Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọgide Na-eme Ihe Ọma”

“Nọgide Na-eme Ihe Ọma”

“Nọgide Na-eme Ihe Ọma”

“Achọrọ m ka unu mara na ndị nwere mmasị n’ọdịdị nke Obodo anyị nakwa n’otú ọ dị n’anya ndị njem na-agafe na ya, ahụwo mgbalị ndị unu na-eme na nrụsi ọrụ ike unu. Ihe owuwu unu na-egosi na unu ji gburugburu ebe obibi unu na Obodo a n’onwe ya kpọrọ ihe nke ukwuu.”

Ọ bụ onyeisi obodo Halton Hills, bụ́ ebe alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke Canada dị, kwuru okwu ịja mma ndị a. Mgbe onyeisi obodo ahụ kwusịrị nke ahụ, o nyere alaka ụlọ ọrụ ahụ ihe ncheta, na-ekwupụta “ekele o nwere maka mgbalị [alaka ụlọ ọrụ ahụ] na-eme na mmasị dị ukwuu ọ nọ na-egosi n’ịkwalite nakwa n’ime ka ụzọ ibi ndụ nke ndị nile bi na Halton Hills ka mma.”

Okwu ịja mma dị otú ahụ sitere n’aka ndị ọchịchị na-egosipụta ịbụ eziokwu nke Ndị Rom 13:3, bụ́ nke na-asị: “Nọgide na-eme ihe ọma, ị ga-enwetakwa ịja mma site [na] ya.” Otú ọ dị, otuto nile na nsọpụrụ nile kwesịrị ịgara Eze eluigwe na ala, bụ́ Jehova.