akọ. Gas sitere n’ihe mkpofu bụ mmanụ e ji akwọ ụgbọala, nke kasị bụrụ nke na-adịghị emebi ikuku, ebe ọ bụ na a pụkwara iji ihe mkpofu mepụta ya, ọ dịghị emebi gburugburu ebe obibi. N’eziokwu, otu n’ime ihe ndị na-afọdụ mgbe e ji ihe mkpofu ahụ mepụta gas bụ fatịlaịza bara uru, nke e ji arụ ọrụ ugbo. A pụkwara iji gas sitere n’ihe mkpofu kwọọ ụgbọala ndị e mepụtaworo, bụ́ ndị a na-eji gas nkịtị akwọ—ndị dị ihe dị ka nde abụọ n’ụwa nile. Na Sweden, a na-eji gas sitere n’ihe mkpofu akwọ ọtụtụ bọs ndị e ji eme ihe n’obodo ukwu, a na-erekwa gas sitere n’ihe mkpofu tinyere mmanụ ụgbọala ndị ọzọ n’ebe ụfọdụ a na-agbata mmanụ ụgbọala ná mba ahụ. Akụkọ ahụ na-ekwu na uru ikpeazụ ọ bara bụ nke a: “Gas sitere n’ihe mkpofu dị nnọọ ọnụ ala karịa mmanụ petrol ma ọ bụ mmanụ diesel.”

 Otú Ahụhụ Ndị Dị Ka Ijere Si Alanarị Idei Mmiri

Olee ihe ahụhụ ndị dị ka ijere na-eme mgbe mmiri na-ezo? Ọ bụ ezie na ọ bụghị ụdị ahụhụ nile dị ka ijere na-ebi n’ime ala, ụfọdụ ndị bi n’ime ala nwere ụzọ dị iriba ama ha na-esi alanarị idei mmiri, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu. Ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụhụ ndị dị ka ijere bụ́ Dr. Edward O. Wilson na Bert Holldobler, na-akọwa na ‘ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nke nọ n’oké ọhịa nke ebe okpomọkụ ahụ obere [mmiri] tasara n’ebe e si abanye n’ọnụ ha, ha na-eji ọsọ gbafere ruo n’ụfụ ọnụ dị iche iche iji mee ka ndị nke ọzọ mara na agwọ nọ n’akịrịka.’ “Ha na-eme ka ụmụ ahụhụ ndị ọzọ bi n’ọnụ ahụ gbasoro ísìsì ha gaa n’ụfụ ndị nke ghere oghe, mgbe ụfọdụkwa ha na-agbasoro ísìsì ahụ pụọ n’ọnụ ahụ kpam kpam.” N’ihe na-akarịghị sekọnd 30, ha na-enwe ike ịkpali ihe ka ọtụtụ n’ìgwè ahụhụ ahụ ime ihe. N’ebe ndịda ọdịda anyanwụ United States kwa nakwa n’ebe ugwu nke Ndịda America, ka The Times, na-akọ, ụdị ijere ụfọdụ “na-esi n’ọnụ ha rịpụta n’ala, kpụkọtasịa n’ìgwè gụnyere ndị nke toworo eto, eze ha na ụmụ ya, ma na-ese n’elu mmiri ahụ na-eto eto. Ọtụtụ n’ime ha na-alanarị . . . Ìgwè ijere ahụ nke na-ese n’elu mmiri na-emesị jide ahịhịa ma ọ bụ osisi aka, ndị nke lanarịrịnụ pụkwara ịlaghachi n’ọnụ ha mgbe mmiri ahụ tara.”

Ịṅụ Oké Mmanya Na-akpa Ndị Mmadụ Aka Ọjọọ

“Ndị inyom na ndị na-eto eto ịṅụbiga mmanya ókè emewo ka e nwee mmụba dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ịṅụ mmanya na-aba n’anya na Britain,” ka akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na London bụ́ The Independent, na-ekwu. “Ndị nwụrụ n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè amụbawo n’ime afọ 20, ihe bụ́ isi kpatara ya bụ ọrịa imeju na-adịghị ala ala.” Afọ ndụ nke ndị ọ na-egbu na-ebelata. “N’iri afọ gara aga, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na-anwụ ná mmalite afọ ndị nke 70 ma ọ bụrụ na ha dịkarịa ndụ. Ọnụ ọgụgụ kasị ọhụrụ e nwetara maka afọ 1998-2000 na-egosi na ha na-anwụzi ná ngwụsị afọ ndị nke iri ise ma ha dịkarịa ndụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ma, ọ bụghị nanị ọrịa bụ ihe mmanya na-aba n’anya na-akpata. Na France “o yiri ka ọ̀ bụ mmanya na-aba n’anya kpọmkwem na-akpata pasent 10 ruo pasent 20 nke ihe mberede ndị a na-enwe n’ọrụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Monde, na-akọ. Ọzọkwa, kwa afọ, na France, mmadụ 2,700 na-anwụ, mmadụ 24,000 na-emerụkwa ahụ́ n’ihe mberede okporo ụzọ bụ́ ndị ịṅụbiga mmanya ókè kpatara, ọ bụkwa mmanya na-aba n’anya na-akpata ihe dị ka pasent 30 nke ime ihe ike. Ịṅụbiga mmanya ókè na-efukwa ego dị ukwuu. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Monde na-ekwu na, na 1996, na France, iji mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi kpatara mfu ego e mere atụmatụ ịbụ ihe hà ka nde euro 17.6 (nde dollar 19.2).

Nrụgide na Nrịanrịa

“Nrụgide a na-enwe n’ebe ọrụ na ike ọgwụgwụ, na-amụba ohere e nwere ibute ajọ ọrịa ndị dị ka àzụ̀zụ̀, ọrịa ndị yiri ya, na ọnyá afọ,” dị ka e gosiri ná nnyocha Netherlands mere n’ebe ihe karịrị mmadụ 8,000 e were n’ọrụ nọ, bụ́ nke Òtù Na-ahụ Maka Nnyocha Nkà Mmụta Sayensị na Netherlands kọrọ banyere ya. “Nnyocha ahụ gosiri na ndị e were n’ọrụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ siri nnọọ ike, nwere àzụ̀zụ̀ n’ụzọ ji pasent 20 karịa ugboro ole ndị e were n’ọrụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ na-esichaghị ike, nwere.” Ihe ndị ọzọ a chọpụtara na ha na-eso eme ka e nwee oghere dị ukwuu nke ibute ọrịa na-agụnye ịrụ ọrụ abalị na ọnọdụ nke amaghị ihe echi ga-abụ bụ́ nke ịhazigharị ụlọ ọrụ na-akpata. “Ndị e were n’ọrụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ abalị na-enwe ohere nke ibute ọrịa karịa ndị e were n’ọrụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ehihie,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.

Ụmụaka na Ịbụ Abụ

Ịbụ abụ bụ “ụzọ dị mkpa e si egosipụta otú obi dị mmadụ, bụ́ nke na-enyere ụmụaka aka ịzụlite àgwà ha,” ka Dr. Michael Fuchs, ọkachamara n’ihe banyere ntị, imi, na akpịrị, bụ́ onye nọ na Mahadum Leipzig, dere na magazin bụ́ Gesundheit, nke a na-ebipụta na Germany, bụ́ nke na-ekwu banyere ahụ́ ike. Otú ọ dị, Fuchs na-akwa arịrị na “n’ụzọ doro anya, ọdịdị ụda olu ụmụaka adịghịzi mma otú ọ dị n’ime afọ 20 gara aga. Ụda olu ha agbanwewokwa.” Fuchs na-ekwu ihe abụọ pụrụ ịkpata ya. Nke mbụ, “ụmụaka taa adịghị abụkebe abụ n’ụlọ. Ọ bụ ezie na ezinụlọ ndị e nwere n’oge gara aga na-eji oge ntụrụndụ ha abụ abụ ma na-akpọ egwú, ugbu a ha na-anọkọta na-ekiri telivishọn, ha na-egerekwa egwú nanị egere.” Nke abụọ, mgbe ụmụaka bụrụ abụ, ọ na-eyi ka hà na-eṅomi olu na-agbaka agbaka nke ndị na-agụ egwú rock na egwú pop. “Ụmụaka na-eme ka akwara ụda olu ha na-arụ ọrụ karịrị ya mgbe ha na-achọ iṅomi ndị dị otú ahụ a ma ama, bụ́ ndị na-eti egwú,” ka Fuchs na-ede. Ime otú ahụ pụrụ ime ka nkọlọ ha na uru ahụ́ ndị dị n’olu ha kwedoo ekwedo. Nrụgide nke a na-akpatakwu pụkwara ime ka akwara ụda olu ha nwee akpụ, na-emekwu ka ọdịdị nke ụda olu ha ghara ịdị mma.

Ime Ka Ekwú Ghara Ịdị Ize Ndụ

“Ọkụ a kwanyere n’ekwú pụrụ imetọ ikuku n’ime ụlọ nakwa n’èzí, ọ pụkwara ịbụ ihe ize ndụ,” ka UC Berkeley Wellness Letter na-akọwa. Iji nyere ndị mmadụ aka izere ihe ize ndụ nakwa nsogbu ahụ́ ike ndị anwụrụ ọkụ sitere n’ekwú na-akpatakarị, Wellness Letter na-atụ aro ndị a:

● “Mee ka ebe anwụrụ ọkụ ekwú na-esi apụ nọgide na-arụ ọrụ nke ọma . . . , na-edebe ya ọcha ma mee ka ọ nọrọ n’ọnọdụ dị mma.”

● “Chee banyere ịrụnye ihe na-achọpụta anwụrụ ọkụ . . . , karịsịa ma ọ bụrụ na ọ dịghị ebe ikuku na-esi apụ n’ime ụlọ.”

● “Na-akwanye obere ọkụ ndị na-enwu nke ọma kama ịkwanye nnukwu ọkụ ndị na-akwụ anwụrụ ọkụ.”

● “Jiri nkụ ndị kpọrọ akpọ, bụ́kwa ndị e chekwara ruo ma ọ dịkarịa ala ọnwa isii, na-akwa ọkụ. Osisi ndị siri ike na-enwu ọkụ nke ọma ma na-anọ ọdụ karị.”

● “Mepetụ windo ka ikuku na-abata.”

● “Jide n’aka na a rụrụ ekwú n’ebe dị mma, ma ọ dịkarịa ala otu mita site n’ahụ́ ájá nakwa n’ebe ngwá ụlọ ndị pụrụ ire ọkụ dị.” ‘Tọọ ihe n’ala tupu ị kwaa ekwú iji mee ka ala ụlọ ghara ikpo ọkụ.’

● “Esula osisi nakwa plywood ndị e ji kemikal chekwaa ma ọ bụ ndị e tere ágbá, akwụkwọ tụrụ àgwà, ma ọ bụ plastik, ọkụ. Ha pụrụ ịkwụ anwụrụ ọkụ dị ize ndụ.”

● “Na-eji ihe a na-eji ekpuchi ekwú ọkụ eme ihe mgbe nile.”

Oge Oyi na Vitamin D

“Ahụ́ chọrọ Vitamin D iji mee ka calcium nwee ike ịgbari ma banye n’ọkpụkpụ, bụ́ nke ga-eme ka ọkpụkpụ ahụ sie ike ma ghara ịgbaji n’ụzọ dị mfe,” ka Tufts University Health & Nutrition Letter na-ekwu. “Akpụkpọ ahụ́ anyị na-emepụta, n’ozuzu ya, pasent 90 nke vitamin D ma anyanwụ na-acha ya. Ma n’ọnwa ndị dabara n’oge oyi, okpomọkụ anyanwụ adịghị esi ike ruo n’ókè nke inye vitamin D n’ahụ́ n’ógbè oyi na-atụsi ike. Nke ka njọ bụ na o siri ike ka onye katatụrụ ahụ́ ma ọ bụ onye meworo agadi rie ihe ga-enye ya pasent 10 nke vitamin D, bụ́ nke ihe oriri kwesịrị inye.” Ya mere, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike nke Mba United States, na-atụ aro na n’oge oyi nke ebe ugwu, ndị gafeworo afọ 50 karịsịa kwesịrị ịdị na-erikwu ihe na-enye vitamin D, bụ́ ndị dị ka azụ̀ nwere abụba na mmanụ imeju okporoko ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ vitamin D kwa ụbọchị, ọ bụ ezie na ha agaghị aṅụfe ya oké.

Ụmụaka Ndị Na-aṅụbiga Mmanya Ókè na South Africa

“Ọ pụrụ ịbụ na South Africa na-azụlite mba na-aṅụbiga mmanya ókè, n’ihi na ụmụaka amalitewala ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè mgbe ha dị nnọọ na nwata,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Star, nke a na-ebipụta na Johannesburg, na-adọ aka ná ntị. A na-ekwu na ụmụaka ndị dị nanị afọ itoolu n’ụlọ akwụkwọ ụfọdụ na-enwe nsogbu ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata ma ha bịa akwụkwọ, ha na-anọgidekwa na-aṅụbiga mmanya ókè. N’ihi gịnị ka e ji nwee nsogbu ịṅụbiga mmanya ókè dị otú ahụ? Ndị uwe ojii na-ezo aka ná “mkpọsa ngwá ahịa [bụ́ nke] na-egosi ụzọ ndụ nke na-adọrọ mmasị ndị nọ n’afọ iri na ụma.” Ihe ndị ọzọ akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru nke mere e ji enwe nsogbu ahụ bụ otú ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya si ju ebe nile, nnabata ọha mmadụ na-anabata ya, nhapụ ndị mụrụ ụmụ na-ahapụ ụmụ ha ime otú masịrị ha, na nnwere onwe nakwa ego ka ukwuu ụmụaka nwere ugbu a. “E nwekwara nsogbu nke ndị mụrụ ụmụ ịhapụ ịchịkwa ụmụ ha nakwa enweghị nkwanye ùgwù maka ịbụisi—n’ụzọ bụ́ isi, ndakpọ nke ụkpụrụ omume na-achịkwa ọha na eze,” ka otu ọkà mmụta n’ihe banyere akparamàgwà mmadụ na-ekwu.